Isi nke 5
Jọn Hụrụ Jisọs ahụ E Meworo Ka Ọ Dị Ebube
Ọhụụ 1—Mkpughe 1:10–3:22
Isiokwu: Jisọs na-enyocha Israel ime mmụọ nọ n’elu ala, na-enyekwa ezi agbamume
Oge mmezu ya: Akụkụ nke a nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-agbatị site na 1914 ruo mgbe onye ikpeazụ n’ime ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nwụrụ, bilitekwa n’ọnwụ
1. È si aṅaa gosi ọhụụ nke mbụ ahụ, oleekwa ụzọ Jọn si gosi oge mmezu ya nke bụ ezie?
ỌHỤỤ mbụ nke dị n’akwụkwọ Mkpughe malitere n’isi nke 1, amaokwu nke 10. Ọhụụ nke a, dị ka ndị ọzọ dị ná Mkpughe, bụ nke e meghere site n’ikwu na Jọn nụrụ ma ọ bụ hụ ihe dị ebube. (Mkpughe 1:10, 12; 4:1; 6:1) E gosiri ọhụụ nke mbụ a n’ọnọdụ yiri nke narị afọ mbụ ebe e zijeere ọgbakọ asaa ndị dị n’oge Jọn akwụkwọ ozi dị iche iche. Ma Jọn gosiri oge mmezu ya nke bụ ezie mgbe ọ sịrị: “E mere ka m nọọ n’ime mmụọ nsọ n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10a) Olee mgbe bụ ‘ụbọchị’ nke a? Oké ihe omume ndị na-eme ka ụwa maa jijiji n’oge a a nọ n’oké ọgba aghara hà nwere mmetụta ọ bụla na nke a? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ilebara amụma ahụ anya nke ọma, dị ka nke metụtara ndụ anyị—ọbụna nlanarị anyị.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:20, 21.
N’Ụbọchị Onyenwe Anyị
2. Olee mgbe ụbọchị Onyenwe anyị ahụ ga-amalite, oleekwa mgbe ọ ga-agwụsị?
2 N’oge dị aṅaa ka nke a gosiri na mmezu nke Mkpughe ga-abụ? Otú ọ dị, gịnị bụ ụbọchị Onyenwe anyị? Pọl onyeozi zoro aka na ya dị ka oge ikpe ikpe na imezu nkwa Chineke dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 1:8; 2 Ndị Kọrint 1:14; Ndị Filipaị 1:6, 10; 2:16) Mgbe ‘ụbọchị’ ahụ bịarutere, nzube ukwu nile nke Jehova na-aga n’ihu n’inwe mmeri ruo ọgwụgwụ ha. ‘Ụbọchị’ ahụ malitere mgbe e kpubere Jisọs okpueze dị ka Eze nke eluigwe. Ọbụna mgbe Jisọs mezusịrị ihe e kpere n’ikpe megide ụwa nke Setan, ụbọchị Onyenwe anyị ahụ nọgidere na-aga n’ihu, na-emezu mweghachi nke Paradaịs na ime ka ụmụ mmadụ zuo okè, ruo mgbe Jisọs ga-emesịa ‘rara alaeze ya nye n’aka Chineke, onye bụkwa Nna.’—1 Ndị Kọrint 15:24-26; Mkpughe 6:1, 2.
3. (a) Olee otú amụma Daniel banyere “oge asaa” ahụ si enyere anyị aka ịhụ mgbe ụbọchị Onyenwe anyị na-amalite? (b) Ihe dịgasị aṅaa mere n’elu ala na-akwado afọ 1914 ịbụ mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị?
3 Mmezu nke amụma Bible ndị ọzọ na-enyere anyị aka ịmata mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere. Dị ka ihe atụ, Daniel kọwara mgbutu nke ịchịisi n’usoro ọmụmụ Eze Devid; mgbe “oge asaa” gasịrị a ga-amata “na Onye ahụ nke Kachasị Ihe Nile Elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla ọ na-achọ ka ọ na-enye ya.” (Daniel 4:23, 24, 31, 32) Mmezu bụ isi nke amụma ahụ malitere mgbe e bibiri alaeze Juda, nke ihe àmà Bible gosiri na ọ bịaruru ozuzu ya n’October 607 T.O.A. Mkpughe 12:6, 14 gosiri na 3 1/2 oge pụtara 1,260 ụbọchị; n’ihi ya, oge asaa (okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ) aghaghị ịbụ 2,520 ụbọchị. N’ịgụkọ “otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ,” anyị na-enweta 2,520 afọ dị ka ogologo oge nke “oge asaa” ahụ ga-anọru. (Ezikiel 4:6) N’ihi nke a, Kraịst Jisọs malitere ọchịchị eluigwe ya n’akụkụ ikpeazụ nke 1914. Ntiwapụ nke agha ụwa mbụ n’afọ ahụ kara akara “mmalite ihe mgbu” nke nọgideworo na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Kemgbe 1914, lee nnọọ ka ihe ndị na-eme n’ime ụwa nke a ọbara tetọsịworo si na-akwado n’ụzọ pụtara ìhè na afọ ahụ bụ mmalite nke ‘ụbọchị’ nke ọnụnọ Jisọs!—Matiu 24:3-14.a
4. (a) Gịnị ka okwu dị ná Mkpughe kpọmkwem na-egosi banyere mgbe ọhụụ nke mbụ ahụ mezuru? (b) Olee mgbe mmezu nke ọhụụ mbụ ahụ na-agwụsị?
4 Ya mere, ọhụụ mbụ ahụ na ndụmọdụ ndị dị na ya bụ maka ụbọchị Onyenwe anyị, site na 1914 gaa n’ihu. A kwadoro na ọ bụ oge a ka a na-ekwu okwu banyere ya site n’eziokwu ahụ nke bụ na n’ime akwụkwọ Mkpughe, ihe ndekọ ahụ kọwara mmezu nke ikpe ziri ezi na nke ezi omume Chineke—bụ́ ihe omume ndị Onyenwe anyị Jisọs na-ekerecha òkè pụtara ìhè na ha. (Mkpughe 11:18; 16:15; 17:1; 19:2, 11) Ọ bụrụ na mmezu nke ọhụụ nke mbụ malitere na 1914, olee mgbe ọ ga-agwụsị? Dị ka akwụkwọ ozi ndị ahụ n’onwe ha na-egosi, nzukọ e degaara ha bụ ọgbakọ Chineke nke ndị e tere mmanụ nọ n’elu ala. N’ihi ya, mmezu nke ọhụụ mbụ ahụ ga-agwụsị mgbe onye ikpeazụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke so n’ọgbakọ ahụ e tere mmanụ nwụrụ wee gaa ná ndụ eluigwe. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Ụbọchị Onyenwe anyị ga-aga n’ihu iwetara atụrụ ọzọ nke ndị nọ n’elu ala ngọzi ruo ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst.—Jọn 10:16; Mkpughe 20:4, 5.
5. (a) Gịnị ka otu olu kpọrọ Jọn òkù ime? (b) N’ihi gịnị ka ebe “nzukọ Kraịst asaa” ndị ahụ dị ji mee ka ọ dị mfe izijere ha akwụkwọ mpịakọta ahụ?
5 N’ime ọhụụ mbụ nke a, tupu Jọn ahụ ihe ọ bụla, ọ dị ihe ọ nụrụ: “M wee nụ otu oké olu n’azụ m, dị ka nke opi, ka ọ na-asị, Ihe ị na-ele anya, dee ya n’akwụkwọ, zigakwara nzukọ Kraịst asaa ndị a; zigara Efesọs, zigakwara Smụana, zigakwara Pagamọm, zigakwara Taịataịra, zigakwara Sadis, zigakwara Filadelfịa, zigakwara Leọdisia.” (Mkpughe 1:10b, 11) N’iji olu dara ụda na nke inye iwu dị ka nke opi ike, otu olu kpọrọ Jọn òkù idegara “nzukọ Kraịst asaa” akwụkwọ. Ọ gaje ịnata okwu dị iche iche, depụtakwa ihe ndị ọ gaje ịhụ na ihe ndị ọ gaje ịnụ n’akwụkwọ. Rịba ama na ọgbakọ ndị ahụ a kpọtụrụ aha dị adị n’ezie n’oge Jọn. Ha nile dịcha n’Asia Minor, n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ site na Patmọs. Ọ dị mfe isi n’otu ọgbakọ ruo n’ọgbakọ ọzọ site n’ọmarịcha ụzọ ndị Rom nwere n’ógbè ahụ. Ọ gaghị esiri onye na-eje ozi ike iji akwụkwọ mpịakọta ahụ na-aga site n’otu ọgbakọ ruo n’ọgbakọ ọzọ. Ọgbakọ asaa ndị a ga-eyi otu akụkụ nke otu sekit Ndịàmà Jehova n’oge a.
6. (a) Gịnị ka ‘ihe ndị dị ugbu a’ pụtara? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọnọdụ ndị dị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ taa aghaghị iyi nke dị n’oge Jọn?
6 Ihe ka ọtụtụ n’amụma ndị dị ná Mkpughe gaje imezu mgbe oge Jọn gasịrị. Ha zoro aka ‘n’ihe ndị gaje ime mgbe ihe ndị a gasịrị.’ Ma ndụmọdụ e nyere ọgbakọ asaa ahụ metụtara ‘ihe ndị dị ugbu a,’ bụ́ ọnọdụ ndị dị adị n’ezie n’ọgbakọ asaa ndị ahụ n’oge ahụ. Ozi ndị ahụ bụrụ ihe enyemaka bara uru nye ndị okenye a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ọgbakọ asaa ndị ahụ, dịkwa ka n’ime ọgbakọ nile ọzọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ahụ.b Ebe ọ bụ na ọhụụ ahụ nwere mmezu ya bụ isi n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ihe Jisọs kwuru nọ dị ka ịdọ aka ná ntị na a ga-atụ anya inwe ọnọdụ ndị dị otú ahụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge anyị a.—Mkpughe 1:10, 19.
7. Ònye ka Jọn hụrụ n’ọhụụ mbụ nke a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa, na-akpalikwa akpali nye anyị taa?
7 N’ime ọhụụ mbụ nke a, Jọn hụrụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-enwupụ enwupụ n’ebube eluigwe Ya. Gịnị ọzọ pụrụ nnọọ ikwesị ekwesị maka akwụkwọ nke amụma ndị metụtara oké ụbọchị nke Onyenwenụ nke a, onye nataworo ikike site n’eluigwe? Gịnị pụkwara ịdị anyị mkpa karị, bụ́ ndị na-ebi ugbu a n’ime oge ahụ, na-aṅakwa ntị n’iwu ya nile? Karịsịa, lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ka e mesie ndị nile na-akwado ọbụbụeze Jehova obi ike na Mkpụrụ ahụ bụ́ Mesaịa ahụ, ebe o nweworo ntachi obi n’ọnwụnwa nile Setan wetaara ya, ebe ọ nwụwokwara ọnwụ ịta ahụhụ mgbe e chipịara “ikiri ụkwụ” Ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, dị ndụ n’eluigwe ugbu a, bụrụkwa onye e nyeworo ikike iweta nzube nile dị ebube nke Chineke ná mmezu ha nke na-enwe mmeri!—Jenesis 3:15.
8. Gịnị ka Jisọs dị njikere ime ugbu a?
8 Ihe àmà na-egosi na Jisọs adịwo njikere ugbu a ịmalite ime ihe dị ka Eze nke nọkwasịworo n’ocheeze. A họpụtawo ya dị ka Onyeisi Mbibi Ihe nke Jehova imezu ihe ikpeazụ Jehova kpere n’ikpe megide ajọ usoro ihe ochie nke a na chi ọjọọ ya, bụ́ Setan. Ọ dịkwa njikere ikpe ndị ahụ ikpe, bụ́ ndị so n’ọgbakọ ya nke ndị e tere mmanụ nakwa oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị na-esonyere ha, tinyekwara ikpe ụwa dum ikpe.—Mkpughe 7:4, 9; Ọrụ 17:31.
9. (a) Olee otú Jọn si kọwaa Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube n’etiti ihe ịdọba oriọna ndị ahụ e ji ọlaedo mee? (b) Gịnị ka e gosiri site n’ọnọdụ ebe ahụ yiri ụlọ nsọ na uwe mwụda ahụ nke Jisọs yi? (ch) Gịnị ka ihe okike ya ahụ e ji ọlaedo mee nọchiri anya ya?
9 Jọn tụgharịrị wee chee ihu n’ebe olu ahụ dị ike si adapụta, nke a bụkwa ihe ọ hụrụ: “M wee chigharịa ile olu ahụ nke na-akpanyere m ụka. Mgbe m chigharịsịrị m wee hụ ihe ịdọba oriọna asaa nke e ji ọlaedo mee.” (Mkpughe 1:12) Mgbe nke a gasịrị, Jọn nụrụ ihe ihe ịdọba oriọna asaa ndị a nọchiri anya ha. Ma ọ bụ onye nọ n’etiti ihe ịdọba oriọna ndị ahụ bụ onye dọọrọ mmasị ya. N’ebe ahụ, “n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa ahụ ahụkwara m otu onye yiri nwa nke mmadụ, onye na-eyi uwe nke ruru n’ụkwụ ala, e werewokwa ihe okike nke ọlaedo kee n’obi ya gburugburu.” (Mkpughe 1:13) Jisọs, bụ́ “nwa nke mmadụ” ahụ, na-egosipụta onwe ya n’ebe a n’ihu onyeàmà nke a na-ahụ ihe dị ịtụnanya, bụ́ Jọn, dị ka ihe oyiyi dị ebube nke na-egbukepu egbukepu. A na-ahụ ya n’ebube na-enwupụ enwupụ n’etiti ihe ịdọba oriọna ahụ e ji ọlaedo mee, bụ́ ndị na-enwu ọkụ. Ọnọdụ nke a nke yiri ụlọ nsọ mere ka Jọn ghọtakwuo eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs nọ n’ọnọdụ nke ịbụ Onyeisi Nchụàjà nke Jehova, na-enwe ike ikpe ikpe. (Ndị Hibru 4:14; 7:21-25) Uwe ogologo ya dị ebube kwekọrọ n’ọnọdụ ya dị ka onye nchụàjà. Dị ka ndị nchụàjà nke ndị Juu oge ochie, ọ na-eyi ihe okike—ihe okike e ji ọlaedo mee nke e kekwasịrị n’obi ya ebe o kpuchiri mkpụrụ obi ya. Nke a na-egosi na ọ ga-eji obi ya nile jezuo ozi nsọ nke ọ natara n’aka Jehova Chineke.—Ọpụpụ 28:8, 30; Ndị Hibru 8:1, 2.
10. (a) Gịnị ka agịrị isi Jisọs nke dị ọcha dị ka snow na anya ya nke na-enwu enwu ka ire ọkụ na-egosi? (b) Gịnị ka ụkwụ Jisọs iyi ọla na-egbukepụ egbukepụ na-egosi?
10 Nkọwa Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “Isi ya na agịrị isi ya dịkwa ọcha dị ka ajị anụ ọcha, dị ka snow; anya ya abụọ dịkwa ka ire ọkụ.” (Mkpughe 1:14) Agịrị isi ya nke dị ọcha dị ka snow na-egosi amamihe nke sitere n’ogologo ndụ ọ dịworo. (Tụlee Ilu 16:31.) Anya nke na-enwu enwu dị ka ire ọkụ na-egosi na ọ dị nkọ, mụrụ anya, ka ọ na-enyocha ihe, na-anwale ihe, ma ọ bụ na-egosipụta ọnụma. Ọbụna ụkwụ Jisọs dọrọkwara mmasị Jọn: “Ụkwụ ya abụọ dịkwa ka ọla a kwọchapụrụ ka o gbupụ, dị ka à ga-asị na e rere ya rịị n’oké ọkụ; olu ya dịkwa ka olu ọtụtụ mmiri.” (Mkpughe 1:15) N’ọhụụ ahụ, ụkwụ Jisọs dị ka ọla, na-egbukepụ egbukepụ, dị ọcha—nke kwesịrị ekwesị ịdị otú ahụ maka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ije, na-enwekwa ọnọdụ dị mma n’ebe Jehova Chineke nọ. Karịsịa, ebe ọ bụ na a na-ejikarị ọlaedo na-ese onyinyo ihe ndị metụtara Chineke n’ime Bible, otú ahụ ka a na-eji ọla na-ese onyinyo ihe ndị metụtara mmadụ.c N’ihi nke a, ụkwụ Jisọs nke na-egbukepụ egbukepụ dị ka ọla a kwọchapụrụ nke ọma na-echetara anyị otú ụkwụ Jisọs “si maa mma nke ukwuu” mgbe o jegharịrị n’elu ala ikwusa ozi ọma ahụ.—Aịsaịa 52:7; Ndị Rom 10:15.
11. (a) Gịnị ka ụkwụ dị ebube nke Jisọs na-echetara anyị? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na olu Jisọs ‘dị ka olu ọtụtụ mmiri’ na-egosi?
11 N’ezie, dị ka mmadụ zuru okè, Jisọs na-enwupụ enwupụ n’ụzọ pụtara ìhè nye ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ. (Jọn 1:14) Ụkwụ ya dị ebube na-echetakwara anyị na ọ na-eje ije n’elu ala dị nsọ n’ime nzukọ Jehova, nke ọ bụ Onyeisi Nchụàjà n’ime ya. (Tụlee Ọpụpụ 3:5.) Ọzọkwa, olu ya na-ada oké ụda dị ka oké mmiri nke si n’elu na-eruda n’ala. Ọ dị ukwuu, na-akpali egwu, dị ka o kwesịrị ịdị banyere onye ahụ a kpọrọ Okwu Chineke, onye ga-abịa ‘ikpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume.’—Ọrụ 17:31; Jọn 1:1.
12. Gịnị ka “mma agha dị nkọ nke nwere ihu abụọ” na-egosi?
12 “O nwekwara kpakpando asaa n’aka nri ya: mma agha dị nkọ nke nwere ihu abụọ na-esikwa n’ọnụ ya pụta: ihu ya dịkwa ka anyanwụ na-amụ n’ike ya. Mgbe m hụrụ ya, m wee daa n’ala n’ụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ.” (Mkpughe 1:16, 17a) N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, Jisọs n’onwe ya kọwara ihe kpakpando asaa ndị ahụ pụtara. Ma rịba ama ihe si n’ọnụ ya pụta: “mma agha dị nkọ nke nwere ihu abụọ.” Lee nnọọ ihe kwesịrị ekwesị nke a bụ! N’ihi na ọ bụ Jisọs ka a họpụtara ịkpọsa ihe ikpeazụ Jehova kpere n’ikpe megide ndị iro Ya. Okwu mkpebi ikpe ndị si n’ọnụ ya na-apụta na-arụpụta mbibi nye ndị ajọ mmadụ nile.—Mkpughe 19:13, 15.
13. (a) Gịnị ka ihu Jisọs nke na-egbukepụ egbukepụ na-echetara anyị? (b) Gịnị bụ nchịkọta nke mmetụta anyị na-enweta site ná nkọwa Jọn kọwara Jisọs?
13 Ihu Jisọs nke na-egbukepụ egbukepụ na-echetara anyị na ihu Mosis na-enwupụ enwupụ mgbe ya na Jehova kparịtasịrị ụka n’elu Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 34:29, 30) Chetakwa na mgbe e nwoghara Jisọs n’ihu ndị ozi ya atọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, “ihu ya wee na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya nile wee na-acha ọcha dị ka ìhè.” (Matiu 17:2) Ugbu a, ná ngosi e gosiri Jisọs n’ọhụụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ihu ya na-egosipụtakwa otu mgbukepụ ahụ nke a na-ahụ n’ihu onye nọworo n’ihu Jehova. (2 Ndị Kọrint 3:18) N’eziokwu, mmetụta bụ isi nke ọhụụ Jọn na-enye bụ nke oké mgbukepụ nke ebube. Site n’agịrị isi nke dị ọcha dị ka snow, anya nke na-enwu enwu dị ka ire ọkụ, na ihu nke na-egbukepụ egbukepụ wee ruo n’ụkwụ ya nke na-egbu mara mara, ọ bụ ọhụụ na-enweghị atụ nke Onye ahụ nke na-ebi ugbu a “n’ime ìhè nke a na-apụghị ịbịaru nso.” (1 Timoti 6:16) Ịbụ ezie nke ihe a ọ hụrụ gbara nnọọ ọkpụrụkpụ! Olee otú Jọn ahụ oké egwu ji si meghachi omume? Onyeozi ahụ na-agwa anyị, sị: “Mgbe m hụrụ ya, m wee daa n’ala n’ụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ.”—Mkpughe 1:17.
14. Olee ụzọ o kwesịrị isi metụta anyị mgbe anyị na-agụ ọhụụ Jọn banyere Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube?
14 Taa, nkọwa ọma nile nke ọhụụ Jọn na-eme ka ndị Chineke nwee obi ekele sitere n’ala ala obi. Ka ọ dị ugbu a, anyị agabigaworị ihe karịrị 90 afọ nke ụbọchị Onyenwe anyị, bụ́ mgbe ọhụụ ahụ na-aga n’ihu n’inwe mmezu ya na-akpali akpali. Ọchịchị Alaeze Jisọs bụ ihe dị adị n’ezie nye anyị, ọ bụghị olileanya ọdịnihu. N’ihi ya, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nye anyị, dị ka ndị nwere obi umeala Alaeze ahụ ga-achị, ilepụ anya gaa n’ihu n’ihe dị ebube nke Jọn kọwara n’ọhụụ mbụ nke a, jirikwa nrubeisi gee ntị n’okwu nile nke Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube.d
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 88-92, 215-218, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
b N’ime narị afọ mbụ, mgbe otu ọgbakọ natara akwụkwọ ozi site n’aka onyeozi, ihe a na-emekarị bụ ime ka akwụkwọ ozi ahụ rute ọgbakọ ndị ọzọ aka ka ha nile wee rite uru site na ndụmọdụ ahụ.—Tụlee Ndị Kọlọsi 4:16.
c E ji ọlaedo mee ma ọ bụ jiri ya kpuchite ihe ndị e ji chọọ ime ụlọ nsọ nke Solomọn mma, ebe e ji ọla mee ihe n’ịchọ gburugburu ogige ahụ mma.—1 Ndị Eze 6:19-23, 28-35; 7:15, 16, 27, 30, 38-50; 8:64.
d Maka nkọwa zuru ezu, lee peji 128-139, 186-189 nke akwụkwọ bụ “Ka Alaeze Gị Bịa,” nke ndị bipụtara akwụkwọ a na-ekesa.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ihe ndị e gwupụtara n’ala n’obodo ndị ahụ ebe e nwere ọgbakọ asaa ahụ kwadoro ihe ndekọ Bible. Ọ bụ n’ebe a ka ndị Kraịst nke narị afọ mbụ natara akwụkwọ ozi agbamume Jisọs ziteere ha, bụ́ ozi ndị na-akpali ọgbakọ a zuru ụwa ọnụ
PAGAMỌM
SMỤANA
TAỊATAỊRA
SADIS
EFESỌS
FILADELFỊA
LEỌDISIA