Ịhụnanya Na-emeri Ekworo Na-ekwesịghị Ekwesị
“Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.”—1 NDỊ KỌRINT 13:4.
1, 2. (a) Gịnị ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ịhụnanya? (b) Ọ̀ pụrụ ikwe omume inwe ma ịhụnanya ma ekworo, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?
ỊHỤNANYA bụ akara e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ,” ka Jisọs Kraịst kwuru. (Jọn 13:35) E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ịkọwa otú ịhụnanya kwesịrị isi emetụta mmekọrịta ndị Kraịst. Tinyere ihe ndị ọzọ, o dere, sị: “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.”—1 Ndị Kọrint 13:4.
2 Mgbe Pọl dere okwu ndị ahụ, ọ na-ezo aka n’ekworo na-ekwesịghị ekwesị. Ma ọ́ bụghị otú ahụ ọ garaghị agwa otu ọgbakọ ahụ, sị: “Eji m ekworo Chineke na-ekworo unu.” (2 Ndị Kọrint 11:2) A kpasuru “ekworo Chineke” ya n’ihi ndị na-enwe mmetụta na-emerụ emerụ n’ọgbakọ. Nke a kpaliri Pọl idere ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ ozi nke abụọ e dere n’ike mmụọ nsọ nke nwere ọtụtụ ndụmọdụ ịhụnanya.—2 Ndị Kọrint 11:3-5.
Ekworo n’Etiti Ndị Kraịst
3. Olee otú nsogbu nke metụtara ekworo si bilite n’etiti ndị Kraịst nọ na Kọrint?
3 N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, Pọl aghaghị ime ihe banyere nsogbu nke na-egbochi ndị Kraịst ọhụrụ ndị a inwe mmekọrịta dị mma n’ebe ibe ha nọ. Ha na-ebuli ụfọdu ndị elu, ebe ha bụ ndị ‘fụliri onwe ha elu, otu onye n’ihi otu onye megide mmadụ ibe ya.’ Nke a dujere ná nkewa dị iche iche n’ime ọgbakọ ahụ, na-enwe ndị dị iche iche na-asị: “Mụ onwe m bụ nke Pọl,” “Mụ onwe m bụkwa nke Apọlọs,” “Mụ onwe m bụkwa nke Sifas.” (1 Ndị Kọrint 1:12; 4:6) N’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ, Pọl onyeozi nwere ike ịchọpụta mkpọrọgwụ nke nsogbu ahụ. Ndị Kọrint na-eme omume dị ka ndị anụ ahụ na-achị, ọ bụghị dị ka “ndị Mmụọ Nsọ na-achị.” N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Unu bụ ndị anụ ahụ na-achị ruo ugbu a: n’ihi na ebe ekworo na esemokwu dị n’etiti unu, ùnu abụghị ndị anụ ahụ na-achị, ndị na-ejegharịkwa dị ka mmadụ?”—1 Ndị Kọrint 3:1-3.
4. Ihe atụ dị aṅaa ka Pọl jiri mee ihe inyere ụmụnna ya aka inweta ezi echiche banyere ibe ha, ihe mmụta dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
4 Pọl nyeere ndị Kọrint aka ịghọta echiche ziri ezi banyere nkà na ikike nke ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ ahụ. Ọ jụrụ, sị: “Ònye na-akpa ókè n’etiti gị na mmadụ ibe gị? ọ̀ bụ gịnịkwa ka i nwere nke ị na-anataghị? ma ọ bụrụ na ị natara ya, gịnị mere ị na-anya isi, dị ka a ga-asị na ị nataghị ya?” (1 Ndị Kọrint 4:7) Ná 1 Ndị Kọrint isi 12, Pọl kọwara na ndị ahụ bụ́ akụkụ nke ọgbakọ ahụ yichara akụkụ dị iche iche nke ahụ mmadụ, dị ka aka, anya, na ntị. Ọ rụtụrụ aka na Chineke mere akụkụ nke ahụ n’ụzọ ha ga-elekọta ibe ha. Pọl dekwara, sị: “Ọ bụrụkwa na a na-enye otu ihe dị n’ahụ otuto, ihe nile dị n’ahụ ahụ soro ya ṅụrịkọọ ọṅụ.” (1 Ndị Kọrint 12:26) Ndị ohu Chineke nile taa kwesịrị iji ụkpụrụ a mee ihe ná mmekọrịta ha na ibe ha. Kama ikwoso onye ọzọ ekworo n’ihi ọrụ e kenyere ya ma ọ bụ ihe ọ na-arụzu n’ije ozi Chineke, anyị kwesịrị isoro onye ahụ ṅụrịa ọṅụ.
5. Gịnị ka a na-ekpughe na Jemes 4:5, oleekwa otú Akwụkwọ Nsọ si emesi eziokwu nke okwu ndị a ike?
5 N’ezie, nke a dị mfe ikwu ekwu karịa ime eme. Onye so dee Bible bụ́ Jemes na-echetara anyị na “ọchịchọ ime anya ụfụ” nọ n’ime mmadụ ọ bụla na-eme mmehie. (Jemes 4:5, NW) Ọnwụ mbụ nke mmadụ bịara n’ihi na Ken dabara n’ekworo na-ekwesịghị ekwesị. Ndị Filistia kpagburu Aịsak n’ihi na ha na-emere ọganihu ya na-arị elu anya ụfụ. Rechel kwosoro ịmị mkpụrụ nke nwanne ya nwanyị n’ịmụ ụmụ ekworo. Ụmụ Jekọb nwere ekworo n’ihi ihu ọma e gosịrị nwanne ha nwoke nke ntakịrị, bụ́ Josef. Ihe àmà na-egosi na Miriam nwere ekworo n’ihi nwunye nwanne ya nwoke na-abụghị onye Israel. Kora, Detan, na Abaịaram jiri anya ụfụ gbaa izu nzuzo megide Mosis na Erọn. Eze Sọl nwere ekworo n’ihi ihe ịga nke ọma Devid nwere n’agha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ekworo bụkwa ihe kpatara ndị na-eso ụzọ Jisọs ji banye n’ịrụ ụka mgbe mgbe banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha. Eziokwu dị na ya bụ na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè nke nweere onwe ya kpam kpam pụọ n’ebe “ọchịchọ ime anya ụfụ” mmehie dị.—Jenesis 4:4-8; 26:14; 30:1; 37:11; Ọnụ Ọgụgụ 12:1, 2; 16:1-3; Abụ Ọma 106:16; 1 Samuel 18:7-9; Matiu 20:21, 24; Mak 9:33, 34; Luk 22:24.
N’Ime Ọgbakọ
6. Olee otú ndị okenye pụrụ isi chịkwaa ọchịchọ ime anya ụfụ?
6 Ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nile nọrọ ná nche megide ime anya ụfụ na ekworo na-ekwesịghị ekwesị. Nke a gụnyere òtù dị iche iche nke ndị okenye a họpụtara ilekọta ọgbakọ nile nke ndị Chineke. Ọ bụrụ na onye okenye dị umeala n’obi, ọ gaghị abụ ọchịchọ ya ịgbalị ịpụta ìhè karịa ndị ọzọ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na onye okenye nwere ikike pụrụ iche dị ka onye nhazi ma ọ bụ onye ọkà okwu, ndị ọzọ ga-aṅụrị ọṅụ maka nke a, na-ele ya anya dị ka ngọzi nye ọgbakọ ahụ. (Ndị Rom 12:15, 16) Nwanna nwoke pụrụ ịdị na-enwe ọganihu dị mma, na-egosi ihe àmà nke ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke ná ndụ ya. N’ịtụle iru eru ya, ndị okenye kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ime ka otu obere ntụpọ buo ibu iji kwadoo ịghara ịhọpụta ya dị ka ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Nke ahụ ga-egosipụta enweghị ịhụnanya na uche ziri ezi.
7. Nsogbu dị aṅaa pụrụ ibilite mgbe onye Kraịst nwetara ụfọdụ ọrụ ọchịchị Chineke?
7 Ọ bụrụ na mmadụ anata ọrụ ọchịchị Chineke ma ọ bụ ngọzi ime mmụọ, ọ dị ndị ọzọ n’ọgbakọ mkpa iche nche megide ime anya ụfụ. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji otu nwanna nwanyị ruru eru mee ihe ọtụtụ mgbe karịa ndị ọzọ n’ime ihe ngosi ná nzukọ ndị Kraịst. Nke a pụrụ ịkpali ekworo n’akụkụ ụmụnna nwanyị ụfọdụ. Otu ụdị nsogbu ahụ pụrụ ịdịworị n’etiti Yuodia na Sintiki nke ọgbakọ Filipaị. Ụdị ndị inyom ahụ nke oge a pụrụ ịchọ agbamume obi ọma site n’aka ndị okenye ịbụ ndị dị umeala, ‘na-atụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’ime Onyenwe anyị.’—Ndị Filipaị 2:2, 3; 4:2, 3.
8. Ekworo pụrụ iduje n’omume mmehie ndị dị aṅaa?
8 Onye Kraịst pụrụ ịmara ndahie gara aga nke onye ahụ e ji ihe ùgwù gọzie ugbu a n’ọgbakọ. (Jemes 3:2) Site n’ekworo, a pụrụ ịnwa mmadụ ịgwa ndị ọzọ banyere nke a na ịma ọrụ e kenyere onye ahụ n’ọgbakọ aka. Nke a ga-emegide ịhụnanya, nke “na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) Okwu e ji ekworo kwuo pụrụ ịkpaghasị udo nke ọgbakọ. “Ọ bụrụ na unu nwere ekworo dị ilu na ịkpa iche iche n’obi unu,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dọrọ aka ná ntị, “unu anyala isi, unu ekwukwala okwu ụgha megide eziokwu. Amamihe a abụghị amamihe nke na-esi n’elu rịdata, kama ọ bụ nke ụwa, bụrụkwa nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, bụrụkwa ihe ndị mmụọ ọjọọ na-ezi.”—Jemes 3:14, 15.
N’Ime Ezinụlọ Gị
9. Olee otú ndị òtù ọlụlụ pụrụ isi chịkwaa mmetụta nke ekworo?
9 Ọtụtụ alụmdi na nwunye na-ada n’ihi ekworo na-ekwesịghị ekwesị. Igosi enweghị ntụkwasị obi n’onye òtù ọlụlụ abụghị ihe ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:7) N’aka nke ọzọ, otu onye òtù ọlụlụ pụrụ ịghara ịdị na-enwe mmetụta echiche ekworo n’akụkụ nke onye nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye bụ́ nwunye pụrụ inwe ekworo n’ihi nlebara anya nke di ya na-enye onye ọzọ na-abụghị nwoke ibe ya. Ma ọ bụ onye bụ́ di pụrụ ịghọ onye ekworo n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ nke oge nwunye ya na-etinye n’ilekọta onye ikwu nwere mkpa. N’ịbụ ndị mmetụta dị otú ahụ na-emechu ihu, ndị di na nwunye pụrụ ịgbachi nkịtị ma gosi nkụda mmụọ ha n’ụzọ ndị ga-eme ka nsogbu ahụ siwanye ike. Kama nke ahụ, ọ dị mkpa ka onye òtù ọlụlụ nwere ekworo nwee nkwurịta okwu ma kwuo eziokwu banyere mmetụta ya. N’aka nke ya, ọ dị onye òtù ọlụlụ nke ọzọ mkpa igosi nghọta ma mesighachi ya obi ike maka ịhụnanya ya. (Ndị Efesọs 5:28, 29) Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ha abụọ wepụ mmetụta nke ekworo site n’izere ọnọdụ ndị na-akpata ya. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye nlekọta bụ́ onye Kraịst nyere nwunye ya aka ịghọta na ya na-enye ndị na-abụghị nwoke ibe ya nlebara anya a kpaara ókè, nke kwesịrị ekwesị iji rụzuo ibu ọrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke ìgwè atụrụ Chineke. (Aịsaịa 32:2) Otú ọ dị, onye okenye kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara mgbe ọ bụla ime ihe e kwesịrị iji kwoo ekworo. Nke a chọrọ ezi nguzo, na-ejide n’aka na ọ na-etinye oge n’iwusi mmekọrịta alụmdi na nwunye nke onwe ya ike.—1 Timoti 3:5; 5:1, 2.
10. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịnagide mmetụta nke ekworo?
10 Ndị nne na nna aghaghịkwa inyere ụmụ ha aka ịghọta ihe ekworo na-ekwesịghị ekwesị pụtara. Ọtụtụ mgbe ụmụaka na-etinye aka n’esemokwu nke na-aghọ ọgụ. Mgbe mgbe ihe na-akpata ya bụ ekworo. N’ihi na mkpa nwa nke ọ bụla pụrụ iche, a gaghị eji otu ụzọ ahụ mesoo ụmụaka ihe. Ọzọkwa, ụmụaka nwere mkpa ịghọta na onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ikike na adịghị ike dịrịtara iche. Ọ bụrụ na a na-agba otu nwatakịrị ume mgbe nile ime nke ọma dị ka onye nke ọzọ, nke a pụrụ ịzụlite anya ụfụ n’otu onye na nganga n’onye nke ọzọ. Ya mere, ndị nne na nna kwesịrị ịzụ ụmụ ha ịtụ ọganihu ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’ịtụle ihe nlereanya ndị dị n’Okwu Chineke, ọ bụghị n’ịsọrịta mpi. Bible na-asị: “Ka anyị ghara ịghọ ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.” Kama nke ahụ, ka “onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.” (Ndị Galetia 5:26; 6:4) Nke kasị mkpa, ọ dị ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst mkpa inyere ụmụ ha aka site n’inwechi ọmụmụ Bible anya, na-emesi ike ihe nlereanya ọma na nke ọjọọ ndị dị n’Okwu Chineke.—2 Timoti 3:15.
Ihe Nlereanya nke Ịchịkwa Ekworo
11. Olee otú Mosis si bụrụ ezi ihe nlereanya n’ime ihe banyere ekworo?
11 N’adịghị ka ndị ndú nke ụwa nke a ọ na-agụ agụụ inwe ike, “Mosis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Mgbe idu ụmụ Israel ghọọrọ Mosis ibu arọ iburu nanị ya, Jehova mere ka mmụọ Ya rụọ ọrụ n’ahụ 70 ụmụ Israel ndị ọzọ, na-enye ha ike inyere Mosis aka. Mgbe mmadụ abụọ n’ime ndị ikom a malitere ịkpa àgwà dị ka ndị amụma, Joshua chere na nke a n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị na-ewepụ ihe n’idu ndú nke Mosis. Joshua chọrọ igbochi ndị ikom ahụ, ma Mosis ji obi umeala tụgharịa uche, sị: “Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ka ị bụrụ m? ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ndị Jehova nile bụ ndị amụma, ka Jehova wee tinyekwasị ha Mmụọ Ya!” (Ọnụ Ọgụgụ 11:29) Ee, obi dị Mosis ụtọ mgbe ndị ọzọ natara ihe ùgwù nke ije ozi. O jighị ekworo chọọ otuto maka onwe ya.
12. Gịnị nyeere Jonatan aka izere mmetụta nke ekworo?
12 Jonatan, nwa Eze Sọl nke Israel, nyere ezi ihe nlereanya nke otú ịhụnanya na-esi emeri mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ekworo a pụrụ inwe. Jonatan bụ onye o ruuru iketa ocheeze nke nna ya, ma Jehova ahọrọwo Devid, nwa Jesse, ịbụ eze ga-esochi. Ọtụtụ ndị nọ n’ọnọdụ Jonatan gaara ekwoso Devid ekworo, na-ele ya anya dị ka onye na-ama ya aka. Otú ọ dị, ịhụnanya Jonatan nwere maka Devid gbochiri ụdị mmetụta ahụ ịchị ya mgbe ọ bụla. Mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ Jonatan, Devid pụrụ ịsị: “Anọ m ná mkpa n’ihi gị, nwanne m Jonatan: ị dị ụtọ nke ukwuu n’ebe m nọ: ịhụnanya gị nke ị hụrụ m dị ebube, karịa ịhụnanya ndị inyom.—2 Samuel 1:26.
Ihe Nlereanya Kasị Pụta Ìhè
13. Ònye bụ ihe nlereanya kasị mma n’ihe banyere ekworo, n’ihi gịnịkwa?
13 Jehova Chineke bụ ihe nlereanya kasị pụta ìhè nke onye chịkwara ọbụna ekworo kwesịrị ekwesị. Ọ na-achịkwa nnọọ mmetụta ndị dị otú ahụ n’ụzọ zuru okè. Ngosipụta ọ bụla nke ekworo Chineke na-ekwekọ mgbe nile n’ịhụnanya, ikpe ziri ezi, na amamihe Chineke.—Aịsaịa 42:13, 14.
14. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’ụzọ dị iche na nke Setan?
14 Ihe nlereanya nke abụọ pụtara ìhè nke onye na-achịkwa mmetụta nke ekworo bụ Ọkpara Chineke hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst. “Ọ bụ ezie na Ọ dịrị n’ụdị nke Chineke na mbụ,” Jisọs “[agụghị] ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke.” (Ndị Filipaị 2:6) Lee ihe dị nnọọ iche ọ bụ n’ụzọ nke mmụọ ozi ahụ nwere oké ọchịchọ ghọrọ Setan Ekwensu weere! Dị ka “eze Babilọn,” Setan jiri ekworo chọọ ‘iyi Onye kachasị ihe nile elu’ site n’iguzobe onwe ya dị ka chi na-ama Jehova aka. (Aịsaịa 14:4, 14; 2 Ndị Kọrint 4:4) Setan ọbụna nwara ime ka Jisọs ‘daa n’ala kpọ isiala nye’ ya. (Matiu 4:9) Ma ọ dịghị ihe pụrụ iwepụ Jisọs n’ụzọ umeala ya nke ido onwe ya n’okpuru ọkaaka Jehova. N’ịdị iche n’ebe Setan nọ, Jisọs “mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee Ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” Jisọs kwadoro ikike Nna ya nwere ịchịisi, na-ajụ ụzọ Ekwensu nke nganga na ekworo kpam kpam. N’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs, “Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.”—Ndị Filipaị 2:7-11.
Ịchịkwa Ekworo Gị
15. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji lezie anya ịchịkwa mmetụta nke ekworo?
15 N’adịghị ka Chineke na Kraịst, ndị Kraịst ezughị okè. Ebe ha bụ ndị na-eme mmehie, mgbe ụfọdụ ha pụrụ ịbụ ndị ekworo mmehie na-akpali ime ihe. Ya mere, kama ikwere ka ekworo kpalie anyị ịkatọ onye kwere ekwe ibe anyị banyere otu ngahie dị nta ma ọ bụ ihe e chere na e mejọrọ, ọ dị mkpa na anyị tụgharịrị uche n’okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ: “Abụbigala onye ezi omume ókè; emekwala onwe gị onye mabigara ihe ókè: n’ihi gịnị ka ị ga-emebi onwe gị?”—Eklisiastis 7:16.
16. Ndụmọdụ ọma dị aṅaa banyere ekworo ka e nyere n’otu mbipụta gara aga nke magazin nke a?
16 N’isiokwu banyere ekworo, Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15, 1911, dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị ịnụ nnọọ ọkụ n’obi, nwee ekworo ná nzube nke Onyenwe anyị, ma anyị kwesịrị ijide nnọọ n’aka na ọ bụghị ihe dịịrị onwe onye nanị; anyị kwesịkwara ịtụle ma anyị bụ ndị ‘na-etinye ọnụ n’ihe ndị ọzọ’ ma ọ bụ na anyị abụghị. Mgbe ahụkwa, anyị kwesịrị ịtụle ma ọ pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị nye ndị okenye ime ihe banyere ya, ma ọ ga-abụkwa ibu ọrụ anyị ịgakwuru ndị okenye ma ọ bụ na ọ gaghị abụ. Anyị nile kwesịrị inwe ekworo dị ukwuu maka nzube Onyenwe anyị na ọrụ Onyenwe anyị, ma lezie nnọọ anya na ọ bụghị ụdị dị ilu . . . n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị kwesịrị ijide n’aka na ọ bụghị ikwoso onye ọzọ ekworo, kama ikwo ekworo maka onye ọzọ, maka ọdịmma ya kasịnụ.”—1 Pita 4:15.
17. Olee otú anyị pụrụ isi zere omume mmehie nke ekworo?
17 Olee otú anyị dị ka ndị Kraịst pụrụ isi zere nganga, ekworo, na anya ụfụ? Ngwọta ya dabeere n’ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-erugharị ná ndụ anyị n’enweghị ihe mgbochi. Dị ka ihe atụ, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere maka mmụọ Chineke na maka enyemaka n’igosipụta ezi mkpụrụ ya. (Luk 11:13) Ọ dị anyị mkpa ịga nzukọ ndị Kraịst, nke a na-eji ekpere emeghe ma nweta mmụọ na ngọzi Chineke na ha. Ọzọkwa, ọ dị anyị mkpa ịmụ Bible, bụ́ nke e dere n’okpuru ike Chineke. (2 Timoti 3:16) Ọ dịkwa anyị mkpa ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze nke a na-eme n’ike mmụọ nsọ Jehova. (Ọrụ 1:8) Inyere ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị ahụmahụ ọjọọ dakwasịworo aka bụ ụzọ ọzọ nke ịnọ n’okpuru mmetụta ọma nke mmụọ Chineke. (Aịsaịa 57:15; 1 Jọn 3:15-17) Iji ịnụ ọkụ n’obi arụzu ibu ọrụ ndị Kraịst ndị a nile ga-enye aka ichebe anyị site n’omume mmehie nke ekworo, n’ihi na Okwu Chineke na-asị: “Na-ejegharịnụ site na Mmụọ Nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.”—Ndị Galetia 5:16.
18. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji na-agba mgba mgbe nile megide mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ekworo?
18 E denyere ịhụnanya na nke mbụ n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) Inwe ịhụnanya ga-enyere anyị aka ịchịkwa ọchịchọ ime mmehie ugbu a. Ma gịnị banyere ọdịnihu? Ọtụtụ nde ndị ohu Jehova nwere olileanya nke ndụ n’ime Paradaịs elu ala na-abịanụ, ebe ha pụrụ ilepụ anya ịbụ ndị e mere ka ha nwee izu okè mmadụ. N’ụwa ọhụrụ ahụ, ịhụnanya ga-ejupụta ebe nile, ọ dịghịkwa onye ga-adaba ná mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ekworo, n’ihi na “a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21.
Isi Ihe Maka Ntụgharị Uche
◻ Ihe atụ dị aṅaa ka Pọl ji mee ihe iji nye aka ịlụso ekworo ọgụ?
◻ Olee otú ekworo pụrụ isi kpaghasịa udo nke ọgbakọ?
◻ Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zụọ ụmụ ha ịnagide ekworo?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere omume mmehie nke ekworo?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ekwela ka ekworo kpaghasịa udo nke ọgbakọ
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị nne na nna pụrụ ịzụ ụmụ ha ịnagide mmetụta nke ekworo