Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/15 p. 13-19
  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mmadụ Pụrụ Ịghọ Ndị Udo
  • Ndị Na-agbaso Udo
  • Mgbanwe Ka Nnọọ Ukwuu
  • Ịchịisi Site n’Aka Onyeisi Udo
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/15 p. 13-19

Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!

“Onye ahụ nke na-achọ ịhụ ndụ n’anya, . . . ya sikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya, mee ezi ihe; ya chọọ udo, gbasookwa ya.”—1 PITA 3:10, 11.

1. Okwu dị aṅaa a ma ama nke Aịsaịa ka e ji n’aka na ọ ghaghị imezu?

“HA GA-AKPỤGHARỊKWA mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Ọ bụ ezie na e depụtara akụkụ akwụkwọ nsọ a a ma ama na nso isi ụlọ ọrụ ụwa nke Mba Ndị Dị n’Otu na New York City, òtù ụwa ahụ emezubeghị ya n’ụzọ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche. Otú ọ dị, dị ka akụkụ nke okwu Jehova Chineke na-adịghị ada ada, nkwupụta okwu ahụ agaghị adị n’enweghị ihe si na ya pụta.—Aịsaịa 55:10, 11.

2. Gịnị ga-emerịrị “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” n’ikwekọ n’Aịsaịa 2:2, 3?

2 Okwu ndị a na-achọta n’Aịsaịa 2:4 bụ n’ezie akụkụ nke otu amụma dị ebube, amụma banyere ezi udo—ọ na-emezukwa n’oge anyị kpọmkwem. Tupu ọ kpọsaa olileanya ahụ na-akpali akpali nke enwekwaghị agha na ngwá agha, amụma ahụ na-asị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile: n’ihi na Zaịọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jerusalem pụta.”—Aịsaịa 2:2, 3.

Ndị Mmadụ Pụrụ Ịghọ Ndị Udo

3. Olee otú mmadụ pụrụ isi gbanwee site n’ịbụ onye na-alụ ọgụ gaa n’ịbụ onye udo?

3 Rịba ama na tupu ndị mmadụ enwe ike ịgbaso ụzọ udo, ha aghaghị ibu ụzọ bụrụ ndị e ziri ihe n’ụzọ Jehova. Nzaghachi nrubeisi nye nkụzi Jehova pụrụ ịgbanwe ụzọ mmadụ si eche echiche ma na-eme omume, nke na onye bụbu onye na-alụ ọgụ na-aghọ onye udo. Olee otú e si emezu mgbanwe nke a? Ndị Rom 12:2 na-asị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” Anyị na-eme ka uche anyị bụrụ ihe ọhụrụ, ma ọ bụ kpalie ya gaa n’ụzọ dị iche, site n’iji ụkpụrụ na iwu sitere n’Okwu Chineke mejuo ya. Ịmụchi Bible anya na-enyere anyị aka ime mgbanwe nke a, ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ịnwapụtara onwe anyị ihe bụ uche Jehova maka anyị, ka anyị wee nwee ike ịhụ nke ọma ụzọ anyị na-aghaghị ịga.—Abụ Ọma 119:105.

4. Olee otú mmadụ si eyikwasị mmadụ ọhụrụ nke udo?

4 Eziokwu Bible na-agbanwe ọ bụghị nanị ụzọ iche echiche anyị kamakwa omume na ụdị ndị anyị bụ. Ọ na-enyere anyị aka ime ihe Pọl onyeozi gbara ume ya: “Tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị; . . . ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu, . . . yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:22-24) Mmụọ nke uche ahụ dị n’ime. A na-agbanwe ya, o wee dị ike ka ịhụnanya anyị maka Jehova na iwu ya na-eto eto, ọ na-emekwa anyị mmadụ ime mmụọ na ndị dị n’udo.

5. Olee otú “iwu ọhụrụ” Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya si atụnye ụtụ n’udo dị n’etiti ha?

5 A na-ahụ mkpa maka mgbanwe a site ná ntụziaka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’ime hour ndị ikpeazụ ya na ha nọ: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:34, 35) Ịhụnanya a yiri nke Kraịst, nke na-achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-ejikọ ndị ahụ na-eso ụzọ ọnụ n’ịdị n’otu zuru okè. (Ndị Kọlọsi 3:14) Nanị ndị dị njikere ịnakwere na ịdị ndụ kwekọrọ ‘n’iwu ọhụrụ’ a ga-enwe udo nke Chineke na-ekwe ná nkwa. È nwere ndị na-eme nke a taa?

6. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji enwe udo, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị ụwa nọ?

6 Ndịàmà Jehova na-agbalị igosi ịhụnanya n’òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ ezie na e si ná mba nile nke ụwa dọta ha, ha adịghị etinye aka n’esemokwu dị iche iche nke ụwa, ọbụna mgbe e mere ka ha nọrọ n’okpuru nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe siri ike. Dị ka ndị dị n’otu, ha bụ ndị mmụta Jehova, ha nwekwara udo. (Aịsaịa 54:13) Ha na-anọpụ iche n’ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha adịghịkwa ekere òkè n’agha. Ụfọdụ ndị na-emebu ihe ike akwụsịwo ụzọ ndụ ahụ. Ha aghọwo ndị Kraịst hụrụ udo n’anya, na-eṅomi ihe nlereanya nke Kraịst Jisọs. Ha jikwa obi ha nile na-agbaso okwu ndụmọdụ Pita: “Onye ahụ nke na-achọ ịhụ ndụ n’anya, na ịhụ ezi ụbọchị, ya mee ka ire ya ghara ikwu ihe ọjọọ, meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ: ya sikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya, mee ezi ihe; ya chọọ udo, gbasookwa ya.”—1 Pita 3:10, 11; Ndị Efesọs 4:3.

Ndị Na-agbaso Udo

7, 8. Nye ihe atụ nke ndị kwụsịrị ịlụ agha ma ghọọ ndị na-achọ ezi udo. (Kọọ ndị ọzọ i nwere ike ịma banyere ha.)

7 Dị ka ihe atụ, e nwere Rami Oved, onye bụbu ọfịsa n’otu òtù ndị agha pụrụ iche maka igbochi iyi ọha egwu. A zụrụ ya igbu ndị iro ya. O kwenyesiri ike n’ịhụ mba ya bụ́ Israel n’anya ruo ụbọchị ọ chọpụtara na ndị rabaị achọghị ka ọ lụọ nwanyị ọ hụrụ n’anya nanị n’ihi na nwanyị ahụ bụ onye Esia, onye Jentaịl. Ọ malitere ịchọ eziokwu n’ime Bible. Mgbe ahụ o zutere Ndịàmà Jehova. Ọmụmụ Bible ya na Ndịàmà nwere mere ka o kweta na ọ pụghị ịnọgide na-abụ onye ji ịnụ ọkụ n’obi gabigara ókè na-ahụ mba n’anya. Ịhụnanya ndị Kraịst pụtara ịhapụ agha na ngwá agha na ịmụta ịhụ ndị agbụrụ nile n’anya. Lee ka o si ju ya anya mgbe ọ natara otu akwụkwọ ozi obiọma nke nwere okwu mmalite bụ́, “Nwanna M Rami”! Gịnị bụ oké ihe dị na nke ahụ? Onye dere ya bụ Onyeàmà bụ́ onye Palestine. “Echere m na nke ahụ siri ike ikweta,” ka Rami na-ekwu, “ebe ndị Palestine bụ ndị iro m, ugbu a kwa otu n’ime ha na-akpọ m ‘Nwanna M.’” Rami na nwunye ya na-agbaso ezi udo ugbu a n’ụzọ Chineke.

8 Ihe atụ ọzọ bụ nke Georg Reuter, bụ́ onye jere ozi n’usuu ndị agha Germany nke wakporo Russia n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. O mesịrị nwee obi ilu n’oké atụmatụ Hitler nwere maka ịchị ụwa. Mgbe o si n’agha ahụ lọta, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. O dere, sị: “N’ikpeazụ, ihe malitere ido m anya. Aghọtara m na Chineke abụghị onye a ga-ata ụta maka nkwafu ọbara nile ahụ . . . Amụtara m na ọ bụ nzube ya iguzobe paradaịs zuru ụwa ọnụ nke nwere ngọzi ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. . . . Hitler etuwo ọnụ banyere ‘Ọchịchị Puku Afọ’ ya ma ọ chịwo nanị ruo [afọ] 12—leekwa oké ihe ọjọọ ọ rụpụtara! Ọ bụghị Hitler kama Kraịst . . . bụ onye pụrụ, ọ ga-eguzobekwa ọchịchị puku afọ n’elu ụwa.” Eri ihe dị ka afọ 50 ugbu a, Georg anọwo na-eje ozi dị ka onye ozi nke ezi udo n’ozi oge nile.

9. Olee otú ahụmahụ Ndịàmà Jehova na Nazi Germany si anwapụta na ha nwere obi ike ma bụrụ ndị udo?

9 Iguzosi ike n’ezi ihe na nnọpụiche Ndịàmà Jehova na Germany n’oge ọchịchị ndị Nazi nọgidere na-abụ ihe akaebe nye ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ na maka udo ọbụna ugbu a, mgbe ihe karịrị afọ 50 gasịrị. Otu akwụkwọ nta nke Ebe Ndebe Ihe Ncheta Oké Mgbukpọ nke United States dị na Washington, D.C., bipụtara, kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova diri mkpagbu siri ike n’okpuru ọchịchị ndị Nazi. . . . Obi ike nke ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ gosipụtara n’ịghara ikweta [ịjụ okpukpe ha], n’agbanyeghị ịta ahụhụ, mmekpọ ọnụ n’ogige ịta ahụhụ, na mgbe ụfọdụ ogbugbu, nwetaara ha nkwanye ùgwù nke ọtụtụ ndị ọgbọ ha.” Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “N’oge ntọhapụ ogige ndị ahụ, Ndịàmà Jehova gara n’ihu n’ọrụ ha, na-aga n’etiti ndị lanarịrịnụ, na-atọghata ndị mmadụ.”

Mgbanwe Ka Nnọọ Ukwuu

10. (a) Mgbanwe ukwu dị aṅaa dị mkpa iji mee ka ezi udo bịa? (b) Olee otú e si see onyinyo nke a n’akwụkwọ Daniel?

10 Nke a ọ̀ pụtara na Ndịàmà Jehova kwere na ha pụrụ iweta udo n’ụwa nile site ná ntọghata nke ìgwè mmadụ gaa n’ikweta ná nnọpụiche ndị Kraịst? Ee e! Iji weghachite udo n’ụwa, mgbanwe ka nnọọ ukwuu dị mkpa. Gịnị ka ọ bụ? Ịchịisi mmadụ na-akpagbu akpagbu, na-akpata nkewa, na nke na-eme ihe ike aghaghị inyere ịchịisi site n’Alaeze Chineke ohere, bụ́ nke Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ya. (Matiu 6:9, 10) Ma olee otú nke ahụ ga-esi were ọnọdụ? Ná nrọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, Daniel onye amụma hụrụ na na mgbe ikpeazụ, Alaeze Chineke, dị ka nkume buru ibu “a na-ejighị aka waa,” ga-akụpịa otu nnukwu ihe oyiyi na-anọchite anya usoro ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ụwa. Mgbe ahụ ọ kpọsara, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:31-44.

11. Site n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-eweta mgbanwe dị mkpa maka udo?

11 Gịnị mere oké mgbanwe nke a n’ihe omume ụwa ga-eji were ọnọdụ? N’ihi na Jehova ekwewo nkwa na ọ ga-ehichapụ n’ụwa ndị nile na-emetọ ma na-ebibi ya. (Mkpughe 11:18) Mgbanwe nke a ga-ewere ọnọdụ n’agha ezi omume Jehova megide Setan na ụwa ajọ omume ya. Anyị na-agụ ná Mkpughe 16:14, 16, sị: “Ha [ya bụ, okwu ndị mmụọ na-adịghị ọcha] bụ mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ, na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche; ndị na-apụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile. Ha wee mee ka ha zukọọ n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn.”

12. Gịnị ka Amagedọn ga-adị ka ya?

12 Gịnị ka Amagedọn ga-adị ka ya? Ọ gaghị abụ apọkalips nuklia ma ọ bụ ọdachi nke ụmụ mmadụ na-akpalite. Ee e, ọ bụ agha Chineke iji kwụsị agha nile nke ụmụ mmadụ ma bibie ndị nile na-akwalite agha ndị dị otú ahụ. Ọ bụ agha Chineke iji weta ezi udo maka ndị hụrụ udo n’anya. Ee, Amagedọn na-abịa dị ka Jehova zubeworo. Ọ gaghị egbu oge. E nyere onye amụma ya bụ́ Habakuk ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) N’ihi echiche anyị dị ka mmadụ, ọ pụrụ ime ka o yie ihe na-anọ ọdụ, ma Jehova na-agbaso usoro ihe omume ya. Amagedọn ga-etiwapụ n’oge hour nke Jehova buworo ụzọ kaa aka.

13. Olee otú Chineke ga-esi mesoo onye omempụ ahụ n’onwe ya, bụ́ Setan Ekwensu?

13 Ihe omume ikpeazụ a ga-akwadebe ụzọ maka ezi udo! Ma ka e guzobe ezi udo n’ụzọ siri ike, e nwere ihe ọzọ a na-aghaghị ime—mwepụ nke onye ahụ na-akpata nkewa, ịkpọasị, na esemokwu. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe ọzọ Bible na-ebu amụma na ọ ga-ewere ọnọdụ—ịtụba Setan n’abyss, bụ́ onye na-akpasu agha na nna ụgha. Jọn onyeozi hụrụ ihe omume a n’ọhụụ amụma, dị ka e dekọrọ ná Mkpughe 20:1-3: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ, ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị.”

14. Olee otú a pụrụ isi kọwaa mmeri Jehova ga-emeri Setan?

14 Nke a abụghị nrọ; ọ bụ nkwa Chineke—Bible na-ekwukwa, sị, ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) N’ihi ya Jehova pụrụ ikwu site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa: n’ihi na ihe ndị a atọwo m ụtọ; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Jeremaịa 9:24) Jehova na-eme ihe n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, udo ọ ga-eweta n’ụwa na-atọkwa ya ụtọ.

Ịchịisi Site n’Aka Onyeisi Udo

15, 16. (a) Ònye ka Jehova họpụtara ịchị dị ka Eze? (b) Olee otú e si kọwaa ịchịisi ahụ, olee ndị ga-ekerekwa òkè na ya?

15 Iji jide n’aka na ezi udo ga-abịara ndị nile na-ebi n’okpuru ndokwa Alaeze ya, Jehova enyewo ịchịisi ya n’aka ezi Onyeisi Udo, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 9:6, 7: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ Dike, Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ. . . . Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” Ọbụ abụ ahụ dekwara n’ụzọ amụma banyere ịchịisi udo nke Mesaịa ahụ, sị: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7.

16 Ọzọkwa, ụmụnna Kraịst 144,000 e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ga-eso ya na-achị n’eluigwe. Ndị a bụ ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe bụ́ ndị Pọl dere banyere ha, sị: “Ma Chineke nke udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu ọsọ ọsọ. Amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu.” (Ndị Rom 16:20) Ee, ndị a ga-ekere òkè site n’eluigwe ná mmeri Kraịst n’isi onye ahụ na-akpalite agha, bụ́ Setan Ekwensu!

17. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji keta ezi udo?

17 Ya mere ugbu a ajụjụ bụ, Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji keta ezi udo? Ezi udo pụrụ ịbịa nanị site n’ụzọ nke Chineke, ijikwa nweta ya ị ghaghị iwere nzọụkwụ ndị dị mma. Ị ghaghị ịnakwere Onyeisi Udo ahụ ma chigharịkwuru ya. Nke a pụtara na ị ghaghị ịnakwere Kraịst n’ọkwá ya dị ka Onye Mgbapụta na Onye Nnapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. Jisọs n’onwe ya kwuru okwu ndị ahụ a ma ama, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ị̀ dị njikere igosipụta okwukwe na Kraịst Jisọs dị ka Onye Ozi Chineke maka iweta ezi udo na nzọpụta? E nweghị aha ọzọ n’okpuru eluigwe nke pụrụ iweta udo ma nye mmesi obi ike maka ya. (Ndị Filipaị 2:8-11) N’ihi gịnị? N’ihi na Jisọs bụ Onye Chineke Họpụtara. Ọ bụ onye ozi udo kasịnụ dịtụworo ndụ n’ụwa. Ị̀ ga-ege Jisọs ntị ma gbasoo ihe nlereanya ya?

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ná nzaghachi nye okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Jọn 17:3?

18 “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ugbu a bụ oge inweta ezi ihe ọmụma site n’ijechi nzukọ nke Ndịàmà Jehova anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nzukọ nkụzi ndị a ga-akpali gị isoro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma gị na olileanya gị. Gị onwe gị kwa pụrụ ịghọ onye ozi maka udo Chineke. Ị pụrụ inwe udo ugbu a site n’ịtụkwasị Jehova Chineke obi, dị ka e kwuru n’Aịsaịa 26:3, dị ka New International Version si sụgharịa ya: “Ị ga-edebe n’udo zuru okè onye ahụ uche ya na-eguzosi ike, n’ihi na ọ na-atụkwasị gị obi.” N’ònye ka i kwesịrị ịtụkwasị obi? “Tụkwasịnụ Jehova obi, ruo mgbe nile, n’ihi na Ja Jehova bụ Nkume nke mgbe nile ebighị ebi.”—Aịsaịa 26:4.

19, 20. Gịnị na-echere ndị na-achọ udo ma na-agbaso ya taa?

19 Were nguzo gị maka ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ udo nke Chineke. Ná Mkpughe 21:3, 4, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” Nke ahụ ọ́ bụghị ọdịnihu udo nke na-agụsi gị agụụ ike?

20 Mgbe ahụ cheta ihe Chineke kweworo ná nkwa. “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Rịba ndị zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo.” (Abụ Ọma 37:11, 37) Mgbe ụbọchị obi ụtọ ahụ bịara, ka anyị jiri obi ekele sị, “Ezi udo n’ikpeazụ! Ekele dịrị Jehova Chineke, isi iyi nke ezi udo!”

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị pụrụ inyere mmadụ aka ime mgbanwe n’echiche na n’omume?

◻ Olee otú Ndịàmà Jehova, n’otu n’otu na n’ìgwè, siworo gosipụta ịhụnanya ha maka ezi udo?

◻ Olee otú Jehova ga-esi mesoo ndị nile na-akwalite ịkpọasị na agha?

◻ Gịnị ka ịchịisi nke Onyeisi Udo ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

A na-emezu okwu Aịsaịa, ọ bụghị site n’aka òtù UN, kama site n’aka ndị na-anara nkụzi Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ndị ikom abụọ a mere mgbanwe dị iche iche iji gbasoo udo

Rami Oved

Georg Reuter

[Foto dị na peeji nke 16]

Ezi udo ga-ejupụta n’okpuru ịchịisi nke Onyeisi Udo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya