Ike Agwụla Gị n’Obi!
“Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—NDỊ GALETIA 6:9.
1, 2. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọdụm si achụ nta? (b) Ole ndị ka Ekwensu nwekarịsịrị mmasị iji mere anụ oriri?
ỌDỤM na-achụ nta n’ụzọ dị iche iche. Mgbe ụfọdụ ọ ga-eruru anụ ọ chọrọ iri mbi n’ọnụ mmiri ma ọ bụ n’ụzọ ọhịa a na-agafekarị. Ma n’oge ụfọdụ, ka akwụkwọ bụ́ Portraits in the Wild na-ekwu, ọdụm “na-eji nnọọ ọnọdụ dapụtara—dị ka ihe atụ, izute nwa ịnyịnya ọhịa na-ehi ụra—eme ihe.”
2 “Onye ahụ nke na-ekuru [anyị] gaa ikpe, bụ́ ekwensu,” ka Pita onyeozi na-akọwa, “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) N’ịmara na oge fọọrọ ya dị mkpụmkpụ, Setan na-atụkwasịkwu nnọọ nrụgide n’ahụ ụmụ mmadụ iji gbochie ha ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, “ọdụm na-agbọ ụja” nke a nwere mmasị karịsịa n’iji ndị ohu Jehova mere anụ oriri. (Mkpughe 12:12, 17) Ụzọ dị iche iche o si achụ nta yiri ndị nke ihe ya na ya yiri n’etiti ụmụ anụmanụ. N’ụzọ dị aṅaa?
3, 4. (a) Olee ụzọ dị iche iche Setan ji anwụde ndị ohu Jehova? (b) N’ihi na ndị a bụ “oge dị oké egwu,” olee ajụjụ ndị a na-ewelite?
3 Mgbe ụfọdụ Setan na-anwa iru mbi—mkpagbu ma ọ bụ mmegide ndị e zubere iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe anyị ka anyị wee kwụsị ijere Jehova ozi. (2 Timoti 3:12) Ma, dị ka ọdụm, n’oge ndị ọzọ Ekwensu na-eji nnọọ ọnọdụ dapụtaranụ eme ihe. Ọ na-echere ruo mgbe anyị nwere nkụda obi ma ọ bụ daa mbà, mgbe ahụkwa ọ na-anwa iji ọnọdụ mmetụta uche anyị dị ala mee ihe iji mee ka ike gwụ anyị. Anyị agaghị abụ anụ ndị ọ dị mfe iri!
4 Ma, anyị na-ebi n’oge kasị sie ike n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. ‘N’oge a dị oké egwu,’ ọtụtụ n’ime anyị pụrụ inwe nkụda obi ma ọ bụ bụrụ ndị ihe na-anyịgbu site na mgbe ruo na mgbe. (2 Timoti 3:1) Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi zere ịda mbà nke ukwuu nke na anyị ghọọrọ Ekwensu anụ dị mfe oriri? Ee, olee otú anyị pụrụ isi ṅaa ntị na ndụmọdụ Pọl onyeozi nke sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà”?—Ndị Galetia 6:9.
Mgbe Ndị Ọzọ Mere Ihe Anyị Na-atụghị Anya Ya
5. Gịnị mere Devid ji daa mbà, ma gịnị ka ọ na-emeghị?
5 N’oge Bible, ọ pụrụ ịdịwo ọbụna ndị ohu Jehova kasị ekwesị ntụkwasị obi ka ihe ọ̀ na-anyịgbu ha. “Adọgbuwo m onwe m n’ọrụ n’ize ume m,” ka ọbụ abụ bụ́ Devid dere. “Kwa abalị ka m na-eme ka ihe ndina m see n’elu anya mmiri m; eji m anya mmiri m dee ihe m ji edina. Anya m emebiwo site ná mkpasu iwe m.” N’ihi gịnị ka o ji dị Devid otú ahụ? “N’ihi ndị mkpagbu m nile,” ka ọ kọwara. Omume mkpasu iwe nke ndị ọzọ kpataara Devid oké ihe mgbu nke obi nke na anya mmiri ya ruru ka mmiri. Ma, Devid ekewapụghị onwe ya n’ebe Jehova nọ n’ihi ihe ụmụ mmadụ ibe ya meworo ya.—Abụ Ọma 6:6-9.
