Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/15 p. 8-13
  • Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta Site n’Akụkọ Ihe Mere Eme
  • Otu Amụma Banyere Oge Anyị
  • Rite Uru Bara Ụba
  • Ànyị Bi “n’Ụbọchị Ikpeazụ” n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?
    Nọrọ na Nche!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/15 p. 8-13

Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu

“Mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. Ma ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”​—⁠2 TIMOTI 3:​1, 13.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee mmasị n’ozizi ndị anyị na-agbaso?

ÀNA-ENYERE gị aka, ka à na-emerụ gị ahụ? À na-egbo mkpa gị, ka à na-eme ka ha ka njọ? Site na gịnị? Site n’ozizi. Ee, ozizi pụrụ imetụta ndụ gị nke ukwuu n’ụzọ ka mma ma ọ bụ n’ụzọ ka njọ.

2 Mmadụ atọ ji ọkwá osote prọfesọ mụrụ banyere nke a n’oge na-adịbeghị anya ma wepụta ihe ndị ha chọpụtara na magazin bụ́ Journal for the Scientific Study of Religion. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ha amụghị banyere gị ma ọ bụ ezinụlọ gị. Ma, ihe ha chọpụtara na-egosi ihe njikọ dị n’etiti ozizi na ọganihu, ma ọ bụ ọdịda nke mmadụ, n’ịnagide oge anyị nke dị oké egwu. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-arịba ama ihe ha chọpụtara.

3, 4. Olee ihe àmà ụfọdụ na-egosi na anyị na-ebi n’oge dị oké egwu?

3 Otú ọ dị, ná mbụ, tụlee ajụjụ nke a: Ì kwetara na anyị na-ebi n’oge dị oké egwu? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ị ga-ahụ n’ezie na ihe àmà na-anwapụta na ndị a bụ “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:​1-⁠5) Ụzọ o si emetụta ndị mmadụ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ị maara ala dị iche iche a na-adọkasị ugbu a ka òtù dị iche iche na-alụ ọgụ maka nke ga-aka ibe ya n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ebe ndị ọzọ, ihe na-akpata igbu ndị mmadụ bụ esemokwu okpukpe ma ọ bụ nke agbụrụ. Ọ bụghị nanị ndị soja ka a na-emerụ ahụ. Chee echiche banyere ndị inyom na ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị e mekpọworo ọnụ ma ọ bụ ndị agadi a napụworo nri, okpomọkụ, na ebe obibi. Ọnụ ọgụgụ a na-apụghị ịgụta agụta na-ata ahụhụ n’ụzọ dị njọ, na-eduga n’ọnụ ọgụgụ karịrị akarị nke ndị gbara ọsọ ndụ na ọtụtụ nhụjuanya ndị metụtara ya.

4 Ihe e jikwa mara oge anyị bụ nsogbu akụ̀ na ụba, na-akpata ụlọ ọrụ ndị e mechiri emechi, enweghị ọrụ, ntụfu ego enyemaka maka ndị ihe na-esiri ike, ego ezumike nká, ndakpọ nke ikike ego, nri dị ntakịrị karị ma ọ bụ iri ugbo nri dị ole na ole karị. Ị̀ pụrụ itinyekwu ihe n’ihe ndepụta nsogbu ndị ahụ? Ma eleghị anya ị pụrụ. Ọtụtụ nde ndị ọzọ gburugburu ụwa na-ata ahụhụ ụkọ nri na ọrịa dị iche iche. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo foto ndị na-awụ ibubo n’ahụ bụ́ ndị sitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, ndị na-egosi ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka tachasịrị ahụ. Ọtụtụ nde mmadụ n’Esia na-ata ahụhụ n’otu aka ahụ.

5, 6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọrịa bụkwa akụkụ pụtara ìhè nke oge anyị dị oké egwu?

5 Anyị nile anụwo banyere ọrịa ndị na-atụ ụjọ bụ́ ndị na-aba ụba ugbu a. Na January 25, 1993, The New York Times kwuru, sị: “N’inwe ihe ịga nke ọma n’etiti inwe mmekọahụ aghara aghara, ihu abụọ na mgbochi a na-ahazighị ahazi, ọrịa AIDS na Latin America na-aga n’ihu karịa nke United States . . . Ihe ka n’ịba ụba ahụ na-abịa site n’ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị na-ebute ọrịa n’etiti . . . ndị inyom.” N’October 1992, U.S.News & World Report sịrị: “Ọ bụ nanị iri afọ abụọ gara aga ka onye dibịa ukwu United States mara ọkwa na oge eruwo maka ‘ịkwụsị inwe nchegbu banyere ọrịa na-efe efe’ mgbe ọ na-aja otu n’ime mmeri ndị kasị ukwuu e nwetụrụla n’ahụ ike ọha na eze mma.” Gịnị banyere ugbu a? “Ụlọ ọgwụ dị iche iche na-ejupụtakwa ọzọ ná ndị ọrịa nwere ihe otiti ndị e chere na e meriwo ha. . . . Ụmụ nje ọrịa anya na-adịghị ahụ na-emepụta ihe ịlụ ọgụ ndị dị ná mkpụrụ ndụ, bụ́ ndị dị akọ karị, ndị na-enye ha ohere ịmụba ọsọ ọsọ karịa ka a na-emepụta ọgwụ ọhụrụ ndị na-egbu nje. . . . ‘Anyị na-abanye n’ọgbọ ọhụrụ nke ọrịa ndị na-efe efe.’”

6 Dị ka otu ihe atụ, Newsweek nke January 11, 1993, kọrọ, sị: “Nje ọrịa ịba na-efe ugbu a ihe dị ka 270 nde mmadụ kwa afọ, na-egbu ihe ruru nde mmadụ 2 . . . na-akpatakwa ọ dịkarịa ala 100 nde ọnọdụ ọrịa ndị siri ike. . . . N’otu oge ahụ, ọrịa ahụ na-eguzogide ọgwụ ndị e jibu agwọ ya n’ụzọ dị ukwuu karị. . . . N’oge na-adịghị anya ụdị ya ụfọdụ apụghị ikwe ngwọta.” Ọ na-eme ka ahụ maa gị jijiji.

7. Olee otú ọtụtụ taa si emeghachi omume n’ebe oge ndị siri ike ndị a dị?

7 Ọ pụrụ ịbụ na ị rịbawo ama na n’oge ndị a dị oké egwu, ọtụtụ ndị na-achọ enyemaka iji gwọta nsogbu ha dị iche iche. Chee echiche banyere ndị na-echigharịkwuru akwụkwọ dị iche iche na-ekwu banyere ịnagide oké nchegbu ma ọ bụ ụdị ọrịa ọhụrụ. Ndị ọzọ nọ n’oké mkpa maka ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye na-ada ada, banyere nlekọta ụmụaka, banyere nsogbu dị iche iche maka ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ banyere otú a ga-esi hazie ihe iji nagide ihe ndị ọrụ ha chọrọ ha n’aka na ihe nrụgide ndị ha na-enwe n’ụlọ. Ee, enyemaka dị ha nnọọ mkpa! Ị̀ na-agbaso nsogbu onwe onye mgba ma ọ bụ na-enwe ụfọdụ n’ime nsogbu ndị agha, ụnwụ nri, ma ọ bụ ọdachi kpatara? Ọbụna ma ọ bụrụ na nsogbu siri ike na-eyi ka ọ̀ gabigawo ngwọta, i nwere ihe mere ị ga-eji jụọ sị, ‘N’ihi gịnị ka anyị jiworo ruo ọnọdụ dị oké egwu otú a?’

8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chigharịkwuru Bible maka nghọta na nduzi?

8 Tupu anyị enwee ike ịnagide n’ụzọ dị irè ma nweta afọ ojuju ná ndụ ugbu a na n’ọdịnihu, ọ dị anyị mkpa ịmara ihe mere anyị ji na-eche oge ndị dị oké egwu otú a ihu. N’ikwu eziokwu, nke ahụ na-enye onye ọ bụla n’ime anyị ihe mere anyị ga-eji tụlee Bible. N’ihi gịnị ka anyị ji ezo aka n’ebe Bible dị? N’ihi na ọ bụ nanị ya nwere amụma ziri ezi, akụkọ ihe mere eme nke e dere tupu ha emee, bụ́ ndị na-egosi ihe kpatara nsogbu anyị, ebe anyị nọ, na ebe anyị na-aga.

Ihe Mmụta Site n’Akụkọ Ihe Mere Eme

9, 10. Olee otú e si mezuo amụma Jisọs na Matiu isi 24 na narị afọ mbụ?

9 Ụlọ Nche nke February 15, 1994, wepụtara ntụleghachi dị ịrịba ama nke amụma doro anya nke Jisọs na Matiu isi 24. Ọ bụrụ na i mepee Bible gị n’isiakwụkwọ ahụ, ị pụrụ ịhụ n’amaokwu nke 3 na ndị ozi Jisọs jụrụ banyere ihe ịrịba ama banyere ọnụnọ ya n’ọdịnihu na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 5 ruo 14, Jisọs buru amụma banyere Kraịst ụgha dị iche iche, agha, ụkọ nri, mkpagbu nke ndị Kraịst, mmebi iwu, na nkwusa zuru ebe nile banyere Alaeze Chineke.

10 Akụkọ ihe mere eme na-egosi na kpọmkwem ihe ndị ahụ weere ọnọdụ n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu. Ọ bụrụ na ị dịrị ndụ mgbe ahụ, oge ndị ahụ ọ́ garaghị abụ oge ndị siri ike? Otú ọ dị, ihe dị iche iche na-agaru ọgwụgwụ ha, bụ́ mkpagbu nke Jerusalem na usoro ihe nke ndị Juu nke ihe dị ka ya na-adịtụbeghị. N’amaokwu nke 15 anyị na-amalite ịgụ banyere ihe merenụ mgbe ndị Rom wakwasịrị Jerusalem na 66 O.A. Ihe omume ndị ahụ bịara n’ọgwụgwụ ha ná mkpagbu ahụ nke Jisọs kwuru okwu banyere ya n’amaokwu nke 21​—⁠mbibi nke Jerusalem na 70 O.A., mkpagbu kasị njọ nke dakwasịtụrụla obodo ahụ. Ma, ị maara na akụkọ ihe mere eme akwụsịghị mgbe ahụ, Jisọs ekwughịkwa na ọ ga-akwụsị. N’amaokwu nke 23 ruo 28, o gosiri na mgbe mkpagbu ahụ nke 70 O.A. gasịrị, ihe ndị ọzọ ga-eme.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka mmezu narị afọ mbụ nke Matiu isi 24 si metụta ụbọchị anyị?

11 Ọ pụrụ ịdị ụfọdụ taa ka ọ̀ bụ ha wezụga ihe ndị dị otú a sitere n’oge gara aga n’ụsọ site n’ịsị, ‘gịnị mezie?’ Nke ahụ ga-abụ imehie ihe. Mmezu nke amụma laa azụ n’oge ahụ dị mkpa. N’ihi gịnị? Ọ dị mma, agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ihe otiti dị iche iche, na mkpagbu n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu gaje ịbụ nke e gosipụtara ná mmezu ka ukwuu mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụrụ na 1914. (Luk 21:24) Ọtụtụ ndị dị ndụ ugbu a ji anya ha hụ Agha Ụwa Mbụ mgbe mmezu nke a nke oge a malitere. Ọbụna ọ bụrụ na a mụrụ gị mgbe 1914 gasịrị, ị hụwo ka a na-emezu amụma Jisọs kemgbe ahụ. Ihe ndị na-eme na narị afọ nke 20 nke a na-anwapụta n’ụzọ dị ukwuu na anyị na-ebi ugbu a n’oge ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a.

12. Dị ka Jisọs kwuru, gịnị ka anyị ka pụrụ ịtụ anya ịhụ?

12 Nke a pụtara na “mkpagbu” nke Matiu 24:29 dị anyị n’ihu. Ọ ga-agụnye ihe omume dị iche iche nke eluigwe ndị pụrụ ịbụ ihe ndị a na-apụghị ichetụdị n’echiche. Amaokwu nke 30 na-egosi na ndị mmadụ ga-ahụ mgbe ahụ ihe ịrịba ama dị iche​—⁠nke na-egosi na mbibi dị nso. Dị ka ihe ndekọ yiri nke ahụ na Luk 21:​25-⁠28 si kọọ, n’oge ahụ dị n’ihu, ‘ụmụ mmadụ ga-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ Ihe ndekọ Luk na-ekwukwa na mgbe ahụ ndị Kraịst ga-eweli isi ha elu n’ihi na mgbapụta ha ga-adị ezi nso.

13. Isi ihe abụọ dị aṅaa ndị bụ isi kwesịrị ka anyị lebara anya?

13 ‘Ekwerewo m ma kweta na nke ahụ,’ ka ị pụrụ ikwu, ‘ma m chere na ihe bụ isiokwu bụ otú m pụrụ isi ghọta ma chee oge anyị ndị a siri ike ihu?’ I ziri ezi. Isi ihe anyị mbụ bụ ịmara nsogbu ndị bụ isi ma hụ otú anyị pụrụ isi zere ha. Ihe e jikọtara ya na nke ahụ bụ isi ihe nke abụọ, otú azịza dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere anyị aka inwe ndụ ka mma ugbu a. N’ihe banyere nke a, mepee Bible gị gaa na 2 Timoti isi 3, wee hụ otú okwu ndị nke Pọl onyeozi pụrụ isi nyere gị aka iche oge ndị a siri ike ihu.

Otu Amụma Banyere Oge Anyị

14. N’ihi gịnị ka e ji nwee ihe mere a ga-eji kwere na ntụle nke 2 Timoti 3:​1-⁠5 pụrụ ịbara anyị uru?

14 Chineke nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ idegara onye Kraịst ahụ na-eguzosi ike n’ihe bụ́ Timoti ndụmọdụ dị mma nke ukwuu nke nyeere ya aka ibi ndụ nwere ihe ịga nke ọma na obi ụtọ karị. Akụkụ nke ihe Pọl dere gaje inwe mmetụta bụ isi n’ụbọchị anyị. Ọbụna ọ bụrụ na ị na-eche na ị maara ha nke ọma, gbasoo okwu amụma ndị ahụ nke 2 Timoti 3:​1-⁠5 n’ụzọ chiri anya. Pọl dere, sị: “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.”

15. N’ihi gịnị ka 2 Timoti 3:1 kwesịrị iji masị anyị n’ụzọ pụrụ iche ugbu a?

15 Biko rịba ama, e nwere ihe 19 e depụtara. Tupu anyị atụlee ihe ndị a ma bịa n’ọnọdụ nke irite uru na ha, kwụsịtụ ma ghọta ihe dum a na-ekwu. Lee anya n’amaokwu nke 1. Pọl buru amụma, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ.” “Mgbe ikpeazụ” nke ole? E nwewo ọtụtụ mgbe ikpeazụ, dị ka mgbe ikpeazụ nke Pompeii oge ochie ma ọ bụ mgbe ikpeazụ nke onye eze ma ọ bụ ezinụlọ na-achị achị. Ọbụna na Bible na-ekwu okwu banyere ọtụtụ mgbe ikpeazụ, dị ka mgbe ikpeazụ nke usoro ihe ndị Juu. (Ọrụ 2:​16, 17) Otú ọ dị, Jisọs nyere ihe mgbakwasị ụkwụ maka anyị iji ghọta na “mgbe ikpeazụ” Pọl kpọtụrụ uche na ya na-ekwu maka oge anyị.

16. Ọnọdụ dị aṅaa ka ilu nke ọka na ata na-ebu amụma ya maka oge anyị?

16 Jisọs ji ilu banyere ọka na ata mee otú ahụ. A kụrụ ndị a n’ubi ma hapụ ha ka ha too. Ọ sịrị na ọka na ata ndị ahụ na-anọchite anya ndị mmadụ​—⁠ezi ndị Kraịst na ndị ụgha. Anyị na-ewelite ilu nke a n’ihi na ọ na-egosipụta na ogologo oge ga-agabiga tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a dum. Mgbe nke ahụ bịara, ọ dị ihe ga-aba ụba. Gịnị? Ndapụ n’ezi ofufe, ma ọ bụ ichigharị pụọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, na-arụpụta mkpụrụ buru ibu nke ajọ omume. Amụma ndị ọzọ nke Bible na-akwado na nke a ga-ewere ọnọdụ na mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Ọ bụ n’ebe ahụ ka anyị nọ, n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.​—⁠Matiu 13:​24-30, 36-⁠43.

17. Ihe ọmụma dị aṅaa nke yiri ya ka 2 Timoti 3:​1-⁠5 na-enye anyị banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?

17 Ị̀ na-ahụ ihe nke a pụtara? Timoti nke Abụọ 3:​1-⁠5 na-enye anyị ihe yiri nke ahụ nke na-egosi na n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ma ọ bụ na mgbe ikpeazụ, mkpụrụ ga-agba ndị Kraịst gburugburu ga-adị njọ. Pọl anaghị ekwu na ihe 19 ahụ e depụtara ga-abụ ụzọ bụ isi isi gosipụta na mgbe ikpeazụ abịaruwo. Kama nke ahụ, ọ na-adọ aka ná ntị banyere ihe anyị gaje ịgbaso mgba na mgbe ikpeazụ. Amaokwu nke 1 na-ekwu banyere “oge dị oké egwu.” Okwu ahụ sitere na Grik, ọ pụtakwara n’ụzọ nkịtị “oge ụjọ a kara aka.” (Kingdom Interlinear) Ọ̀ bụ na i kweghị na “ụjọ” na-akọwa n’ụzọ kwesịrị ekwesị ihe anyị na-eche ihu taa? Akụkụ ihe odide ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-aga n’ihu inye nghọta sitere n’aka Chineke banyere oge anyị.

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ilekwasị anya ka anyị na-amụ okwu amụma ndị nke Pọl?

18 Mmasị anyị n’amụma a kwesịrị inye anyị ohere ịmata ihe atụ dị iche iche nke ọdachi nke ụzọ oge anyị sị dị oké egwu, ma ọ bụ bụrụ nke ụjọ. Cheta isi ihe anyị abụọ bụ́ isi: (1) ịmata nsogbu ndị na-eme ka oge anyị bụrụ nke siri ike na ịhụ ụzọ e si ezere ha; (2) ịgbaso ozizi ndị bara uru n’ezie, ndị pụkwara inyere anyị aka ịdị ndụ ka mma. Ya mere kama ikwu ọtụtụ okwu n’ihe ndị na-adịghị mma, anyị ga-elekwasị anya n’ozizi ndị pụrụ inyere anyị na ezinụlọ anyị aka n’oge ndị a dị oké egwu.

Rite Uru Bara Ụba

19. Ihe àmà dị aṅaa ka ị hụworo nke na ụmụ mmadụ na-ahụ nanị onwe ha n’anya?

19 Pọl malitere ndepụta ya site n’ibu amụma na na mgbe ikpeazụ, “mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya.” (2 Timoti 3:2) Gịnị ka o bu n’uche? Ị ga-ezi ezi ikwu na n’akụkọ ihe mere eme nile e nwewo ndị ikom na ndị inyom onwe ha juru afọ, ndị na-ejere ọdịmma nanị onwe ha ozi. Ma, e nweghị ihe ịrụ ụka na ntụpọ nke a juru ebe nile n’ụzọ pụrụ iche. Ọ gabigara ókè n’ime ọtụtụ ndị. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ omenala n’ụwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke azụmahịa. Ndị ikom na ndị inyom na-achụso ike na oké aha n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Ọtụtụ mgbe nke ahụ na-abụ ná mfu ụdị ọ bụla nye ndị ọzọ, n’ihi na ndị dị otú ahụ na-ahụ nanị onwe ha n’anya adịghị echegbu onwe ha banyere otú ha si na-emerụ ndị ọzọ ahụ. Ha na-adị ngwa n’ịgba ndị ọzọ akwụkwọ ma ọ bụ ịghọgbu ha. Ị pụrụ ịghọta ihe mere ọtụtụ ndị ji akpọ nke a “ọgbọ onwe m.” Ndị na-eme omume ndị a na-azụghị azụ na ndị na-eche banyere nanị onwe ha juru eju.

20. Olee otú ndụmọdụ Bible si dị iche ná mmụọ ịhụ onwe onye n’anya bụ́ nke jupụtara ebe nile?

20 Ọ dịghị mkpa ka e chetara anyị ahụmahụ dị ilu anyị nweworo n’iso “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya” na-emekọ ihe. Ma ọ bụkwa eziokwu na site n’ime ka a mata nsogbu nke a n’eziokwu, Bible n’ezie na-enyere anyị aka, n’ihi na ọ na-ezi anyị ụzọ e si ezere ọnyà nke a. Nke a bụ ihe ọ na-ekwu: “Emela ihe ọ bụla site n’oké ọchịchọ onwe onye nanị ma ọ bụ site n’ọchịchọ nke otuto efu, ma nwee umeala n’obi n’ebe ibe unu nọ, na-agụ ndị ọzọ mgbe nile dị ka ndị ka unu onwe unu mma. Na-elepụkwa anya maka ọdịmma nke ibe unu, ọ bụghị nanị maka nke gị.” “Agụla onwe gị n’onye dị oké mkpa karịa ka i kwesịrị. Kama nke ahụ, mara otú ị hà n’echiche gị.” A na-achọta ndụmọdụ ọma ahụ ná Ndị Filipaị 2:​3, 4 na Ndị Rom 12:3, dị ka e si dee ya na Today’s English Version.

21, 22. (a) Ihe àmà dị aṅaa nke sara mbara ka e nwere nke na ndụmọdụ dị otú ahụ pụrụ ịba uru taa? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ndụmọdụ Chineke nwere ná ndị mmadụ nkịtị?

21 Mmadụ pụrụ ime mkpesa sị, ‘Nke ahụ dị ka ọ dị mma, ma ọ bụghị ihe a pụrụ ime eme.’ N’ezie, ọ bụ. Ọ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma, ọ na-enwekwa, n’ebe ụmụ mmadụ nkịtị nọ taa. Na 1990 onye na-ebipụtara Oxford University akwụkwọ biri The Social Dimensions of Sectarianism. A kpọrọ isiakwụkwọ nke 8 “Ndịàmà Jehova n’Otu Mba Ndị Katọlik,” ọ kọwakwara otu ihe ọmụmụ na Belgium. Anyị na-agụ, sị: “Iche ihu n’ụzọ ihe ndọrọ ziri ezi nke ịbụ Onyeàmà, e wezụga ihe ndọrọ nke ‘Eziokwu ahụ’ n’onwe ya, ndị zara ajụjụ ọnụ a gbara ha mgbe ụfọdụ kpọtụrụ aha ihe karịrị otu ejimara. . . . Ikpo ọkụ, omume enyi, ịhụnanya, na ịdị n’otu bụ àgwà ndị a kasị kpọtụ aha mgbe nile, ma ime ihe n’eziokwu, na àgwà ọma nke onwe onye ‘n’itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ’ bụkwa àgwà Ndịàmà na-ewere n’ihe dị oké ọnụ ahịa.”

22 Anyị pụrụ iji ntụleghachi ahụ tụnyere onyinyo e setere site n’enyo na-eseta ọtụtụ ihe; ọ bụrụ na, kama nke ahụ, i jiri enyo e ji esete ihe ndị nọ ebe dị anya, ị pụrụ ịhụ ihe nke ọma karị, ọtụtụ ahụmahụ nke ihe ndị na-eme ná ndụ. Ndị a ga-agụnye ndị ikom dịbu mpako, ndị na-enyekarị ndị ọzọ iwu, ma ọ bụ ndị ọ pụtara ìhè na ha na-achọ ọdịmma onwe ha nanị ma bụrụ ugbu a ndị dị nwayọọ karị, na-aghọ ndị di na nna na-egosi nwunye ha, ụmụ ha na ndị ọzọ ịhụnanya na obi ọma n’ụzọ dị nro karị. Ọ ga-agụnyekwa ndị inyom na-achịbu ọchịchị nchịgbu ma ọ bụ ndị na-adịghị egosi obi ọma ma ugbu a bụrụ ndị na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta ụzọ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. E nwere ọtụtụ narị puku ihe atụ ndị dị otú ahụ. Ugbu a, biko kwuo eziokwu. Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ ya dị ka ihe dị mma karị ịnọ ndị dị otú ahụ nso karịa ịbụ ndị ndị ikom na ndị inyom na-ahụ onwe ha n’anya karịsịa gbara gburugburu? Ọ́ gaghị adị mfe karị ịnagide oge anyị nke dị oké egwu? Ya mere ịgbaso ụdị ozizi Bible dị otú ahụ ọ́ gaghị eme ka i nwee obi ụtọ karị?

23. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji baa uru ilebakwu anya na 2 Timoti 3:​2-⁠5?

23 Otú ọ dị, anyị atụlewo nanị ihe mbụ dị ná ndepụta Pọl nke e dekọrọ na 2 Timoti 3:​2-⁠5. Gịnị banyere ndị nke ọzọ? Gị iji nlezianya tụlee ha ọ̀ ga-enyekwara gị aka ịmata nsogbu ndị bụ isi nke oge anyị iji zere ha ma nyere gị aka ịghọta ụzọ nke ga-ewetara gị na ndị ị hụrụ n’anya obi ụtọ ka ukwuu? Isiokwu nke na-esonụ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị ahụ na iji rite uru bara ụba.

Isi Ihe Ndị A Ga-echeta

◻ Olee ihe àmà ụfọdụ na-egosi na anyị na⁠-⁠ebi n’oge dị oké egwu?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?

◻ Isi ihe abụọ dị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ ka anyị pụrụ iwepụta site n’ọmụmụ nke 2 Timoti 3:​1-⁠5?

◻ N’ime oge a mgbe ọtụtụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, olee otú ozizi Bible siworo nyere ndị Jehova aka?

[Ebe e si nweta foto dị na peeji 8]

Foto n’elu n’aka ekpe: Andy Hernandez/Sipa Press; foto n’ala n’aka nri: Jose Nicolas/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya