ISI NKE ISE
Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
1, 2. N’ebe onye nọ ka ndị nne na nna kwesịrị ilega anya maka enyemaka n’ịzụlite ụmụ ha?
“IHE nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ,” ka otu nna nke nwere obi ekele kwupụtara n’ihe dị ka 3,000 afọ gara aga. (Abụ Ọma 127:3) N’ezie, ọṅụ nke ịbụ nne ma ọ bụ nna bụ ụgwọ ọrụ dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị di na nwunye pụrụ inweta. Otú ọ dị, ndị nwere ụmụ na-emesịa chọpụta n’oge na-adịghị anya na tinyere ọṅụ, ịbụ nne ma ọ bụ nna na-eweta ibu ọrụ.
2 Karịsịa taa, ịzụ ụmụ bụ ọrụ na-akụda obi. Ka o sina dị, ọtụtụ enwewo ihe ịga nke ọma n’ime ya, onye ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ rụtụkwara aka n’ụzọ ahụ, na-asị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” (Abụ Ọma 127:1) Ka ị na-agbasochikwu ntụziaka Jehova anya nke ọma karị, otú ahụ ka ị na-aghọkwa nne ma ọ bụ nna nke ka mma. Bible na-asị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị.” (Ilu 3:5) Ì nwere ọchịchọ obi ige ndụmọdụ Jehova ntị ka ị na-eweghara ọrụ gị nke ịzụlite nwa nke na-ewe 20 afọ?
ỊNABATA ECHICHE NKE BIBLE
3. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị bụ nna nwere ná nzụlite nke ụmụ?
3 N’ọtụtụ ebe obibi gbaa ụwa gburugburu, ndị ikom na-ele ịzụ nwa anya dị ka ọrụ nke nwanyị n’ụzọ bụ isi. N’eziokwu, Okwu nke Chineke na-arụtụ aka n’ibu ọrụ nke nna dị ka onye bụ isi na-eweta nri ezinụlọ. Otú ọ dị, ọ na-asịkwa na o nwere ibu ọrụ n’ebe obibi. Bible na-asị: “Dozie ije ozi gị n’èzí, jikerekwara ya onwe gị n’ọhịa; e mesịa wuokwa ụlọ gị.” (Ilu 24:27) N’anya Chineke, ndị nna na ndị nne bụ ndị na-arụkọ ọrụ n’ịzụ nwa.—Ilu 1:8, 9.
4. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji lee ụmụ ndị nwoke anya dị ka ndị ka ndị nwanyị mma?
4 Olee otú i si ele ụmụ gị anya? Akụkọ na-ekwu na n’Esia “ụmụ ọhụrụ bụ́ nwanyị na-enweta nnabata na-adịghị mma ọtụtụ mgbe.” Inwe echiche na-ezighị ezi megide ụmụntakịrị nwanyị ka a na-akọ na ọ ka dị na Latin America, ọbụna n’etiti “ezinụlọ ndị maara nke a na-akọ.” Otú ọ dị, nke bụ eziokwu bụ na ụmụntakịrị nwanyị abụghị ụmụaka nọ n’ọkwá nke abụọ. Jekọb, nna nke a maara nke ọma n’oge ochie, kọwara ụmụ ya nile, gụnyere ụmụ ndị nwanyị a mụrụ ruo n’oge ahụ, dị ka “ụmụ nke Chineke nyeworo [m] n’amara.” (Jenesis 33:1-5; 37:35) N’otu aka ahụ, Jisọs gọziri “ụmụntakịrị” nile (ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị) a kpọtaara ya. (Matiu 19:13-15) Anyị pụrụ inwe obi ike na o gosipụtara echiche Jehova.—Deuterọnọmi 16:14.
5. Ihe ndị dị aṅaa a ga-atụle kwesịrị iduzi mkpebi di na nwunye banyere otú ezinụlọ ha ga-aha?
5 N’ógbè unu à na-ele nwanyị anya ịmụ ọtụtụ ụmụ dị ka o kwere omume? N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ụmụ ole di na nwunye nwere bụ mkpebi onwe ha. Gịnị ma ọ bụrụ na nne na nna enweghị ike inye ọtụtụ ụmụ ihe oriri, iyikwasị ha uwe, na ịzụ ha n’akwụkwọ? N’ezie, di na nwunye ahụ kwesịrị ịtụle nke a mgbe ha na-ekpebi otú ezinụlọ ha ga-aha. Ụfọdụ di na nwunye ndị na-apụghị ịkwadonwu ụmụ ha nile na-enyefe ndị ikwu ha ibu ọrụ nke ịzụlite ụfọdụ n’ime ha. Omume nke a ọ̀ dị mma? Ọ dịchaghị. Ọ dịghịkwa anapụ ndị nne na nna ibu ọrụ ha nwere n’ebe ụmụ ha nọ. Bible na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị.” (1 Timoti 5:8) Di na nwunye nwere ezi uche na-agbalị ime atụmatụ otú “ezinụlọ” ha ga-aha ka ha wee nwee ike ‘ichere ndị nke aka ha ihe na-akpa ha.’ Hà pụrụ itinye usoro nchịkwa ọmụmụ n’ọrụ iji nwee ike ime nke a? Nke ahụ bụkwa mkpebi onwe onye, ọ bụrụkwa na di na nwunye ekpebie ịgbaso ụzọ a, nhọrọ nke ọgwụ e ji egbochi ime bụ ihe dịịrị onwe onye. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) Otú ọ dị, usoro nchịkwa ọmụmụ nke gụnyere ụdị ọ bụla nke isikwopụ afọ ime na-emegide ụkpụrụ Bible. Jehova Chineke bụ “isi iyi ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) Ya mere, ibibi ndụ mgbe a tụrụsiwooro ime ya ga-egosi oké enweghị nkwanye ùgwù maka Jehova, ọ bụkwa igbu mmadụ.—Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 139:16; Jeremaịa 1:5.
IMEZU MKPA NKE NWA GỊ
6. Olee mgbe ka ọzụzụ nke nwatakịrị kwesịrị ịmalite?
6 Ilu 22:6 na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị.” Ịzụlite ụmụ bụ ibu ọrụ ọzọ gbara ọkpụrụkpụ nke ndị nne na nna. Ma, olee mgbe ọzụzụ ahụ ga-amalite? N’ezi oge. Pọl onyeozi kwuru na a zụlitere Timoti ‘site na nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:15) Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a pụrụ izo aka n’ebe obere nwa ọhụrụ ma ọ bụ ọbụna nwa a na-amụbeghị amụ nọ. (Luk 1:41, 44; Ọrụ 7:18-20) Ya mere, Timoti natara ọzụzụ site n’oge ọ dị nnọọ ntakịrị—ọ dịkwa mma otú ahụ. Oge nwa ọhụrụ bụ oge kasị mma ịmalite ịzụ nwata. Ọbụna nwa ka dị nta nwere agụụ maka ihe ọmụma.
7. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka nne na nna ahụ wulite mmekọrịta chiri anya n’ebe nwa ọhụrụ ahụ nọ? (b) Mmekọrịta dị aṅaa dịrị n’etiti Jehova na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya?
7 “Mgbe mbụ m hụrụ nwa m,” ka otu nne na-ekwu, “m hụrụ ya n’anya.” Otú ahụ ka ọtụtụ ndị bụ nne na-eme. Nrapagide ahụ dị n’etiti nne na nwa ọhụrụ na-eto ka ha na-anọkọ ọnụ mgbe ọmụmụ nwa ahụ gasịrị. Inye nwa ara na-etinye ihe n’ichi anya ahụ. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7.) Nne ịdịda nwa ọhụrụ ya aka na ịgwa ya okwu dị mkpa n’imeju mkpa mmetụta uche nke nwa ọhụrụ ahụ. (Tụlee Aịsaịa 66:12.) Ma gịnị banyere nna ya? Ya onwe ya kwa kwesịrị iguzobe njikọ chiri anya n’ebe nwa ọhụrụ ya nọ. Jehova n’onwe ya bụ ihe atụ nke a. N’akwụkwọ Ilu, anyị na-amụta banyere mmekọrịta Jehova na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, onye e gosipụtara na ọ na-ekwu, sị: “Jehova nwere m ná mmalite ụzọ Ya . . . M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị.” (Ilu 8:22, 30; Jọn 1:14) N’ụzọ yiri nke ahụ, ezi nna na-azụlite mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke ịhụnanya ya na nwa ya site kpọmkwem ná mmalite nke ndụ nwa ahụ. “Gosi ọtụtụ mmetụta,” ka otu nna na-ekwu. “Ọ dịghị nwa nwụtụrụla n’ihi mmakụ na nsusu ọnụ.”
8. Mkpali echiche dị aṅaa ka nne na nna kwesịrị inye ụmụ ọhụrụ ozugbo o kwere omume?
8 Ma ụmụ ọhụrụ nwere mkpa karịrị nke ahụ. Site n’oge a mụrụ ha, ụbụrụ ha dị njikere ịnabata na idebe ihe ọmụma, ndị nne na nna bụkwa isi iyi bụ isi maka nke a. Were asụsụ dị ka ihe atụ. Ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na ókè nwata mụtaruru ikwu okwu na ịgụ ihe ka “e chere na o nwere njikọ chiri anya n’ụdị mmekọrịta nwata ahụ na nne na nna ya nwere ná mmalite.” Kwunyere nwa gị okwu ma gụọrọ ya ihe site na nwata gaa n’ihu. N’oge na-adịghị anya ọ ga-achọ iṅomi gị, n’oge na-adịghịkwa anya ị ga na-akụziri ya ịgụ ihe. Eleghị anya, ọ ga-enwe ike ịgụ ihe tupu ọ banye n’ụlọ akwụkwọ. Nke ahụ ga-abụ ihe enyemaka pụrụ iche ma ọ bụrụ na i bi ná mba ebe e nwere ndị nkụzi ole na ole na klas na-ejubiga ókè.
9. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ kasị mkpa nke dị ndị nne na nna mkpa icheta?
9 Nchegbu bụ isi nke nne na nna bụ́ ndị Kraịst bụ imeju mkpa ime mmụọ nke nwa ha. (Lee Deuterọnọmi 8:3.) Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya? Inyere nwa ha aka ịzụlite ọdịdị nke Kraịst, ya bụ, iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” ahụ. (Ndị Efesọs 4:24) Maka nke a ọ dị ha mkpa ịtụle ihe ndị dị mma e ji ewu ụlọ na ụzọ ndị dị mma isi wuo ụlọ.
KỤNYE EZIOKWU AHỤ N’IME NWA GỊ
10. Àgwà dịgasị aṅaa dị ụmụaka mkpa ịzụlite?
10 Ọdịdị nke ụlọ dabeere nke ukwuu n’ụdị ihe ndị e ji ewu ụlọ e ji mee ihe n’ihe owuwu ahụ. Pọl onyeozi kwuru na ihe kachasị mma iji wuo ụlọ maka ọdịdị ndị Kraịst bụ “ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ.” (1 Ndị Kọrint 3:10-12) Ndị a na-ese onyinyo àgwà ndị dị ka okwukwe, amamihe, nghọta, ịnọgidesi ike n’ihe, nkwanye ùgwù, na obi ekele site n’ịhụnanya maka Jehova na iwu ya. (Abụ Ọma 19:7-11; Ilu 2:1-6; 3:13, 14) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka site nnọọ ná mmalite nke oge nwata ịzụlite àgwà ndị a? Site n’ịgbaso usoro e depụtara ogologo oge gara aga.
11. Olee otú nne na nna bụ́ ndị Israel si nyere ụmụ ha aka ịzụlite ọdịdị Chineke?
11 N’oge na-adịghị anya tupu mba Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Israel, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ee, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịbụ ihe atụ, ndị mkpakọrịta, ndị na-ekwurịta okwu, na ndị nkụzi.
12. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na nne na nna bụ ihe atụ dị mma?
12 Bụrụ ihe atụ. Mbụ, Jehova sịrị: “Okwu ndị a . . . ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” O wee kwukwasị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.” Ya mere àgwà Chineke aghaghị ibu ụzọ dịrị n’obi nne ma ọ bụ nna ahụ. Nne ma ọ bụ nna ahụ aghaghị ịhụ eziokwu n’anya ma na-ebi n’ụzọ kwekọrọ na ya. Nanị mgbe ahụ ka ọ pụrụ iru n’obi nwata ahụ. (Ilu 20:7) N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ụmụntakịrị na-ahụ na-emetụta ha karịa ihe ha na-anụ.—Luk 6:40; 1 Ndị Kọrint 11:1.
13. N’ilebara ụmụ ha anya, olee otú ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ihe atụ Jisọs?
13 Bụrụ onye mkpakọrịta. Jehova gwara ndị nne na nna n’Israel, sị: ‘Soro ụmụ unu kwurịta okwu mgbe unu na-anọdụ ala n’ụlọ unu na mgbe unu na-eje ije n’ụzọ.’ Nke a chọrọ iwepụta oge soro ụmụ ahụ nọkọọ n’agbanyeghị otú nne na nna ahụ si jideruo ọrụ n’aka. Ihe àmà na-egosi na Jisọs nwere mmetụta na ụmụntakịrị ruru eru inweta oge ya. N’ụbọchị ndị ikpeazụ nke ozi ya, “ha wee kutara Ya ụmụntakịrị, ka O wee metụ ha aka.” Gịnị bụ mmeghachi omume nke Jisọs? “O wee kuru ha n’aka Ya, . . . wee gọzie ha nke ọma.” (Mak 10:13, 16) Leedị, hour ndị ikpeazụ nke ndụ Jisọs na-abịa ngwa ngwa. N’agbanyeghị nke ahụ, o nyere ụmụntakịrị ndị a oge na nlebara anya ya. Lee ezi ihe mmụta nke a bụ!
14. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe abamuru nne na nna iwepụta oge soro nwa ha nọkọọ?
14 Bụrụ onye na-ekwurịta okwu. Iwepụta oge soro nwa gị nọkọọ ga-enyere gị aka iso ya kwurịta okwu. Ka ị na-ekwurịta okwu karị, otú ahụ ka ị ga-aghọta nke ọma karị otú ọdịdị ya si na-etolite. Ma, cheta, nkwurịta okwu karịrị nanị ikwu okwu. “Aghaghị m ịzụlite nkà nke ige ntị,” ka otu nne na Brazil kwuru, “na-eji obi m na-ege ntị.” Ndidi ya mịpụtara mkpụrụ mgbe nwa ya malitere ịkọrọ ya mmetụta ndị ọ na-enwe.
15. Gịnị ka ọ dị mkpa iburu n’uche mgbe a bịara ná ntụrụndụ?
15 “Mgbe ịchị ọchị . . . na mgbe ite egwú,” oge maka ntụrụndụ, dị ụmụntakịrị mkpa. (Eklisiastis 3:1, 4; Zekaraịa 8:5) Ntụrụndụ na-arụpụta ihe dị ukwuu mgbe nne na nna na ụmụntakịrị nwekọrọ ya ọnụ. Ọ bụ eziokwu dị mwute na n’ọtụtụ ebe obibi ntụrụndụ pụtara ilele telivishọn. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ihe omume telivishọn pụrụ ịkpa ọchị, ọtụtụ n’ime ha na-emebi ụkpụrụ ọma, ilele telivishọn yikwara ka ọ na-abịada nkwurịta okwu n’ezinụlọ. Ya mere, gịnị ma i soro ụmụ gị mee ihe nkà? Bụọ abụ, gwuo egwu, soro ndị enyi kparịta, leta ebe ndị na-enye ọṅụ. Ihe omume ndị dị otú ahụ na-akwalite nkwurịta okwu.
16. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha banyere Jehova, oleekwa ụzọ ha kwesịrị isi mee ya?
16 Bụrụ onye nkụzi. “Ị ga-ejisikwa ike izi [okwu ndị a],” ka Jehova sịrị. Ihe a na-ekwu n’ebe a na-agwa gị ihe a ga-ezi na ụzọ isi zie ya. Nke mbụ, “ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Deuterọnọmi 6:5) Mgbe ahụ, ‘okwu ndị a . . . ị ga-ejisikwa ike izi ha.’ Kụnye ntụziaka nke a haziri iji zụlite ịhụnanya sitere n’obi dum maka Jehova na iwu ya. (Tụlee Ndị Hibru 8:10.) Okwu ahụ bụ “izi” pụtara ịkụzi ihe site n’ime ihe ugboro ugboro. Ya mere Jehova, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, na-agwa gị na ụzọ bụ isi isi nyere ụmụ gị aka ịzụlite ọdịdị nke Chineke bụ ikwu okwu banyere ya mgbe nile. Nke a gụnyere iso ha nwee ọmụmụ Bible chiri anya.
Nne na nna, bụrụnụ ihe atụ, ndị mkpakọrịta, ndị na-ekwurịta okwu, na ndị nkụzi
17. Gịnị pụrụ ịdị ndị nne na nna mkpa ịzụlite ná nwa ha? N’ihi gịnị?
17 Ọtụtụ ndị nne na nna maara na itinye ihe ọmụma n’ime obi nwatakịrị adịghị mfe. Pita onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.” (1 Pita 2:2) Okwu ahụ bụ́ ‘ka agụụ . . . na-agụsi unu ike’ na-apụta na ọtụtụ adịghị enwe agụụ n’ime onwe ha maka nri ime mmụọ. Ọ pụrụ ịdị nne na nna mkpa ịchọta ụzọ isi zụlite agụụ ahụ n’ime nwa ha.
18. Olee ụzọ izi ihe ụfọdụ nke Jisọs nke a na-agba ndị nne na nna ume iṅomi?
18 Jisọs ruru n’obi site n’iji ihe atụ mee ihe. (Mak 13:34; Luk 10:29-37) Ụzọ izi ihe nke a na-adị irè nke ukwuu n’ebe ụmụaka nọ. Kụzie ụkpụrụ Bible site n’iji akụkọ ndị mara mma, ndị na-adọrọ mmasị, ikekwe ndị ahụ a na-ahụta ná mbipụta bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible.a Mee ka ụmụaka ahụ sonye. Kwee ka ha jiri nkà ha mee ihe n’ise na ime ihe ngosi nke ihe ndị mere na Bible. Jisọs jikwara ajụjụ mee ihe. (Matiu 17:24-27) Ṅomie ụzọ ya n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ gị. Kama ikwupụta nanị otu iwu Chineke, jụọ ajụjụ ndị dị ka, N’ihi gịnị ka Jehova ji nye anyị iwu a? Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị edebe ya? Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị edebeghị ya? Ajụjụ ndị dị otú ahụ na-enyere nwata aka iche echiche na ịhụ na iwu Chineke dị irè dịkwa mma.—Deuterọnọmi 10:13.
19. Ọ bụrụ na nne na nna agbasoo ụkpụrụ Bible n’imeso ụmụ ha ihe, abamuru buru ibu dịgasị aṅaa ka ụmụaka ahụ ga-enweta?
19 Site n’ịbụ ihe atụ, onye mkpakọrịta, onye nkwurịta okwu, na onye nkụzi, ị pụrụ inyere nwa gị aka site n’afọ ya ndị mbụ iguzobe mmekọrịta onwe onye chiri anya nke ya na Jehova Chineke. Mmekọrịta a ga-agba nwa gị ume inwe obi ụtọ dị ka onye Kraịst. Ọ ga-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe ya ọbụna mgbe o zutere nrụgide ndị ọgbọ na ọnwụnwa dị iche iche. Na-enyere ya aka mgbe nile iji mmekọrịta a dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe.—Ilu 27:11.
MKPA GBARA ỌKPỤRỤKPỤ NKE ỊDỌ AKA NÁ NTỊ
20. Gịnị bụ ịdọ aka ná ntị, oleekwa otú e kwesịrị isi nye ya?
20 Ịdọ aka ná ntị bụ ọzụzụ nke na-agbazi echiche na obi. Ụmụaka chọrọ ya mgbe nile. Pọl dụrụ ndị bụ nna ọdụ ka ha “na-azụpụta [ụmụ ha] n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ndị nne na nna kwesịrị inye ịdọ aka ná ntị n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Jehova na-eme. (Ndị Hibru 12:4-11) A pụrụ inyefe ịdọ aka ná ntị nke dabere n’ịhụnanya site n’ịtụgharị uche. N’ihi ya, a na-agwa anyị ka anyị ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị.’ (Ilu 8:33) Olee otú e kwesịrị isi nye ịdọ aka ná ntị?
21. Ụkpụrụ dịgasị aṅaa ka ndị nne na nna kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-adọ ụmụ ha aka ná ntị?
21 Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ịdọ ụmụ ha aka ná ntị gụnyere nanị ịgwa ha okwu n’olu iyi egwu, na-abara ha mba, ma ọ bụ ọbụna na-akparị ha. Otú ọ dị, n’otu isiokwu ahụ, Pọl na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe.” (Ndị Efesọs 6:4) A gbara ndị Kraịst nile ume ka ha ‘dị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ . . . n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ha aka ná ntị.’ (2 Timoti 2:24, 25) Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst, ọ bụ ezie na ha na-aghọta mkpa nke ịnọgidesi ike, na-agbalị idebe okwu ndị a n’uche ha mgbe ha na-adọ ụmụ ha aka ná ntị. Ma, mgbe ụfọdụ, ịtụgharị uche adịghị ezu, ụdị ụfọdụ nke inye ahụhụ pụkwara ịdị mkpa.—Ilu 22:15.
22. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e nye nwata ahụhụ, gịnị ka a na-aghaghị inyere ya aka ịghọta?
22 Ụmụaka dị iche iche chọrọ ụdị dị iche iche nke ịdọ aka ná ntị. Ụfọdụ abụghị ‘ndị okwu nkịtị na-agbazi’ (NW). Nye ha, ahụhụ nke a na-enye n’oge ụfọdụ maka nnupụisi pụrụ ịzọpụta ndụ. (Ilu 17:10; 23:13, 14; 29:19) Ma, nwata kwesịrị ịghọta ihe mere e ji enye ahụhụ. ‘Mkpanaka na ịba mba na-enye amamihe.’ (Ilu 29:15; Job 6:24) Ọzọkwa, inye ahụhụ nwere ókè. “M ga-adọ gị aka ná ntị [ruo n’ókè kwesịrị ekwesị, NW],” ka Jehova gwara ndị ya. (Jeremaịa 46:28b) Ọ dịghị ụzọ Bible si na-akwado iji iwe pịa ihe ma ọ bụ iti ihe nke dị njọ, nke na-echihịasị na ọbụna na-emerụsị nwatakịrị ahụ.—Ilu 16:32.
23. Gịnị ka nwatakịrị kwesịrị inwe ike ịghọta mgbe nne na nna ya nyere ya ahụhụ?
23 Mgbe Jehova gwara ndị ya na ọ ga-adọ ha aka ná ntị, o bu ụzọ sị: “Atụla egwu . . . n’ihi na gị ka M nọnyeere.” (Jeremaịa 46:28a) N’otu aka ahụ, ịdọ aka ná ntị nne na nna, n’ọdịdị ọ bụla kwesịrị ekwesị, ekwesịghị ma ọlị idebe nwatakịrị n’ọnọdụ nke ịbụ onye a jụrụ ajụ. (Ndị Kọlọsi 3:21) Kama nke ahụ, nwa ahụ kwesịrị ịghọta na e nyere ịdọ aka ná ntị ahụ n’ihi na nne ma ọ bụ nna ahụ ‘nọnyeere ya,’ n’akụkụ ya.
CHEBE NWA GỊ PỤỌ NÁ MMERỤAHỤ
24, 25. Gịnị bụ otu ihe iyi egwu jọrọ njọ nke nchebe dị ụmụntakịrị mkpa site na ya n’ụbọchị ndị a?
24 Ọtụtụ ndị toworo eto na-eleghachi anya azụ n’oge nwata ha dị ka oge obi ụtọ. Ha na-echetaghachi mmetụta na-ekpo ọkụ nke ịnọ ná nchebe, mmesi obi ike nke na ndị nne na nna ha ga-elekọta ha n’agbanyeghị ihe merenụ. Ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha nwee mmetụta otú ahụ, ma n’ụwa taa nke ndakpọ omume, ọ na-esi ike karịa ka ọ dị na mbụ ime ka ụmụaka nọrọ ná nchebe.
25 Otu ihe iyi egwu jọrọ njọ nke toliteworo n’afọ ndị a bụ mmetọ mmekọahụ nke ụmụaka. Na Malaysia, akụkọ nke mmetọ ụmụaka rịrị elu okpukpu anọ n’ogologo oge nke afọ iri. Na Germany a na-emetọ ihe dị ka 300,000 ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ kwa afọ, ma n’otu mba nke Ebe Ndịda America, dị ka otu nchọpụta na-egosi, ọnụ ọgụgụ dị egwu nke e mere atụmatụ ya kwa afọ bụ 9,000,000! N’ụzọ dị mwute, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka ndị a bụ ndị e metọrọ n’ebe obibi nke aka ha site n’aka ndị ha maara ma tụkwasị obi. Ma ụmụaka kwesịrị inwe ihe mgbochi siri ike n’ebe nne na nna ha nọ. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi bụrụ ndị nchebe?
26. Olee ụzọ ụfọdụ a purụ isi debe ụmụaka ná nchebe, oleekwa otú ihe ọmụma pụrụ isi chebe nwatakịrị?
26 Ebe ahụmahụ na-egosi na ụmụaka ndị na-amaghị ihe banyere mmekọahụ bụ ndị a na-ekpughekarị nye ndị na-emetọ ụmụaka, otu nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ maka nchebe bụ ịkụziri nwa ahụ ihe, ọbụna mgbe ọ ka dị nta. Ihe ọmụma pụrụ inye nchebe pụọ “n’ụzọ onye ọjọọ, n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ.” (Ilu 2:10-12) Ihe ọmụma gịnị? Ihe ọmụma nke ụkpụrụ Bible, nke ihe dị mma na ihe dị njọ n’ụzọ omume. Ihe ọmụma kwa nke na ụfọdụ ndị toworo eto na-eme ihe ndị dị njọ nakwa na ọ bụghị iwu na onye na-eto eto ga-erube isi mgbe ndị mmadụ na-atụ aro ihe na-ekwesịghị ekwesị. (Tụlee Daniel 1:4, 8; 3:16-18.) Emela ka ntụziaka dị otú ahụ bụrụ nanị n’otu oge nke nkwurịta okwu. Ọ na-adị ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ụmụntakịrị mkpa ịmụghachi ihe ọmụmụ ugboro ugboro tupu ha ana-echeta ya nke ọma. Ka ụmụaka na-emewanye okenye, nna ga-eji ịhụnanya kwanyere ikike ihe dịịrị onwe onye nke nwa ya nwanyị ùgwù, nne nyekwa nwa ya nwoke—si otú a na-emesikwu ike echiche nke nwa ahụ ịmara ihe ziri ezi. N’eziekwa, otu n’ime ihe nchebe kasị mma megide mmetọ bụ nlekọta chiri anya site n’aka gị dị ka nne ma ọ bụ nna.
CHỌỌ NDUZI CHINEKE
27, 28. Ònye bụ Isi Iyi kasị ukwuu nke enyemaka maka ndị nne na nna mgbe ha na-eche ihe ịma aka nke ịzụlite nwata ihu?
27 N’eziokwu, ọzụzụ nke nwata site na nwa ọhụrụ bụ ihe ịma aka, ma ọ dịghị mkpa na nne na nna bụ́ ndị kwere ekwe ga-eche ịma aka ahụ ihu nanị ha. Laa azụ n’ụbọchị Ndị Ikpe, mgbe otu nwoke a na-akpọ Manoa nụrụ na ọ gaje ịbụ nna, ọ rịọrọ Jehova maka nduzi n’ịzụlite nwa ya. Jehova zara ekpere ya.—Ndị Ikpe 13:8, 12, 24.
28 N’ụzọ yiri nke ahụ taa, ka ndị nne na nna bụ́ ndị kwere ekwe na-azụlite ụmụ ha, ha pụkwara ịgwa Jehova okwu n’ekpere. Ịbụ nne ma ọ bụ nna bụ ọrụ siri ike, ma e nwere ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst na Hawaii na-asị: “I nwere afọ 12 iji rụchapụ ọrụ gị tupu afọ ndị ahụ dị egwu nke afọ iri na ụma. Ma ọ bụrụ na ị rụsiwo ọrụ ike iji tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ọ bụ oge iji nweta ọṅụ na udo mgbe ha kpebiri na ha chọrọ ife Jehova site n’obi.” (Ilu 23:15, 16) Mgbe nwa gị mere mkpebi ahụ, a ga-akwali gị onwe gị kwa iti mkpu, sị: “Ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.”
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.