6. (a) Olee otú okwu ma ọ bụ omume ndị ọzọ pụrụ isi metụta anyị? (b) Olee otú ụfọdụ si eme onwe ha anụ dị mfe oriri nye Ekwensu?
6 N’otu aka ahụ, okwu ma ọ bụ omume nke ndị ọzọ pụrụ ime ka anyị daa mbà n’oké ihe mgbu nke obi. “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha,” ka Ilu 12:18 na-ekwu. Mgbe onye ahụ na-adịghị eche echiche bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị onye Kraịst, ‘ndụpu mma agha’ ahụ pụrụ ịba ime. Ọchịchọ mmadụ pụrụ ịbụ iwe iwe, ma eleghị anya na-ebu iwe n’obi. Nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na anyị chere na e mesowo anyị n’ụzọ obi ọjọọ ma ọ bụ n’ikpe na-ezighị ezi. Ọ pụrụ isiri anyị ike ikwusara onye mmejọ ahụ okwu; anyị pụrụ ọbụna ịma ụma na-ezere ya. N’ịbụ ndị iwe na-anyịgbu, ike agwụwo ụfọdụ n’obi, ha akwụsịwokwa ịbịa nzukọ ndị Kraịst. N’ụzọ dị mwute, ha si otú ahụ ‘nye Ekwensu ụzọ’ ịwakwasị ha dị ka anụ dị mfe oriri.—Ndị Efesọs 4:27.
7. (a) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịdaba n’aka Ekwensu mgbe ndị ọzọ mere ihe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ kpasuo anyị iwe? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji hapụ iwe?
7 Olee otú anyị pụrụ isi zere ịdaba n’aka Ekwensu mgbe ndị ọzọ mere ihe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ kpasuo anyị iwe? Anyị aghaghị ịgbalị ịhapụ ibu iwe n’obi. Kama nke ahụ, bute ụzọ n’ime ka udo dị ma ọ bụ idozi okwu ngwa ngwa dị ka o kwere omume. (Ndị Efesọs 4:26) Ndị Kọlọsi 3:13 na-agba anyị ume, sị: “Werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta.” Mgbaghara kwesịrị ekwesị karịsịa mgbe onye ahụ mejọrọnụ kwetara mmejọ ahụ ma nwee ezigbo mwute. (Tụlee Abụ Ọma 32:3-5 na Ilu 28:13.) Ma, ọ na-enyere anyị aka ma anyị buru n’uche na ịgbaghara abụghị ịnakwere ma ọ bụ ime ka ihe ọjọọ ndị ndị ọzọ mere dị ala. Ịgbaghara gụnyere ịhapụ iwe. Iwe bụ ibu dị arọ ibu. Ọ pụrụ irikpu echiche anyị, na-anapụ anyị obi ụtọ. Ọ pụrụ ọbụna imetụta ahụ ike anyị. N’ụzọ dị iche, mgbaghara, n’ebe o kwesịrị ekwesị, na-abara anyị uru. Ka anyị, dị ka Devid, ghara inwe ike ọgwụgwụ mgbe ọ bụla ma kewapụ n’ebe Jehova nọ n’ihi ihe ndị ọzọ kwuworo ma ọ bụ mee anyị!
Mgbe Anyị Gahiere
8. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji enwe oké obi amamikpe mgbe ụfọdụ? (b) Olee ihe ize ndụ dị n’ịbụ onye obi amamikpe rikpuru nke na ike onwe anyị gwụrụ anyị?
8 “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe,” ka Jemes 3:2 na-ekwu. Mgbe anyị sụrụ ngọngọ, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị inwe mwute. (Abụ Ọma 38:3-8) Mmetụta nke obi amamikpe pụrụ isikarị ike ma ọ bụrụ na anyị na-alụso otu adịghị ike nke anụ ahụ ọgụ ma na-enwe ndaghachi azụ n’oge ụfọdụ.a Otu onye Kraịst nke chere mgba dị otú ahụ ihu kọwara, sị: “Achọbughị m ịga n’ihu na-adị ndụ, n’amataghị ma mụ emeela mmehie ahụ na-enweghị mgbaghara ma ọ bụ na emebeghị m ya. Ọ dịrị m ka ọ bụ mụ adọgbudịla onwe m n’ọrụ n’ozi Jehova n’ihi na ma eleghị anya oge agabigala m nke ukwuu.” Mgbe obi amamikpe rikpuru anyị nke ukwuu otú a nke na ike onwe anyị na-agwụ anyị, anyị na-enye Ekwensu ohere—ọ pụkwara ime ngwa iji ya mee ihe! (2 Ndị Kọrint 2:5-7, 11) Ihe dị mkpa pụrụ ịbụ echiche ka guzozie eguzozi banyere obi amamikpe.
9. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee obi ike n’ebere Chineke?
9 Mgbe anyị mehiere o kwesịrị ekwesị inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi amamikpe. Ma, mgbe ụfọdụ, mmetụta nke obi amamikpe na-adịgide n’ihi na onye Kraịst na-eche na ọ dịghị mgbe ya ga-eru eru inweta ebere Chineke. Ma, Bible na-emesi anyị obi ike n’ụzọ na-ekpo ọkụ, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ bụ Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.” (1 Jọn 1:9) È nwere ezi ihe ọ bụla mere a ga-eji kwere na Chineke agaghị eme nke ahụ n’ọnọdụ anyị? Cheta, n’Okwu ya, Jehova na-asị na ya “na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5; 130:3, 4) Ebe ọ na-apụghị ịgha ụgha, ọ ga-eme dị ka Okwu ya kwere ná nkwa, ọ bụrụhaala na anyị ejiri obi nchegharị bịakwute ya.—Taịtọs 1:2.
10. Mmesi obi ike dị aṅaa na-ekpo obi ọkụ ka Ụlọ Nche e bipụtaburu nyere banyere ịlụso otu adịghị ike nke anụ ahụ ọgụ?
10 Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị na-alụso otu adịghị ike ọgụ ma nwee ndaghachi azụ? Ike agwụla gị n’obi! Ndaghachi azụ adịchaghị akagbu ọganihu i nwewororịị. Mbipụta nke November 1954, nke magazin a kwuru ihe imesi obi ike nke a: “Ayi [nwere ike ịchọpụta] na ayi onwe ayi nasu ngọngọ, nada kwa ọtutu mb̧e n’ebe omume ọjọ ufọdu di, bu nke rimiworo nime aha ihe-ilere-anya nke ndu ayi nadi mbu kari otu ayi mataworori. . . . Echela na olile-anya nile agwuwo. Ekpebila na i mewo nmehie nke nenweghi nb̧aghara. Nke ahu bu uzọ Setan gachọ ka i neche. Ezi okwu ahu nke bu na i nenwe nwuta, newe kwa iwe megide onwe-gi, negosi n’onwe-ya na i kagabigagh oke. Ka ike ghara igwu gi mb̧e ọ bula n’iji obi-ume-ala na ezi-okwu chigharikute Chineke, nachọ nb̧aghara-Ya na ka Ọ me ka i di ọcha, ye-kwa-ra gi aka. Jekuru Ya dika nwata si ejekuru nna-ya na mb̧e ọ nọ nime nmekpa-aru, naṅagh nti ub̧o ole ọ gabu nime otu njehie ahu, Jehova geji kwa amara yere gi aka n’ihi ebere-Ya nke ayi nerughi inara, ọzọ, ọ buru na i ji ezi-okwu me nka, Ọ geme ka i mata na emewo ka akọ-na-uche-gi di ọcha.”
Mgbe Ọ Dị Anyị Ka Anyị Adịghị Eme Ihe Zuru Ezu
11. (a) Olee mmetụta anyị kwesịrị inwe banyere ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze? (b) Olee mmetụta ndị ndị Kraịst ụfọdụ na-agbaso mgba banyere ikere òkè n’ozi ahụ?
11 Ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-ekere òkè dị mkpa ná ndụ onye Kraịst, ikere òkè n’ime ya na-ewetakwa ọṅụ. (Abụ Ọma 40:8) Ma, ụfọdụ ndị Kraịst na-enwe oké obi amamikpe banyere enweghị ike imekwu ihe n’ozi ahụ. Obi amamikpe dị otú ahụ pụrụ ọbụna irichapụ ọṅụ anyị ma mee ka ike gwụ anyị, na-eche na Jehova na-eche na ọ dịghị mgbe anyị na-eme ihe zuru ezu. Tụlee mmetụta ole na ole ụfọdụ ndị na-agbaso mgba.
“Ị̀ maara otú ịda ogbenye si na-eri oge?” ka otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst dere, bụ́ onye ya na di ya na-azụlite ụmụ atọ. “M ghaghị ichekwa ihe n’akụkụ ọ bụla m nwere ike. Nke a pụtara itinye oge na-achọgharị ihe n’ụlọ ahịa ọkịrịka, ahịa mgbuka, ma ọ bụ ọbụna na-akwa ákwà. M na-etinyekwa otu hour ma ọ bụ abụọ kwa izu n’ịrụ ọrụ tiketi nri [nsepụ ego]—na-ebekata ha, na-etinye ha na faịlụ, ma na-ere ha. Mgbe ụfọdụ, m na-enwe oké obi amamikpe n’ime ihe ndị a, na-eche na m kwesịrị iji oge ahụ nọrọ n’ozi ubi.”
“Echere m na ọ ghaghị ịbụ na mụ ahụghị Jehova n’anya n’ụzọ zuru ezu,” ka otu nwanna nwanyị nwere ụmụ anọ na di na-ekweghị ekwe kọwara. “Ya mere m gbara mgba ijere Jehova ozi. M gbalịsiri nnọọ ike, ma ọ dịghị mgbe ọ na-adị m ka o zuru ezu. Enweghị m mmetụta ọ bụla nke uru onwe onye, ya mere apụghị m ịhụ otú Jehova pụrụ isili nakwere ozi m na-ejere ya.”
Otu onye Kraịst ọ dịrị mkpa ịhapụ ozi oge nile kwuru, sị: “Apụghị m ịnagide echiche nke na m na-ada ada ná nkwa m ijere Jehova ozi oge nile. Ị pụghị ịghọta otú m nweruru mmechuihu! M na-ebe ákwá ugbu a ma m cheta ya.”
12. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst ji enwe oké obi amamikpe n’ihi enweghị ike imekwu ihe n’ozi ahụ?
12 O kwekọrọ nnọọ n’okike ịchọ ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu otú o kwere omume. (Abụ Ọma 86:12) Ma, n’ihi gịnị ka ụfọdụ ji enwe oké obi amamikpe banyere enweghị ike imekwu ihe? Nye ụfọdụ, o yiri ka e jikọrọ ya na ozuzu nke mmetụta nke abaghị uru, ikekwe na-esite n’ahụmahụ ndị na-adịghị mma ná ndụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ, obi amamikpe na-ekwesịghị ekwesị pụrụ isite n’echiche ezi izu na-adịghị ya nke ihe Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị. “Echeburu m na ọ gwụla ma ahụ ọ̀ fụrụ gị ụfụ, ọ dịghị ka ị na-eme ihe zuru ezu,” ka otu onye Kraịst kwetara. N’ihi ya, o setịpụụrụ onwe ya ụkpụrụ ndị dịbigara elu ókè—wee nwezie obi amamikpe ọbụna nke ka ukwuu mgbe ọ na-enweghị ike iru ha.
13. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị?
13 Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị? Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Jehova na-atụ anyị anya iji obi dum jeere ya ozi, na-eme ihe ọnọdụ anyị nyere ohere ya. (Ndị Kọlọsi 3:23) Otú ọ dị, a pụrụ inwe oké ọdịiche n’etiti ihe anyị ga-achọ ime na ihe ezi izu dị na ya na anyị pụrụ ime. Ihe ndị dị ka afọ ndụ, ahụ ike, ume anụ ahụ, ma ọ bụ ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ ịkpara anyị ókè. Ka o sina dị, mgbe anyị mere ihe nile anyị pụrụ ime, obi pụrụ isi anyị ike na ozi anyị jeere Jehova sitere n’obi dum—n’enweghị ọdịiche n’obi dum nke onye ahụ ike na ọnọdụ ya nyere ya ohere ịnọ n’ozi oge nile.—Matiu 13:18-23.
14. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na enyemaka dị gị mkpa n’ikpebi ihe ị pụrụ iji ezi uche tụọ anya ya n’aka onwe gị?
14 Ya mere, olee otú ị pụrụ isi kpebie ihe ị pụrụ ịtụ anya ya n’aka gị onwe gị n’ụzọ ezi izu dị na ya? Ị pụrụ ịchọ iso enyi gị bụ́ onye Kraịst nke tozuru okè, nke a tụkwasịrị obi, ikekwe onye okenye ma ọ bụ nwanna nwanyị nweworo ahụmahụ, bụ́ onye maara ikike gị, ihe ịkpa ókè ndị i nwere, na ibu ọrụ ezinụlọ gị, kwurịta okwu ahụ. (Ilu 15:22) Cheta na n’anya Chineke, a dịghị eji ókè ihe i mere n’ozi ubi atụ uru ị bara dị ka mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ndị ohu Jehova nile dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. (Hagaị 2:7; Malakaị 3:16, 17) Ihe i na-eme n’ọrụ nkwusa ahụ pụrụ ịdị ala ma ọ bụ ịdị elu karịa ihe ndị ọzọ na-eme, ma ọ bụrụhaala na ọ nọchitere anya ihe kasị mma i nwere ike ya, obi dị Jehova ụtọ, ọ dịghịkwa gị mkpa inwe obi amamikpe.—Ndị Galetia 6:4.
Mgbe A Chọrọ Ihe Dị Ukwuu n’Aka Anyị
15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a na-achọ ihe dị ukwuu n’aka ndị okenye ọgbakọ?
15 “Onye ọ bụla e nyere ihe ukwu,” ka Jisọs kwuru, “n’aka ya ka a ga-achọkwa ihe ukwu.” (Luk 12:48) N’ezie ‘a na-achọ ihe ukwuu n’aka’ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye ọgbakọ. Dị ka Pọl ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi ọgbakọ. (2 Ndị Kọrint 12:15) Ha nwere okwu ndị ha ga-akwadebe, nleta ọzụzụ atụrụ ime, okwu ikpe ileba anya—ha dum n’elefurughị ezinụlọ ndị nke aka ha anya. (1 Timoti 3:4, 5) Ụfọdụ ndị okenye jikwa ọrụ n’aka n’inye aka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-eje ozi na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ, na-enyekwa onwe ha n’afọ ofufo ná mgbakọ dị iche iche. Olee otú ndị ikom a na-arụsi ọrụ ike, ndị nyefere onwe ha, pụrụ isi zere ịda mbà n’okpuru ịdị arọ nke ibu ọrụ dịgasị otú ahụ?
16. (a) Ihe ngwọta dị aṅaa dị irè ka Jetro nyere Mosis? (b) Olee àgwà ga-enyere onye okenye aka iso ndị ọzọ kee ibu ọrụ ndị kwesịrị ekwesị?
16 Mgbe Mosis, nwoke dị umeala n’obi, na-arụgbu onwe ya n’ọrụ n’ilekọta nsogbu nke ndị ọzọ, nna nwunye ya, bụ́ Jetro, tụrụ aro dị irè: soro ndị ikom ọzọ ruru eru kee ibu ọrụ ụfọdụ. (Ọpụpụ 18:17-26; Ọnụ Ọgụgụ 12:3) “N’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị,” ka Ilu 11:2 na-ekwu. Ịdị umeala n’obi pụtara ịmata na ịnakwere ihe ịkpa ókè ndị i nwere. Nwoke dị umeala n’obi adịghị ala azụ ikenye ndị ọzọ ọrụ, ọ dịghịkwa atụ egwu na ya anakwaghị enwecha ikike site n’iso ndị ikom ọzọ ruru eru kee ibu ọrụ ndị kwesịrị ekwesị.b (Ọnụ Ọgụgụ 11:16, 17, 26-29) Kama nke ahụ, ọ na-anụ ọkụ n’obi inyere ha aka inwe ọganihu.—1 Timoti 4:15.
17. (a) Olee otú ndị òtù ọgbakọ pụrụ isi mee ka ibu ndị okenye ka mfe? (b) Àjà dịgasị aṅaa ka ndị nwunye ndị okenye na-achụ, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi gosi ha na anyị adịghị ewere ndị a n’ihe nta?
17 Ndị òtù ọgbakọ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka ibu ndị okenye ka mfe. Ịghọta na ndị okenye nwere ezinụlọ ndị nke ha ilekọta, ndị ọzọ agaghị achọ ihe ezi uche na-adịghị ya n’oge na nlekọta nke ndị okenye. Ha agaghịkwa ewere àjà sitere n’ọchịchọ obi nke ndị nwunye ndị okenye na-achụ ka ha so ọgbakọ na-ekerịta ndị di ha n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’ihe nta. Otu nne nke ụmụ atọ onye di ya na-eje ozi dị ka okenye kọwara: “Otu ihe ọ na-adịghị mgbe m na-eme mkpesa banyere ya bụ ibu ntụkwasị m ji ọchịchọ obi m na-ebu n’ezinụlọ ka di m nwee ike ije ozi dị ka okenye. Amaara m na ngọzi Jehova bara ụba n’ezinụlọ anyị n’ihi ya ịdị na-eje ozi, adịghịkwa m atamu ntamu maka ihe di m na-enye. Ma, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ọtụtụ mgbe m ghaghị ịrụ ọrụ n’ụlọ karị, meekwa ihe ka ukwuu n’inye ụmụ anyị ọzụzụ karịa ka m gaara emebu n’ihi na di m ji ọrụ n’aka.” N’ụzọ dị mwute, nwanna nwanyị a chọpụtara na ụfọdụ, kama inwe ekele n’ibu ntụkwasị ahụ ọ na-ebu, na-ekwu ihe ndị na-adịghị egosi mmetụta dị ka, “Gịnị mere ị dịghị asụ ụzọ?” (Ilu 12:18) Lee ka o si ka nnọọ mma ịja ndị ọzọ mma n’ihi ihe ha na-eme kama ịkatọ ha maka ihe ha na-enweghị ike ime!—Ilu 16:24; 25:11.
N’ihi na Ọgwụgwụ ahụ Abịabeghị
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka oge a ji ghara ịbụ oge ịkwụsị n’ọsọ ndụ ebighị ebi ahụ? (b) Okwu ndụmọdụ dị aṅaa kwesịrị oge ya ka Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst nọ na Jerusalem?
18 Mgbe onye na-agba ọsọ maara na ya nọ nso ọgwụgwụ nke ọsọ dị ogologo, ike adịghị agwụ ya. Anụ ahụ ya pụrụ iruwo njedebe nke ntachi obi ya—n’enwekwaghị ume, na-ekpobiga ọkụ ókè, bụrụkwa nke mmiri na-adịkwaghị—ma nso nso ebe mgbaru abụghị oge ịkwụsị ịgba. N’otu aka ahụ, dị ka ndị Kraịst anyị nọ n’ọsọ maka ihe nrite nke ndụ, anyị nọkwa nnọọ nso ebe mgbaru ya. Ugbu a abụghị oge anyị ga-akwụsị ịgba ọsọ!—Tụlee 1 Ndị Kọrint 9:24; Ndị Filipaị 2:16; 3:13, 14.
19 Ndị Kraịst na narị afọ mbụ chere ọnọdụ yiri nke ahụ ihu. N’ihe dị ka na 61 O.A., Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Jerusalem akwụkwọ. Oge na-agwụsị—“ọgbọ” ọjọọ ahụ, usoro ihe ndị Juu si n’ezi ofufe dapụ, na-achọ ‘ịgabiga.’ Ọ dị ndị Kraịst nọ na Jerusalem mkpa karịsịa ịmụrụ anya ma na-ekwesị ntụkwasị obi; ọ ga-adị ha mkpa ịgbapụ n’obodo ahụ mgbe ha hụrụ ka a chị usuu ndị agha gbaa ya gburugburu. (Luk 21:20-24, 32) Mgbe ahụ, okwu ndụmọdụ Pọl kwesịrị oge ahụ: ‘Ike agwụla unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.’ (Ndị Hibru 12:3) N’ebe a Pọl onyeozi jiri ngwaa abụọ pụtara ìhè mee ihe: ‘ike ịgwụ’ (kaʹmno) na “daa mbà” (e·klyʹo·mai). Dị ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, okwu Grik ndị a bụ ndị “Aristotle jiri mee ihe banyere ndị na-agba ọsọ na-atụsara ahụ ma daa mgbe ha gafesịworo ebe mgbaru ọsọ. Ndị gụrụ [akwụkwọ ozi Pọl] ka nọ n’ọsọ ahụ. Ha agajeghị inwe ike ọgwụgwụ ma ọlị mgbe oge ya na-erubeghị. Ha agaghị ekwe ka ha tụbọọ ma daa ma ọlị site n’ịda mbà. Ọzọkwa a na-akpọ òkù ịnọgidesi ike n’agbanyeghị ihe isi ike.”
20. N’ihi gịnị ka okwu ndụmọdụ Pọl ji kwesị oge nye anyị taa?
20 Lee ka okwu ndụmọdụ Pọl si kwesị oge a nye anyị taa! N’ihi nrụgide ndị na-akawanye njọ, a pụrụ inwe mgbe anyị ga-enwe mmetụta nke onye na-agba ọsọ ume na-adịkwaghị bụ́ onye ike na-achọ ịgwụ ụkwụ ya. Ma ebe anyị nọ nnọọ nso n’ebe mgbaru ọsọ ahụ, ọ dịghị ihe ga-eme ka ike gwụ anyị! (2 Ihe Emere 29:11) Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Onye Na-ebu Iro megide anyị, “ọdụm na-agbọ ụja” ahụ, ga-achọ ka anyị mee. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova emewo ndokwa ndị na-enye “onye dara mbà ike.” (Aịsaịa 40:29) Ihe ihe ndị a bụ na ụzọ anyị pụrụ isi jiri ha mee ihe ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, ụfọdụ pụrụ ịgba mgba ịchịkwa àgwà onwe onye nke gbamiri mkpọrọgwụ, dị ka iwe oké iwe, ma ọ bụ imeri nsogbu nke mmetọ onwe onye.—Lee Teta!, October 8, 1989, peji nke 14-16; November 8, 1981 (Bekee), peji nke 16-20; na Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, peji nke 35-43, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Lee isiokwu bụ́ “Ndị Okenye—Na-ekenyenụ Ọrụ!” ná mbipụta October 15, 1992, nke Ụlọ Nche, peji nke 20-23.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere ike ịgwụ anyị mgbe ndị ọzọ mere ihe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ kpasuo anyị iwe?
◻ Echiche dị aṅaa guzoziri eguzozi banyere obi amamikpe ga-eme ka ike ghara ịgwụ anyị?
◻ Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị?
◻ Olee otú umeala n’obi pụrụ isi nyere ndị okenye ọgbakọ aka izere ịda mbà?
◻ N’ihi gịnị ka okwu ndụmọdụ Pọl ná Ndị Hibru 12:3 ji kwesị oge nye anyị taa?