Ha Naara Ịhụnanya Chineke n’Achọghị Ọdịmma nke Nanị Onwe Ha
“Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere ya, na oké ọrụ ya nile nke ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ.”—ABỤ ỌMA 107:8.
1. Olee ụzọ Jọn onyeozi si mesie ike àgwà nke ịhụnanya n’akwụkwo ozi mbụ ya?
“CHINEKE bụ ịhụnanya.” Lee nnọọ ka okwu ndị ahụ si jupụta n’ihe ọmụma! Ka a sịkwa ihe mere Jọn onyeozi ji chee na ọ dị mkpa ideghachi ha n’akwụkwọ ozi mbụ ya. (1 Jọn 4:8, 16) Ọ bụghị nanị na Jehova Chineke bụ ịhụnanya, kama o nwekwara ịhụnanya n’ime onwe ya, bụrụ ihe atụ ya zuru okè.
2. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Chineke si gosipụta ịhụnanya n’ike nwoke na nwanyị nakwa inye ha ihe dị ha mkpa?
2 Chee echiche banyere ịhụnanya Chineke gosipụtara n’ụzọ o si kee anyị. Okwu ekele Devid kwesịrị nnọọ ekwesị. Dị ka onye ọbụ abụ nke nwere ike mmụọ nsọ, ọ sịrị: “M ga-ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 139:14) Ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ n’ahụ ike na obi ụtọ, Chineke mere ka o kwe anyị omume inweta ọtụtụ ihe ụtọ na-adịghị agwụ agwụ site n’ike ise anyị ji amata ihe—ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, ịnụ ụtọ ihe, ịnụ ísìsì ihe, na inwe mmetụta ihe. Lee nnọọ ụdị ịma mma anyị na-ahụ n’ihe okike gbara anyị gburugburu! Lee ka ha si dị ebube, bụ́ ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ dị iche iche, ma ya fọdụkwa ikwu banyere ịma mma nke ụdị mmadụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche! Chineke mekwara ka aka anyị nwee ike iru ụdị dị iche iche nke mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, na ihe oriri ndị ọzọ. (Abụ Ọma 104:13-16) E nwere ezi ihe mere Pọl onyeozi ji chetara ndị bi na Listra oge ochie na Chineke “na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.”—Ọrụ 14:17.
3. Ikike dịgasi aṅaa dị ebube ka Chineke nyeworo anyị?
3 Cheekwa echiche banyere ngọzi ndị e jikọtara ha na ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Karịa nke ahụ, tụgharịa uche n’ihe ụtọ nile anyị pụrụ inweta n’ihi ike echiche na mmetụta anyị nile: iji anya nke uche hụ ihe, ịtụgharị uche, icheta ihe, akọ na uche, na karịsịa, ikike anyị nwere ife ofufe—ha nile bụ́ ndị na-edo anyị n’ọnọdụ dị elu nke ukwuu karịa ụmụ anụmanụ; anyị ekwesịghịkwa ilefuru ihe ụtọ nke egwú otiti pụrụ inye anyị anya. Onyinye ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ.
4. Ngosipụta dịgasi aṅaa nke ịhụnanya Chineke ka ụmụ mmadụ nwetaworo eri mgbe ndahie nke nne na nna mbụ ha?
4 E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla dị ya na Adam na Iv nwetara ọtụtụ ihe ụtọ n’ọnọdụ izu okè ha n’ime ogige Iden ahụ. (Jenesis 2:7-9, 22, 23) Ma mgbe ha na-enweghị ike ịnara ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke ndị ha na-enweta n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ha, Chineke ọ̀ gbakụtara agbụrụ mmadụ azụ? Ọ dịghị ma ọlị! O mere ngwa ngwa ime ndokwa iji dozie ihe ọjọọ nile ndị sitere ná mmehie nke nne na nna anyị mbụ ahụ pụta. (Jenesis 3:15) Jehova gosipụtakwara ịhụnanya site n’iji ndidi nagide ụmụ Adam ndị na-ezughị okè. (Ndị Rom 5:12) Ruo ogologo oge ha aṅaa? Ee, ruo ihe dị ka 6,000 afọ ugbu a! Karịsịa, Chineke egosipụtawo ịhụnanya n’imeso ndị ohu ya ihe. Okwu ndị a bụ eziokwu:” Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; onye na-edebere [puku mmadụ] ọtụtụ ugbo ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.”—Ọpụpụ 34:6, 7.
5. Olee ụzọ Jehova si gosi iji ịhụnanya nwee ndidi n’imeso mba Israel ihe?
5 Ee, ọ dị ukwuu n’ezie, bụ́ ndidi Jehova Chineke gosiri ná mmeso o mesoro ụmụ Israel malite n’oge ahụ mgbe o wepụtara ha dị ka otu mba n’okpuru Ugwu Saịnaị ruo mgbe njehie ha manyere ya ịgbakụta ha azụ kpam kpam. Dị ka anyị na-agụ na 2 Ihe Emere 36:15, 16: “Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wee zigara ha ozi n’aka ndị ozi ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na o nwere ọmịiko n’ahụ ndị ya na n’ebe ebe obibi ya dị: ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” Ma e nwere ndị naara ịhụnanya Jehova Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ha. Iji wee hụ ụzọ ha si mee nke ahụ, ka anyị tụlee ugbu a ndụ nke ụfọdụ n’ime ndị a. Nke a ga-atọ ntọala a ga-eji gosi ụzọ anyị onwe anyị pụrụ isi nara ịhụnanya Jehova n’ụzọ ndị pụtara ìhè.
Ụzọ Mosis Si Mee Ihe n’Achọghị Ọdịmma nke Nanị Onwe Ya
6. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe nlereanya Mosis bụ nke pụtara ìhè, n’ọnọdụ dịgasịkwa aṅaa ka o nwere ahụmahụ nke ịhụnanya Chineke?
6 Mosis bụ ihe nlereanya pụtara ìhè nke onye naara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya. Lee nnọọ ọtụtụ ohere ndị e debere n’ihu Mosis dị ka onye ada Fero weere dị ka nwa ya! Ma “ọ họọrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke, kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge; ebe ọ gụrụ ịta ụta nke Kraịst anyị n’akụ dịkarịrị akụ nile nke Ijipt ukwuu.” (Ndị Hibru 11:25, 26) N’otu oge, Mosis chọrọ ịnapụta ụmụnna ya, bụ́ ndị Israel, site n’ịnọ n’agbụ n’Ijipt ma ha enweghị ekele n’ihi mgbalị ya nile, oge nke Chineke erubeghịkwa maka nnapụta ha. (Ọrụ 7:23-29) Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ iri afọ gasịrị, n’ihi okwukwe ya na ọchịchọ na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị o nwere inyere ụmụnna ya aka, Jehova nyere ya ike ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube nakwa ijere ndị Israel ozi ruo 40 afọ dị ka onye amụma Ya, onye ikpe, onye na-enye iwu, na onye ogbugbo. N’ọnọdụ ndị a nile, Mosis nwere ahụmahụ nke ọtụtụ ngosipụta ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ya na ndị Israel ibe ya nọ.
7. Olee ụzọ Mosis si nara ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke?
7 Olee ụzọ Mosis si meghachi omume n’ịhụnanya na obi ebere na-erughịrị mmadụ nke Chineke? Ọ̀ ‘naara amara Jehova ma kwere ka nzube ya funarị ya’? (2 Ndị Kọrint 6:1) Ọ dịghị ma ọlị! N’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya, Mosis naara ngosipụta nile nke ịhụnanya Jehova n’ebe ọ nọ site n’imikpu onwe ya kpam kpam n’ihe banyere Chineke. Ọ na-elegara Jehova anya mgbe nile, nweekwa mmekọrịta chiri anya nke ya na Onye Mere ya. Lee nnọọ ka Chineke si kwuo okwu ọma banyere Mosis mgbe ọ na-abara Erọn na Miriam mba maka ịkatọ nwanne ha nwoke! Ee, Jehova gwara Mosis okwu “ọnụ na ọnụ,” kweekwa ka ọ hụ “ụdị Jehova.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:6-8) N’agbanyeghị ọtụtụ ihe ùgwù Mosis nwere, ọ nọgidere na-abụ onye kasị dịrị obi umeala n’etiti ụmụ mmadụ, mezuokwa ihe nile Jehova nyere n’iwu ‘otú ahụ.’—Ọpụpụ 40:16; Ọnụ Ọgụgụ 12:3.
8. Olee ụzọ Mosis si gosi na ya mikpuru onwe ya n’ezie n’ihe banyere Chineke?
8 Mosis gosikwara na ya mikpuru onwe ya n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya n’ihe banyere Chineke site ná nchegbu o gosiri maka aha Jehova, àgwà e ji mara ya, na ofufe ya dị ọcha. Otú a, Mosis nwere ihe ịga nke ọma ugbo abụọ n’ịrịọ Jehova ka o meere Israel ebere n’ihi na o metụtara aha Chineke. (Ọpụpụ 32:11-14; Ọnụ Ọgụgụ 14:13-19) Mgbe Israel tinyere aka n’ofufe arụsị nke nwa ehi, Mosis gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe dị ọcha site n’iti mkpu, sị: “Ònye dịịrị Jehova? Ya bịakwute m.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Mosis na ndị ahụ ya na ha nọ gburu 3,000 n’ime ndị ahụ na-ekpere arụsị. Mgbe ahụ, ruo 40 afọ, ọ nagidere ndị ahụ na-eme mkpesa, na-enupukwa isi. E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla dị ya na Moses naara ngosipụta nke ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya, na-esetịpụ ezi ihe nlereanya nye anyị taa.—Ọpụpụ 32:26-28; Deuterọnọmi 34:7, 10-12.
