Ị̀ Na-echeta?
Ì jiriwo nlezianya chebara mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ahụ ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe ndị na-esonụ:
◻ N’ihi gịnị ka ozizi nke ọdịnihu a kara aka ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya?
Ọ bụrụ na Chineke bu ụzọ mara ma kpebie ndaba Adam dabara ná mmehie, mgbe ahụ Jehova ghọrọ onye kpatara mmehie mgbe o kere mmadụ, ọ ga-abụkwa ya kpatara ajọ omume na ahụhụ nile nke mmadụ. A pụghị ime ka nke a kwekọọ n’eziokwu bụ́ na Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya bụ́ onye kpọrọ ajọ omume asị. (Abụ Ọma 33:5; Ilu 15:9; 1 Jọn 4:8)—4/15, peji nke 7, 8.
◻ Ná mmezu nke Aịsaịa 2:2-4, gịnị ka ndị mmadụ si n’ọtụtụ mba na-eme?
Ka ha na-enuga n’ụlọ ofufe Jehova, ha na-ezerekwa ‘ịmụta agha’ n’ihi na ha etinyewo obi ike ha ná nchebe nke usuu ndị agha eluigwe nke Chineke, bụ́ ndị dị njikere ibibi ndị iro nile nke udo.—4/15, peji nke 30.
◻ Olee ndị bụ ndị dike Chineke e kwuru okwu ha na Joel 3:10, 11?
Ihe dị ka ugboro 280 n’ime Bible, a kpọrọ ezi Chineke ahụ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha.” (2 Ndị Eze 3:14) Usuu ndị agha a bụ ìgwè ndị mmụọ ozi dị ike nke eluigwe, bụ́ ndị dị njikere ime ihe Jehova gwara ha.—5/1, peji nke 23.
◻ Ihe dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site na Jehova ịchọ ka Job kpeere ndị mehiere ya ekpere? (Job 42:8)
Tupu e weghachi ahụ ike Job, Jehova chọrọ ka o kpee ekpere n’isi ndị mehiere ya. Nke a na-egosi na Jehova na-achọ ka anyị gbaghara ndị mehiere anyị tupu e nwee ike ịgbaghara mmehie anyị. (Matiu 6:12; Ndị Efesọs 4:32)—5/1, peji nke 31.
◻ Gịnị ka Jemes bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya”? (Jemes 1:4)
Ntachi obi nwere ihe ọ ga-arụ, “ọrụ.” Ọrụ ya bụ ime ka anyị tozuo okè n’akụkụ nile. N’ihi ya, site n’ikwe ka ọnwụnwa ruo n’ọgwụgwụ ya n’ejighị ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị weta ha ná njedebe dị ngwa, a na-anwale ma na-anụcha okwukwe anyị.—5/15, peji nke 16.
◻ Gịnị mere Chineke jiworo chere ogologo oge otú a ịgwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ?
Ụzọ Jehova si ele oge anya dị iche na nke anyị. Nye Chineke nke na-adịru ebighị ebi, ogologo oge site n’okike Adam ruo ugbu a erughịdị otu izu. (2 Pita 3:8) Ma ihe ọ sọrọ ya bụrụ ụzọ anyị si ele oge anya, ụbọchị ọ bụla nke na-agafe na-ewetakwu anyị nso n’ụbọchị mwepụ n’ụta nke Jehova.—6/1, peji nke 5, 6.
◻ Gịnị na-akwali Ndịàmà Jehova?
Nkụzi Jehova emepụtawo ndị bụ ọpụrụiche, ndị e ziri ịhụ ibe ha na onye agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha. (Aịsaịa 54:13) Ịhụnanya bụ ihe na-akwali Ndịàmà Jehova ịnọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide ọha. (Matiu 22:36-40; 1 Ndị Kọrint 13:1-8)—6/15, peji nke 20.
◻ Gịnị ka okwu Jisọs bụ́: “Jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa” na-enye echiche ya? (Luk 13:24)
Okwu Jisọs na-enye echiche ịgbalịsi ike, ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ. Okwu ya na-egosikwa na ụfọdụ pụrụ ịchọ ‘isi n’ọnụ ụzọ ahụ baa’ nanị mgbe ọ dịrị ha mfe, n’ụzọ dị nwayọọ nke ha họọrọ. Ya mere onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ sị, ‘Èji m ịdị uchu na ịgba mbọ na-etinye onwe m n’ọrụ?’—6/15, peji nke 31.
◻ Olee otú a ga-esi kpee ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie “ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche,” dị ka ọrụ nile ha si dị? (Mkpughe 20:12)
Akwụkwọ ndị a abụghị ihe ndekọ nke ihe ndị ha mere n’oge gara aga; mgbe ha nwụrụ, a tọhapụrụ ha site ná mmehie ndị ha mere n’oge ndụ ha. (Ndị Rom 6:7, 23) Otú ọ dị, mmadụ ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ka ga-anọ n’okpuru mmehie Adam. Mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ na akwụkwọ ndị a ga-esetịpụ ntụziaka Chineke nke mmadụ nile na-aghaghị ịgbaso iji rite uru zuru ezu site n’àjà Jisọs Kraịst.—7/1, peji nke 22.
◻ Ihe mmụta ndị dị aṅaa dịịrị anyị n’ilu Jisọs banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi? (Luk 10:30-37)
Ilu Jisọs na-egosi na onye ụzọ ya ziri ezi n’ezie abụghị onye na-erube isi n’iwu Chineke nanị kamakwa onye na-eṅomi àgwà ya. (Ndị Efesọs 5:1) Ọ na-egosikwa na omume nke ezi onye agbata obi kwesịrị ịgafe ihe mgbochi nile nke mba, ọdịbendị, na okpukpe. (Ndị Galetia 6:10)—7/1, peji nke 31.
◻ Olee akụkụ atọ ị pụrụ ịmara ụmụ gị ma nye ha nduzi nne na nna?
(1) Nyere ụmụ gị aka ịhọrọ ụdị ọrụ ego kwesịrị ekwesị; (2) kwadebe ha ịnagide nrụgide mmetụta uche n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ọrụ; (3) gosi ha otú ha ga-esi gboo mkpa ime mmụọ ha.—7/15, peji nke 4.
◻ N’ihi nzube dị aṅaa ka Chineke ji zuo ike “n’ụbọchị nke asaa”? (Jenesis 2:1-3)
Chineke ezughị ike n’ihi ike ọgwụgwụ. Kama, ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ okike nke ụwa iji nye ohere ka ọrụ aka ya tolite ma bịa n’ebube zuru ezu, iji nye ya otuto na nsọpụrụ.—7/15, peji nke 18.
◻ Olee ụzọ atọ anyị pụrụ isi mee ihe e kpere n’ikpe?
Nke mbụ, anyị ga-ekwekọrịrị n’ụkpụrụ omume nke Chineke. (Aịsaịa 1:17) Nke abụọ, anyị na-eme ihe e kpere n’ikpe mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ anyị chọrọ ka Jehova si mesoo anyị. (Abụ Ọma 130:3, 4) Nke atọ, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke mgbe anyị ji ịdị uchu na-arụ ọrụ nkwusa ahụ. (Ilu 3:27)—8/1, peji nke 14, 15.