Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume ka Ụbọchị Ahụ Na-abịaru Nso
“Na-agbarịtanụ ibe unu ume, na-emekwanụ otú ahụ karị ka unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.”—NDỊ HIBRU 10:25, New World Translation.
1, 2. Olee ụbọchị nke na-abịaru nso, gịnịkwa kwesịrị ịbụ àgwà nke ndị Jehova?
NDỊ ahụ na-ekere òkè taa n’ịsị, ‘Bịa nara mmiri nke ndụ n’efu,’ adịghị ekewapụ onwe ha n’ebe ndị ọzọ nọ. Ka oké ụbọchị ahụ nke mmeri Jehova na-abịaru nso, ha na-etinye ndụmọdụ Bible ahụ n’ọrụ, bụ́: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike [“na-agbarịta onwe anyị ume,” NW]; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ ha otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.”—Ndị Hibru 10:24,25.
2 Akwụkwọ nsọ buru amụma banyere “ụbọchị” ahụ dị ka ‘ụbọchị Jehova.’ (2 Pita 3:10) Ebe Jehova bụ Onye Kasị Elu, Chineke nke ji ike nile, ọ dịghị ụbọchị ọ bụla nke pụrụ ịdị ebube karịa ụbọchị ya. (Ọrụ 2:20) Ọ pụtara iwepụ ịbụ ọkaaka ya n’ụta dị ka Chineke n’eluigwe na ala. Ụbọchị ahụ nke ịdị mkpa ya na-enweghị atụ na-abịaru nso.
3. Olee uzọ o si bụrụ na ụbọchị Jehova na-abịaru nso nye ndị Kraịst nọ na narị afọ mbụ, gịnịkwa banyere anyị taa?
3 Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst na narị afọ mbụ nke Oge Anyị na ụbọchị Jehova na-abịaru nso. Ha lepụrụ anya maka ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, ma laa azụ n’oge ahụ, ụbọchị ahụ ka dị ihe karịrị 1,900 afọ n’ọdịnihu. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3) N’agbanyeghị eziokwu ahụ, ha kwesịrị ịbụ ndị a gbara ume n’ihi na ọ bụ ihe e ji n’aka na ụbọchị ahụ gaje ịbịa, ọ bụrụkwa na ndị Kraịst anọgide na-aga n’ihu n’okwukwe ahụ, ha ga-abanye n’ụbọchị ahụ a gọziri agọzi. (2 Timoti 4:8) Laa azụ n’ebe ahụ, a hụrụ ụbọchị ahụ dị ka ihe na-abịaru nso. N’ihe banyere anyị onwe anyị taa, ụbọchị Jehova abịawo nso n’ezie. Mmezu nile dị ebube nke amụma Bible na-anwapụta eziokwu nke a na-akpata ọṅụ. N’isi nso, aha Chineke, bụ́ Jehova, ga-abụ nke e doro nsọ ruo mgbe nile ebighị ebi.—Luk 11:2.
Ndị A Gbara Ume site n’Aha Chineke
4. Dị ka Mkpughe 19:6 si kwuo, ònye gaje ịghọ Eze, oleekwa ụzọ e si amata aha ya?
4 Aha Chineke kwesịrị ịbụ ihe na-akpali mmasị nye ezinụlọ dum nke ihe a kpọrọ mmadụ. Nsụgharị Today’s English Version na-asị: “Toonụ Chineke! N’ihi na Onyenwe anyị, hụ Chineke anyị Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ Eze!” (Mkpughe 19:6) Dị ka nsụgharị Bible ahụ nke e mere na narị afọ nke 20 anyị a si kwuo, ọ bụ Onyenwe anyị, Chineke onye pụrụ ime ihe nile. Nsụgharị ahụ, dịkwa ka ọtụtụ nsụgharị ndị nke oge a, enyeghị aha nke Onye ahụ bụ chi, onye malitere ịchị achị dị ka Eze. Otú ọ dị, aha Chineke ahụ dị n’otiti mkpu ahụ bụ “Haleluja!” (“Toonụ Jaa” ma ọ bụ “Toonụ Jehova”) nke dị ná nsụgharị Revised Standard Version, New International Version, na nsụgharị Moffatt nke Mkpughe 19:6. N’akụkụ ka ukwuu nke Oge Anyị a, e kpuchiwo aha Chineke ahụ n’ụzọ bụ isi ná nsụgharị Bible dị iche iche. Otú ọ dị, dị ka anyị gaje ịhụ, aha ahụ abụwo oké ihe agbamume nye ndị Chineke, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a.
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị Mosis mkpa ịmata aha nke Chineke ahụ onye ọ na-anọchite anya ya? (b) Gịnị ga-abụworị mmetụta e nwere n’ahụ ndị Israel mgbe Mosis mesiri aha Chineke ike?
5 Anyị na-echeta na mgbe Chineke Onye Kasị Elu zipụrụ Mosis ijekwuru ndị Israel nọ n’ohu n’ala Ijipt, ajụjụ banyere onye zitere ya bilitere n’echiche nke ndị ahụ e zijeere Mosis. Mosis tụrụ anya na ndị Juu ahụ nọ n’ahụhụ ga-achọ ịmara aha Chineke nke ọ na-anọchite anya ya. N’ihe banyere nke a, anyị na-agụ n’Ọpụpụ 3:15, sị: “Chineke sịkwara Mosis ọzọ, Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, o zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.”
6 Mgbe e mesiri okwu nke a ike nye ụmụ Israel, ọ ghaghị ịbụwororị ha oké ihe agbamume. Ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, kwere nkwa ịnapụta ha. Leekwa nnọọ ihe agbamume ọ na-aghaghị ịbụworị inwe olileanya nke ịmata Chineke nke ọma mgbe ọ ga-egosipụta ihe aha ahụ o nwere n’onwe ya pụtara—ọ bụghị iji mpako kewapụ onwe ya n’ebe ndị ọzọ nọ!—Ọpụpụ 3:13; 4: 29-31.
7. (a) Ànyị si aṅaa mara na ndị na-eso ụzọ Jisọs maara aha Chineke? (b) Olee ụzọ e si kpuchie aha Chineke?
7 Ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwetakwara oké agbamume site n’aha Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na ihe ọ nọchiri anya ya. (Jọn 17:6, 26) N’oge ije ozi elu ala nke Jisọs, o doro anya na ọ kwazụgaghị aha Chineke ahụ n’azụ, ọ bụghịkwa nzube ya idebe aha nke onwe ya, bụ́ Jisọs, n’ihu. Ọ bụ nanị mgbe ndapụ n’ezi ofufe pụọ n’okwukwe ndị Kraịst, bụ́ nke e buru amụma ya, malitesịrị ka a malitere ikpuchi aha Chineke, ee, wepụchaa ya nnọọ kpam kpam ná mkparịta ụka ndị Kraịst. (Ọrụ 20:29, 30) Ozugbo aha nke Ọkpara Chineke malitere ịnọ n’ọnọdụ dị elu karị, na-ekpuchi aha nke Nna, ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst ga-ahụ na ofufe ha na-efe Nna ahụ na-abụwanye nke na-enweghị mmetụta mmadụ na ibe ya, nke na-enweghị ịdị nso nke ndị nọ n’ezinụlọ, nke na-abụghịkwa oké ihe agbamume.
8. Gịnị bụworo mmetụta na-aga n’ihu n’ahụ ndị Chineke n’ihi nnabata a nabatara aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova?
8 Otú a, ọ bụ ihe na-akpata ọṅụ a na-apụghị iji ọnụ kọọ mgbe Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile nke ha na Watch Tower Society na-arụkọ ọrụ nabatara aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova na 1931. Ọ bụghị nanị na ọ bụ ihe na-akpali ọṅụ, kama ọ bụkwa ihe oké agbamume. N’ihi nke a, ndị mmụta Bible ahụ a kpọkwasịrị aha ọhụrụ pụrụ ịgbarịta ibe ha ume.—Tụlee Aịsaịa 43:12.
9. Gịnị bụ echiche ezi ndị Kraịst banyere Onye ahụ ha
9 N’ihi nke a, ezi ndị Kraịst taa na-ahụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ime ka a mara Onye ahụ ha bụ Ndịàmà ya e buru n’amụma, ọbụna dị ka Jisọs Kraịst bụ́ Onye ndú ha mere mgbe ọ nọ n’elu ala ebe a. (Mkpughe 1:1, 2) Ee, ha na-eme ka a mara nanị ya dị ka onye nwere aha ahụ bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.
Ndị Jupụtara n’Ọṅụ na Mmụọ Nsọ
10-12. (a) Gịnị ga-abụ mmetụta nke ike ọrụ ahụ n’ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs? (b) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova ahụ a kpaliworo ọṅụ n’ime ha kwesịrị isi na-emesorịta ibe ha?
10 Jisọs Kraịst kwuru n’okwu ọ gwara ndị ozi ya mgbe ọ na-akwado ịhapụ ha, sị: “Ya mere, gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu: ma lee, mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 28:19, 20.
11 Rịba ama na e kwesịrị ime ndị Kraịst e ziri ihe ọhụrụ baptism n’aha nke mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ nke a abụghị onye, kama ọ bụ ike ọrụ nke Jehova Chineke, nke Ọ na-eji eme ihe site na Jisọs Kraịst. Na Pentikọst, Jehova Chineke, site na Jisọs, wụpụrụ ike ọrụ nke a n’isi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst raara onwe ha nye. (Ọrụ 2:33) E ji mmụọ nsọ nke a mejupụta ha, otu n’ime ngosipụta ma ọ bụ mkpụrụ, nke mmụọ nsọ, bụkwa ọṅụ. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Efesọs 5:18-20) Ọṅụ bụ àgwà nke na-akpali akpali. A gaje iji ọṅụ nke mmụọ nsọ mejupụta ndị ahụ na-eso ụzọ. Ekpere ahụ nke Pọl onyeozi dere okwu dị na ya kwesịrị nnọọ ekwesị: “[Ka] Chineke nke olileanya ahụ mejuo unu n’ọṅụ nile na udo nile n’ikwe ekwe, ka unu wee nwebiga olileanya ahụ okè, n’ike mmụọ nsọ.”—Ndị Rom 15:13.
12 N’ịbụ ndị e ji mmụọ nke a na-akpali ọṅụ mejuo, Ndịàmà Jehova taa, gụnyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ga-achọ, ee, ha ga-abụ ndị a kpaliri, ịgbarịta ibe ha ume n’ime usoro ihe dị ugbu a nke na-enweghị omume enyi. N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Pọl onyeozi kwuru okwu banyere ‘mgbarịta ume.’—Mkpughe 7:9, 10; Ndị Rom 1:12, NW; 14:17.
Ezi Ihe Mere A Ga-eji Bụrụ Ndị A Gbara Ume
13. Ihe dịgasị aṅaa mere anyi ga-eji bụrụ ndị a kasiri obi nakwa ndị na-akasirịta ibe anyị obi?
13 N’ịchọta onwe ha n’ime usoro ihe nke a, nke onye na-achị ya bụ onye na-emegide ihe nile dị n’ezi omume, ọbụna bụrụkwa chi ya, ndị Kraịst ga-achọ ịgbarịta ibe ha ume n’ime ọgbakọ ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ, nke mmụọ nsọ Jehova Chineke jupụtara n’ime ya. (Ndị Hibru 10:24, 25; Ọrụ 20:28) Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji bụrụ ndị a gbara ume. Ee, lee ka anyị si nwee ekele inwe ezi ihe ọmụma nke Jehova na nke Ọkpara Ya na nke ike ọrụ ha na-eji eme ihe, bụ́ mmụọ nsọ! Lee ka anyị si nwee obi ekele maka olileanya ha na-enye anyị! Ofufe anyị si otu a bụrụ nke e ji ọṅụ mejupụta. Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ahụ o degaara akwụkwọ ozi ya na ha kwesịrị ịgbarịta ibe ha ume, na-ewulirịtakwa ibe ha elu n’ime okwukwe ha nke kasị dịrị nsọ. Ha kwesịrị ịdị na-eme nke a ‘karịa, ka ha na-ahụ ka ụbọchị ahụ na-abịaru nso n’ụzọ ihe atụ.’ Ọzọkwa, mgbe ike ọchịchị dị iche iche nke ụwa nke a kpochapụrụ Iso Ụzọ Kraịst egbugbere ọnụ, tinyere okpukpe ụgha ndị ọzọ nile, ọnọdụ dị mgbe ahụ ga-eme ka ọ dịrị mkpa ka anyị gbarịta onwe anyị ume ọbụna karị.
14. Ole ndị kwesịrị ịdị na-agbarịta ibe ha ume, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
14 Ọ bụ ezie na ndị okenye na-ebute ụzọ n’ịgba ìgwè atụrụ ndị nọ n’ọgbakọ ha dị iche iche ume, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nile gbarịta ibe ha ume, dị nnọọ ka Ndị Hibru 10:25 nyere ndụmọdụ ka e mee. N’eziokwu, nke a bụ ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ị bụ otu onye n’ime ọgbakọ, ị̀ na-enye agbamume nke a? Ị pụrụ iche, sị, ‘Olee ụzọ m pụrụ isi mee ya? Gịnị ka m pụrụ ime?’ Nke mbụ, nanị site n’ọnụnọ ị nọ ná nzukọ ndị ahụ na nkwado ị na-enye ndokwa nile nke ndị Kraịst, ọ̀ bụ na ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ndị ọzọ adịghị enweta agbamume, ọbụna dị ka o yiri ka gị onwe gị na-enwetakwa mgbe ị na-ahụ ndị ọzọ ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-abịazu nzukọ ọgbakọ dị iche iche? Ha pụkwara inweta agbamume site n’ihe nlereanya gị nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi. Site ná nnọgide ị nọgidere n’ụzọ ndị Kraịst n’agbanyeghị nsogbu na ihe isi ike nile nke ndụ, n’adaghị mbà mgbe ọ bụla, ị pụrụ isetịpụ ihe nlereanya nke na-akpali akpali.
Guzogide Nkụda Aka Sitere n’Aka Ekwensu
15. N’ihi gịnị ka Ekwensu ji na-enwe “oké ọnụma,” ọ̀ bụkwa megide òle ndị?
15 Ọ bụghị nanị anyị bụ ndị maara na ụbọchị Jehova dị nso. Setan bụ Ekwensu maakwara. Mkpughe 12:12 na-agwa anyị na ahụhụ na-adịrị ụwa ugbu a “n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Dị ka Mkpughe 12:17 na-egosi, oké ọnụma ya bụ megide ndị ahụ “bụ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.” Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị na ya—Ekwensu chọrọ ịkụda anyị aka! Ọ maakwara kpọmkwem ụzọ ọ ga-esi gbalịa ime nke a. Ọ maara adịghị ike na nsogbu nile anyị nwere, ọ na-ejikwa ndị a eme ihe.
16. N’ihi gịnị ka Setan ji na-eji nkụda aka eme ihe di ka ngwá agha?
16 N’ihi gịnị ka Ekwensu na-eji eji nkụda aka eme ihe dị ka ngwá agha? N’ihi na ọ na-agara ya nke ọma ọtụtụ mgbe. Ọbụna onye tachiworo obi ná mmegide na mkpagbu pụtara ìhè pụrụ ịbụ onye nkụda aka rikpuru. Setan chọrọ ịkwa Jehova Chineke emo wee gbalịa ịnwapụta na ya pụrụ ichigharị ụmụ mmadụ pụọ n’ijere Ya ozi. (Ilu 27:11; tụlee Job 2:4, 5; Mkpughe 12:10.) Ọ bụrụ na ọ pụrụ ịkụda gị aka, ọ pụrụ ime ka i belata ozi ị na-ejere Chineke; ọ pụrụ ọbụna ime ka ị kwụsị, ka ị ghọọ onye na-adịghị arụkwa ọrụ ná nkwusa ozi ọma Alaeze ahụ.—2 Ndị Kọrint 2: 10, 11; Ndị Efesọs 6:11; 1 Pita 5:8.
17. Olee ụzọ mmetụta ọjọọ nke nkụda aka si pụta ìhè n’oge Mosis?
17 A pụrụ ịhụta ajọ mmetụta nkụda aka na-enwe n’ihe banyere ụmụ Israel ndị nọ n’Ijipt oge ochie. Mgbe Mosis gwasịrị Fero okwu, onye ọchịchị aka ike ahụ mụbara ibu arọ ha na mmegbu ọ na-emegbu ha nke ukwuu. Chineke gwara Mosis ka o mesie ndị Israel ahụ obi ike na Ya ga-anapụta ha n’ezie, mee ka ha bụrụ ndị nke Ya, wepụtara ha ụzọ mgbapụ, kpọbatakwa ha n’ala nkwa ahụ. Mosis kọwara nke a gwa ụmụ Israel. Ma Ọpụpụ 6:9 (NW) na-akọ, sị: “Ha egeghị Mosis ntị n’ihi nkụda aka na n’ihi ọnọdụ siri ike nke ịbụ ohu ha nọ na ya.” Ruo mgbe Jehova mere ka Mosis kwere, gbaakwa ya ume, mmeghachi omume nke a mere ka ọbụna Mosis nwee nkụda aka n’ịchọ ịgwa Fero okwu dị ka e nyere ya n’iwu.—Ọpụpụ 6: 10-13.
18. N’ihi gịnị ka e ji nwee oké mkpa ka ndị Chineke guzogide nkụda aka nke Ekwensu na-akpata?
18 Setan bụ Ekwensu maara nke ọma ajọ mmetụta nkụda aka pụrụ inwe n’ahụ ohu Chineke. Dị ka Ilu 24:10 na-asị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’oge dị omimi otú a n’ime mgbe ikpeazụ ahụ, ọ dị mkpa ka anyị nwee ike, guzosiekwa ike n’ime mmụọ. Ọ dị nnọọ njọ na anyị aghaghị ịgbaso ezughị okè anyị nile, adịghị ike anyị nile, na mmejọ ihe nile ndị pụrụ ịdọla anyị azụ, mgba; ma, ebe Setan na-achọkwa iji mmejọ ihe ndị a mere ngwá ọrụ, enyemaka dị anyị mkpa.
Daberesie Ike n’Àjà Kraịst
19. Gịnị ga-enyere anyị aka iji guzogide nkụda aka, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
19 Otu oké ihe enyemaka n’ihe banyere nke a bụ ndokwa mgbapụta ahụ Jehova mere ka o kwe omume site na Jisọs Kraịst. Anyị pụrụ ịbụ ndị nwere mmeri site n’ịdaberesi ike n’àjà mgbapụta ahụ. Ọ bụ ihe dị ize ndụ ibelata onyinye nke a. Ee, anyị ka ga-emejọ ihe, ma ọ bụ mee mmehie, ebe anyị ka bụ ndị na-ezughị okè. Ma ọ dịghị mkpa ka a kụda anyị aka ma ọ bụ ka anyị kwụsị ime mgbalị, na-eche na e nwekwaghị olileanya dịnụ, wee si otú ahụ daba n’ọnyà Setan. Anyị maara na anyị nwere àjà zuru ezu maka mmehie. Ihe mgbapụta ahụ nwere ike iwepụ mmehie nile. Ọ bụrụ na anyị so ‘n’okè ìgwè mmadụ’ ahụ, anyị aghaghị inwe okwukwe na ntụkwasị obi zuru ezu na anyị pụrụ ịsa uwe mwụda anyị, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.—Mkpughe 7:9, 14.
20. Olee ụzọ Mkpughe 12:11 si gosi na a pụrụ imeri oké onye nkụda aka ahụ, bụ́ Ekwensu?
20 Ná Mkpughe 12:10, a kọwara Setan dị ka “nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị.” Olee ụzọ anyị pụrụ isi merie ajọ onye ebubo na oké onye nkụda aka dị otú ahụ? Amaokwu 11 nke isiakwụkwọ ahụ na-enye azịza ya: “Ndị ahụ wee merie ya n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na n’ihi okwu àmà ha; ha ahụghịkwa ndụ ha n’anya ruo ọnwụ.” Ya mere, ọ dị mkpa ka ndị Jehova nwee obi ike zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ, bụ́ ọbara Nwa Atụrụ ahụ. Mee ka agbamume ahụ sie ike, bụ́ nke na-abịa site n’ịgba àmà, iso onye ọ bụla ị pụrụ irute na-ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke mgbe nile.
21. Olee ụzọ anyị pụrụ isi kere okè n’amaghị ama n’ọrụ Ekwensu nke ịkụda ụmụna anyị aka?
21 Mgbe ụfọdụ, ọbụna n’amaghị ama, anyị pụrụ ikere okè n’ọrụ Ekwensu nke ịkụda ụmụnna anyị aka. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịghọ ndị na-emekarị nkatọ, ndị na-achọkarị ihe n’aka ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị na-emebiga ezi omume ókè. (Eklisiastis 7:16) Anyị nile nwechara ebe ndị anyị dara mbà na adịghị ike dị iche iche. Ka anyị ghara ịdị na-eji ha eme ihe dị ka Ekwensu na-eme. Kama nke ahụ, ka anyị kwuo okwu n’ụzọ na-agba ume banyere ụmụnna anyị nakwa banyere ndị Jehova dị ka ìgwè ndị a haziri ahazi. Anyị chọrọ ịnọgide na-akasirịta ibe anyị obi, wee si otú a na-ezere ịkụdarịta ibe anyị aka.
Ịgba Ume Ka Ụbọchị Ahụ Na-abịaru Nso
22, 23. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji hapụrụ ya nanị ndị okenye ịbụ ebe e si enweta agbamume? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi gbaa ndị nlekọta no n’ọgbakọ ndị Kraịst ume?
22 Anyị kwesịrị ime mkpebi siri ike ịdị na-agbarịta ibe anyị ume mgbe nile ka ụbọchị ahụ na-abịaru nso. Na-agba ndị ọzọ ume site n’ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi gị na okwu nkasi obi. Ṅomie Jehova na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’ihe banyere nke a. Ahapụrụla ya nanị ndị okenye ọgbakọ ịbụ ebe e si enweta agbamume. Ee, ndị okenye n’onwe ha chọkwara agbamume. Ha nwere adịghị ike dị iche iche na ebe ndị ha na-ada mbà, dịkwa ka ihe fọdụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ, ha na-echekwa otu nsogbu ndị ahụ ihu n’ịchọta ihe ha ga-eji akwado ezinụlọ ha n’ime ụwa nke na-eretọ eretọ. Tụkwasị na nke ahụ, ha nwere ihe ahụ Pọl kọwara dị ka nchegbu maka ọgbakọ nile. (2 Ndị Kọrint 11: 28, 29) Ọrụ ha bụ ọrụ siri ike—agbamume dị ha mkpa.
23 Ị pụrụ inye ndị nọ n’ọnọdụ nlekọta n’ime ọgbakọ ndị Kraịst agbamume dị ukwuu site n’ikwenyere ha. Mgbe ahụ, ị ga na-agbaso ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Hibru 13:17: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.”
24. N’oge a nke jupụtara ná nkụda aka, gịnị ka anyị kwesịrị ịnọ na-eme, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
24 Anyị na-ebi n’ime oge nke nkụda aka. Obi ụmụ mmadụ na-atụbọ n’ezie n’ihi egwu na ile anya ihe ndị na-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi, dị ka Jisọs buru n’amụma. (Luk 21:25, 26) Ebe e nwere ọtụtụ nsogbu, bụ́ ndị yiri ka ha na-akpata obi ịda mbà, na-akụdakwa mmụọ, ‘na-agbarịtanụ ibe unu ume, na-emekwa otú a karị ka unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.’ Gbasoo ezi ndụmọdụ Pọl onyeozi nke dị ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:11: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi, wulirịtakwa ibe unu elu dị ka ụlọ, dị ka unu na-emekwa
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji na-agbarịta ibe ha ume, ọbụna karịa ka ha na-eme na mbụ?
◻ Olee ụzọ ịmara aha Chineke siworo bụrụ ihe agbamume nye ndị Jehova?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gbarịta ibe anyị ume n’otu n’otu?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji zere ikere òkè n’ọrụ Ekwensu nke ịkụda ụmụnna anyị aka?
bụ Ndịàmà ya?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị okenye na-ebute ụzọ n’ịgba ìgwè atụrụ nọ n’ogbakọ ha dị iche iche ume