Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Jọn nke Mbụ 4:18 na-agwa anyị, sị: “Egwu adịghị n’ịhụnanya: kama ịhụnanya nke zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí.” Ma Pita dere, sị: “Hụnụ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke.” (1 Pita 2:17) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka amaokwu abụọ a kwekọọ?
Ma Pita ma Jọn bụcha ndị ozi mụtara ihe site n’aka Jisọs Kraịst n’onwe ya kpọmkwem. Ya mere anyị pụrụ inwe obi ike na ihe ha dere kwekọrọ. Banyere amaokwu ndị ahụ e hotara n’elu, azịza ya bụ na ndị ozi abụọ ahụ na-ekwu banyere ụdị egwu dịrịtara iche.
Ka anyị buru ụzọ tụlee ndụmọdụ Pita. Dị ka ihe ndị gbara okwu ya gburugburu na-egosi, Pita na-enye ndị Kraịst ibe ya okwu ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ banyere omume ha n’ebe ndị na-achị isi nọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ na-ekwu banyere ụzọ kwesịrị ekwesị a ga-esi na-ele ido onwe onye n’okpuru n’ọnọdụ ụfọdụ anya. N’ihi ya, o nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ka ha doo onwe ha n’okpuru ndị mmadụ nwere ọkwá ọchịchị na gọọmenti ụmụ mmadụ, dị ka ndị eze ma ọ bụ ndị gọvanọ. (1 Pita 2:13, 14) N’ịga n’ihu, Pita dere, sị: “Sọpụrụnụ mmadụ nile. Hụnụ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.”—1 Pita 2:17.
E buru n’obi ihe ndị gbara okwu ya gburugburu, o doro anya na mgbe Pita sịrị na ndị Kraịst kwesịrị ‘ịtụ egwu Chineke,’ o bu n’uche na anyị kwesịrị inwe nsọpụrụ ofufe, nke dị omimi maka Chineke, egwu nke imejọ ịchịisi kasị elu.—Tụlee Ndị Hibru 11:7.
Gịnị banyere okwu Jọn onyeozi? Tupu mgbe ahụ na 1 Jọn isi nke 4, onyeozi ahụ kwuru banyere mkpa nke ịnwale “okwu mmụọ nile” dị ka ndị ahụ na-esite n’ọnụ ndị amụma ụgha. Okwu ndị ahụ n’ezie adịghị esite n’ebe Jehova Chineke nọ abịa; ha na-esite ma ọ bụ na-egosipụta ajọ ụwa nke a.
N’ụzọ dị iche, ndị Kraịst e tere mmanụ “siri na Chineke pụta.” (1 Jọn 4:1-6) Ebe ọ dị otú ahụ, Jọn gbara ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta.” Chineke butere ụzọ n’igosi ịhụnanya—o ‘zitere Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie anyị.’ (1 Jọn 4:7-10) Olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi?
N’ụzọ doro anya, anyị na Chineke anyị na-ahụ n’anya kwesịrị ịnọgide na-adị n’otu. Anyị ekwesịghị ịnọ n’ụjọ maka ya ma ọ bụ maa jijiji n’atụmanya nke ịgakwuru ya n’ekpere. Tupu mgbe ahụ Jọn dụrụ n’ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ; ihe ọ bụla anyị na-arịọkwa, anyị na-anata ya n’aka Ya, n’ihi na anyị na-edebe ihe nile O nyere n’iwu.” (1 Jọn 3:21-22) Ee, ezi akọ na uche na-enye anyị nnwere onwe ịgakwuru Chineke n’enweghị egwu na-akụnwụ ahụ ma ọ bụ nke na-egbochi mmadụ ime ihe. N’ihi ịhụnanya, anyị na-enwere onwe anyị ịgwa Jehova okwu, ma ọ bụ ịgakwuru ya n’ekpere. N’akụkụ a, “egwu adịghị n’ịhụnanya.”
Ka anyị jikọtazie echiche abụọ ahụ. Onye Kraịst aghaghị mgbe nile inwe egwu nsọpụrụ Jehova, nke sitere ná nkwanye ùgwù miri emi maka ọkwá, ike, na ikpe ziri ezi ya. Ma anyị na-ahụkwa Chineke n’anya dị ka Nna anyị ma na-enwe mmetụta nke ịnọ ya nso na nnwere onwe ịgakwuru ya. Kama ịbụ ndị ụjọ ya gbochiri, anyị nwere obi ike na anyị pụrụ ịgakwuru ya, dị ka nwa na-enwere onwe ya ịgakwuru nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya.—Jemes 4:8.