Isi nke 19
Mgbe Ihe Ọmụma Chineke Jupụtara Ụwa
1, 2. Olee otú ihe okike Jehova si bụrụ nke e bibiri?
KA E were na otu onye ọkà ukwu n’ise ihe ka sepụrụ otu ihe osise magburu onwe ya. O lere ya anya n’izi ezi dị ka nke dị mma nke ukwuu—ọrụ onye ọkà! Ma mgbe chi na-abọ onye iro na-ekwo ekworo esekasịa ya. O kwere nghọta na nke a ga-akpatara onye ọkà ise ihe ahụ obi mgbu dị ukwuu. Lee ka ọ ga-esi gụsie ya agụụ ike ịhụ na a kpọchiri onye ụrụ ahụ! Ị pụkwara ịghọta otú onye ọkà ahụ ga-esi chọsie ike iweghachi ihe o sere n’ịma mma mbụ ya.
2 Dị ka onye ọkà ise ihe ahụ, Jehova mere ihe onye ọkà n’ịkwadebe ụwa na itinye ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ya. Mgbe o kesịrị nwoke na nwanyị, o kwupụtara na ọrụ ya nile n’elu ụwa “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Adam na Iv bụ ụmụ Chineke n’onwe ya, ọ hụkwara ha n’anya. Ọ tụrụ anya ọdịnihu obi ụtọ, nke dị ebube maka ha. N’eziokwu, Setan dubara ha ná nnupụisi, ma e bibighị ihe dị ebube Chineke kere ruo n’ókè na-enweghị mmekwata.—Jenesis 3:23, 24; 6:11, 12.
3. Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie”?
3 Chineke ekpebiwo idozi ihe. Ọ na-achọsi ike ịhụ ka anyị biri ndụ n’ụzọ o zubere na mbụ. Ịdị adị anyị nke dị mkpirikpi na nke nsogbu abụghị “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie,” n’ihi na o rutụdịghị ma ọlị ihe Jehova bu n’uche. “Ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie” nke Chineke zubere maka anyị bụ “ndụ ebighị ebi” n’okpuru ọnọdụ ndị zuru okè.—1 Timoti 6:12, 19.
4, 5. (a) Olee otú a ga-esi mezuo olileanya Paradaịs ahụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chee echiche banyere olileanya anyị maka ọdịnihu?
4 Ihe ọmụma Chineke na-eweta ibu ọrụ n’ihu Jehova. (Jemes 4:17) Ma chee banyere ngọzi ndị ị ga-enwe ma ọ bụrụ na i tinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ ma chụsoo ndụ ebighị ebi. N’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova Chineke esewo onyinyo mara mma nke ihe ndụ ahụ ga-adị ka ya n’ụwa Paradaịs nke dị nnọọ nso. Otú ọ dị, dị ka ndị Jehova anyị adịghị ejere Chineke ozi nanị n’ihi ọchịchọ inweta ụgwọ ọrụ. Anyị na-ejere Chineke ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (Mak 12:29, 30) Ọzọkwa, anyị adịghị arụta ndụ n’ọrụ site n’ijere Jehova ozi. Ndụ ebighị ebi bụ onyinye nke Chineke. (Ndị Rom 6:23) Ọ ga-adịrị anyị mma ịtụgharị uche ná ndụ dị otú ahụ n’ihi na olileanya Paradaịs ahụ na-echetara anyị ụdị Chineke Jehova bụ—‘onye na-eji ịhụnanya na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.’ (Ndị Hibru 11:6) Olileanya nke na-egbukepụ nke ọma n’uche na n’obi anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịnagide ihe isi ike dị iche iche n’ụwa Setan.—Jeremaịa 23:20.
5 Ka anyị tụkwasị uche ugbu a n’olileanya ahụ dabeere na Bible nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ụwa n’ọdịnihu. Gịnị ka ndụ ga-adị ka ya mgbe ihe ọmụma Chineke jupụtara n’ụwa?
AMAGEDỌN GASỊA—ỤWA PARADAỊS
6. Gịnị bụ Amagedọn, gịnịkwa ka ọ ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ?
6 Dị ka e gosiri na mbụ, Jehova Chineke ga-ebibi usoro ihe ọjọọ dị ugbu a n’isi nso. Ụwa ji ọsọ na-eru ihe Bible kpọrọ Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn. Okwu ahụ pụrụ ime ka ụfọdụ ndị chee banyere mgbukpọsị nuklia nke mba ndị na-eburịta agha kpatara, ma Amagedọn abụghị ihe yiri nke ahụ. Dị ka Mkpughe 16:14-16 na-egosi, Amagedọn bụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” Ọ bụ agha nke metụtara “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” ma ọ bụ mba nile. Ọkpara Jehova Chineke, bụ́ Eze ahụ a họpụtara, n’isi nso ga-agbara bata n’agha. Ihe ga-esi na ya pụta doro nnọọ anya. A ga-ekpochapụ ndị nile na-emegide Alaeze Chineke na ndị bụ akụkụ nke usoro ihe ọjọọ Setan. Nanị ndị na-anọgidesi ike n’ihe nye Jehova ga-alanarị.—Mkpughe 7:9, 14; 19:11-21.
7. Olee ebe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-anọ n’ime Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, oleekwa otú nke a ga-esi baara ihe a kpọrọ mmadụ uru?
7 Ka e were ya na ị lanarịwo mbibi ahụ. Gịnị ka ndụ ga-adị ka ya n’elu ụwa n’ụwa ọhụrụ Chineke o kwere ná nkwa? (2 Pita 3:13) Ọ dịghị anyị mkpa ịkọwa nkọ, n’ihi na Bible na-agwa anyị, ihe ọ na-ekwukwa na-akpali akpali. Anyị na-amụta na a ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ọrụ, kpọchie ha n’ime abyss nke arụghị ọrụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst. Ndị e kere eke obi ọjọọ ahụ, bụ́ ndị arụrụala, agakwaghị anọ ná nzuzo ọzọ na-akpata nsogbu ma na-agbalị inubanye anyị n’ihe omume dị iche iche nke ekwesịghị ntụkwasị obi megide Chineke. Lee aha ihe ikuru ume ndụ ọ bụ!—Mkpughe 20:1-3.
8, 9. N’ụwa ọhụrụ ahụ, gịnị ga-eme nhụjuanya, nrịanrịa, na ịka nká?
8 Mgbe oge na-aga, ụdị nile nke ọrịa ga-apụ n’anya. (Aịsaịa 33:24) Ndị ngwụrọ ga-eguzo ọtọ, jee ije, gbaa ọsọ, teekwa egwú n’ụkwụ ndị dị mma, gbasie ike. Mgbe ọtụtụ afọ ndụ nke anụghị ihe ha gasịrị, ndị ntị chiri ga-anụ olu ọṅụ ndị na-ada gburugburu ha. Ndị ìsì ga-enwe ihe ịtụnanya dị egwu ịhụ ụbara nke àgwà na ụdị ihe dị iche iche anya ha na-ahụ. (Aịsaịa 35:5, 6) Ha ga-emesị hụ ihu nke ndị ha hụrụ n’anya! Ma eleghị anya mgbe ahụ anya mmiri nke ọṅụ ga-agbachi ha anya nwa ntakịrị oge.
9 Cheedị nnọọ! E nwekwaghị enyo anya, e nwekwaghị mkpara e ji eje ije, e nwekwaghị ọgwụ, e nwekwaghị ụlọ ọgwụ eze ma ọ bụ ụlọ ọgwụ ndị ọzọ! Ọ dịkwaghị mgbe nrịanrịa mmetụta uche na nkụda mmụọ ga-anapụ ndị mmadụ obi ụtọ. Ọ dịghịkwa nwata nke ọrịa ga-emekpa ahụ. A ga-echigharị ihe nile ịka nká mebisịrị ihu. (Job 33:25) Anyị ga-enwe ahụ ike karị, gbasie ike karị. Kwa ụtụtụ anyị ga-ebili site n’ụra abalị nke na-enye ume ọhụrụ na-enwe ume ọrụ dị ọhụrụ, jupụta n’ike ma na-anụ ọkụ n’obi maka ụbọchị ọhụrụ nke ndụ dị gara gara na ọrụ na-enye afọ ojuju.
10. Ọrụ dị aṅaa ka ndị lanarịrị Amagedọn ga-arụ?
10 A ga-enwe ọrụ dị ukwuu na-enye ọṅụ nke ndị lanarịrị Amagedọn ga-arụ. Ha ga-agbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs. A ga-ewepụsị ihe nile rụrụ arụ nke usoro ihe ochie nke a. Ubi na ogige ntụrụndụ dị iche iche ga-apụta n’ọnọdụ mkpọmkpọ ebe na ala ndị e bibiri ebibi. Mmadụ nile ga-enwe ụlọ dị mma, nke na-enye ntụsara ahụ. (Aịsaịa 65:21) Ka oge na-aga, akụkụ ndị ahụ ghọworo paradaịs n’elu ụwa ga-ebuwanye ibu ma jikọta ọnụ ruo mgbe elu ụwa dum ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ịma mma nke Onye Okike ahụ setịpụrụ laa azụ n’ogige Iden. Lee aha ihe na-enye afọ ojuju ọ ga-abụ ikere òkè n’ọrụ mweghachi ahụ!
11. Gịnị ga-abụ mmekọrịta ihe a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu n’ebe mbara ụwa na ụmụ anụmanụ dị?
11 A ga-eme ihe a dum n’okpuru nduzi Chineke ka e wee ghara imebi mbara ebe obibi. Ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-adị n’udo. Kama ịdị na-egbukpọsị ha n’echeghị echiche, mmadụ ga-ewereghachi ọrụ ilekọta ụwa n’ụzọ ezi uche, na-elekọta ha nke ọma. Jiri uche hụ anụ ọhịa wolf na ụmụ atụrụ, ọdụm na ụmụ ehi, ka ha na-atakọ nri—anụ ndị ahụ na-ebi n’ụlọ enweghịkwa ihe ize ndụ. Ọbụna nwatakịrị agaghị enwe ihe ọ ga-atụrụ egwu n’ebe anụ ọhịa dị iche iche dị, ụmụ mmadụ nwere obi ọjọọ, na-eme ihe ụjọ agaghịkwa akpaghasị ịdị jụụ nke ụwa ọhụrụ ahụ. (Aịsaịa 11:6-8) Lee aha ụwa ọhụrụ nke udo nke ahụ ga-abụ!
A GBANWEE IHE A KPỌRỌ MMADỤ
12. Olee otú Aịsaịa 11:9 si na-emezu taa, oleekwa ụzọ a ga-esi mezuo ya na Paradaịs?
12 Aịsaịa 11:9 na-agwa anyị ihe mere a na-agaghị eji nwee mmejọ n’ụwa dum. Ọ na-asị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Nke a bụ banyere ụmụ mmadụ n’ihi na ụmụ anụmanụ apụghị ịnara “ihe ọmụma Jehova” ma mee mgbanwe, ebe ọ bụ na amamihe ebumpụta ụwa na-achịkwa ha. Ma ihe ọmụma Onye Okike anyị na-agbanwe ndị mmadụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i meworị mgbanwe ụfọdụ n’onwe gị n’ihi itinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ ná ndụ gị. Ọtụtụ nde mmadụ emewo otú ahụ. Ya mere, amụma a amaliteworị imezu ná ndị na-ejere Jehova ozi. Ma, ọ na-atụkwa aka n’oge mgbe ndị mmadụ n’ụwa dum ga-ewepụsị àgwà anụmanụ ọ bụla ma ọ bụ nke ime ihe ike ma ghọọ ndị na-achọ udo ruo mgbe ebighị ebi.
13. Usoro nkụzi dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’ụwa?
13 Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya mgbe ihe ọmụma Chineke na-ejupụta elu ụwa! A ga-enwe oké ọrụ nkụzi n’okpuru nduzi nke Eze Jisọs Kraịst na 144,000 ndị so ya na-achị. “Akwụkwọ” ndị ọhụrụ ga-abata n’ọrụ mgbe ahụ. Ihe àmà na-egosi na ndị a bụ ntụziaka Chineke ndị e dere ede bụ́ ndị ga-eje ozi dị ka ihe ndabere maka ịkụziri ndị bi n’ụwa ihe. (Mkpughe 20:12) Ihe a kpọrọ mmadụ ga-amụta udo, ọ bụghị agha. Ngwá agha nile na-ebibi ihe ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 46:9) A ga-akụziri ndị bi n’ụwa ọhụrụ ahụ imeso ndị mmadụ ibe ha n’ịhụnanya, nkwanye ùgwù na ná nsọpụrụ.
14. Olee otú ụwa ga-esi dị iche mgbe ihe a kpọrọ mmadụ bụ otu ezinụlọ dị n’otu?
14 Ihe a kpọrọ mmadụ ga-aghọ otu ezinụlọ dị n’otu. A gaghị enwe ihe mgbochi nye ịdị n’otu na ịbụ òtù ụmụnna. (Abụ Ọma 133:1-3) Ọ dịghị onye ọ ga-adị mkpa ịkpọchi ụzọ ụlọ ya iji gbochie ndị ohi. Udo ga-achị dị ka eze n’obi ọ bụla, n’ụlọ ọ bụla, n’akụkụ ọ bụla nke ụwa.—Maịka 4:4.
MBILITE N’ỌNWỤ AHỤ NA-ENYE ỌṄỤ
15. Olee ìgwè abụọ a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa?
15 N’ime Narị Afọ Iri ahụ, mbilite n’ọnwụ ga-ewere ọnọdụ. A gaghị akpọlite ndị ma ụma mehie megide mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, site n’ime ihe megidere ngosipụta ma ọ bụ idu ndú ya ma hapụ ichegharị. (Matiu 23:15, 33; Ndị Hibru 6:4-6) Otú ọ dị, Chineke ga-ekpebi ndị mehiere n’ụzọ dị otú ahụ. Ma a ga-akpọlite ìgwè abụọ dị iche iche—‘ndị ezi omume na ndị ajọ omume.’ (Ọrụ 24:15) Ebe ọ bụ na a ga-enwe ezigbote ịdị n’usoro, ezi uche dị n’ikwubi na ndị mbụ a ga-anabataghachi ná ndụ n’elu ụwa ga-abụ ndị ezi omume, ndị jeere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe.—Ndị Hibru 11:35-39.
16. (a) Olee ndị ga-eso ná “ndị ezi omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa? (b) Olee ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị ị ga-enwe mmasị karịsịa izute, n’ihi gịnịkwa?
16 Kama ịdị na-anụ akụkọ agha, ọdachi, na ọnwụ, ndị ohu Jehova ga-anata akụkọ ndị magburu onwe ha nke mbilite n’ọnwụ. Ọ ga-abụ ihe na-akpali akpali ịnụ banyere nlọtaghachi nke ndị ikom na ndị inyom ndị dị ka Ebel, Inọk, Noa, Abraham, Sera, Job, Mosis, Rehab, Rut, Devid, Elaịja, Esta. Lee ihe akụkọ ndị mere eme n’ezie bụ́ ndị na-akpali akpali ha ga-akọ ka ha na-ekwu ihe ndị gbara ihe ndekọ Bible gburugburu! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha na ndị ezi omume nwụrụ n’oge ndị a ga-enwe oké mmasị n’otu aka ahụ ịmụta banyere ọgwụgwụ usoro ihe Setan na ụzọ Jehova si doo aha nsọ ya nsọ ma wepụ ọkaaka ya n’ụta.
17. Enyemaka dị aṅaa ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-enye ndị ọzọ a kpọlitere?
17 Lee ka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ga-esi nye aka n’oge nke agba mbilite n’ọnwụ nke na-esote, mgbe a tọhapụrụ ọtụtụ ijeri “ndị ajọ omume” site n’agbụ nile nke ọnwụ! Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ enwebeghị ohere ịmara Jehova. Setan ‘na-eme ka uche ha kpuo ìsì.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Ma a ga-emeghasị ọrụ Ekwensu nile. Ndị ajọ omume ga-alọghachi bịa n’ụwa mara mma ma dị n’udo. Ndị a haziri nke ọma ịkụziri ha banyere Jehova na Ọkpara ya na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-anabata ha. Ka ọtụtụ ijeri ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-amata ma na-ahụ Onye Okike ha n’anya, ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa n’ụzọ ọ na-emetụbeghị mbụ.
18. Olee otú i chere ọ ga-adị gị mgbe ị na-anabataghachi ndị a hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ?
18 Lee aha ọṅụ mbilite n’ọnwụ ahụ ga-ewetara obi anyị! Olee onye na-atabeghị ahụhụ n’ihi onye iro anyị bụ́ ọnwụ? N’ezie, olee onye na-enwebeghị mmetụta nke ịbụ onye isi gbaghasịrị mgbe a dọbiri otu ihe nkekọ nke ịhụnanya ma ọ bụ ọbụbụenyi mgbe ọrịa, ịka nká, ihe ọghọm, ma ọ bụ ime ihe ike weere ndụ onye a hụrụ n’anya? Mgbe ahụ, cheedị banyere ọṅụ nke ndị a na-ejikọghachi ọnụ ọzọ n’ime Paradaịs. Ndị nne na nna, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ndị enyi na ndị ikwu, ga-agbara makụọ onwe ha, na-achị ọchị, na-ebekwa ákwá n’ihi ọṅụ.
E MESỊA NWEE IZU OKÈ!
19. Ọrụ ebube dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’ime Narị Afọ Iri ahụ?
19 N’ime Narị Afọ Iri ahụ dum, otu ọrụ ebube magburu onwe ya ga na-ewere ọnọdụ. Nye ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-abụ ma eleghị anya akụkụ kasị na-akpali akpali nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Jehova ga-atụziri Ọkpara ya iji uru nke àjà mgbapụta ahụ mee ihe maka nwoke na nwanyị ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi ma na-erube isi. Site n’ụzọ ahụ, a ga-ewepụ mmehie nile, buliekwa ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’izu okè.—1 Jọn 2:2; Mkpughe 21:1-4.
20. (a) Gịnị ka izu okè ga-apụta? (b) Olee mgbe ndị lanarịrị Amagedọn na ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-amalite ibi ndụ n’ụzọ kasị zuo ezu?
20 Izu oke! Gịnị ka ọ ga-apụta? Ọ ga-apụta nlaghachi gaa ná ndụ otú Adam na Iv nwere ya tupu ha emehie megide Jehova Chineke. N’anụ ahụ, n’uche, ná mmetụta uche, n’omume, n’ime mmụọ—n’ụzọ ọ bụla a pụrụ iche n’echiche—ụmụ mmadụ zuru okè ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ Chineke setịpụrụ n’ụzọ zuru ezu. Ma mmadụ nile hà ga-eyi ibe ha mgbe ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe okike nile Jehova—osisi, okooko ọhịa, anụmanụ—ha nile na-akụziri anyị na o nwere mmasị ná ndịrịta iche. Ụmụ mmadụ zuru okè ga-enwe ọdịdị na nkà dị iche iche. Nke ọ bụla ga-anụ ụtọ ndụ dị ka Chineke zubere ya. Mkpughe 20:5 na-asị: “Ndị fọdụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ ruo mgbe [puku afọ] ahụ ga-agwụsị.” Dị ka oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị lanarịrị Amagedọn, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-adị ndụ n’ụzọ zuru ezu mgbe ha ruru izu okè nke enweghị mmehie.
21. (a) Gịnị ga-eme n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst? (b) Gịnị ga-emesị mee Setan na ndị nile dụnyeere ya úkwù?
21 Ụmụ mmadụ zuru okè ga-eche otu ule ikpeazụ ihu. Ná ngwụsị nke Narị Afọ Iri ahụ, a ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’abyss ruo nwa oge ma nye ha ohere ime mgbalị ikpeazụ iji dọrọ ndị mmadụ pụọ n’ebe Jehova nọ. Ụfọdụ ga-ebute ọchịchọ ọjọọ dị iche iche ụzọ tupu ịhụnanya maka Chineke, ma a ga-ebi nnupụisi nke a nkenke. Jehova ga-egbusịsị ndị a na-achọ ọdịmma onwe ha nanị ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nile. Mgbe ahụ ndị nile na-eme ihe ọjọọ ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 20:7-10.
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
22. Gịnị ka ị na-atụ anya ime na Paradaịs?
22 Ebighị ebi ga-agbasapụ n’ihu ndị hụrụ Jehova Chineke n’anya ma biri n’ụwa Paradaịs ahụ. Ọ ga-esiri anyị ike iji anya nke uche hụ ọṅụ ha, gị onwe gị pụkwara ikere òkè na nke a. Egwú, nkà, ọrụ aka—ee, ihe ihe a kpọrọ mmadụ zuru okè ga-arụzu ga-akarị ọrụ kasị mma nke ndị ọkà kasị ukwuu n’ụwa ochie rụpụtara! E kwuwerị, ụmụ mmadụ ga-ezu okè ma nwee oge na-enweghị ọgwụgwụ n’ihu ha. Cheedị ihe ị ga-enwe ike ime dị ka mmadụ zuru okè. Cheekwa banyere ihe gị na ụmụ mmadụ ibe gị ga-amụta banyere ihe okike Jehova—site n’ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando dị na mbara igwe ruo n’ụmụ irighiri atọm ndị kasị nta. Ihe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ rụzuru ga-atọkwu obi Nna eluigwe anyị nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ụtọ.—Abụ Ọma 150:1-6.
23. N’ihi gịnị ka ndụ n’ime Paradaịs na-agaghị eji na-atụ ọbọ mgbe ọ bụla?
23 Ndụ na mgbe ahụ agaghị na-atụ ọbọ. Ọ ga na-adọrọwanye mmasị ka oge na-aga. Leenụ, e nweghị ọgwụgwụ nke ihe ọmụma Chineke. (Ndị Rom 11:33) N’oge nile na-enweghị ọgwụgwụ, a ga-enwe mgbe nile ihe ndị a ka ga-amụta na akụkụ ndị ọhụrụ a ga-achọpụta. (Eklisiastis 3:11) Ka ị nọgidekwara na-amụta banyere Jehova Chineke, ị ga-anọgide na-adị ndụ—ọ bụghị nanị afọ ole na ole kama ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 22:26.
24, 25. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji bie ndụ ugbu a n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụma Chineke?
24 Ọ̀ bụ na ọdịnihu obi ụtọ n’elu ụwa paradaịs erughị eru maka mgbalị ma ọ bụ àjà ọ bụla ị na-achụ? O ruru ya nnọọ! Ee, Jehova echewo n’ihu gị mkpịsị ugodi nke ọdịnihu ahụ magburu onwe ya. Mkpịsị ugodi ahụ bụ ihe ọmụma Chineke. Ị̀ ga-eji ya mee ihe?
25 Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya, ị ga-enwe obi ụtọ n’ime ihe ọ na-achọ. (1 Jọn 5:3) Ka ị na-agbaso ụzọ ahụ, lee aha ngọzi ndị ị ga-enwe! Ọ bụrụ na i tinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ, ọ pụrụ iwetara gị ndụ na-enye obi ụtọ karị ọbụna n’ụwa a nke nsogbu. Ụgwọ ọrụ ndị dịkwa n’ihu buru ibu, n’ihi na nke a bụ ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi! Ugbu a bụ oge dị mma ka i mee ihe. Kpebisie ike ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ọmụma Chineke. Gosipụta ịhụnanya gị maka Jehova. Sọpụrụ aha nsọ ya ma nwapụta Setan ịbụ onye ụgha. N’aka nke ya, Jehova Chineke, bụ́ Isi Iyi nke ezi amamihe na ihe ọmụma, ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi gị n’obi ukwu ya na nke na-ahụ n’anya. (Jeremaịa 31:3; Zefanaịa 3:17) Ọ ga-ahụkwa gị n’anya ruo mgbe ebighị ebi!
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie”?
Amagedọn gasịa, gịnị ga-ewere ọnọdụ n’elu ụwa?
Ole ndị ka a ga-akpọlite n’elu ụwa?
Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ ga-esi zuo okè, e mesịakwa lee ha ule?
Gịnị bụ olileanya gị banyere Paradaịs?
[Foto dị na peeji nke 188, 189]
Ì nwere olileanya ibi n’ime Paradaịs, mgbe ihe ọmụma Chineke na-ejupụta ụwa?