Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 44 p. 314-319
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-asị: “Bịa”!
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 44 p. 314-319

Isi nke 44

Mkpughe na Gị Onwe Gị

1. (a) Olee ụzọ mmụọ ozi ahụ si mesie Jọn obi ike banyere nkwa nile dị ebube dị ná Mkpughe? (b) Ònye kwuru, sị, “Ana m abịa ọsọ ọsọ,” oleekwa mgbe ‘ọbịbịa’ nke a ga-abụ?

MGBE ị gụrụ nkọwa ahụ na-enye obi ụtọ nke Jerusalem Ọhụrụ, a pụrụ ịkpali gị ịjụ, sị: ‘Ihe dị ebube otú a ọ̀ pụrụ ịdị adị n’ezie?’ Jọn zara ajụjụ ahụ site n’ịkọ okwu ọzọ mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “O wee sị m, Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu: Onyenwe anyị, bụ́ Chineke nke [okwu sitere n’ike mmụọ nsọ, NW] nke ndị amụma, zitekwara mmụọ ozi ya igosi ndị ohu ya ihe nile na-aghaghị ịpụta na mgbe nta. Leekwa, ana m abịa ọsọ ọsọ. Ngọzi na-adịrị onye na-edebe okwu nile nke amụma nke akwụkwọ a.” (Mkpughe 22:6, 7) Nkwa nile dị ebube nke Mkpughe ga-emezucha n’ezie! N’ikwu okwu n’aha Jisọs, mmụọ ozi ahụ kwupụtara na Jisọs na-abịa n’oge na-adịghị anya, “ọsọ ọsọ.” Nke a aghaghị ịbụ ọbịbịa Jisọs “dị ka onye ohi” maka ibibi ndị iro Jehova nakwa iwebata oké mmezu ahụ dị obi ụtọ nke Mkpughe. (Mkpughe 16:15, 16) Ya mere, anyị kwesịrị ime ka ndụ anyị kwekọọ n’okwu nile nke “akwụkwọ a,” bụ́ Mkpughe, ka anyị wee bụrụ ndị a kpọrọ ndị obi ụtọ n’oge ahụ.

2. (a) Gịnị bụ mmeghachi omume Jọn banyere ịba ụba nke mkpughe ahụ, gịnịkwa ka mmụọ ozi ahụ gwara ya? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu mmụọ ozi ahụ bụ, “Lezie anya” na, “Kpọọ isiala nye Chineke”?

2 Mgbe o nwetasịrị mkpughe dị ukwuu otú a, o kwere nghọta na oké ibubo nwụrụ Jọn n’ahụ: “Mụ onwe m Jọn bụkwa onye na-anụ na-ahụkwa ihe ndị a. Mgbe m nụrụ, hụkwa, m wee daa n’ala ịkpọ isiala n’ihu ụkwụ mmụọ ozi ahụ onye na-egosi m ihe ndị a. O wee sị m, Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, ha na ndị na-edebe okwu nile nke akwụkwọ a: kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 22:8, 9; tụlee Mkpughe 19:10.) Ịdọ aka ná ntị nke a e nyere ugbo abụọ ka a ghara ife ndị mmụọ ozi ofufe kwesịrị nnọọ ekwesị n’oge Jọn, bụ́ mgbe ihe àmà gosiri na ụfọdụ ndị na-agbaso ofufe dị otú ahụ ma ọ bụkwanụ na-ekwu na ndị mmụọ ozi na-enye ha mkpughe ụfọdụ ndị pụrụ iche. (1 Ndị Kọrint 13:1; Ndị Galetia 1:8; Ndị Kọlọsi 2:18) Taa, ọ na-eme ka eziokwu ahụ pụta ìhè nke bụ na anyị aghaghị ife nanị Chineke ofufe. (Matiu 4:10) Anyị ekwesịghị imetọ ezi ofufe ahụ site n’ife onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ofufe.—Aịsaịa 42:5, 8.

3, 4. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ gara n’ihu ịgwa Jọn, oleekwa ụzọ ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ siworo rube isi n’okwu ya ndị ahụ?

3 Jọn gara n’ihu, sị: “O wee sị m, Akala okwu nile nke amụma nke akwụkwọ nke a akara; n’ihi na oge ahụ dị nso. Onye na-eme ajọ omume, ya mee ajọ omume gaa n’ihu: onye rukwara unyi, ka e mee ka o ruo unyi gaa n’ihu: onye ezi omume, ya mee ezi omume gaa n’ihu: onye dịkwa nsọ, ka e doo ya nsọ gaa n’ihu.”—Mkpughe 22:10, 11.

4 Ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ taa erubewo isi n’okwu ndị ahụ nke mmụọ ozi ahụ. Ha akachighị okwu nile nke amụma ahụ akara. Ee, mbipụta mbụ nke Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence (July 1879) depụtara nkọwa nke ọtụtụ amaokwu nke Mkpughe. Dị ka anyị hotara n’isiakwụkwọ mbụ nke akwụkwọ a, Ndịàmà Jehova ebipụtawo akwụkwọ ndị ọzọ na-enye nkọwa nke Mkpughe n’ọtụtụ afọ ndị gaworo aga. Ugbu a, anyị na-adọrọkwa uche nke ndị nile hụrụ eziokwu n’anya ọzọ gaa n’amụma ndị ahụ dị oké ike nke Mkpughe na mmezu ha.

5. (a) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ achọọ ilefuru ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ ndị dị ná Mkpughe anya? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ nzaghachi nke ndị nwere obi umeala na ndị ezi omume?

5 Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ achọọ ilefuru ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ ndị dị ná Mkpughe anya, ha mee otú ahụ! “Onye na-eme ajọ omume, ya mee ajọ omume gaa n’ihu.” Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ha họọrọ, ndị ahụ ndị na-awagharị n’ime ịrụ arụ nke ọgbọ nke a onye ọ bụla na-emere ihe sọrọ ya pụrụ ịnwụ n’ịrụ arụ dị otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, a ga-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe n’ụzọ zuru ezu, na-amalite ná mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ. Ndị nwere obi umeala dị uchu n’ige ntị n’okwu onye amụma ahụ bụ: “Chọọnụ Jehova, . . . chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:3) Ma n’ihe banyere ndị ahụ rarawooro onwe ha nye Jehova, “onye ezi omume, ya mee ezi omume gaa n’ihu: onye dịkwa nsọ, ka e doo ya nsọ gaa n’ihu.” Ndị maara ihe matara na ọ dịghị abamuru ọ bụla na-adị nwa oge nke na-esi ná mmehie abịa nke a pụrụ iji tụnyere ngọzi ndị na-adịgide adịgide nke ndị na-agbaso ezi omume na ịdị nsọ ga-enweta. Bible na-asị: “Na-anwanụ onwe unu, ma ùnu dị n’okwukwe anyị; na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5) N’ịdabere n’ụzọ nke ị họrọworo, nke ị nọgidekwara na ya, ị ga-enweta ụgwọ ọrụ gị.—Abụ Ọma 19:9-11; 58:10, 11.

6. Gịnị ka Jehova kwuru mgbe ọ na-agwa ndị na-agụ akwụkwọ Mkpughe okwu nke ikpeazụ n’amụma ahụ?

6 Ugbu a, Jehova, bụ́ Eze nke mgbe ebighị ebi na-agwa ndị na-agụ Mkpughe okwu nke ikpeazụ n’ime amụma ahụ, na-asị: “Lee, ana m abịa ọsọ ọsọ; ụgwọ ọrụ m dịkwa n’aka m, inyeghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị. Mụ onwe m bụ Alfa ahụ na Omega ahụ, onye mbụ na onye ikpeazụ, mmalite na ọgwụgwụ. Ngọzi na-adịrị ndị na-asa uwe mwụda ha, ka ha wee nwee ike n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị, sikwa n’ọnụ ụzọ ámá ahụ baa n’ime obodo ahụ. N’azụ obodo ka ha dị, bụ́ nkịta nile, na ndị nile na-agwọ nsí, na ndị nile na-akwa iko, na ndị ogbu mmadụ nile, na ndị nile na-ekpere arụsị, na onye ọ bụla nke na-ahụ ụgha n’anya na-emekwa ya.”—Mkpughe 22:12-15.

7. (a) Ọ̀ bụ maka ime gịnị ka Jehova ‘na-abịa ọsọ ọsọ’? (b) N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe Krisendọm na-agaghị enwe òkè ọ bụla na Jerusalem Ọhụrụ?

7 Ọzọkwa, Jehova Chineke na-emesi ọbụbụeze ebighị ebi ya ike nakwa eziokwu ahụ nke bụ na ihe o buru ụzọ mee nzube ya ka ọ ga-emesịa mee. Ọ ‘na-abịa ọsọ ọsọ’ imezu ihe o kpere n’ikpe, ọ ga-enyeghachikwa ndị ahụ na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụ ụkpụrụ ya nile ka a na-eji ekpebi onye a ga-enyeghachi ụgwọ ọrụ na onye a ga-ajụ ajụ. Ndị ndú okpukpe nke Krisendọm akpawo àgwà dị ka “nkịta dara ogbi,” na-agbachi àgwà ọjọọ nile ndị Jehova kọwara n’ebe a nkịtị. (Aịsaịa 56:10-12; leekwa Deuterọnọmi 23:18, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.) N’ezie, ha ‘ahụwo n’anya, na-ezikwa’ ozizi na nkwenkwe ụgha dị iche iche, gbakụtakwa azụ kpam kpam ndụmọdụ ahụ Jisọs nyere ọgbakọ asaa ahụ. Ya mere, ha enweghị òkè ọ bụla na Jerusalem Ọhụrụ.

8. (a) Ọ̀ bụ nanị olee ndị na-eje “n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị,” gịnịkwa ka nke a pụtara? (b) Olee ụzọ oké ìgwè mmadụ ahụ siworo ‘saa uwe mwụda ha,’ oleekwa ụzọ ha na-esi anọgide n’ọnọdụ dị ọcha?

8 Ọ bụ nanị ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị “na-asa uwe mwụda ha” n’ezie ka ha wee dịrị ọcha n’anya Jehova nwere ihe ùgwù nke ịga “n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị.” Ya bụ, ha na-enweta iru eru na ikike nke ịdị ndụ anwụghị anwụ n’ọnọdụ ha n’eluigwe. (Tụlee Jenesis 3:22-24; Mkpughe 2:7; 3:4, 5.) Mgbe ha nwụsịrị dị ka ụmụ mmadụ, ha na-abanye n’ime Jerusalem Ọhụrụ site ná mbilite n’ọnwụ. Ndị mmụọ ozi 12 ahụ na-emeghere ha ụzọ ịbata, ma na-achụpụ onye ọ bụla nke na-ekwu okwu ụgha ma ọ bụ na-eme omume na-adịghị ọcha ọ bụ ezie na ọ na-azọrọ na ya nwere olileanya eluigwe. Oké ìgwè mmadụ ndị nọ n’elu ala “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,” ọ dịkwa mkpa ka ha nọgide n’ọnọdụ nke dị ọcha. Ha pụrụ ime nke a site n’izere àgwà ọjọọ ndị ahụ Jehova dọrọ aka ná ntị megide ha, sitekwa n’iburu n’obi ndụmọdụ ahụ Jisọs nyere n’ozi asaa ahụ o zijeere ọgbakọ ndị ahụ.—Mkpughe 7:14; isi nke 2 na 3.

9. Okwu ndị dị aṅaa ka Jisọs kwuru, ọ̀ bụkwa olee ndị ka ozi ya na Mkpughe dum dịịrị n’ụzọ bụ isi?

9 Mgbe Jehova kwusịrị, Jisọs kwuru okwu. Ọ na-agwa ndị obi ha ziri ezi, bụ́ ndị na-agụ Mkpughe okwu agbamume, na-asị: “Mụ onwe m, bụ́ Jisọs, zitere mmụọ ozi m iwere ihe ndị a gbaara unu àmà nye nzukọ m nile. Mụ onwe m bụ mkpọrọgwụ Devid, bụrụkwa nwa ọ mụrụ, kpakpando na-enwu enwu, nke bụkwa kpakpando ụtụtụ ahụ.” (Mkpughe 22:16) Ee, n’ụzọ bụ isi okwu ndị a dịịrị ‘nzukọ ndị ahụ.’ N’ụzọ bụ isi, nke a bụ ozi dịịrị ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nọ n’elu ala. Ihe nile dị ná Mkpughe bụ nke e dere n’ụzọ bụ isi nye ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-ebi n’ime Jerusalem Ọhụrụ. Site n’ọgbakọ ahụ, oké ìgwè mmadụ ahụ nwekwara ihe ùgwù nke inweta nghọta nke eziokwu amụma ndị a dị oké ọnụ ahịa.—Jọn 17:18-21.

10. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ onwe ya (a) ‘mkpọrọgwụ Devid na nwa ọ mụrụ’? (b) “kpakpando na-enwu enwu, nke bụkwa kpakpando ụtụtụ ahụ”?

10 E nyere Jisọs Kraịst ọrụ nke izitere Jọn Mkpughe, sitekwa n’aka ya zijere ya ọgbakọ ahụ. Jisọs bụ “mkpọrọgwụ Devid, bụrụkwa nwa ọ mụrụ.” O si n’usoro ọmụmụ Devid dị ka anụ ahụ si dị, wee si otú a ruo eru ịbụ Eze nke Alaeze Jehova. Ọ ga-aghọkwa “Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi” nke Devid, wee si otú a bụrụ “mkpọrọgwụ” Devid. (Aịsaịa 9:6; 11:1, 10) Ọ bụ Eze ahụ na-adịgide adịgide, nke na-adịghị anwụ anwụ, nke dị n’usoro ọmụmụ Devid, na-emezu ọgbụgba ndụ ahụ Jehova sooro Devid banye na ya, bụrụkwa “kpakpando na-enwu enwu, nke bụkwa kpakpando ụtụtụ” ahụ e buru amụma ya n’oge Mosis. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17; Abụ Ọma 89:34-37) Ọ bụ “kpakpando chi ọbụbọ” ahụ nke na-ebilite, na-eme ka chi bọọ. (2 Pita 1:19) Aghụghọ nile nke oké onye ụgha ahụ bụ Babilọn Ukwu ahụ enweghị ike igbochi chi ọbụbọ nke a dị ebube.

Na-asị: “Bịa”!

11. Ọkpụkpọ òkù dị aṅaa nke ghere oghe ka Jọn kwupụtara ugbu a, ọ̀ bụkwa olee ndị pụrụ ịzaghachi na ya?

11 Ugbu a bụ ohere nke Jọn ikwu okwu. Site n’obi nke jupụtara n’ekele maka ihe nile ọ hụworo, nụkwa, o tiri mkpu, sị: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Abamuru nke àjà mgbapụta Jisọs agaghị adịrị nanị 144,000 ahụ, n’ihi na nke a bụ ọkpụkpọ òkù ghere oghe. Mmụọ Jehova nke na-akpali akpali na-arụ ọrụ site n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, ya mere a nọgidere na-ezisa ozi ahụ n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè: “Nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Leekwa Aịsaịa 55:1; 59:21.) A na-akpọ onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume òkù ka ọ “bịa,” narakwa ihe site n’ịba ụba nke Jehova. (Matiu 5:3, 6) Lee ka o si bụrụ ihe ùgwù nye ndị nile gaje iso n’òtù elu ala ahụ, bụ́ ndị na-aza òkù ahụ nke òtù Jọn ahụ e tere mmanụ na-akpọ!

12. Olee ụzọ oké ìgwè mmadụ ahụ si azaghachi n’ọkpụkpọ òkù ahụ dị ná Mkpughe 22:17?

12 Kemgbe mmalite afọ ndị 1930, ọnụ ọgụgụ ahụ na-abawanye ụba nke oké ìgwè mmadụ anọwo “na-anụ”—na-aṅa ntị n’ọkpụkpọ òkù ahụ. Dị ka ndị ohu ibe ha bụ́ ndị e tere mmanụ, ha enwetawo ọnọdụ dị ọcha n’ihu Jehova. Ha na-elepụ anya maka oge mgbe Jerusalem Ọhụrụ ga-esi n’eluigwe rịdata iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi. Ebe ha nụworo ozi ahụ na-akpali akpali nke Mkpughe, ọ bụghị nanị na oké ìgwè mmadụ ahụ na-asị, “Bịa,” kama ha na-arụsikwa ọrụ ike n’ịchịkọta ndị ọzọ bịa ná nzukọ Jehova, na-azụ ndị a ka ha na-akpọsakwa, sị: “Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa.” Ya mere, ọnụ ọgụgụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ nọgidere na-abawanye ụba, ka ihe karịrị 6,000,000 n’ime ha nọ n’ihe karịrị 230 ala dị iche iche gburugburu ụwa sooro ihe ahụ na-erukwaghị 9,000 nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ e tere mmanụ, n’ịkpọsa òkù ahụ ịbịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”

13. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs na-enye?

13 Ọ bụ Jisọs kwukwara okwu ọzọ, na-asị: “Mụ onwe m na-agbara onye ọ bụla àmà, bụ́ onye na-anụ okwu nile nke amụma nke akwụkwọ a, sị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-atụkwasịrị ha okwu, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti nile nke e deworo n’akwụkwọ a: ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ga-ewepụ okwu n’ime okwu nile nke akwụkwọ nke amụma nke a, Chineke ga-ewepụ òkè ya n’osisi nke ndụ ahụ, wepụkwa òkè ya n’obodo nsọ ahụ, bụ́ ihe e deworo n’akwụkwọ a.”—Mkpughe 22:18, 19.

14. Olee ụzọ òtù Jọn ahụ si ele “amụma” nke Mkpughe anya?

14 Ndị so n’òtù Jọn ahụ aghaghị ịdọrọ uche gaa ‘n’amụma’ nke Mkpughe. Ha agaghị ezochi ya ma ọ bụkwanụ tụkwasị ihe na ya. A ghaghị izisa ozi dị na ya n’ihu ọha, ‘site n’elu ụlọ.’ (Matiu 10:27) Mkpughe bụ ihe sitere n’obi Chineke. Ònye ga-anwa anwa ịgbanwe otu mkpụrụ okwu dị n’ihe Chineke n’onwe ya kwuworo, nke o sitekwara n’aka onye ahụ nke bụ Eze na-achị achị ugbu a, bụ́ Jisọs Kraịst, zite? N’ezie, ọ ga-ekwesị ekwesị ka onye dị otú ahụ ghara inweta ndụ ahụ nke ọ na-achọ, ka ọ taakwa ahụhụ ihe otiti ndị na-aghaghị ịbịakwasị Babilọn Ukwu ahụ, nke ga-abịakwasịkwa ụwa dum.

15. Gịnị bụ isi ihe ndị dị n’okwu ndị Jisọs kwuru nke bụ na ọ ‘na-agbara ihe ndị a àmà’ na “ana m abịa ọsọ ọsọ”?

15 Ugbu a, Jisọs na-ekwu otu okwu agbamume ọzọ: “Onye ahụ nke na-agba àmà ndị a na-asị, Ee: ana m abịa ọsọ ọsọ.” (Mkpughe 22:20a) Jisọs bụ “onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu.” (Mkpughe 3:14) Ọ bụrụ na ọ gbaara ọhụụ nile nke Mkpughe àmà, ha aghaghị ịbụ eziokwu. Ma ya ma Jehova Chineke n’onwe ya na-emesi eziokwu ahụ ike mgbe mgbe na ha na-abịa “ọsọ ọsọ,” ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya, n’ebe a Jisọs na-ekwukwa nke ahụ nke ugbo ise ya. (Mkpughe 2:16; 3:11; 22:7, 12, 20) ‘Ọbịbịa’ ahụ bụ iji mezuo ihe e kpere n’ikpe n’isi oké nwanyị ahụ na-akwa iko, “ndị eze” ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọzọ nile bụ ndị na-emegide “alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova], na nke Kraịst ya.”—Mkpughe 11:15; 16:14, 16; 17:1, 12-14.

16. Ebe ị matara na Jehova Chineke na Jisọs na-abịa ọsọ ọsọ, gịnị ka i kwesịrị ikpebisi ike ime?

16 Gị ịmara na Jehova Chineke na Jisọs na-abịa ọsọ ọsọ kwesịrị ịgba gị ume “idebe ọbịbịa nke ụbọchị Jehova nso n’uche gị.” (2 Pita 3:12, NW) Ihe ọ bụla nke yiri nguzosi ike nke usoro ihe Setan n’elu ala bụ ihe aghụghọ. Ihe ọ bụla yiri ihe ịga nke ọma nke eluigwe nke ndị ọchịchị ụwa ndị nọ n’okpuru nduzi Setan pụrụ inweta bụ ihe na-adịghị adịgide adịgide. Ihe ndị a nile na-agabiga agabiga. (Mkpughe 21:1) Nanị ihe na-adịgide adịgide bụ nke a na-achọta n’ebe Jehova nọ, Alaeze ya nke dị n’okpuru Jisọs Kraịst, nakwa n’ụwa ọhụrụ ya ahụ e kwere ná nkwa. Ekwela ka anya gị pụọ na nke ahụ mgbe ọ bụla!—1 Jọn 2:15-17.

17. N’ụzọ dị aṅaa ka nghọta i nwere banyere ịdị nsọ nke Jehova kwesịrị isi metụta gị?

17 Ya mere, kwere ka ihe ị mụtaworo site ná Mkpughe metụta ndụ gị n’ụzọ dị omimi. Ọ̀ bụ na nnyoba anya i nyobara n’ọnụnọ eluigwe nke Jehova emeghị ka ị ghọta ebube na ịdị nsọ na-enweghị atụ nke Onye Okike anyị? (Mkpughe 4:1–5:14) Lee ihe ùgwù ọ bụ ijere Chineke dị otú ahụ ozi! Ka nghọta i nwere banyere ịdị nsọ ya kpalie gị iji ndụmọdụ Jisọs nyere ọgbakọ asaa ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, zerekwa ihe ndị dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, ikpere arụsị, ịkwa iko, ọnọdụ nke ekpoghị ọkụ ajụghị oyi, ịrọ òtù nke ndị dapụworo n’ezi ofufe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ ime ka ije ozi gị bụrụ ihe Jehova na-adịghị anara nke ọma. (Mkpughe 2:1–3:22) Okwu Pita onyeozi gwara òtù Jọn ahụ jikwa otu ụkpụrụ ahụ metụta oké ìgwè mmadụ ahụ: “Dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche.”—1 Pita 1:15, 16.

18. N’ọrụ dị aṅaa ka i kwesịrị ikere òkè zuru ezu ruo ókè o kwere mee, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọrụ nke a ji dị ngwa taa?

18 Ọzọkwa, ka a kpalie gị inwe ịnụ ọkụ n’obi dị ọhụrụ ka ị nọ na-akpọsa “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 35:4; 61:2) Ma ì so n’ìgwè atụrụ nta ahụ ma ọ bụ n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ka i kere òkè zuru ezu karịsịa ruo otú ọ pụrụ ikwe mee n’ịkpọsa mwụpụ nke ọkwá asaa ahụ nke iwe Jehova, na-agwa ndị mmadụ banyere ikpe Chineke kpeworo ụwa nke Setan. Otu mgbe ahụ, tinyekọọ olu gị ná mkpọsa ahụ na-enye ọṅụ nke ozi ọma ebighị ebi ahụ banyere Alaeze ahụ e guzobeworo nke Jehova na Kraịst ya. (Mkpughe 11:15; 14:6, 7) Mee ngwa n’ịrụ ọrụ nke a. Ka nghọta nke eziokwu ahụ bụ na anyị na-ebi n’ime ụbọchị Onyenwe anyị kpalie ọtụtụ ndị, ndị na-amalitebeghị ijere Jehova ozi ka ha sonye n’ọrụ ahụ nke ikwusa ozi ọma. Ka ndị a nweekwa ọganihu ruo n’ịrara ndụ ha nye Chineke, na-eburu n’uche ime baptism. Cheta na “oge ahụ dị nso”!—Mkpughe 1:3.

19. Gịnị bụ okwu mmechi nke onyeozi ahụ meworo agadi bụ Jọn, oleekwa ụzọ i si azaghachi na ha?

19 Otú a, anyị na-esonyere Jọn n’ikpesi ekpere ike, sị: “Amen: bịa, Onyenwe anyị Jisọs.” Jọn, bụ́ onyeozi ahụ meworo agadi, kwukwara, sị: “Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ nile.” (Mkpughe 22:20b, 21) Ka ọ dịnyekwara unu nile ndị na-agụ akwụkwọ nke a. Ka unu nwee okwukwe na mmezu dị ebube nke Mkpughe adịwo nso, ka unu nweekwa ike isonyere anyị iji obi unu nile sị “Amen”!

[Foto dị na peeji nke 314]

“N’azụ obodo ka ha dị, bụ́ nkịta nile . . . ”

[Foto dị na peeji nke 315]

“Ngọzi na-adịrị ndị . . . sikwa n’ọnụ ụzọ ámá ahụ baa n’ime obodo ahụ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya