Jehova Kwesịrị Ịbụ Obi Ike Anyị
“Jehova ga-abụ ntụkwasị obi gị.”—ILU 3:26.
1. Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-azọrọ ịtụkwasị Chineke obi, gịnị na-enye echiche na ha adịghị eme otú ahụ mgbe nile?
ỤKPỤRỤ nduzi bụ́ “Na Chineke Ka Anyị Tụkwasịrị Obi” dị n’ego United States of America. Ma ndị nile na-eji ego a eme ihe n’ala ahụ ma ọ bụ n’ebe ọzọ, hà na-atụkwasị obi n’ebe Chineke nọ n’ezie? Ka hà na-atụkwasị ego ahụ n’onwe ya obi karị? A pụghị ime ka ntụkwasị obi dị otú ahụ n’ebe ego nke ala ahụ ma ọ bụ nke mba ọ bụla ọzọ dị kwekọọ n’inwe ntụkwasị obi n’ebe Chineke nke ịhụnanya pụrụ ime ihe nile nọ, bụ́ onye na-adịghị eji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọlị, onye na-adịtụghịkwa anyaukwu. N’ezie, ọ na-akatọ anyaukwu n’ụzọ doro anya.—Ndị Efesọs 5:5.
2. Àgwà dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nwere banyere ikike nke akụ̀ na ụba?
2 Ezi ndị Kraịst na-enwe obi ike n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba, ya na “aghụghọ” ya. (Matiu 13:22) Ha na-aghọta na ikike ego nwere ịkwalite obi ụtọ na ichekwa ndụ bụ nke a kpaara nnọọ ókè. Ikike nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile adịghị otú ahụ. (Zefanaịa 1:18) Ya mere, lee otú ndụmọdụ ahụ si bụrụ nke amamihe: “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na Ya onwe ya ekwuwo, sị, M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.
3. Olee otú ihe ndị gbara Deuterọnọmi 31:6 gburugburu si eme ka nhota Pọl hotara amaokwu ahụ pụta ìhè?
3 Mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru okwu ndị ahụ dị n’elu, Pọl onyeozi hotara ntụziaka ndị Mosis nyere ụmụ Israel nwa oge tupu ọnwụ ya: “Dịnụ ike, nweekwanụ ume, unu atụla egwu, unu amakwala jijiji n’ihu ha; n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, Ya onwe ya bụ onye gị na Ya na-eje; Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị.” (Deuterọnọmi 31:6) Ihe ndị gbara amaokwu a gburugburu na-egosi na Mosis nọ na-agba ume inwe obi ike n’ebe Jehova nọ nke karịrị nanị ịtụkwasị ya obi igbo mkpa anụ ahụ ha. N’ụzọ dị aṅaa?
4. Olee otú Chineke si gosi ụmụ Israel na a pụrụ ịtụkwasị ya obi?
4 N’ime afọ 40 ahụ Israel wagharịrị n’ọzara, Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’inye ha ihe ndị dị mkpa ná ndụ. (Deuterọnọmi 2:7; 29:5) O duzikwara ha. Otu ụzọ o si gosi nke a bụ alụlụ n’ehihie na ọkụ n’abalị, bụ́ nke duuru ụmụ Israel gaa ‘n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’ (Ọpụpụ 3:8; 40:36-38) Mgbe oge ruru maka ịba n’Ala Nkwa ahụ n’ezie, Jehova họọrọ Joshua ka ọ nọchie Mosis. A pụrụ ịtụ anya na ndị bi n’ala ahụ ga-eguzogide ha. Ma Jehova esorowo ndị ya zọọ ije ruo ọtụtụ iri afọ, ya mere ọ dịghị mkpa ịtụ egwu. Ndị Israel nwere ezi ihe mere ha ga-eji mara Jehova dị ka Chineke a pụrụ ịtụkwasị obi!
5. Olee otú ọnọdụ ndị Kraịst taa si yie nke ụmụ Israel tupu ha abaa n’Ala Nkwa ahụ?
5 Ndị Kraịst taa anọwo na-azọ ije n’ọzara nke ajọ ụwa dị ugbu a ka ha na-agaje n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ụfọdụ ha anọwo na-agbaso ụzọ a ruo ihe karịrị afọ 40. Ugbu a ha guzo n’ókè nke ụwa ọhụrụ Chineke. Ma, ndị iro ka guzochiiri ha ụzọ, na-ezube igbochi onye ọ bụla ịba n’ihe ga-aghọ ihe dị ka Ala Nkwa, nke dị ebube karịa nke oge ochie ahụ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ ruru na ya. Ya mere nye ndị Kraịst taa, lee otú okwu Mosis, dị ka Pọl si kwughachi ya si kwesị ekwesị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị”! Ndị nile nọgidesiri ike ma nwee obi ike, jupụta n’okwukwe, na-enwe obi ike n’ebe Jehova nọ, ji n’aka inweta ụgwọ ọrụ.
Obi Ike Dabeere n’Ihe Ọmụma na Ọbụbụenyi
6, 7. (a) Gịnị tinyere obi ike Abraham n’ebe Jehova nọ n’ule? (b) Olee mmetụta Abraham pụrụ inweworị mgbe ọ na-eme njem gaa n’ebe ọ ga-achụ nwa ya bụ́ Aịsak n’àjà?
6 N’otu oge e nyere nna nna ụmụ Israel bụ́ Abraham iwu ka ọ chụọ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ. (Jenesis 22:2) Gịnị mere ka nna a nke na-ahụ n’anya nwee ike inwe obi ike dị otú ahụ a na-apụghị ibibi ebibi n’ebe Jehova nọ nke na ọ dị njikere irube isi ozugbo? Ndị Hibru 11:17-19 na-aza, sị: “Mgbe a na-anwa Abraham, ọ bụ okwukwe ka o ji chee Aịsak n’ihu Chineke dị ka àjà: ee, onye ahụ nke naararị nkwa ahụ nke ọma na-eche nwa nwoke ọ mụrụ nanị ya n’ihu Chineke dị ka àjà: bụ́ onye e kwuru okwu banyere ya, sị, N’ime Aịsak ka a ga-akpọ mkpụrụ gị: ebe ọ na-agụ na Chineke pụrụ ime ka o si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie; nke ọ naraghachikwara ya site n’ebe ahụ n’ime ilu.”
7 Buru n’uche na o were Abraham na Aịsak ụbọchị atọ iji ruo n’ebe a gaje ịchụ àjà ahụ. (Jenesis 22:4) Abraham nwere oge dị ukwuu ịtụleghachi ihe a gwaworo ya ka o mee. Ànyị pụrụ icheli n’echiche mmetụta ndị o nwere? Ọmụmụ Aịsak abụwo ihe a na-atụghị anya ya kpatara nnọọ ọṅụ. Ihe àmà ahụ nke ntinye aka Chineke mere ka mmekọrịta nke Abraham na nwunye ya bụbu nwanyị aga, bụ́ Sera, nwere n’ebe Chineke nọ mikwuo emi. N’ezie ha biri ndụ mgbe nke ahụ gasịrị n’atụmanya nke ihe ọdịnihu ga-abụrụ Aịsak na ụmụ ya. Atụmanya ha ọ̀ na-abịa ná njedebe mberede, dị ka ọ pụrụ iyi n’ihi ihe Chineke kwuru ka ha mee ugbu a?
8. Olee otú obi ike Abraham n’ebe Chineke nọ si bụrụ ihe karịrị ikwere na Ọ pụrụ ime ka Aịsak si n’ọnwụ bilie?
8 Ma, Abraham nwere obi ike ná ndabere nke ihe ọmụma ezi ndị enyi nwere n’ebe ibe ha nọ. Dị ka “enyi nke Chineke,” Abraham “kwere okwu Chineke, e wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” (Jemes 2:23) Obi ike Abraham n’ebe Jehova nọ gabigara nanị ikwere na Chineke pụrụ ime ka Aịsak si n’ọnwụ bilie. Abraham kwekwara na ihe Jehova na-agwa ya ka o mee kwesịrị ekwesị, ọ bụ ezie na Abraham amaghị ihe nile kpatara ya. Ọ dịghị ihe mere ọ ga-eji rụwa ụka ma Jehova ò ziri ezi n’ịrịọ arịrịọ a. E mesịa, e mere ka obi ike Abraham sikwuo ike ka mmụọ ozi Jehova batara iji gbochie Aịsak ịbụ onye e gburu n’àjà n’ezie.—Jenesis 22:9-14.
9, 10. (a) Olee mgbe Abraham buworo ụzọ gosipụta obi ike n’ebe Jehova nọ? (b) Ihe mmụta dị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka Abraham?
9 Abraham egosipụtawo otu ụdị obi ike a n’ezi omume Jehova n’ihe dị ka afọ 25 tupu mgbe ahụ. N’ịbụ onye a dọrọ aka ná ntị na a gaje ibibi Sọdọm na Gọmọra, dị ka o kwesịrị o nwere nchegbu banyere ọdịmma nke ndị ezi omume ọ bụla bi n’ebe ahụ, gụnyere nwa nwanne ya bụ́ Lọt. Abraham rịọrọ Chineke arịrịọ n’okwu ndị a: “Ya bụrụ Gị ihe arụ ime dị ka ihe a si dị, ime ka onye ezi omume so onye na-emebi iwu nwụọ, o wee bụrụ na dị ka ndị ezi omume si dị, otú a ka ndị na-emebi iwu dị; ya bụrụ Gị ihe arụ: Onyeikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?”—Jenesis 18:25.
10 Nna ochie ahụ bụ́ Abraham kwetara na Jehova adịghị eme ajọ omume ma ọlị. Ọbụ abụ ahụ mesịrị bụọ, sị: “Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere n’ọrụ Ya nile.” (Abụ Ọma 145:17) Anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-anakwere ihe Jehova kwere ka m nwee ahụmahụ ya n’enweghị obi abụọ banyere ezi omume ya? M̀ kwetara na ihe ọ bụla o kwere ka ọ dịrị ga-emesịa bụrụ maka ọdịmma m nakwa ọdịmma ndị ọzọ?’ Ọ bụrụ na anyị pụrụ ịza ee, anyị amụtawo ihe dị mkpa site n’aka Abraham.
Igosipụta Obi Ike ná Nhọrọ Ndị Jehova Mere
11, 12. (a) Akụkụ dị aṅaa nke obi ike dịworo ndị ohu Chineke mkpa? (b) Gịnị pụrụ ịbụrụ anyị nsogbu mgbe ụfọdụ?
11 Ndị na-ele Jehova anya dị ka obi ike ha na-egosipụtakwa obi ike ná ndị ikom Jehova họọrọ iji mee ihe n’imezu nzube ya nile. Nye ụmụ Israel, nke a pụtara igosi obi ike n’ebe Mosis nọ, e mesịakwa n’ebe onye nọchiri ya, bụ́ Joshua nọ. Nye ndị Kraịst oge mbụ, ọ pụtara igosi obi ike n’ebe ndị ozi na ndị okenye nke ọgbakọ Jerusalem nọ. Nye anyị taa, ọ pụtara inwe obi ike n’ebe “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nọ, bụ́ ndị a họpụtara inye anyị ‘ihe e ji azụ anyị’ n’ụzọ ime mmụọ “n’oge ya,” nakwa n’ebe ndị ahụ sitere n’etiti ha bụ́ ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi nọ.—Matiu 24:45.
12 N’eziokwu, inwe obi ike n’ebe ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ndị Kraịst nọ bụ maka abamuru anyị. A gwara anyị, sị: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.”—Ndị Hibru 13:17.
Zere Inwe Obi Abụọ ná Nhọrọ Ndị Jehova Mere
13. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji enwe obi ike n’ebe ndị a họpụtara idu ndú nọ?
13 Bible na-enyere anyị aka inwe ezi nguzo n’igosipụta obi ike n’ebe ndị na-edu ndú n’etiti ndị Jehova nọ. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị: ‘Ọ̀ dị mgbe Mosis hiere ụzọ? Ndị ozi hà gosiri àgwà yiri nke Kraịst nke Jisọs chọrọ ka ha nwee mgbe nile?’ Azịza ha doro anya. Jehova ahọrọwo iji ndị ikom na-eguzosi ike n’ihe, rarakwaara onwe ha nye, mee ihe iduzi ndị ya, ọ bụ ezie na ha bụ́ ndị ikom na-ezughị okè. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ndị okenye taa ezughị okè, anyị ka kwesịrị ịnakwere ha dị ka ndị ‘Mmụọ Nsọ [họpụtara ịbụ] ndị nlekọta, na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ.’ Ha kwesịrị ka anyị kwadoo ha ma rubere ha isi.—Ọrụ 20:28.
14. Gịnị kwesịrị ịrịba ama banyere nhọrọ Jehova họọrọ Mosis dị ka onye ndú kama ịhọrọ Erọn ma ọ bụ Miriam?
14 Erọn ji afọ atọ tọọ Mosis, ma nwanne ha nwanyị bụ́ Miriam tọrọ ha abụọ. (Ọpụpụ 2:3, 4; 7:7) Ebe ọ bụkwa na okwu na-aga Erọn were were n’ọnụ karịa Mosis, a họpụtara ya ije ozi dị ka ọnụ na-ekwuru nwanne ya nwoke. (Ọpụpụ 6:29–7:2) Ma, iji duo ụmụ Israel, Jehova ahọrọghị onye nke tọchara, bụ́ Miriam, ma ọ bụ onye okwu kasị aga were were n’ọnụ, bụ́ Erọn. Nhọrọ ọ họọrọ Mosis bụ nke o mere ná nghọta zuru ezu nke eziokwu nile na mkpa ndị e nwere mgbe ahụ. Mgbe ha na-enweghị nghọta a doro anya ruo oge ụfọdụ, Erọn na Miriam mere mkpesa, sị: “Ọ̀ bụ ezie na nanị Mosis ka Jehova wereworo kwuo okwu? Ọ́ bụghịkwa anyị ka O wereworo kwuo okwu?” E nyere Miriam ntaramahụhụ, bụ́ onye ma e leghị anya kpalitere ya n’ụzọ bụ́ isi n’ihi àgwà enweghị nsọpụrụ a n’ebe onye Jehova họọrọ nọ, bụ́ onye ya na Erọn kwesịrị ịmataworị dị ka onye “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.”—Ọnụ Ọgụgụ 12:1-3, 9-15.
15, 16. Olee otú Keleb si gosi na o nwere obi ike n’ebe Jehova nọ?
15 Mgbe e zipụrụ ndị nledo 12 iledo Ala Nkwa ahụ, mmadụ 10 weghachiri akụkọ na-adịghị mma. Ha menyere ụmụ Israel ụjọ site n’ikwu banyere ndị Kenean ‘dị ukwuu hie nne.’ Nke a meziri ka ụmụ Israel “tamuo ntamu megide Mosis, megidekwa Erọn.” Ma ọ bụghị ndị nledo nile ahụ gosipụtara enweghị obi ike n’ebe Mosis na Jehova nọ. Anyị na-agụ, sị: “Keleb wee mee ka ndị Israel gba nkịtị n’ebe Mosis nọ, ọ sị, Ka anyị rịgoo nnọọ, nweta ya; n’ihi na anyị pụrụ ime ya nke ọma.” (Ọnụ Ọgụgụ 13:2, 25-33; 14:2) Onye nledo ibe Keleb bụ́ Joshua nwekwara otu nguzo ahụ siri ike. Ha abụọ gosiri na ha emewo Jehova obi ike ha mgbe ha sịrị: “Ọ bụrụ na ihe anyị atọọ Jehova ụtọ, Ọ ga-emekwa ka anyị baa n’ala nke a, Ọ ga-enyekwa anyị ya; bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Nanị . . . unu atụkwala egwu ndị ala ahụ . . . Jehova nọnyeere anyị: unu atụla egwu ha.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:6-9) Obi ike a n’ebe Jehova nọ wetara ụgwọ ọrụ. N’ime ọgbọ ndị toworo eto dị ndụ n’oge ahụ, nanị Keleb, Joshua, na ụfọdụ ndị Livaị nwere ihe ùgwù ịbanye n’Ala Nkwa ahụ.
16 Afọ ụfọdụ mgbe nke a gasịrị Keleb sịrị: “Mụ onwe m sozuru Jehova, bụ́ Chineke m, n’azụ. . . . Ma ugbu a, lee, Jehova emewo ka m dị ndụ, dị ka O kwuru, [iri afọ anọ] na ise ndị a, site na mgbe Jehova gwara Mosis okwu a, mgbe Israel jere ije n’ọzara: ma ugbu a, lee, mụ onwe m gbara [iri afọ asatọ] na ise taa. Ruo ugbu a m dị ike taa dị ka m dị n’ụbọchị Mosis zigara m: dị ka ike m si dị mgbe ahụ, otú a ka ike m dịkwa ugbu a.” (Joshua 14:6-11) Rịba àgwà ziri ezi Keleb, ikwesị ntụkwasị obi ya, na ikike ọkpụkpụ aka ya ama. Ma, Jehova ahọrọghị Keleb ịnọchi Mosis. E nyere Joshua ihe ùgwù a. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova nwere ihe mere o ji mee nhọrọ ya, ọ bụkwa nhọrọ kasị mma.
17. Gịnị pụrụ imeworị ka o yie ka Pita erughị eru maka ibu ọrụ?
17 Pita onyeozi gọnahụrụ Onyenwe ya ugbo atọ. N’echeghị echiche o mere ihe ọ na-abụghị ya kwesịrị ime, na-egbupụ ntị nke ohu onyeisi nchụàjà. (Matiu 26:47-55, 69-75; Jọn 18:10, 11) Ụfọdụ pụrụ ịsị na Pita bụ onye ụjọ, onye na-enweghị ezi nguzo, nke na-erughị eru inweta ihe ùgwù ndị pụrụ iche. Ma, ònye ka e nyeworo mkpịsị ugodi nke Alaeze ahụ, na-enwe ihe ùgwù imeghere ìgwè atọ ụzọ gaa n’ọkpụkpọ òkù eluigwe? Ọ bụ Pita.—Ọrụ 2:1-41; 8:14-17; 10:1-48.
18. Ihie ụzọ dị aṅaa, dị ka Jud kpọtụrụ uche, ka ọ dị anyị mkpa izere?
18 Ihe atụ ndị a na-egosi na anyị aghaghị ịkpachara anya banyere ikpe ikpe dabere n’ọdịdị a na-ahụ anya. Ọ bụrụ na anyị enwee obi ike n’ebe Jehova nọ, anyị agaghị enwe obi abụọ banyere nhọrọ ndị o mere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè, bụ́ ndị na-adịghị azọrọ na ha adịghị eme mmehie, mejupụtara ọgbakọ elu ala ya, ọ na-eji ha eme ihe n’ụzọ dị ukwuu. Jud, onye otu nne ji ya na Jisọs, dọrọ ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị banyere ndị ‘na-ajụ ịbụ onyenwe mmadụ, na-ekwulukwa ndị nọ n’ebube.’ (Jud 8-10) Anyị ekwesịghị ịdị ka ha ma ọlị.
19. N’ihi gịnị ka ọ na-enweghị ihe mere anyị ga-eji enwe obi abụọ ná nhọrọ ndị Jehova mere?
19 Ihe àmà na-egosi na Jehova na-ahọrọ ndị mmadụ maka ibu ọrụ ụfọdụ bụ́ ndị nwere otu àgwà kpọmkwem nke dị mkpa iji duzie ndị ya n’ụzọ ọ chọrọ ka ha gaa na mgbe ahụ kpọmkwem. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịmata eziokwu a, ọ bụghị inwe obi abụọ ná nhọrọ ndị Chineke mere, kama inwe afọ ojuju n’ụzọ obi umeala iji jee ozi n’ebe Jehova debeworo anyị n’otu n’otu. N’ụzo dị otú a, anyị na-egosi na anyị emewo Jehova obi ike anyị.—Ndị Efesọs 4:11-16; Ndị Filipaị 2:3.
Igosipụta Obi Ike n’Ezi Omume Jehova
20, 21. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Chineke si mesoo Mosis?
20 Ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ ọ na-eyi ka anyị na-enwebiga obi ike ókè n’ebe anyị onwe anyị nọ ma nwee nke dị oké nta n’ebe Jehova nọ, ka anyị mụta ihe site n’aka Mosis. Mgbe ọ dị afọ 40, ọ zọliri njem n’onwe ya iji tọpụ ụmụ Israel n’agbụ ndị Ijipt. Mgbalị ya bụ ndị o doro anya na e mere ná nzube dị mma, ma ha emeghị ka a gbapụta Israel ozugbo, ma ọ bụ mee ka ọnọdụ ya onwe ya ka mma. N’ezie, a manyere ya ịgbalaga. Nanị mgbe o nwesịrị ọzụzụ tara akpụ nke were afọ 40 n’ala ọzọ ka o ruru eru ịbụ onye a họpụtara ime ihe ọ chọburu ime. Ugbu a ọ pụrụ inwe obi ike ná nkwado Jehova n’ihi na a na-eme ihe ugbu a n’ụzọ Jehova si chọọ ya mgbe kwekọrọ n’oge Ya.—Ọpụpụ 2:11–3:10.
21 Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-agbachi Jehova na ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ ihu mgbe ụfọdụ, na-anwa ime ka ihe gaa ngwa ngwa ma ọ bụ na-eme ihe otú m si chọọ? Kama inwe mmetụta nke ịbụ onye e leghaara anya maka ihe ùgwù ụfọdụ, m̀ na-adị njikere ịnakwere oge ọzụzụ m na-aga n’ihu?’ N’ụzọ bụ́ isi, ànyị amụtawo ihe dị mkpa site n’aka Mosis?
22. N’agbanyeghị ịbụ onye oké ihe ùgwù funahụrụ, olee mmetụta Mosis nwere banyere Jehova?
22 Ọzọkwa, anyị pụrụ ịmụta ihe ọzọ site n’aka Mosis. Ọnụ Ọgụgụ 20:7-13 na-agwa anyị banyere otu ụzọ o hiere, nke mere ka oké ihe funahụ ya. Ọ tụfuru ihe ùgwù nke iduru ụmụ Israel baa n’Ala Nkwa ahụ. Ò meghachiziri omume n’ụzọ na-egosi na mkpebi Jehova n’okwu ahụ ezighị ezi? Ò wezụgara onwe ya n’otu akụkụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-akwa ụwa ya n’ihi na Chineke na-emeso ya omume n’ụzọ dị oké njọ? Mosis ọ̀ tụfuru obi ike ya n’ezi omume Jehova? Anyị pụrụ ịchọta azịza ha n’okwu ndị Mosis n’onwe ya gwara ụmụ Israel nwa mgbe tupu ọnwụ ya. Banyere Jehova, Mosis sịrị: “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Mosis nwegidere obi ike n’ebe Jehova nọ n’ezie ruo nnọọ ọgwụgwụ. Gịnị banyere anyị? Ànyị na-eme ihe n’otu n’otu iji mee ka obi ike anyị n’ebe Jehova nọ nakwa n’ezi omume ya sikwuo ike? Olee otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ? Ka anyị hụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee ihe ndị mere ụmụ Israel ga-eji tụkwasị Jehova obi?
◻ N’ihe banyere obi ike, gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’aka Abraham?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere inwe obi abụọ ná nhọrọ ndị Jehova mere?
[Foto dị na peeji nke 13]
Obi ike n’ebe Jehova nọ na-agụnye ịkwanyere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ùgwù