Ndị Nne na Nna Na-enwe Nrụgide
NDỊ nne na nna ọhụrụ ọtụtụ mgbe na-eyi ka ha na-enwe oké obi ụtọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile banyere nwa ọhụrụ ha na-enye ha oké obi ụtọ. Ọchị mbụ, okwu ndị mbụ, na nzọụkwụ ndị mbụ nke nwa ọhụrụ bụcha oge ndị dị mkpa. Ha na-eji ọtụtụ akụkọ na foto eme ndị ikwu na ibe obi ụtọ. Obi abụọ adịghị ya, ha hụrụ nwa ha n’anya.
Otú ọ dị, n’ezinụlọ ụfọdụ, ọdachi na-ebilite ka ọtụtụ afọ na-agafe. Okwu ọjọọ ndị na-afụ ụfụ na-anọchi okwu egwuregwu nke ndị nne na nna; iti ihe n’iwe ma ọ bụ emetụghị ahụ na-anọchi ibi ọmà ịhụnanya kpam kpam; obi ilu na-anọchi ịnya isi nke nne na nna. “Agaraghị m amụ ụmụ,” ka ọtụtụ ndị na-ekwu. N’ezinụlọ ndị ọzọ nsogbu ahụ ka njọ—ndị nne na nna egosighị ịhụnanya ọbụna mgbe nwa ahụ bụ nwa ọhụrụ! N’ọnọdụ nke ọ bụla, gịnị mere? Ebee ka ịhụnanya ahụ gara?
N’ezie, ụmụaka enweghị ike ịmata azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ. Ma nke ahụ agaghị egbochi ha iru nkwubi okwu nke ha. N’ime ime obi ya, nwatakịrị pụrụ nnọọ ikwubi, sị, ‘Ọ bụrụ na mama m ma ọ bụ papa m ahụghị m n’anya, ọ bụ n’ihi na ọ dị ihe dị njọ n’ebe m nọ. Ọ ghaghị ịbụ na m dị nnọọ njọ.’ Nke a pụrụ ịghọ nkweta siri ike e nwere—nke pụrụ ịkpata ụdị mbibi dị iche iche n’oge nile a dị ndụ.
Otú ọ dị, ihe bụ eziokwu bụ na ndị nne na nna nwere ike ha agaghị egosi ụmụaka ịhụnanya ahụ dị ha mkpa n’ihi ihe dịgasị iche iche. A ghaghị ikweta ya na ndị nne na nna taa na-eche nrụgide ndị dị ukwuu ihu, ụfọdụ n’ime ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ụdị ya. Nye ndị nne na nna na-adịghị njikere ime ihe banyere ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, nrụgide ndị a pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ọrụ ha na-arụ dị ka ndị nne na nna. Otu ilu oge ochie amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.”—Eklisiastis 7:7.
“Oge Dị Oké Egwu”
Ọgbọ nke Ihe Izu Okè. Nke ahụ bụ ihe ọtụtụ ndị tụworo anya ka o bilite na narị afọ a. Cheedị echiche—e nwekwaghị nrụgide akụ̀ na ụba, ụnwụ nri, ụkọ mmiri ozuzo, agha! Ma e mezubeghị olileanya ndị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ụwa nke taa aghọwo ihe otu onye so dee Bible buru n’amụma laa azụ na narị afọ mbụ O.A. O dere na anyị ga-eche “oge dị oké egwu” ihu n’oge anyị. (2 Timoti 3:1-5) Ihe ka ukwuu ná ndị nne na nna ga-abụ ndị mbụ ga-ekweta okwu ndị ahụ.
Ọtụtụ ndị nne na nna ọhụrụ na-ahụkarị onwe ha ka ha bụ ndị oké mmefu nke ịzụlite ụmụaka n’ime ụwa nke taa riri ọnụ. Ọtụtụ mgbe, ma nne ma nna aghaghị ịrụ ọrụ n’èzí nanị iji nweta ihe ndị bụ isi. Mmefu nlekọta ahụ ike, uwe, ịga akwụkwọ, nlekọta ụmụaka, na ọbụna ihe oriri na ebe obibi pụchara ịtụnye ụtụ n’oké ụgwọ a na-akwụ kwa ọnwa nke na-eme ka ndị nne na nna na-eche na mmiri na-achọ iri ha. Ọnọdụ akụ̀ na ụba dịnụ na-echetara ndị na-amụ Bible amụma dị ná Mkpughe nke na-ebu amụma banyere oge mgbe ndị mmadụ ga-eji ihe dum a rụtara n’ụbọchị zụta nanị ihe ndị dị mkpa ga-ezuru ha otu ụbọchị!—Mkpughe 6:6.
A pụghị ịtụ anya ka ụmụaka ghọta ihe nrụgide a nile na-eche ndị nne na nna ha ihu. Ee e, dị ka e si kee ha, ụmụaka na-enwe mkpa, na-enwe agụụ maka ịhụnanya na nlebara anya. Nrụgide ha na-enwetakwa site n’usoro mgbasa ozi na site n’aka ụmụ akwụkwọ ibe ha inwe ihe egwuregwu, uwe, na ngwá electronic ndị kasị ọhụrụ na-arụpụtakarị nrụgide nye ndị nne na nna inye ihe ndị a chọrọ bụ́ ndị na-anọgide na-amụba.
Nrụgide ọzọ dịkwasịrị ndị nne na nna, nke yiri ka ọ na-aka njọ n’ụbọchị ndị a, bụ nnupụisi. N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible buru amụma nnupụisi zuru ebe nile nke ụmụaka nye ndị nne na nna dị ka ihe àmà ọzọ nke oge anyị nọ ná nsogbu. (2 Timoti 3:2) N’eziokwu, nsogbu nke inye ụmụaka ịdọ aka ná ntị abụghị ihe ọhụrụ. Ọ dịghịkwa nne ma ọ bụ nna pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ọ bụ àgwà ọjọọ nke nwatakịrị kpatara imeso nwatakịrị mmeso ọjọọ. Ma ị́ gaghị ekweta na ndị nne na nna taa aghaghị ịgba mgba megide ịzụlite ụmụaka na gburugburu ebe jupụtara ná nnupụisi? Egwú na-ewu ewu nke na-akwalite ọnụma, nnupụisi, na obi nkoropụ; usoro ihe omume TV ndị na-egosi ndị nne na nna dị ka ndị nzuzu na ụmụaka dị ka ndị ka ha dịrị akọ; ihe nkiri sịnịma ndị na-akwalite ime ihe ná mkpali ime ihe ike—mmetụta ndị dị otú ahụ na-awụkwasị ụmụaka taa. Ụmụaka ndị na-amụta ma na-eṅomi omume nnupụisi a pụrụ ịtụkwasị ndị nne na nna ha nrụgide dị ukwuu.
“Ndị Ihe Mmadụ Ibe Ha Na-adịghị Atọ Ụtọ”
Otú ọ dị, e nwere akụkụ ọzọ dị n’otu amụma oge ochie a nke na-agba àmà ọbụna nsogbu ka ukwuu nye ezinụlọ nke taa. Ọ na-egosi na ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” (2 Timoti 3:3) Ihe mmadụ ịtọ ibe ha ụtọ bụ ihe na-ejikọta ezinụlọ ọnụ. Ọbụnakwa ndị kasị enwe obi abụọ banyere amụma Bible aghaghị ikweta na oge anyị ahụwo ndakpọ na-awụ akpata oyi n’ahụ ná ndụ ezinụlọ. N’ụwa nile, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm arịwo elu nke ukwuu. N’ọtụtụ ógbè, a na-ahụkarị ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ezinụlọ nkuchi karịa ezinụlọ ọdịnala. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ nwa na ndị nne na nna nkuchi mgbe ụfọdụ na-eche ihe ịma aka na nrụgide ndị pụrụ iche ihu bụ́ ndị pụrụ ime ka o siere ha ike igosi ụmụaka ịhụnanya ahụ dị ha mkpa.
Otú ọ dị, e nwere mmetụta dị omimi karị. Ọtụtụ n’ime ndị nne na nna nke taa n’onwe ha etolitewo n’ezinụlọ ebe o siri ike inweta ‘ndị ihe mmadụ ibe na-atọ ụtọ’—ezinụlọ ndị ịkwa iko na ịgba alụkwaghịm tisara; ezinụlọ ndị enweghị omume enyi na ịkpọasị mebiworo; ikekwe ọbụna ezinụlọ ebe nkwutọ, mmetọ n’ụzọ mmetụta uche, iti ihe, ma ọ bụ mmetọ n’ụzọ mmekọahụ bụ ihe a na-ahụkarị. Itolite n’ezinụlọ ndị dị otú ahụ abụghị nanị na ọ na-ebibi ụmụaka kama ọ pụrụ ibibi ndị toworo eto ha na-aghọ. Ihe ndekọ na-egosi ọdịnihu dị njọ—ndị nne na nna e metọrọ mgbe ha bụ ụmụaka yikarịrị ka ha ga-emetọ ụmụ nke ha. N’oge Bible, ndị Juu nwere otu ilu: “Nna anyị hà eriwo mkpụrụ vine na-achaghị acha, ezé ụmụ ha wee na-eru izizi.”—Ezikiel 18:2.
Otú ọ dị, Chineke gwara ndị ya na o kwesịghị ịdị otú ahụ. (Ezikiel 18:3) A ghaghị ime ka otu isi ihe dị mkpa pụta ìhè n’ebe a. Nrụgide a nile na-abịakwasị ndị nne na nna hà pụtara na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime ma ọ bụghị imegbu ụmụ nke ha? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ma hụ onwe gị ka ị na-agbaso ụfọdụ n’ime nrụgide ndị ahụ e hotaworo mgba, ị na-echegbukwa onwe gị ma ọ̀ dị mgbe ị ga-abụ ezigbo nne ma ọ bụ nna, nwee obi ike! Ị ga-ghị eso na ya. Nzụlite gị adịghị ekpebirịrị ihe ga-abụ ọdịnihu gị.
N’ikwekọ ná mmesi obi ike nke Akwụkwọ Nsọ na a pụrụ ime ka ihe ka mma, akwụkwọ bụ́ Healthy Parenting kwuru nke a, sị: “Ọ bụrụ na [i] jighị nlezianya mee mgbalị ime omume n’ụzọ dị iche na nke ndị mụrụ gị, ụzọ ime ihe nke oge ị bụ nwata ga-emeghachi n’agbanyeghị ma ị chọrọ ha ma ọ bụ na ị chọghị ha. Iji kwụsị usoro a, ọ dị gị mkpa ịmata ụzọ ime ihe ndị na-adịghị mma ị na-akwalite ma mụta ụzọ isi gbanwee ha.”
Ee, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ị pụrụ ịkwụsị usoro ịzụ ụmụ n’ụzọ na-adịghị mma! Ị pụkwara ịnagide nrụgide ndị na-eme ka ịzụ ụmụ sie oké ike taa. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Olee ebe ị pụrụ isi mụta ezi ụkpụrụ kasị mma, nke a pụrụ ịdabere na ya karịsịa, banyere ịzụ ụmụ? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle okwu a.
[Foto dị na peeji nke 6]
N’inwe nrụgide, ụfọdụ ndị nne na nna adịghị egosi ụmụ ha ịhụnanya
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị nne na nna kwesịrị igosipụta ịhụnanya ahụ dị ụmụ ha mkpa