Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/15 p. 28-30
  • Ịghọta Ụkpụrụ Ya Na-egosi Ntozu Okè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọta Ụkpụrụ Ya Na-egosi Ntozu Okè
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ikom Nwere Ụkpụrụ Chineke
  • Ụkpụrụ na Obi
  • Lee Anya n’Azụ Iwu Ahụ
  • Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Ụkpụrụ Chineke Pụrụ Ịbara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • ‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/15 p. 28-30

Ịghọta Ụkpụrụ Ya Na-egosi Ntozu Okè

MKPAKỌRỊTA ọjọọ na-emebi omume ọma. Ihe ị kụrụ ka ị ga-aghọta. (1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Galetia 6:7) Ma ọ̀ bụ n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ, okwu nke ọ bụla bụ ihe atụ nke otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ—ụkpụrụ—nke ọ bụla na-enyekwa ihe ndabere maka iwu. Otú ọ dị, iwu pụrụ ịbịa ma laa, ha yikwara ka a na-akapị ha ọnụ. N’aka nke ọzọ, ụkpụrụ na-asa mbara, ha pụkwara ịdịru ebighị ebi. N’ihi ya, Okwu Chineke na-agba anyị ume iche echiche banyere ụkpụrụ n’ebe ọ bụla o kwere mee.

Webster’s Third New International Dictionary na-akọwa ụkpụrụ dị ka “eziokwu ọha maara ma ọ bụ nke bụ isi: iwu, nkwenkwe, ma ọ bụ nchepụta bụ isi ma zuo ezu nke ndị ọzọ na-adabere na ha ma ọ bụ ebe e si enweta ndị ọzọ.” Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ inye nwatakịrị iwu sị, “Emetụla stovu aka ma ọlị.” Ma nye onye toworo eto okwu bụ́, “Stovu ahụ dị ọkụ” ga-ezu. Rịba ama na nke ikpeazụ ahụ bụ okwu bụ isi karị. N’ihi na ọ na-eduzi ihe mmadụ pụrụ ime—ikekwe sie nri, ghee ihe, ma ọ bụ gbanyụọ stovu—ọ na-aghọ ụkpụrụ n’otu echiche.

N’ezie, ụkpụrụ ndị bụ isi ná ndụ metụtara ihe ime mmụọ; ha na-achịkwa ofufe anyị na-enye Chineke na obi ụtọ anyị. Otú ọ dị, ụfọdụ adịghị etinye mgbalị a chọrọ iji tụgharịa uche n’ụkpụrụ dị iche iche. Ha na-ahọrọ ịdị mfe nke ụkpụrụ nduzi mgbe ime mkpebi chere ha ihu. Amamihe adịghị na nke a, ọ na-emegidekwa ihe nlereanya nke ndị ikom oge ochie setịpụrụ n’oge Bible.—Ndị Rom 15:4.

Ndị Ikom Nwere Ụkpụrụ Chineke

N’etiti ndị ikom na-ezughị okè, a pụrụ ịkpọ Ebel nwoke mbụ nke nwere ụkpụrụ Chineke. Eleghị anya o chebaara nkwa ahụ e kwere banyere “mkpụrụ” ahụ echiche ma ghọta na mgbapụta site ná mmehie ga-agụnye iji ọbara chụọ àjà. (Jenesis 3:15) N’ihi ya o nyere Chineke “ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya.” Nkebi okwu ahụ bụ “na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba” na-egosi na Ebel nyere Jehova ihe kasị mma o nwere. Ma, ọ ga-abụ ihe karịrị puku afọ abụọ mgbe Ebel nwụsịrị ka Chineke ga-ekwupụta na nke mbụ ya ihe nile ọ chọrọ banyere àjà. N’adịghị ka Ebel bụ́ nwoke nwere ụkpụrụ nke na-atụ egwu Chineke, nwanne ya nwoke bụ́ Ken chụụrụ Chineke àjà n’ụzọ imezu iwu. Ma àgwà ya adịghị mma, ihe banyere onyinye ya nke na-egosi obi na-enweghị ụkpụrụ.—Jenesis 4:3-5.

Noa bụkwa nwoke nwere ụkpụrụ Chineke. Ọ bụ ezie na ihe ndekọ Bible na-egosi na Chineke nyere ya iwu kpọmkwem ka o wuo ụgbọ, anyị agụghị banyere iwu ọ bụla e nyere ya imere ndị ọzọ nkwusa. Ma, a kpọrọ Noa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ọ bụ ezie na ikekwe Chineke gwara Noa ka o mee nkwusa, obi abụọ adịghị ya na echiche ya banyere ụkpụrụ na ịhụnanya o nwere n’ebe ndị agbata obi ya nọ kwalikwara ya ime otú ahụ. Ebe anyị na-ebi n’oge ndị yiri nke Noa, ka anyị ṅomie àgwà na ihe nlereanya ọma ya.

N’adịghị ka ndị ụkọchukwu nke ụbọchị ya, Jisọs kụziiri ndị mmadụ iche echiche banyere ụkpụrụ. Ozizi Elu Ugwu ya bụ otu ihe atụ. Akụkụ ya dum na-akwado ụkpụrụ. (Matiu, isi nke 5-7) Jisọs kụziri ihe n’ụzọ dị otú a n’ihi na, dị ka Ebel na Noa ndị bu ya ụzọ, ọ maara Chineke n’ezie. Ọbụna mgbe ọ bụ nwata, o nwere nsọpụrụ maka eziokwu ahụ bụ isi: “Ọ bụghị nanị achịcha . . . kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:3; Luk 2:41-47) Ee, isi ihe dị n’ịbụ onye nwere ụkpụrụ Chineke bụ n’ezie ịmara Jehova, ihe ndị na-amasị ya, ihe ndị na-adịghị amasị ya, na nzube ya. Mgbe ụkpụrụ ndị a bụ isi banyere Chineke na-achịkwa ndụ anyị, ha na-aghọ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụkpụrụ ndị dị ndụ.—Jeremaịa 22:16; Ndị Hibru 4:12.

Ụkpụrụ na Obi

O kwere omume irubere iwu isi nanị n’ụzọ imezu iwu, ikekwe n’ihi egwu ntaramahụhụ maka inupụ isi. Otú ọ dị, ikwenyere ụkpụrụ adịghị agụnye àgwà dị otú ahụ, n’ihi na ọ bụ nnọọ ihe bụ isi n’ụkpụrụ na iji bụrụ ndị ọ na-achịkwa, a ghaghị irube isi site n’obi. Tụlee Josef onye, dị ka Ebel na Noa, dịrị ndụ tupu nguzobe nke ọgbụgba ndụ Iwu Mosis. Mgbe nwunye Pọtifa gbalịrị ịrata ya, Josef zaghachiri, sị: “M ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” Ee, Josef maara ụkpụrụ ahụ bụ na di na nwunye bụ “otu anụ ahụ.”—Jenesis 2:24; 39:9.

Taa ụwa enweghị ụkpụrụ ezi omume. Ọ na-eri ime ihe ike na omume rụrụ arụ dị ka onye na-eribiga nri ókè si eri. Ihe ize ndụ bụ na a pụrụ ịnwa onye Kraịst iritụ, ikekwe na nzuzo, otu nri ratụ ratụ ahụ—ihe nkiri sịnịma, vidio, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe ịja mma mgbe anyị, dị ka Josef, jụrụ ihe ọjọọ n’ihi ụkpụrụ, na-echeta na Chineke ga-echebe nanị ndị na-anọgidesi ike n’ihe gabiga “mkpagbu ukwu” na-abịanụ. (Matiu 24:21) Ee, ọ bụ n’ụzọ bụ isi ihe anyị bụ mgbe anyị nọ nanị anyị, ọ bụghị n’ihu ọha, na-ekpughe ihe anyị bụ n’ime n’ezie.—Abụ Ọma 11:4; Ilu 15:3.

N’ihi ya ọ bụrụ na ụkpụrụ Bible na-eduzi anyị, anyị agaghị achọ oghere ndị e chere na ha dị n’iwu Chineke; anyị agaghịkwa agbalị ịhụ ókè anyị pụrụ ịgaru n’emebighị otu iwu ọ bụla. Echiche dị otú ahụ bụ mmadụ imegide onwe ya; ọ na-emerụ anyị ahụ n’ikpeazụ.

Lee Anya n’Azụ Iwu Ahụ

N’ezie, iwu na-arụ ọrụ dị mkpa ná ndụ onye Kraịst. Ha dị ka ndị nche na-enye aka ichebe anyị, e nwekwara na ntọala ha ọtụtụ ụkpụrụ ndị dị mkpa. Aghọtaghị ụkpụrụ ndị a pụrụ ibelata ịhụnanya anyị nwere n’ebe iwu ndị ha na ya nwere njikọ dị. Mba Israel oge ochie gosipụtara nke a.

Chineke nyere Israel Iwu Iri ahụ, nke mbụ n’ime ha machibidoro ife chi ọ bụla ọzọ ma e wezụga Jehova. Na Jehova kere ihe nile bụ eziokwu bụ isi dị n’azụ iwu a. (Ọpụpụ 20:3-5) Ma mba ahụ ọ̀ dịrị ndụ dị ka ụkpụrụ a si dị? Jehova n’onwe ya na-aza, sị: “‘Ị bụ nna anyị’ [ka ndị Israel gwara] ogwe osisi [ha kpọkwara] nkume ‘Nne.’ Ma mụ [Jehova] ka ha gbakụtaworo azụ, ha wepụkwara ihu ha n’ebe m nọ.” (Jeremaịa 2:27, The New English Bible) Leedị nzuzu obi ịta mmiri na nke na-enweghị ụkpụrụ ọ bụ! Leekwa ka o siri gbuo Jehova mgbu n’obi!—Abụ Ọma 78:40, 41; Aịsaịa 63:9, 10.

Ndị Kraịst nwekwara iwu ndị Chineke nyere. Dị ka ihe atụ, ha aghaghị izere ikpere arụsị, mmekọahụ rụrụ arụ, na iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Ọrụ 15:28, 29) Mgbe i chere echiche banyere ya, anyị pụrụ ịhụ ụkpụrụ ndị na-apụtachaghị ìhè, dị ka: Chineke kwesịrị inweta ofufe anyị a na-ekewaghị ekewa; anyị aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye onye anyị lụrụ; na Jehova bụ Onye Na-enye Ndụ anyị. (Jenesis 2:24; Ọpụpụ 20:5; Abụ Ọma 36:9) Ọ bụrụ na anyị matara ma ghọta n’ụzọ miri emi ụkpụrụ ndị dị n’azụ ntụziaka ndị a, anyị na-ahụ na ha bụ maka ọdịmma anyị. (Aịsaịa 48:17) Nye anyị, ‘ihe Chineke nyere n’iwu adịghịkwa arọ.’—1 Jọn 5:3.

Ọ bụ ezie na ndị Israel n’otu oge leghaara iwu Chineke anya, n’oge Jisọs ndị “ọkachamara nke iwu ahụ,” bụ́ ndị odeakwụkwọ, emebigawo ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ. Ha echepụtawo ọtụtụ ụkpụrụ nduzi na omenala ndị gbochiri ofufe dị ọcha, kpuchiekwa ụkpụrụ Chineke. (Matiu 23:2, NEB) Ndị mmadụ yiri ndị a hapụworo n’aka ọdịda, enweghị olileanya, ma ọ bụ ihu abụọ. (Matiu 15:3-9) Ọtụtụ n’ime iwu ndị mmadụ mere bụkwa nke obi ọjọọ. Mgbe ọ na-aga ịgwọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, Jisọs jụrụ ndị Farisii nọ n’ebe ahụ, sị: “Ò ziri ezi n’iwu ime ezi ihe . . . n’ụbọchị izu ike?” Nkịtị ha gbara na-aza ee e dara ụda, na-eme ka Jisọs nwee ‘mwute nke ukwuu na a na-eme ka obi ha mee etili.’ (Mak 3:1-6) Ndị Farisii nwere ike inyere anụ ụlọ (ihe na-enye ego) nwere ọdachi ma ọ bụ merụrụ ahụ aka na Sabat, ma ha agaghị anwa anwa inyere nwoke ma ọ bụ nwanyị aka—ọ gwụla ma ọ bụ okwu ọnwụ na ndụ. N’ezie, ụkpụrụ nduzi ndị mmadụ nyere na otú e si edebe ha juru ha isi nke na dị ka ụmụ ahụhụ na-arịgharị n’elu ihe osise, ha apụghị ịhụ ihe osise ahụ dum—ụkpụrụ Chineke.—Matiu 23:23, 24.

Ma, ọbụna ndị na-eto eto, mgbe ha nwere obi eziokwu, pụrụ iwetara Jehova nsọpụrụ site ná nghọta ha ghọtara ụkpụrụ Bible. Onye nkụzi Rebecca dị afọ 13 jụrụ klas ya onye ga-agba chaa chaa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ sịrị na ha agaghị agba. Ma, mgbe a kpọtụrụ ọnọdụ dị iche iche aha, ha nile ma e wezụga Rebecca kwetaziri na ha ga-agba chaa chaa n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Onye nkụzi ahụ jụrụ Rebecca ma ọ̀ ga-azụrụ tiketi chaa chaa nke cent 20 maka nzube kwesịrị ekwesị. Rebecca sịrị ee e ma gosi ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru kpatara ime otú ahụ ji bụrụ otu ụdị nke ịgba chaa chaa. Mgbe ahụ onye nkụzi ya gwara ndị klas ahụ dum, sị: ‘N’uche m, Rebecca bụ nanị onye nọ ebe a nke nwere ihe m na-akpọ “ụkpụrụ” n’ezi echiche nke okwu ahụ.’ Ee, Rebecca pụrụ nanị ịzaworị, sị, “O megidere okpukpe m,” kama o chemikwuru echiche karịa nke ahụ; ọ pụrụ ịza ihe mere ịgba chaa chaa jiri dị njọ nakwa ihe mere o ji jụ ikere òkè na ya.

Ihe nlereanya ndị dị ka Ebel, Noa, Josef, na Jisọs na-egosi anyị otú anyị si erite uru site n’iji “izuzu” na “uche” anyị na-eme ihe n’ife Chineke ofufe. (Ilu 2:11; Ndị Rom 12:1) Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ga-eme nke ọma iṅomi Jisọs mgbe ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke dị n’etiti ha.’ (1 Pita 5:2) Dị ka Jisọs mere ihe atụ ya, ndị hụrụ ụkpụrụ Chineke n’anya bụ ndị na-eme nke ọma n’okpuru ọbụbụeze Jehova.—Aịsaịa 65:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya