“Karịsịa Ihe Nile, Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike”
“Ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso. . . . Karịsịa ihe nile, nweenụ ịhụnanya siri ike maka ibe unu.”—1 PITA 4:7, 8.
JIZỌS maara na awa ole na ole ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya ga-anọ dị oké ọnụ ahịa. Ọ maara ihe na-echere ha. Ha nwere nnukwu ọrụ ha ga-arụ, ma a ga-akpọ ha asị ma kpagbuo ha, ọbụna dị ka e mere ya. (Jọn 15:18-20) Ihe karịrị otu ugboro n’abalị ikpeazụ ahụ ya na ha nọkọrọ, o chetaara ha mkpa ọ dị ‘ịhụrịta ibe ha n’anya.’—Jọn 13:34, 35; 15:12, 13, 17.
2 Pita onyeozi, onye nọ ya n’abalị ahụ, ghọtara ihe o kwuru. Ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, ka ọ na-ede akwụkwọ obere oge tupu mbibi nke Jeruselem, Pita mesiri mkpa ịhụnanya dị ike. Ọ dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso. . . . Karịsịa ihe nile, nweenụ ịhụnanya siri ike maka ibe unu.” (1 Pita 4:7, 8) Okwu Pita nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye ndị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe dị ugbu a. (2 Timoti 3:1) Gịnị bụ “ịhụnanya siri ike”? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nwee ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe ndị ọzọ nọ? Oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị nwere ya?
“Ịhụnanya Siri Ike”—Gịnị Ka Ọ Bụ?
3 Ọtụtụ ndị na-eche na ịhụnanya bụ mmetụta na-abịara onwe ya. Ma, Pita adịghị ekwu banyere ụdị ịhụnanya ọ bụla nnọọ; ọ na-ekwu banyere ụdị ịhụnanya kasị mma. Okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” nke dị na 1 Pita 4:8 bụ nsụgharị nke okwu Grik bụ́ a·gaʹpe. Okwu ahụ pụtara ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị, nke ụkpụrụ na-eduzi, ma ọ bụ na-achịkwa. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-ekwu, sị: “Ịhụnanya agape bụ nke a pụrụ ịchịkwa achịkwa n’ihi na n’ụzọ bụ́ isi ọ bụghị mmetụta kama ọ bụ mkpebi siri ike nke na-eduga n’ime ihe.” Ebe ọ bụ na anyị nwere àgwà e ketara eketa nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ọ dị mkpa ka a na-echetara anyị igosi ibe anyị ịhụnanya, na-egosi ya n’ụzọ ndị ụkpụrụ Chineke na-eduzi.—Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12.
4 Nke a apụtaghị na anyị ga-ahụ ibe anyị n’anya nanị n’ihi na iwu ji anyị ime otú ahụ. Mmasị na mkpali akọghị ụkọ n’a·gaʹpe. Pita kwuru na anyị aghaghị ‘inwe ịhụnanya siri ike [n’ụzọ nkịtị, “na-agbasapụ agbasapụ”] maka ibe anyị.’a (Kingdom Interlinear) Ka o sina dị, ụdị ịhụnanya ahụ chọrọ mgbalị. Banyere okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “siri ike,” otu ọkà mmụta na-ekwu, sị: “Ọ na-enye echiche nke onye na-agba ọsọ nke ji ike ikpeazụ ya na-agba ọsọ ka ọ na-eru ná njedebe.”
5 Ya mere, ịhụnanya anyị agaghị akwụsị n’ime nanị ihe ndị ga-adịrị anyị mfe ma ọ bụ igosi ya nanị mmadụ ole na ole. Ịhụnanya Ndị Kraịst na-achọ ka anyị ‘gbasapụ’ obi anyị, na-egosi ịhụnanya ọbụna mgbe ọ pụrụ isi ike ime otú ahụ. (2 Ndị Kọrint 6:11-13) N’ụzọ doro anya, ọ dị anyị mkpa ịzụlite na imeziwanye ụdị ịhụnanya a, dị nnọọ ka onye na-asọ mpi egwuregwu na-aghaghị ịzụ onwe ya na ịrụ ọrụ iji meziwanye nkà ya. Ọ dị mkpa ka anyị nwee ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe ibe anyị nọ. N’ihi gịnị? N’ihi ihe atọ ma ọ dịkarịa ala.
N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Kwesị Ịhụrịta Ibe Anyị n’Anya?
6 Nke mbụ, “n’ihi na ịhụnanya sitere na Chineke.” (1 Jọn 4:7) Jehova, bụ́ Isi Iyi nke àgwà a na-adọrọ mmasị, buru ụzọ hụ anyị n’anya. Jọn onyeozi na-ekwu, sị: “Site na nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ọnọdụ anyị, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya.” (1 Jọn 4:9) E “zitere” Ọkpara Chineke site na ya ịghọ mmadụ, ijezu ozi ya na ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ—ihe a nile bụ “ka anyị nwee ike inweta ndụ.” Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ná ngosipụta a kasịnụ nke ịhụnanya Chineke? Jọn na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:11) Rịba ama na Jọn na-ede, sị, “Ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya”—ọ bụghị nanị gị kama anyị. Ihe ọ na-ekwu doro anya: Ọ bụrụ na Chineke hụrụ ndị anyị na ha na-efekọ ofufe n’anya, mgbe ahụ anyị kwesịrị ịhụkwa ha n’anya.
7 Nke abụọ, ọ dị oké mkpa ka anyị hụrịta ibe anyị n’anya ugbu a karị iji nyere ụmụnna anyị nọ ná mkpa aka n’ihi na “ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso.” (1 Pita 4:7) Anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ọnọdụ ụwa, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na mmegide na-ewetara anyị ihe isi ike. Ọ dị mkpa ka anyị bịarukwuo ibe anyị nso mgbe anyị nọ n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Ịhụnanya siri ike ga-ejikọta anyị ma kpalie anyị ‘ilekọta ibe anyị.’—1 Ndị Kọrint 12:25, 26.
8 Nke atọ, ọ dị mkpa ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya n’ihi na anyị achọghị ‘inye Ekwensu ohere’ ọ ga-eji nweta anyị. (Ndị Efesọs 4:27) Setan na-adị ngwa n’iji ezughị okè nke ndị kwere ekwe ibe anyị—adịghị ike ha, mmejọ, na mmehie ihe ha—mee ihe dị ka ihe mkpọbi ụkwụ. Okwu ọjọọ ma ọ bụ mmeso ọjọọ ọ̀ ga-eme ka anyị hapụ ọgbakọ? (Ilu 12:18) Ọ gaghị eme ma ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya siri ike maka ibe anyị! Ịhụnanya dị otú ahụ na-enyere anyị aka ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo ma jiri ịdị n’otu na-ejere Chineke ozi “n’otu ubu.”—Zefanaịa 3:9.
Ụzọ Isi Gosi na Ị Hụrụ Ndị Ọzọ n’Anya
9 Ịgosi ịhụnanya aghaghị ịmalite n’ụlọ. Jizọs kwuru na a ga-eji ịhụnanya ezi ụmụazụ ya nwere n’ebe ibe ha nọ mara ha. (Jọn 13:34, 35) Ịhụnanya aghaghị ịpụta ìhè ọ bụghị nanị n’ọgbakọ kamakwa n’ezinụlọ—n’etiti di na nwunye nakwa n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. O zughị ezu inwe ịhụnanya n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị nọ; ọ dị mkpa ka anyị na-egosipụta ya n’ụzọ doro anya.
10 Olee otú di na nwunye pụrụ isi gosirịta ibe ha ịhụnanya? Di nke hụrụ nwunye ya n’anya n’ezie na-eme ka ọ mata site n’okwu ọnụ nakwa n’omume ya—n’ihu ọha na mgbe nanị ha nọ—na ya hụrụ ya n’anya. Ọ na-asọpụrụ ùgwù onwe onye nke nwunye ya ma na-echebara echiche ya, otú o si ele ihe anya, na mmetụta ndị ọ na-enwe echiche. (1 Pita 3:7) Ọ na-ebute ọdịmma nwunye ya ụzọ tupu nke ya, ọ na-emekwa ihe nile ọ pụrụ ime iji gboo mkpa anụ ahụ́ ya, nke ime mmụọ ya, na nke mmetụta uche ya. (Ndị Efesọs 5:25, 28) Nwunye nke hụrụ di ya n’anya n’ezie na-akwanyere ya “ùgwù miri emi,” ọ bụrụgodị na ọ dịghị eme ihe ndị ọ tụrụ anya ha mgbe ụfọdụ. (Ndị Efesọs 5:22, 33) Ọ na-akwado di ya ma na-edo onwe ya n’okpuru ya, ọ dịghị achọ ihe gabigara ókè n’aka ya, kama ọ na-akwado ya n’ịhụ na ha na-elekwasị anya n’ihe ime mmụọ.—Jenesis 2:18; Matiu 6:33.
11 Ndị mụrụ ụmụ, olee otú unu pụrụ isi gosi ịhụnanya n’ebe ụmụ unu nọ? Njikere unu dị ịrụsi ọrụ ike iji nye ha ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ́ na-egosi na unu hụrụ ha n’anya. (1 Timoti 5:8) Ma ụmụaka chọrọ ihe karịrị nri, uwe, na ebe obibi. Ọzụzụ ime mmụọ dị ha mkpa ma ọ bụrụ na ha ga-etolite ịhụ ezi Chineke ahụ n’anya na ijere ya ozi. (Ilu 22:6) Nke ahụ pụtara idokwa oge iji mụọ Bible dị ka ezinụlọ, kere òkè n’ozi ma gaa nzukọ Ndị Kraịst. (Deuterọnọmi 6:4-7) Ịdị na-eme ihe ndị a mgbe nile chọrọ ịchụ ihe dị ukwuu n’àjà, karịsịa n’oge ndị a pụrụ iche. Nchegbu unu na mgbalị unu na-eme iji gboo mkpa ime mmụọ nke ụmụ unu bụ ngosipụta nke ịhụnanya, n’ihi na unu na-esi otú ahụ egosi na unu bu ọdịmma ebighị ebi ha n’obi.—Jọn 17:3.
12 Ọ dị oké mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na-egosikwa ịhụnanya site n’igbo mkpa mmetụta uche nke ụmụ ha. Ihe na-emetụta ụmụaka ngwa ngwa; obi ha nke na-esibeghị ike na-achọ ka unu na-agwa ha mgbe mgbe na unu hụrụ ha n’anya. Na-agwanụ ha na unu hụrụ ha n’anya ma na-egosi ha ịhụnanya dị ukwuu, n’ihi na ngosipụta ndị dị otú ahụ na-emesi ha obi ike na ha bụ ndị a pụrụ ịhụ n’anya nakwa na ha bara uru. Na-ajanụ ha mma site n’ala ala obi na n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’ihi na ọ na-eme ka ha mata na unu na-ahụ mgbalị ha ma jiri ha kpọrọ ihe. Na-ejinụ ịhụnanya adọ ha aka ná ntị, n’ihi na mgbazi dị otú ahụ na-agwa ha na unu na-eche banyere ụdị mmadụ ha na-aghọ. (Ndị Efesọs 6:4) Ngosipụta ịhụnanya nile dị otú ahụ, bụ́ ndị na-ewuli elu, na-enye aka ewulite ezinụlọ obi ụtọ, nke dị n’otu, bụ́ nke a kwadebere n’ụzọ ka mma iguzogide nrụgide nke ụbọchị ikpeazụ ndị a.
13 Ịhụnanya na-akwali anyị ileghara adịghị ike nke ndị ọzọ anya. Cheta na mgbe Pita na-adụ ndị na-agụ akwụkwọ ya ọdụ banyere ‘inwe ịhụnanya siri ike maka ibe ha,’ o kwuru ihe mere nke ahụ ji dị oké mkpa, sị: “N’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) ‘Ikpuchi’ mmehie apụtaghị ‘ikpuchi’ mmehie ndị dị oké njọ. Ọ bụ ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ bụ ndị e kwesịrị ime ka ha mata banyere okwu ndị dị otú ahụ, ọ bụkwa ha ga-eleba anya na ha. (Levitikọs 5:1; Ilu 29:24) Ọ ga-abụ nnọọ egosipụtaghị ịhụnanya—na ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị—ikwe ka ndị na-eme mmehie dị oké njọ nọgide na-eme ka ndị aka ha dị ọcha nwee mwute ma ọ bụ na-emegbu ha.—1 Ndị Kọrint 5:9-13.
14 N’ọtụtụ ọnọdụ, mmehie ihe na mmejọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị na-adị nta. Mgbe ụfọdụ, anyị nile na-asụ ngọngọ n’okwu ma ọ bụ n’omume, na-emejọ ma ọ bụ ọbụna na-eme ka ibe anyị nwee mwute. (Jems 3:2) Ànyị ga-adị ngwa ịkọsa adịghị ike nke ndị ọzọ? Nanị ihe omume dị otú ahụ ga-eme bụ ịkpata esemokwu n’ọgbakọ. (Ndị Efesọs 4:1-3) Ọ bụrụ na ịhụnanya na-achịkwa anyị, anyị agaghị ‘ebo onye anyị na ya na-efekọ ofufe ebubo ụgha,’ ma ọ bụ na-akọsa mmejọ ya. (Abụ Ọma 50:20) Dị nnọọ ka simenti na ágbá na-ekpuchi ntụpọ ndị dị n’ahụ́ ụlọ, otú ahụ ka ịhụnanya na-esi ekpuchi ezughị okè nke ndị ọzọ.—Ilu 17:9.
15 Ịhụnanya ga-eme ka anyị gbatara ndị nọ ná mkpa n’ezie ọsọ enyemaka. Ka ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị ikpeazụ ndị a nọgidere na-aka njọ, a pụrụ inwe oge mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị ga-achọ enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị. (1 Jọn 3:17, 18) Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị onye ọgbakọ anyị dabara ná nnukwu nsogbu ego ma ọ bụ na-enwekwaghị ọrụ? Mgbe ahụ, ikekwe, anyị pụrụ igbo mkpa anụ ahụ́ ya, ruo ókè ike anyị hà. (Ilu 3:27, 28; Jems 2:14-17) Ọ̀ dị mkpa ka a rụzie ụlọ agadi nwanyị di ya nwụrụ? Ya bụrụ otú ahụ, ikekwe, anyị pụrụ inye aka n’akụkụ ụfọdụ nke ọrụ ahụ n’echeghị ka a gwa anyị agwa.—Jems 1:27.
16 Anyị igosipụta ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ akwụsịghị n’ebe ndị bi gburugburu ebe obibi anyị nọ. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịnụ akụkọ banyere ndị ohu Chineke n’ala ndị ọzọ bụ́ ndị oké mmiri ozuzo, ala ọma jijiji, ma ọ bụ ọgba aghara obodo, metụtara. Mkpa ihe oriri, uwe, na ihe ndị ọzọ, pụrụ ịkpasi ha ike. Ọ dịghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ha si n’agbụrụ ọzọ. Anyị ‘nwere ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum.’ (1 Pita 2:17) N’ihi ya, dị ka ọgbakọ ndị dị na narị afọ mbụ, anyị na-achọsi ike ịkwado ọrụ enyemaka ndị e dokwaworo iji nyere ha aka. (Ọrụ 11:27-30; Ndị Rom 15:26) Mgbe anyị gosiri ịhụnanya n’ụzọ nile dị otú ahụ, anyị na-ewusi ihe nkekọ na-eme ka anyị dị n’otu n’ụbọchị ikpeazụ ndị a ike.—Ndị Kọlọsi 3:14.
17 Ịhụnanya na-akpali anyị ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze Chineke. Tụlee ihe nlereanya Jizọs. N’ihi gịnị ka o ji mee nkwusa ma zie ihe? O “nwere ọmịiko n’ahụ́” ìgwè mmadụ ahụ n’ihi ọnọdụ ime mmụọ ha nke kwesịrị imere ebere. (Mak 6:34) Ndị ọzụzụ atụrụ nke okpukpe ụgha, bụ́ ndị kwesịrị ịkụziri ha eziokwu ime mmụọ ma mee ka ha nwee olileanya, leghaara ha anya ma duhie ha. N’ihi ya, n’ịbụ onye ịhụnanya na ọmịiko dị omimi ndị sitere n’ala ala obi kpaliri, Jizọs ji “ozi ọma banyere alaeze Chineke” kasie ndị ahụ obi.—Luk 4:16-21, 43.
18 Taakwa, e legharawo ọtụtụ ndị anya n’ụzọ ime mmụọ ma duhie ha, ha enweghịkwa olileanya. Dị ka Jizọs, ọ bụrụ na anyị ana-echebakwuru mkpa ime mmụọ nke ndị na-amatabeghị ezi Chineke ahụ echiche, mgbe ahụ ịhụnanya na ọmịiko ga-akpali anyị ikwusara ha ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 6:9, 10; 24:14) N’ihi obere oge fọdụrụnụ, ọ dị ngwa ikwusa ozi a na-azọpụta ndụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.—1 Timoti 4:16.
“Ọgwụgwụ nke Ihe Nile Eruwo Nso”
19 Cheta, Pita ji okwu bụ́: “Ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso” malite ndụmọdụ o nyere ka anyị na-enwe ịhụnanya n’ebe ibe anyị nọ. (1 Pita 4:7) N’oge na-adịghị anya, ajọ ụwa a ga-enyere ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke ohere. (2 Pita 3:13) N’ihi ya, ugbu a abụghị oge mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ. Jizọs dụrụ anyị ọdụ, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.”—Luk 21:34, 35.
20 Ya mere, ihe ọ sọkwara ya mee, ka anyị ‘nọrọ na nche,’ na-eburu n’uche ebe anyị nọ ka oge na-aga. (Matiu 24:42) Ka anyị nọrọ na nche megide ọnwụnwa ọ bụla nke Setan, nke pụrụ ịdọpụ uche anyị. Ka anyị ghara ikwe ma ọlị ka ụwa a na-enweghị mmetụta, nke na-enweghị ịhụnanya gbochie anyị igosipụta ịhụnanya anyị maka ndị ọzọ. Karịsịa, ka anyị bịarukwuo ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, nso, bụ́ onye Alaeze Mezaịa ya ga-emezu nzube ya dị ebube banyere ụwa a n’isi nso.—Mkpughe 21:4, 5.
[Ntụaka ala peeji]
a Na 1 Pita 4:8, nsụgharị Bible ndị ọzọ na-ekwu na anyị aghaghị ịhụ ibe anyị n’anya “site n’ezi obi,” “n’ụzọ miri emi,” ma ọ bụ “n’ụzọ siri ike.”
AJỤJỤ MAKA IHE ỌMỤMỤ
• Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ na-ahapụ ha, gịnịkwa na-egosi na Pita ghọtara ya? (Para. 1-2)
• Gịnị bụ “ịhụnanya siri ike”? (Para. 3-5)
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịhụrịta ibe anyị n’anya? (Para. 6-8)
• Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya? (Para. 9-18)
• N’ihi gịnị ka oge a na-ejighị bụrụ oge mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ, oleekwa ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Para. 19-20)
[Ihe Osise nke dị na peeji nke 29]
Ezinụlọ dị n’otu na-abụ ndị a kwadebere n’ụzọ ka mma ịnagide nsogbu ndị a na-enwe n’ụbọchị ikpeazụ ndị a
[Ihe Osise nke dị na peeji nke 30]
Ịhụnanya na-akpali anyị ịgbatara ndị nọ ná mkpa n’ezie ọsọ enyemaka
[Ihe Osise nke dị na peeji nke 31]
Ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ omume ịhụnanya