Ezi Mmeghachi Omume nke Devid
9. (a) Olee ụzọ Devid si zaghachi n’ịhụnanya Jehova Chineke? (b) Dị ka Devid, olee ụzọ anyị pụrụ isi jiri ihe onwunwe anyị nye Jehova nsọpụrụ?
9 Onye ọzọ a ma ama na Bible nke setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ịnara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya bụ onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid, bụ́ eze nke abụọ nke Israel. Ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka aha Jehova kpaliri ya ibuso nnukwute dike onye Filistia ahụ na-akwa emo, bụ́ Golaịat, agha, onye Chineke mere ka Devid merie. (1 Samuel 17:45-51) Otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ kpaliri Devid ibuteghachi igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem. (2 Samuel 6:12-19) Ọ̀ bụkwa na ọchịchọ Devid iwuru Jehova ụlọ nsọ abụghị ngosipụta ọzọ nke ịnụ ọkụ n’obi na ekele o nwere maka ịhụnanya na ịdị mma nke Chineke? N’ezie, ọ bụ ya. Ịbụ onye a napụrụ ihe ùgwù ahụ emeghị ka Devid laa azụ n’ime ndokwa maka ọrụ ahụ na inye Jehova nsọpụrụ site n’iweta onyinye nke ọlaedo, ọla ọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. (2 Samuel 7:1-13; 1 Ihe Emere 29:2-5) Inara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’ụzọ dị otú ahụ kwesịrị ịkpali anyị ‘iji ihe onwunwe anyị sọpụrụ Jehova’ site n’iji ihe onwunwe anyị nile mee ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu.—Ilu 3:9, 10; Matiu 6:33.
10. N’akụkụ dị aṅaa ka ụzọ Devid gbasoro bụ ihe kwesịrị nṅomi?
10 Ọ bụ ezie na Devid mehiere ihe ndị dị ukwuu, n’oge ndụ ya nile, o gosipụtara onwe ya ịbụ ‘onye dị ka obi Jehova si chọọ.’ (1 Samuel 13:14; Ọrụ 13:22) Abụ ọma ya nile jupụtara ná nkwupụta okwu ekele maka ịhụnanya Chineke. Akwụkwọ bụ The International Standard Bible Encyclopædia kwuru na Devid “jupụtara karị n’ekele karịa onye ọ bụla ọzọ a kpọtụrụ aha n’ime Akwụkwọ Nsọ.” Onye ọbụ abụ bụ Esaf kwuru na Chineke “họpụtakwara Devid, bụ́ ohu ya, o wee si n’ogige ìgwè ewu na atụrụ kuru ya: ... ịzụ Jekọb, bụ́ ndị ya, na Israel, bụ́ ihe nketa ya, dị ka atụrụ. O wee na-azụ ha dị ka izu okè nke obi ya si dị.” (Abụ Ọma 78:70-72) N’ezie, anyị kwesịrị iṅomi ụzọ nke Devid.
Jisọs Kraịst, Ihe Nlereanya Anyị Zuru Okè
11, 12. Olee ụzọ Jisọs si gosi na ya mikpuru onwe ya n’ezie n’ihe banyere Chineke?
11 N’ezie, Jisọs Kraịst bụ ihe nlereanya Akwụkwọ nsọ kachasị mma nke onye naara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya. Gịnị ka nke a kpaliri Jisọs ime? Karịsịa ihe nile, a kpaliri ya inye Jehova ofufe a raara nye nanị ya. E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jisọs mikpuru onwe ya kpam kpam n’ihe banyere Chineke. Ekele o nwere maka ịhụnanya na ịdị mma nke Nna ya nke eluigwe kpaliri ya ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị n’ezie. O nwere mmekọrịta chiri anya nke ya na Chineke. Jisọs bụ onye ji ikpe ekpere kpọrọ ihe, ọ na-amasịkwa ya nke ukwuu ịgwa Nna ya nke eluigwe okwu. Ọtụtụ mgbe, anyị na-agụ na Kraịst na-ekpe ekpere. N’otu oge, ọ nọrọ ogologo abalị dum n’ikpe ekpere. (Luk 3:21, 22; 6:12; 11:1; Jọn 17:1-26) N’imeghachi omume n’ịhụnanya Chineke, Jisọs biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu ahụ nke bụ na ‘ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke si n’ọnụ Jehova pụta.’ N’eziokwu, ime ihe Nna ya na-achọ bụụrụ ya nri. (Matiu 4:4; Jọn 4:34) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịnara ịhụnanya Chineke n’ụzọ yiri nke ahụ, na-enye ya ofufe a raara nye nanị ya?
12 N’imeghachi omume n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya n’ebe ịhụnanya Chineke dị, mgbe nile, Jisọs Kraịst na-adọrọ uche gaa n’ebe Chineke na Nna ya nọ. Mgbe otu onye kpọrọ Jisọs “Ezi Onye ozizi,” ọ jụrụ ajụ wee sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla bụ ezi onye, ma ọ bụghị otu onye, bụ́ Chineke.” (Luk 18:18, 19) Mgbe mgbe, Jisọs mesiri ya ike na ya apụghị ime ihe ọ bụla site n’uche nke aka ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ hapụrụ iji ohere nke ibuli aha Nna ya elu wee mee ihe, n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, ọ malitekwara ekpere ihe nlereanya ya site n’arịrịọ ahụ bụ: “Ka e doo aha gị nsọ.” O kpere ekpere, sị: “Nna, nye aha gị otuto.” N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ, Kraịst gwakwara Nna ya, sị: “Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa, ebe m rụzuru ọrụ i nyeworo m ka m rụọ.” (Matiu 6:9; Jọn 12:28; 17:4) N’ezie, n’imeghachi omume n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị ịchọ inye Jehova otuto, na-ekpe ekpere ka e doo aha nsọ ya nsọ.
13. Olee ụzọ ịhụnanya Chineke si kpalie Jisọs ime ihe?
13 Ugbu a, biko rịba ama ụzọ nke abụọ ịnara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị si kpalie Jisọs ime ihe. O mere ka ọ hụ ezi omume n’anya, kpọọkwa ihe ọjọọ asị, dị ka e buru amụma ya n’Abụ Ọma 45:7. (Ndị Hibru 1:9) Ọ “dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) Jisọs mara ndị ahụ ji obi ọjọọ na-emegide ya aka ka ha maa ya ikpe mmehie, ma ha apụghị ime otú ahụ. (Jọn 8:46) Ugbo abụọ dị iche iche, ikpọasị o nwere maka ajọ ihe kpaliri ya ikpochapụsị ndị okpukpe nwere anyaukwu n’ụlọ nsọ ahụ. (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:13-17) Leekwa oké nkatọ Jisọs ji katọọ ndị ndú okpukpe ahụ nwere ihu abụọ, ọbụna na-agwa ha na ha sitere n’Ekwensu!—Matiu 6:2, 5, 16; 15:7-9; 23:13-32; Jọn 8:44.
14. N’ịzaghachi nye ịhụnanya Jehova, olee ụzọ Jisọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe?
14 Ụzọ ọzọ kwa ịhụnanya Jehova si kpalie Jisọs bụ nke a pụrụ ịhụta ná mmeso o mesoro ndị ozi ya na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ. Lee ka o si jiri ịhụnanya, ndidi, na ogologo ntachi obi mesoo ha ihe! Ọ ghaghị ịbụworị na omume ịma aka ha, ịrụrịta ụka n’etiti onwe ha banyere onye kachasị ukwuu ọbụna ruo n’anyasị ụbọchị ahụ a raara ya nye, ga-akpasuworị ya iwe nke ukwuu. (Luk 22:24-27) Ma, mgbe nile, Jisọs gosiri onwe ya ịbụ onye nwayọọ na onye wedara onwe ya ala n’obi. (Matiu 11:28-30) N’ezie, Judas raara Jisọs nye, Pita gọnarịrị ya ugbo atọ, ndị ozi ndị ọzọ gbafusịkwara mgbe ìgwè mmadụ bịara ijide ya. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere obi ilu ma ọ bụ wee oké iwe. Anyị si aṅaa mara nke ahụ? Ọ dị mma, mgbe ọ bịakwuteghachiri ndị ozi ahụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jisọs abasighịrị ha mba ike n’ihi ịbụ ndị kwere ka egwu jide ha otú ahụ. Kama nke ahụ, ọ kasiri ha obi, gbaakwa ha ume maka ije ozi Alaeze n’ọdịnihu.—Jọn 20:19-23.
15. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si lekọta mkpa anụ ahụ nke ụmụ mmadụ n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya?
15 Ka anyị tụleekwa ụzọ ọzọ Jisọs Kraịst si nara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya. 0 mere otú a site n’ịchụ onwe ya n’àjà n’ihi ndị ọzọ, ruo n’ịnwụ ọnwụ ihere na nke ihe ụfụ n’elu osisi ịta ahụhụ. (Ndị Filipaị 2:5-8) Jisọs lekọtara mkpa anụ ahụ nke ndị mmadụ site n’iji ụzọ ọrụ ebube zụọ ọtụtụ ìgwè mmadụ nakwa ịgwọ ọtụtụ ọrịa. (Matiu 14:14-22; 15:32-39) Mgbe nile, ọ na-edebe ọdịmma nke ndị ọzọ n’ihu ọdịmma nke ya onwe ya. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ikwu, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi ya.” (Matiu 8:20) Jisọs matara na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ime ya ka ọ na-esi n’ahụ ya na-apụ mgbe ọ na-agwọ ọtụtụ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ nwara inweta uru ihe onwunwe site n’iji ike ndị karịrị ike mmadụ na-eme ihe, mgbe otu nwanyị nke nwere oruru ọbara ruo afọ 12 ji okwukwe metụ uwe mwụda ya aka, e wee mee ka ahụ dị ya ike. (Mak 5:25-34) Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs jiri ike karịrị ike mmadụ meere onwe ya ihe.—Tụlee Matiu 4:2-4.
16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Kraịst si lekọta mkpa ime mmụo nke ụmụ mmadụ?
16 Ọ bụ ezie na Jisọs mere ihe n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ya n’ilekọta mkpa anụ ahụ nke ndị mmadụ site n’ịgwọ ha ọrịa ha dị iche iche na inye ha nri n’ụzọ ọrụ ebube, ihe mkpali bụ isi dị n’ije ozi elu ala ya bụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, izi ihe, na ime ndị na-eso ụzọ. N’agbanyeghị ọgwụgwọ ọrụ ebube nile ọ gwọrọ, a maghị ya dị ka Onye Dibia Ukwu ma ọ bụ Onye Na-arụ Ọrụ Ebube, kama ọ bụ dị ka Ezi Onye Ozizi. (Matiu 4:23, 24; Mak 10:17) Jisọs zoro aka n’ebe onwe ya nọ dị ka Onye Ozizi, dịkwa ka ndị na-eso ụzọ ha ọbụna ndị iro ya mere. (Matiu 22:16; 26:18; Mak 9:38) Leekwa nnọọ eziokwu ndị ọ kụziri, dị ka n’Ozizi Elu Ugwu ya! (Matiu 5:1-7:29) Lee ka ihe atụ ndị o mere si kwesị nnọọ ekwesị, leekwa ka ilu ndị ọ tụrụ n’ụzọ amụma na amụma ndị ọzọ o buru si pụta nnọọ ìhè! Ka a sịkwa ihe mere na ndị agha e dujere ka ha jee jide Jisọs n’otu oge enweghị ike imetụ ya aka!—Jọn 7:45, 46.
17. (a) Olee ụzọ Jisọs si setipụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè nke ịhụnanya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
17 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs Kraịst setịpụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè nke ịnara ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke n’ebe anyị nọ n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị. Jisọs nyere Nna ya nke eluigwe ọnọdụ mbụ ná ndụ ya na ná mmetụta ịhụnanya ya nile. Ọ hụrụ ezi omume n’anya n’ezie, jiri ịhụnanya mesoo ndị ozi ya na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ ihe, tinyekwa ndụ ya nile n’ilekọta mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ụmụ mmadụ. N’ikpeazụ, Jisọs kpubere ije ozi ya okpueze site n’inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta. (Matiu 20:28) Ma gịnị banyere anyị? N’eziokwu, anyị bụ ndị na-ezughị okè dị ka Mosis na Devid. Otú ọ dị, dị ka isiokwu na-esonụ na-egosi, e nwere ụzọ dị iche iche pụtara ìhè anyị pụrụ isi ṅomie Onye ahụ nke setịpụụrụ anyị ihe nlereanya n’ịnara ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na “Chineke bụ ịhụnanya”?
◻ Olee ụzọ Mosis si nara ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Devid si nara ịhụnanya Jehova Chineke?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs Kraịst setịpụrụ n’ịzaghachi n’ịhụnanya Chineke?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ị̀ maara ụzọ Mosis si nara ịhụnanya Chineke?
[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]
Jisọs zaghachiri n’ịhụnanya Chineke site n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ, sitekwa n’inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta