Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 9/1 p. 8-13
  • Ndị Àmà Megide Chi Ụgha Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Àmà Megide Chi Ụgha Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àmà Abraham Gbara Maka Eziokwu Ahụ
  • Otu Mba nke Ndị Àmà
  • Ule nke Chi Dị Iche Iche
  • “Unu Onwe Unu Bụ Ndị Àmà M”!
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Maka Ọkaaka Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ndị Nlanarị site ná Mba Nile
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 9/1 p. 8-13

Ndị Àmà Megide Chi Ụgha Nile

“Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara.”—AỊSAỊA 43:10.

1. Ònye bụ ezi Chineke ahụ, n’akụkụ ndị dịkwa aṅaa ka ọ bụ onye kachasị ọtụtụ chi ndị a na-efe ofufe taa elu?

ÒNYE bụ ezi Chineke ahụ? Taa, ajụjụ nke a kasị mkpa na-eche ihe nile a kpọrọ mmadụ ihu. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ na-efe ọtụtụ chi, nanị Otu pụrụ inye anyị ndụ ma nyekwa anyị ọdịnihu obi ụtọ. Nanị banyere Otu ka a pụrụ ikwu, sị: “Ọ bụ n’ime Ya onwe ya ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa.” (Ọrụ 17:28) N’ezie, nanị otu Chineke ka ofufe ruuru. Dị ka ndị ukwe nke eluigwe n’akwụkwọ Mkpughe na-asị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”—Mkpughe 4:11.

2, 3. (a) Olee otú Setan si jiri ụgha maa nruru o ruuru Jehova ịbụ onye e fere ofufe aka? (b) Gịnị ka mmehie Iv rụpụtaara Iv na ụmụ ya, gịnịkwa ka ọ rụpụtaara Setan?

2 N’ogige Iden, Setan ji ụgha maa oruru o ruuru Jehova ịbụ onye a ga-efe ofufe aka. N’iji agwọ eme ihe, ọ gwara Iv na ọ bụrụ na o nupụ isi megide iwu Jehova ma rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ nke Jehova machibidoro iwu, ya onwe ya ga-adị ka Chineke. Okwu ya bụ: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:5) Iv kwenyeere agwọ ahụ ma rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu.

3 N’ezie, Setan ghara ụgha. (Jọn 8:44) Nanị ụzọ Iv si “dị ka Chineke” mgbe o mehiere bụ na o weghaara ibu ọrụ nke ikpebi ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ, ihe e kwesịrị ịhapụrụ Jehova. N’agbanyeghikwa ụgha Setan, o mesịrị nwụọ. Ya mere nanị onye ritere uru site ná mmehie Iv bụ Setan. N’ezie, ihe mgbaru ọsọ a na-ekwupụtaghị ekwupụta nke Setan n’inubanye Iv ime mmehie bụ ịghọ chi n’onwe ya. Mgbe Iv mehiere, ọ ghọrọ mmadụ mbụ na-eso ụzọ ya, n’oge na-adịghịkwa anya Adam sonyeere ya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụ ha abụghị nanị ndị a mụrụ “n’ime mmehie” kamakwa ha dabara n’okpuru nchịkwa Setan, ná mkpirikpi oge kwa, ụwa nile nke e kewapụrụ n’ebe ezi Chineke ahụ nọ bịara dịrị.—Jenesis 6:5; Abụ Ọma 51:5.

4. (a) Ònye bụ chi nke ụwa nke a? (b) Banyere gịnị ka e nwere mkpa dị ngwa?

4 E bibiri ụwa ahụ n’Iju Mmiri ahụ. (2 Pita 3:6) Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị ụwa ọzọ nke e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ bilitere, ọ ka dịkwa. Banyere ya Bible na-asị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Site na ya ime ihe megide nzube na ihe iwu Jehova kwuru kpọmkwem, ụwa a na-emezu nzube Setan. Ọ bụ chi ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ma, n’ụzọ bụ isi ọ bụ chi na-akpaghị ume. Ọ pụghị ime ndị mmadụ obi ụtọ ma ọ bụ nye ha ndụ; nanị Jehova pụrụ ime nke ahụ. Ya mere, ndị chọrọ ndụ nwere nzube na ụwa ka mma aghaghị ibu ụzọ mụta na Jehova bụ ezi Chineke ahụ ma mụtazie ime uche ya. (Abụ Ọma 37:18, 27, 28; Eklisiastis 12:13) N’ihi ya e nwere mkpa dị ngwa maka ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe ịgba àmà, ma ọ bụ ịkpọsa eziokwu ahụ, banyere Jehova.

5. “Oké ìgwè ndị àmà” dị aṅaa ka Pọl kpọtụrụ aha? Kpọọ aha ụfọdụ ndị o depụtara.

5 Site ná mmalite, ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị otú ahụ apụtaworị n’ụwa. Pọl onyeozi, ná Ndị Hibru isi nke 11, na-enye ogologo ihe ndepụta ha ma na-akpọ ha “oké ìgwè ndị àmà.” (Ndị Hibru 12:1) Nwa Adam na Iv nke abụọ, Ebel, bụ onye mbụ n’ihe ndepụta Pọl. A kpọkwara Ịnọk na Noa aha n’oge dịrị tupu Iju Mmiri ahụ. (Ndị Hibru 11:4, 5, 7) Onye pụtara ìhè bụ Abraham, nna nna nke agbụrụ ndị Juu. Abraham, onye a kpọrọ “enyi nke Chineke,” ghọrọ nna ochie nke Jisọs, bụ́ “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.”—Jemes 2:23; Mkpughe 3:14.

Àmà Abraham Gbara Maka Eziokwu Ahụ

6, 7. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndụ na ọrụ Abraham si gbaa àmà na Jehova bụ ezi Chineke ahụ?

6 Olee ụzọ Abraham si jee ozi dị ka onye àmà? Site n’okwukwe ya siri ike na Jehova na nrubeisi ya n’ụzọ nnọgidesi ike n’ihe nye ya. Mgbe a kpọrọ ya òkù ịhapụ obodo ukwu nke Ua ma bie ndụ ya nke fọdụrụnụ n’ala dị anya, Abraham rubere isi. (Jenesis 15:7; Ọrụ 7:2-4) Ndị agbụrụ ya na-awagharị awagharị ga-ahapụ ndụ ngagharị ha ọtụtụ mgbe ma kpebie ịhọrọ ndụ ịnọ na ntụkwasị obi nke obodo ukwu. Ya mere, mgbe Abraham hapụrụ obodo ukwu ahụ wee malite ibi n’ụlọ ntu, o nyere ihe àmà siri ike nke ntụkwasị obi ya n’ebe Jehova Chineke nọ. Nrubeisi ya bụ ihe àmà nye ndị na-ekiri ya. Jehova gọziri Abraham n’ụba maka okwukwe ya. Ọ bụ ezie na o bi n’ụlọ ntu, Abraham bara ụba n’ụzọ ihe onwunwe. Mgbe a dọọrọ Lọt na ezinụlọ ya n’agha, Jehova nyere Abraham ihe ịga nke ọma ná nchụso ya, nke mere ka o nwee ike ịnapụta ha. Nwunye Abraham mụrụ otu nwa nwoke n’agadi ya, sizie otú a gosipụta eziokwu nke nkwa Jehova kwere na Abraham ga-amụ otu mkpụrụ. Site n’Abraham, ndị mmadụ hụrụ na Jehova bụ Chineke na-adị ndụ na-emezu nkwa ya nile.—Jenesis 12:1-3; 14:14-16; 21:1-7.

7 Mgbe o si n’ịnapụta Lọt na-alọghachi, Abraham bụ onye Melkizedek zutere, bụ́ eze nke Selem (nke e mesịrị kpọọ Jerusalem), onye nabatara Abraham, na-asị ‘Onye a gọziri agọzi ka Abram nke Chineke Nke kachasị ihe nile elu bụ.’ Eze nke Sọdọm zutekwara ya ma chọọ inye ya onyinye dị iche iche. Abraham jụrụ. N’ihi gịnị? Ọ chọghị ka e nwee obi abụọ ọ bụla banyere Isi Iyi nke ngọzi ya. O kwuru, sị: “Eweliwo m aka m nye Jehova, bụ́ Chineke Nke kachasị ihe nile elu, Onyenwe eluigwe na ụwa, na m gaghị ewere ihe ma ọlị n’ime ihe ọ bụla nke i nwere, site n’ogho wee ruo eriri akpụkpọ ụkwụ, ka i wee ghara ịsị, Mụ onwe m emewo Abram ka ọ bụrụ ọgaranya.” (Jenesis 14:17-24) Lee aha ezi onye àmà Abraham bụ!

Otu Mba nke Ndị Àmà

8. Olee otú Mosis si gosi okwukwe dị ukwuu n’ebe Jehova nọ?

8 Mosis, onye sitere n’usoro ọmụmụ Abraham, pụtakwara n’ihe ndepụta Pọl nke ndị àmà. Mosis gbakụtara akụ̀ na ụba nke Ijipt azụ ma mesịa jiri anyaike chee onye ọchịchị nke ike ụwa ukwuu ahụ ihu iji duje ụmụ Israel ná nnwere onwe. Olee ebe o nwetara obi ike ahụ? Site n’okwukwe ya. Pọl na-asị: “[Mosis] nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.” (Ndị Hibru 11:27) A na-ahụ chi nile nke Ijipt anya, na-emetụ ha aka. Ọbụna taa, ihe oyiyi ha na-eju ndị mmadụ anya. Ma Jehova, ọ bụ ezie na a dịghị ahụ ya anya, dị adị nke ukwuu n’ebe Mosis nọ karịa chi ụgha ndị ahụ nile. Mosis enweghị obi abụọ na Jehova dị adị nakwa na ọ ga-akwụghachi ndị na-efe Ya ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6) Mosis ghọrọ onye àmà pụtara ìhè.

9. Olee otú mba Israel ga-esi jeere Jehova ozi?

9 Mgbe o dujesịrị ụmụ Israel ná nnwere onwe, Mosis ghọrọ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị n’etiti Jehova na ụmụ Abraham site na Jekọb. N’ihi ya, mba Israel malitere ịdị adị dị ka ihe onwunwe pụrụ iche nke Jehova. (Ọpụpụ 19:5, 6) Na nke mbụ ya, a na-aga ịgba àmà dị ka otu mba. Okwu Jehova site n’ọnụ Aịsaịa, ihe dị ka 800 afọ n’ihu, dị irè n’ụkpụrụ site ná mmalite ịdị adị nke mba ahụ: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara: ka unu wee mara, kwere m, ghọta na Mụ onwe m bụ Onye ahụ.” (Aịsaịa 43:10) Olee otu mba ọhụrụ a ga-esi eje ozi dị ka ndị àmà Jehova? Site n’okwukwe na nrubeisi ha nakwa site n’ihe ndị Jehova mere n’ihi ha.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ọrụ ndị dị ike nke Jehova n’ihi Israel si gbaa àmà, gịnịkwa si na nke a pụta?

10 Ihe dị ka 40 afọ mgbe ọ malitesịrị, Israel fọrọ nke nta ka ha nweta Ala Nkwa ahụ. E zipụrụ ndị nledo inyocha obodo Jeriko, Rehab, onye bikwa na Jeriko, chebere ha. N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “Anyị anụwo otú Jehova mere ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọrọ n’ihu unu, mgbe unu siri n’Ijipt pụta; na ihe unu mere eze abụọ nke ndị Amọraịt, ndị bi n’ofè Jọdan, bụ́ Saịhọn na Ọg, ndị unu wezugara ka e bibie ha. Ma mgbe anyị nụrụ ya, obi anyị wee lọọ anyị mmiri, ọ dịghịkwa mmụọ guzoro ọzọ n’ime nwoke ọ bụla, n’ihi unu: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke unu, Ya onwe ya bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu, na n’elu ụwa dị n’okpuru.” (Joshua 2:10, 11) Akụkọ nke ọrụ ndị dị ike nke Jehova kpaliri Rehab na ezinụlọ ya ịhapụ Jeriko na chi ụgha ya nile na isoro Israel fee Jehova. N’ụzọ doro anya, Jehova esitewo n’Israel gbaa àmà dị ike.—Joshua 6:25.

11. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nne na nna nile bụ́ ndị Israel nwere banyere ịgba àmà?

11 Mgbe ụmụ Israel ka nọ n’Ijipt, Jehova zijere Mosis n’ebe Fero nọ ma sị: “Bakwuru Fero: n’ihi na Mụ onwe m emewo ka obi ya na obi ndị ohu ya dị arọ, ka M wee tinye ihe ịrịba ama ndị a n’etiti ha: ka i wee kọọkwa ná ntị nwa gị na nwa nwa gị akụkọ banyere emo M kwara ndị Ijipt, na ihe ịrịba ama nile nke M tinyere n’etiti ha; ka unu wee mara na Mụ onwe m bụ́ Jehova.” (Ọpụpụ 10:1, 2) Ụmụ Israel na-erube isi ga-agwa ụmụ ha banyere ọrụ ndị dị ike nke Jehova. N’aka nke ha, ụmụ ha ga-akọrọ ụmụ ha, otú ahụ ka a ga na-eme ya site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. Otú a, a ga-echeta ọrụ ndị dị ike nke Jehova. N’otu aka ahụ taa, ndị nne na nna nwere ibu ọrụ nke ịgbara ụmụ ha àmà.—Deuterọnọmi 6:4-7; Ilu 22:6.

12. Olee otú ngọzi Jehova nyere Solomọn na Israel si gbaa àmà?

12 Ngọzi Jehova gọziri Israel n’ụba mgbe o kwesịrị ntụkwasị obi jere ozi dị ka àmà nye mba ndị gbara ha gburugburu. Dị ka Mosis kwuru mgbe ọ kọsịrị ngọzi ndị Jehova kwere ná nkwa, sị: “Ndị nile nke ụwa ga-ahụkwa na ọ bụ aha Jehova ka a na-akpọkwasị gị; ha ga-atụkwa egwu gị.” (Deuterọnọmi 28:10) E nyere Solomọn amamihe na akụ̀ na ụba n’ihi okwukwe ya. N’okpuru ya mba ahụ nwere ọganihu ma nwee ogologo oge nke udo. Banyere oge ahụ anyị na-agụ, sị: “Ha wee si ná ndị nile bịa ịnụ amamihe Solomọn, si n’eze nile nke ụwa, bụ́ ndị nụrụ amamihe ya.” (1 Ndị Eze 4:25, 29, 30, 34) Onye pụtara ìhè n’ime ndị ọbịa Solomọn bụ eze nwanyị nke Sheba. Mgbe o jisịrị anya ya hụrụ ngọzi Jehova ná mba ahụ na eze ya, o kwuru, sị: “Ka Jehova, bụ́ Chineke gị, bụrụ onye a gọziri agọzi, Onye ihe gị tọrọ Ya ụtọ, itinyekwasị gị n’ocheeze Ya, ịbụrụ Jehova, bụ́ Chineke gị, eze: n’ihi na Chineke gị hụrụ Israel n’anya.”—2 Ihe Emere 9:8.

13. Gịnị pụrụ ịbụworị àmà kasị irè Israel gbara, oleekwa otú anyị ka si na-erite uru na ya?

13 Pọl onyeozi hotara ihe bụ ma eleghị anya àmà kasị irè nke Israel. Mgbe o soro ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom na-ekwurịta banyere Israel anụ ahụ, o kwuru, sị: “E weere okwu si n’ọnụ Chineke pụta nye ha n’aka ná ntụkwasị obi.” (Ndị Rom 3:1, 2) Na-amalite n’ebe Mosis nọ, e nyere ụfọdụ ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi ike mmụọ nsọ idekọ mmeso nile Jehova mesoro Israel, nakwa ndụmọdụ ya, iwu ya, na amụma ya nile. Site n’ihe odide ndị a, ndị odeakwụkwọ oge ochie ahụ gbaara ọgbọ nile ga-abịanụ àmà—tinyere nke anyị taa—na e nwere nanị otu Chineke, aha ya bụkwa Jehova.—Daniel 12:9; 1 Pita 1:10-12.

14. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị gbaara Jehova àmà ji nweta mkpagbu?

14 N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ mgbe Israel egosighị okwukwe, mgbe ahụkwa Jehova aghaghị izijere mba nke onwe ya ndị àmà. A kpagburu ọtụtụ n’ime ndị a. Pọl kwuru na ụfọdụ “ka a nwara ọnwụnwa nke ihe ọchị na ụtarị, ee, tụkwasị ihe ndị a, nke agbụ na ụlọ mkpọrọ.” (Ndị Hibru 11:36) Ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi n’ezie! Lee ka o si dị mwute na mkpagbu ha ọtụtụ mgbe sitere n’aka ndị ibe ha bụ́ ndị òtù nke mba Jehova họọrọ! (Matiu 23:31, 37) N’ezie, mmehie nke mba ahụ ghọrọ nke dị nnọọ ukwuu nke na, na 607 T.O.A., Jehova kpọbatara ndị Babilọn ka ha bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya ma duru ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ Israel dị ndụ gaa biri n’ala ọzọ. (Jeremaịa 20:4; 21:10) Nke ahụ ọ̀ bụ ọgwụgwụ nke ịgba àmà dị ka otu mba nye aha Jehova? Ee e.

Ule nke Chi Dị Iche Iche

15. Olee otú e si gbaa àmà ọbụna mgbe e bi n’ala ọzọ na Babilọn?

15 Ọbụna mgbe ha bi n’ala ọzọ na Babilọn, ndị òtù kwesịrị ntụkwasị obi nke mba ahụ egbughị oge ịgba àmà banyere Ịbụ Chineke na ike nke Jehova. Dị ka ihe atụ, Daniel ji nkwuwa okwu kọwaa nrọ ndị Nebukadneza rọrọ, kọwaara Belshaza ihe e dere ná mgbidi, ma jụ imebi okwukwe ya n’ihu Daraịọs n’okwu metụtara ekpere. Ndị Hibru atọ ahụkwa, mgbe ha na-ajụ ịkpọ isiala nye otu ihe oyiyi, gbaara Nebukadneza ọmarịcha àmà.—Daniel 3:13-18; 5:13-29; 6:4-27.

16. Olee otú Jehova si buo amụma nlaghachi Israel n’ala ha, gịnịkwa ga-abụ nzube nke nlaghachi a?

16 Ka o sina dị, Jehova zubere na a ga-agba àmà dị ka otu mba ọzọ n’ala Israel. Ezikiel, onye buru amụma n’etiti ndị Juu bi n’ala ọzọ na Babilọn, dere banyere mkpebi Jehova metụta ala ahụ e bibiri ebibi: “M ga-emekwa ka mmadụ baa ụba n’elu unu, bụ́ ụlọ Israel nile, ha nile: mmadụ ga-ebikwa n’obodo unu nile, ọ bụkwa mkpọmkpọ ebe nile unu ka a ga-ewu.” (Ezikiel 36:10) Gịnị mere Jehova ga-eji mee nke a? N’ụzọ bụ́ isi dị ka àmà nye aha nke ya. Site n’ọnụ Ezikiel o kwuru, sị: “Ọ bụghị n’ihi unu ka Mụ onwe m na-arụ ọrụ, unu ụlọ Israel, kama ọ bụ n’ihi aha nsọ m, nke unu meworo ka ọ ghara ịdị nsọ n’etiti mba nile.”—Ezikiel 36:22; Jeremaịa 50:28.

17. Gịnị bụ ihe gbara okwu nke Aịsaịa 43:10 gburugburu?

17 Ọ bụ mgbe ọ na-ebu amụma banyere nlọghachi nke Israel site n’ibi n’ala ọzọ na Babilọn ka e nyere onye amụma bụ́ Aịsaịa ike mmụọ nsọ idetu okwu ndị nke Aịsaịa 43:10, na-asị na Israel bụ onye àmà Jehova, ohu ya. N’Aịsaịa 43 na 44, a kọwara Jehova dị ka Onye Okike, Onye Kpụrụ, Chineke, Onye Nsọ, Onye Nzọpụta, Onye Mgbapụta, Eze, na Onye Mere Israel. (Aịsaịa 43:3, 14, 15; 44:2) E kwere ka ibi n’ala ọzọ nke Israel mee n’ihi na mba ahụ mgbe mgbe enyeghị ya otuto dị ka onye bụ ihe ndị ahụ. Otú ọ dị, ha ka bụ ndị ya. Jehova agwawo ha, sị: “Atụla egwu, n’ihi na agbapụtawo m gị; akpọwo m gị n’aha gị, nke m ka ị bụ.” (Aịsaịa 43:1) Israel ibi n’ala ọzọ na Babilọn ga-agwụ.

18. Olee otú mgbapụta nke Israel n’aka Babilọn si gosi na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ?

18 N’ezie, Jehova mere ka mgbapụta nke Israel n’aka Babilọn bụrụ ule nke chi dị iche iche. O cheere chi ụgha nke mba nile aka mgba iwepụta ndị àmà ha, ọ kpọkwara Israel aha dị ka onye àmà ya. (Aịsaịa 43:9, 12) Mgbe ọ gbapụtara Israel, o gosiri na chi nile nke Babilọn abụtụghị chi nakwa na ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ. (Aịsaịa 43:14, 15) Ihe dị ka 200 afọ tupu ihe omume ahụ, mgbe ọ kpọrọ Saịrọs nke Peasia aha dị ka ohu ya n’ime ka ndị Juu nwere onwe ha, o nyekwuru ihe àmà nke Ịbụ Chineke ya. (Aịsaịa 44:28) A ga-agbapụta Israel. N’ihi gịnị? Jehova na-akọwa, sị: “Akụkọ otuto m ka ha [Israel] ga-akọ.” (Aịsaịa 43:21) Ọ ga-enyekwu ohere maka ịgba àmà.

19. Àmà dị aṅaa ka a gbara site na Saịrọs ịkpọ ụmụ Israel òkù ịlaghachi na Jerusalem nakwa site n’ọrụ nke ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi mgbe nlaghachi ahụ gasịrị?

19 Mgbe oge ya bịara, Saịrọs bụ́ onye Peasia meriri Babilọn dị nnọọ ka e buru ya n’amụma. Ọ bụ ezie na Saịrọs bụ onye na-ekpere arụsị, ọ kpọsara Ịbụ Chineke nke Jehova mgbe o kwupụtaara ndị Juu nọ na Babilọn, sị: “Ònye nọ n’etiti unu site ná ndị Ya nile? ka Chineke ya nọnyere ya, ya rịgoruokwa Jerusalem, wuo ụlọ Jehova, bụ́ Chineke Israel, (Ya onwe ya bụ Chineke,) nke dị na Jerusalem.” (Ezra 1:3) Ọtụtụ ndị Juu ṅara ntị. Ha jiri ụkwụ gaghachi n’Ala Nkwa ahụ ma wuo ebe ịchụ àjà n’ebe e wuru ụlọ nsọ ochie ahụ. N’agbanyeghị nkụda aka na mmegide siri ike, ha mesịrị nwee ike iwughachi ụlọ nsọ ahụ na obodo Jerusalem. Ihe ndị a nile mere, dị ka Jehova n’onwe ya kwuru, sị, “ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ [ya].” (Zekaraịa 4:6) Ihe ndị a a rụzuru nyekwuru ihe àmà na Jehova bụ ezi Chineke ahụ.

20. N’agbanyeghị adịghị ike nile nke Israel, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ha ịgbara aha Jehova àmà n’ụwa ochie?

20 Otú a, Jehova gara n’ihu iji Israel eme ihe dị ka onye àmà ya, ọ bụ ezie na ọ bụ mba nke ndị na-ezughị okè na mgbe ụfọdụ ndị nnupụisi. N’ụwa dị tupu oge ndị Kraịst, mba ahụ, ya na ụlọ nsọ na usoro ndị nchụàjà ya, guzo dị ka ebe bụ́ isi nke ezi ofufe n’ụwa. Onye ọ bụla gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere ọrụ Jehova nile metụta Israel enweghị ike inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na e nwere nanị otu ezi Chineke, aha ya bụkwa Jehova. (Deuterọnọmi 6:4; Zekaraịa 14:9) Otú ọ dị, a gaje ịgba àmà ka nnọọ ukwuu nye aha Jehova, anyị ga-atụlekwa nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee otú Abraham si gbaa àmà na Jehova bụ ezi Chineke ahụ?

◻ Àgwà dị aṅaa pụrụ iche nke Mosis nyeere ya aka ịbụ onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Israel si gbaa àmà dị ka otu mba banyere Jehova?

◻ Olee otú mgbapụta nke Israel n’aka Babilọn si bụrụ ngosipụta na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Site n’okwukwe na nrubeisi ya, Abraham gbara àmà pụtara ìhè nye Ịbụ Chineke nke Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya