Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/1 p. 4-6
  • Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe A Mụrụ Jisọs?
  • Olileanya Ha Banyere Narị Afọ Iri Ọ̀ Ga-adakpọ?
  • Ihe Oge Ya Na-erubeghị Ka Ọ̀ Bụ Ihe Oge Ya Gafeworo?
    Teta!—1999
  • 2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?
    Teta!—1998
  • Puku Afọ Nke Dị Ebube Na-abịaru Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/1 p. 4-6

Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?

Ị̀ NỤWO ka a na-ekwu na iri narị afọ nke atọ agaghị amalite n’afọ 2000 kama na ọ bụ n’afọ 2001? Nzọrọ ahụ ziri ezi—ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị ewere ya na a mụrụ Jisọs Kraịst n’ihe a maara ugbu a dị ka afọ 1 T.O.A., dị ka ụfọdụ cheburu, mgbe ahụ December 31, 2000 (ọ bụghị 1999), ga-abụ ọgwụgwụ nke iri narị afọ nke abụọ, January 1, 2000 ga-abụkwa mmalite nke iri narị afọ nke atọ.a Otú ọ dị, taa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ọkà mmụta nile kwetara na a mụghị Jisọs Kraịst n’afọ 1 T.O.A. Oleezi mgbe a mụrụ ya?

Olee Mgbe A Mụrụ Jisọs?

Bible ekpugheghị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jisọs. Otú ọ dị, o kwuru na a mụrụ ya “n’ụbọchị Herọd, bụ́ eze.” (Matiu 2:1) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Bible kwenyere na Herọd nwụrụ n’afọ 4 T.O.A. nakwa na a mụrụ Jisọs tupu mgbe ahụ—ikekwe laarị azụ n’ihe dị ka n’afọ 5 ma ọ bụ 6 T.O.A. Ha hiwere nkwubi okwu ha banyere ọnwụ Herọd isi n’ihe onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ bụ́ Flavius Josephus kwuru.b

Dị ka Josephus si kwuo, ntakịrị oge tupu Eze Herọd anwụọ, chi jiri n’ehihie. Ndị ọkà mmụta Bible na-ezo aka na chi jitụrụ n’ehihie na March 11, 4 T.O.A., dị ka ihe àmà na-egosi na ọ ghaghị ịbụ na Herọd nwụrụ n’afọ ahụ. Otú ọ dị, n’afọ 1 T.O.A., chi jiri n’ehihie kpam kpam na January 8, chi jitụkwara n’ehihie na December 27. Ọ dịghị onye pụrụ ikwu ma Josephus ọ̀ na-ezo aka n’otu n’ime chi ndị ahụ jiri n’ehihie n’afọ 1 T.O.A ka ọ bụ nke mere n’afọ 4 T.O.A. N’ihi ya, anyị apụghị iji okwu Josephus mee ihe iji kwubie afọ Herọd nwụrụ. Ọ bụrụgodị na anyị pụrụ, ma e nweghị ihe ọmụma ọzọ, anyị apụghị ikwu kpọmkwem mgbe a mụrụ Jisọs.

Ihe àmà kasịnụ anyị nwere banyere oge a mụrụ Jisọs sitere n’ime Bible. Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu na nwa nwanne nne Jisọs, bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptism, malitere ọrụ ya dị ka onye amụma n’afọ nke 15 nke ọchịchị Eze Ukwu Taịbiriọs Siza nke Rom. (Luk 3:1, 2) Akụkọ ihe mere eme na-abụghị nke okpukpe na-akwado na a kpọrọ Taịbiriọs eze ukwu na September 15, 14 O.A., ya mere afọ nke 15 ya ga-abụ malite ná ngwụsị nke afọ 28 O.A. ruo ná ngwụsị nke afọ 29 O.A. Jọn malitere ozi ya n’oge ahụ, ihe àmà gosikwara na Jisọs malitere ozi ya ọnwa isii ka e mesịrị. (Luk 1:24-31) Nke a, tinyere ihe àmà ọzọ, ga-eme ka mmalite nke ozi Jisọs bụrụ n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.A.c Bible na-ekwu na Jisọs dị ihe “dị ka [iri afọ atọ]” mgbe ọ malitere ozi ya. (Luk 3:23) Ọ bụrụ na ọ dị afọ 30 n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.A., ọ ghaghị ịbụ na a mụrụ ya n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 2 T.O.A. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị agụọ puku afọ abụọ n’ihu malite n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 2 T.O.A. (na-echeta na e nweghị afọ dị n’agbata afọ 1 T.O.A. na afọ 1 O.A; n’ihi ya, malite na 2 T.O.A. ruo na 1 O.A. bụ afọ abụọ), anyị ga-ahụ na iri narị afọ nke abụọ gwụsịrị, iri narị afọ nke atọ malitekwa n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1999!

Ọ̀ dị ihe nke ahụ mere? Dị ka ihe atụ, mmalite nke iri narị afọ nke atọ ọ̀ ga-abụ mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ Jisọs Kraịst, nke e zoro aka na ya n’akwụkwọ Mkpughe? Ee e. Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible na-egosi na e nwere njikọ dị n’agbata iri narị afọ nke atọ na Ọchịchị Puku Afọ Kraịst.

Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị megide ịkọ nkọ banyere oge. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.” (Ọrụ 1:7) Tupu mgbe ahụ, Jisọs kpughere na ọbụna ya onwe ya amaghị n’oge ahụ mgbe Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ajọ usoro ihe a, na-edozi ụzọ maka Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge awa ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.”—Matiu 24:36.

Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Kraịst ga-alọghachi kpọmkwem mgbe afọ 2,000 malite n’oge a mụrụ ya dị ka mmadụ, gasịrị? Ee e, ọ bụghị. Jisọs aghaghị ịmaworị ụbọchị a mụrụ ya. Ọ makwaara n’ezie otú ọ ga-esi gụta afọ 2,000 malite n’ụbọchị ahụ. Ma, ọ maghị ụbọchị na oge awa ọ ga-abịa. N’ụzọ doro anya, ọ gaghị adị mfe otú ahụ ikwu kpọmkwem ụbọchị ọ ga-alọghachi! ‘Oge na ụbọchị ahụ’ dị n’ike Nna ya—usoro oge bụ nanị ya ka ọ dịịrị ịma.

Ọzọkwa, Jisọs enyeghị ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha chere ya n’otu ebe kpọmkwem. Ọ gwara ha, ọ bụghị ka ha gbakọta ọnụ chere ya, kama ka ha gbasaa ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ’ ma mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kagbubeghị iwu ahụ.—Ọrụ 1:8; Matiu 28:19, 20.

Olileanya Ha Banyere Narị Afọ Iri Ọ̀ Ga-adakpọ?

Ka o sina dị, ụfọdụ bụ́ ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ́ isi nke okpukpe nwere oké atụmanya maka afọ 2000. Ha kwenyere na n’ime ọnwa ole na ole na-abịanụ, a ga-emezu akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ Mkpughe n’ụzọ nkịtị. N’ezie, ha na-ahụ onwe ha dị ka ndị na-ekere òkè ná mmezu ahụ. Dị ka ihe atụ, ha na-ezo aka n’amụma ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 11:3, 7, 8, bụ́ nke na-akọ banyere ndị àmà abụọ na-ebu amụma ‘n’obodo ukwu, bụ́ nke a na-akpọ Sọdọm na Ijipt n’ụzọ nke Mmụọ Nsọ, ebe a kpọgidekwara Onyenwe ha [n’elu osisi, NW].’ Mgbe ha gbasịrị àmà ha, anụ ọhịa ọjọọ nke si n’abyss pụta gburu ndị àmà abụọ ahụ.

Dị ka otu akụkọ dị na The New York Times Magazine nke December 27, 1998, si kwuo, onye ndú nke otu ìgwè okpukpe “agwawo ụmụazụ ya na ya bụ otu n’ime ndị àmà ahụ e kwubiworo na ha ga-ama ọkwa mbibi nke ụwa na ọbịbịa nke Onyenwe anyị—mgbe ahụ bụrụ ndị Setan ga-egbu n’okporo ámá Jerusalem.” N’ụzọ kwere nghọta, ndị ọchịchị Israel na-enwe nchegbu. Ha na-atụ ụjọ na ndị ụfọdụ na-emebiga ihe ókè pụrụ ịnwa “imezu” amụma ahụ n’onwe ha—ọ bụrụgodị na nke ahụ apụta ịkpasu agha! Otú ọ dị, Chineke achọghị “enyemaka” mmadụ iji mezuo nzube ya. A ga-emezu amụma nile Bible buru n’oge nke Chineke na n’ụzọ nke Chineke.

E dere akwụkwọ Mkpughe “n’ụzọ ihe atụ.” (NW) Dị ka Mkpughe 1:1 si kwuo, Jisọs chọrọ ikpughere “ndị ohu ya” (ọ bụghị ụwa nile) ihe ga-eme n’isi nso. Iji ghọta akwụkwọ Mkpughe, mmụọ nsọ Chineke ga-adị ndị ohu Kraịst, ma ọ bụ ụmụazụ ya mkpa, bụ́ nke Jehova na-enye ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ bụrụ na a ga-aghọta akwụkwọ Mkpughe n’ụzọ nkịtị, ọbụna ndị na-enweghị okwukwe pụrụ ịgụ ya ma ghọta ya. Mgbe ahụ ọ gaghị adị mkpa ka ndị Kraịst na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ iji ghọta ya.—Matiu 13:10-15.

Anyị ahụwo na dị ka ihe àmà sitere na Bible na-egosi, iri narị afọ nke atọ site n’oge a mụrụ Jisọs ga-amalite n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1999, nakwa na ma oge ahụ ma January 1, 2000, ma January 1, 2001, adịghị nke pụrụ iche. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere narị afọ iri nke na-adọrọ mmasị ndị Kraịst nke ukwuu. Ọ bụrụ na ọ bụghị iri narị afọ nke atọ, olee nke ọ bụ? Isiokwu ikpeazụ dị n’usoro a ga-aza ajụjụ a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee igbe isiokwu ya bụ “2000 Ka Ọ̀ Bụ 2001?” na peji nke 5.

b Dị ka usoro ọgụgụ oge nke ndị ọkà mmụta a si dị, iri narị afọ nke atọ ga-amaliteworị na 1995 ma ọ bụ 1996.

c Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko lee akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta nke 1, peji nke 1094-1095.

[Igbe dị na peeji nke 5]

2000 Ka Ọ̀ Bụ 2001?

Iji ghọta ihe mere ụfọdụ ndị ji na-ekwu na iri narị afọ nke atọ site n’oge a mụrụ Jisọs ga-amalite na January 1, 2001, tụlee ihe atụ a. Ka e were ya na ị na-agụ akwụkwọ nwere peji 200. Mgbe i ruru ná mmalite nke peji nke 200, ị gụsịwo peji 199, na-afọdụ otu peji ị ga-agụ. Ị gaghị agụsị akwụkwọ ahụ ruo mgbe i ruru ná ngwụsị nke peji nke 200. N’otu aka ahụ, afọ 999 n’ime narị afọ iri nke a, dị ka a na-ewerekarị ya, ga-agwụsịworị na December 31, 1999, na-afọdụ otu afọ tupu narị afọ iri ahụ agwụsịa. N’ịgụ ya otú ahụ, iri narị afọ nke atọ ga-amalite na January 1, 2001. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na afọ 2000 ga-akụrụ ọnụ n’oge ahụ kpọmkwem malite n’oge a mụrụ Jisọs, dị ka isiokwu a na-egosi.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Otú E Si Wepụta Usoro Ịgụ Oge nke B.C.-A.D.

Ná mmalite nke narị afọ nke isii O.A., Popu John nke Mbụ nyere otu onye mọnk aha ya bụ Dionysius Exiguus ọrụ iwepụta otu usoro ngụkọ nke ga-eme ka chọọchị dị iche iche nwee ike iyi otu oge a nabatara maka Ista.

Dionysius malitere ọrụ. Ọ gụụrụ laghachi azụ, gafere mgbe Jisọs nwụrụ, ruo n’oge o chere bụ́ afọ a mụrụ Jisọs; o nyeziri afọ nke ọ bụla nọmba malite n’oge ahụ gaa ihu. Dionysius kpọrọ oge dị malite mgbe a mụrụ Jisọs “A.D.” (maka Anno Domini—“n’afọ nke Onyenwe anyị.”) Ọ bụ ezie na o zubere nanị ichepụta ụzọ a pụrụ ịdabere na ya nke isi na-agbakọ oge Ista kwa afọ, Dionysius n’amaghị ama malitere echiche nke inye afọ ọ bụla nọmba malite n’oge a mụrụ Kraịst gaa n’ihu.

Ọ bụ ezie na ihe ka ukwuu ná ndị ọkà mmụta kwenyere na a mụghị Jisọs n’afọ ahụ Dionysius gbadoro ụkwụ wee mee ngụkọ ya, usoro ya nke ịgụ oge mere ka anyị nwee ike ịmata mgbe ihe dị iche iche mere ka oge na-aga ma hụ njikọ dị n’agbata ha na ibe ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya