Mee Ka Ịga n’Ihu Gị Pụta Ìhè
1 Chee echiche laa azụ n’oge mbụ mgbe ị nụrụ ozi Alaeze ahụ. Eziokwu ndị dị mfe kpaliri ọchịchọ gị maka ihe ọmụma na nghọta. N’oge na-adịghị anya ị pụrụ ịhụ mkpa nke ime mgbanwe n’ụzọ ndụ gị n’ihi na ụzọ Jehova dị elu nke ukwuu karịa ụzọ gị nile. (Aịsa. 55:8, 9) I nwere ọganihu, rara ndụ gị nye, e meekwa gị baptism.
2 Ọbụna mgbe i nwesịworo ọganihu ime mmụọ ụfọdụ, a ka nwere adịghị ike ndị a na-aghaghị imeri. (Rom 12:2) Ikekwe egwu mmadụ na-atụ gị, nke mere ka ị na-ala azụ n’ikere òkè n’ozi ubi. Ma ọ bụ eleghị anya ị dịghị eru ihe a chọrọ n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Kama ịla azụ, i kpebisiri ike inwe ọganihu site n’isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke.
3 Ọtụtụ afọ pụrụ ịgafewo ugbu a kemgbe i mere nraranye gị. N’ileghachi anya azụ, ọganihu dị aṅaa ka ị pụrụ ịhụ n’ime onwe gị? Ì ruwo ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ gị? Ị̀ na-enwe ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ i ‘nwere ná mmalite’? (Hib 3:14) Timoti abụrụworị onye Kraịst tozuru okè nke nwekwara ọtụtụ afọ nke ahụmahụ mgbe Pọl gbara ya ume, sị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Tim. 4:15.
4 Nnyocha Onwe Onye Dị Mkpa: Mgbe anyị tụgharịrị uche n’ụzọ anyị gara aga, ànyị na-achọpụta na anyị ka nọ na-enwe ụfọdụ n’ime adịghị ike ndị anyị nwere mgbe anyị malitere? Ànyị adawo n’iru ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị anyị setịpụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị? N’agbanyeghị na anyị nwere ezi nzube, ọ pụrụ ịbụ na anyị egbuwo oge. Ikekwe anyị ekwewo ka nchegbu nke ndụ ma ọ bụ nrụgide nke usoro ihe a dọghachi anyị azụ.—Luk 17:28-30.
5 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime banyere oge gara aga, anyị pụrụ nnọọ ime ihe banyere ọdịnihu. Anyị pụrụ iji ezi obi nyochaa onwe anyị, chọpụta ebe anyị na-adịghị emezi, mgbe ahụkwa tinye magbalị siri ike imeziwanye ihe. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime nke ọma karị n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke, dị ka njide onwe onye, ịdị nwayọọ, ma ọ bụ ogologo ntachi obi. (Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe ma ọ bụ isoro ndị okenye arụkọ ọrụ, ọ dị mkpa ka anyị zụlite obi dị umeala.—Fil. 2:2, 2.
6 Ànyị pụrụ ime ka ịga n’ihu anyị pụta ìhè site n’iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche nke ije ozi? Site n’imekwu mgbalị ụmụnna nwoke pụrụ inwe ike iru eru dị ka ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye. Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Nye ọtụtụ ndị ọzọ, ịsụ ụzọ inyeaka pụrụ ịbụ ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru. Ndị ọzọ pụrụ ịgbalị ime ka àgwà ọmụmụ ihe onwe onye ha ka mma, ghọọ ndị na-ekere òkè nke ọma karị ná nzukọ ọgbakọ, ma ọ bụ bụrụ ndị na-arụpụta ihe karị dị ka ndị nkwusa ọgbakọ.
7 N’ezie, ọ bụ ibu ọrụ dịịrị onye ọ bula n’ime anyị ikpebi ebe anyị nwere mkpa inwe ọganihu. Anyị pụrụ ijide n’aka na ezi mgbalị anyị ‘iru n’itozu okè’ ga-etinye ihe dị ukwuu n’ọṅụ anyị ma mee anyị ndị òtù ọgbakọ na-arụpụta ihe karị.—Hib. 6:1.