Isi 3
Okpukpe Nile nke Ụwa Hà Na-enye Nduzi Ziri Ezi?
1. Ajụjụ dịgasị aṅaa dị mkpa banyere okpukpe nile nke ụwa ka e welitere n’ebe a?
“OKPUKPE abụwo otu n’ime ihe ndị na-akpalikarị ndị mmadụ n’akụkọ ihe mere eme,”28 ka The World Book Encyclopedia kwuru. Ma okpukpe nile nke ụwa hà abụwo ike ziri ezi na-akwali ndị mmadụ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? Hà akụziworo ndị òtù ha na ịhụnanya nwanne kwesịrị ịgafe ókèala mba na ịdị iche nile nke agbụrụ? Ọzọ, chọọchị nile nke Krisendọm, Katọlik, Protestant na Orthodox, hà ekwekọwo n’ezie n’ihe ha na-ekwu nke bụ na ha na-eso ụzọ Jisọs Kraịst dị ka “Onyeisi Udo”? Ka ọ̀ bụ na ha etinyewo ihe n’ezie n’ịkpọ asị nke na-eyi ọdịnihu mmadụ egwu? Ile anya n’ihe ndekọ e nwere ga-enye azịza na-eju anya.
2. Gịnị ka ihe akụkọ dị iche iche na-agwa anyị banyere ihe ndekọ ihe mere eme?
2 Banyere nke a, Parade Magazine kwuru, sị: “Akụkọ ihe mere eme na-akụziri ndị chọrọ ịmụrụ akọ ihe. Otu n’ime ihe mmụta ndị bụ isi bụ na esemokwu ndị dabeere n’okpukpe na ịrọ òtù dị iche iche ọtụtụ mgbe na-abụkarị ndị kasị njọ, ndị na-adịte anya ma sikarịa ike idozi.”29 Dịkwa ka Chicago Tribune kwuru, sị: “Okpukpe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ na-ekwusa udo na ịbụ nwanne na ebere, ma e mere ụfọdụ n’ime ihe ndị jọkarịsịrị njọ na nke e kweghị ndị ọzọ nọrọ n’akụkọ ihe mere eme n’aha Chineke.”30 N’iburu ụdị akụkọ ziri ezi ndị a nke ihe mere eme n’uche, onye editọ akwụkwọ akụkọ bụ C. L. Sulzberger jụrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “N’agbanyeghị na ndị mmadụ agaghị achọ ikwere ya, ọ̀ bụ na e kwesịghị ịghọta na tinyere ihe ndị ọzọ na-akpata ha—ọchịchị nchịgbu, ịkpa ókè agbụrụ, ibu agha—na okpukpe aghọwo ihe na-anọgide na-eyi ndụ mmadụ egwu karị?”31
3. Omume ihere dị aṅaa nke okpukpe ka akụkọ ihe mere eme nke narị afọ iri abụọ nke anyị na-ekpughe?
3 Ee, e ji mwụfu ọbara nke ọgba aghara okpukpe kwadoro mee ka akụkọ ihe mere eme jupụta ná ntụpọ. Nanị na narị afọ anyị a, n’oge agha ụwa abụọ ahụ na mgbe ha gasịrị, anyị ahụwo omume ihe ihere nke ndị òtù okpukpe igburita ibe ha—ndị Katọlik na-egbu ndị Katọlik, ndị Protestant na-egbu ndị Protestant, ndị Alakụba na-egbu ndị Alakụba, na ndị ọzọ. Ndị ndú okpukpe kwa n’akụkụ ndị na-emegiderịta onwe ha, ọ bụ ezie na ha bụ ndị òtù nke otu okpukpe, na-agọzi ndị agha ndị, mgbe na-adịghị anya, ga na-egbu ndị ụmụnna ha nke otu okpukpe.
4. (a) Gịnị mere a ga-eji takarịa chọọchị nile nke Krisendọm ụta? (b) Gịnị ka otu ihe odide akwụkwọ akụkọ kwuru banyere agha?
4 N’etiti ndị ụta dịkarịsịịrị n’okwu a bụ chọọchị nile nke Krisendọm. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-azọrọ na ha na-anọchi anya Chineke nke Bible na Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, onye sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ma, ọ bụ n’ala ndị Krisendọm ka e gbukarịsịrị ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ. Dị ka otu ihe odide e dere na Waterloo Courier nke Iowa kwupụtara, sị: “O mebeghịkwa ndị Kristian ihere mgbe ọ bụla ịlụso ndị Kristian ndị ọzọ agha. Ọ bụrụ na o mewo ha, agaraghị alụ agha ndị dịkarịsịrị ilu a lụrụ na Europe. . . . A pụghị inweworị Agha Ụwa nke Mbụ na nke Abụọ, bụ́ ndị guzobere ihe ndekọ kasị elu ruo ugbu a nke ndị Kristian igbu ndị Kristian.”32
5. (a) Gịnị ka Bible gwara ndị na-efe Chineke n’ezie n’ụzọ doro anya? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ndị òtù chọọchị dị iche iche na-aghaghị iche ihu banyere chọọchị nke ha?
5 Banyere okwu a, Bible na-edo anya: A gwara ndị na-efe Chineke n’ezie ka ha “chọọ udo, gbasookwa ya,” ka ha ‘kpụgharịakwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma òge,’ na ka ha ghara ‘ịmụtakwa agha ọzọ.’ (1 Pita 3:11; Aịsaịa 2:2-4) “Ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: ọ bụghị dị ka Ken si bụrụ onye si n’ajọ onye ahụ [Setan bụ Ekwensu] pụta, wee gbuo nwanne ya.” (1 Jọn 3:10-12) Ma ndị na-eso okpukpe nile nke ụwa nọgidere na-egbu ụmụnna ha, dị ka Ken mere, ndị ndú ha akwadowokwa ndị na-eme ihe dị otú ahụ. N’ihi nke ahụ, ọ bụrụ na i so n’otu okpukpe, jụọ onwe gị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ụwa sonyeere okpukpe m, à gaara akwụsịwo agha, ụwa nke a kwa ọ̀ ga-aghọwo ebe ezi udo dị ugbu a?’
6. Gịnị ka ọnọdụ e kewasịrị ekewasị na nke ịlụ agha nke okpukpe nile nke ụwa na-egosipụta?
6 Ọnọdụ e kewara ekewa na nke ibu agha nke okpukpe nile nke ụwa gosipụtara na ọ bụghị Chineke na-akwado ha. Nke a pụrụ ịbụ ihe ijuanya nye ndị na-eche na okpukpe nile aghaghị ịdị mma ebe ha na-azọrọ na ha na-anọchi anya Chineke. Ma Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) O gosikwara na e nwere ma ezi okpukpe na okpukpe ụgha. O kwukwara na nanị okpukpe nke dabeere n’eziokwu, nke ihu abụọ na-adịghị na ya, ka Chineke na-akwado.—Matiu 15:7-9; Jọn 4:23, 24; Taịtọs 1:16.
7. (a) Okwu dị aṅaa ka Bible ji kọwaa okpukpe nile nke ụwa? (b) Gịnị ka a sịrị na ha mere?
7 Ebe okpukpe nile nke ụwa, n’ihi nke a, agbawo akwụna n’ihi uru ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Bible na-ese onyinyo ya dị ka nwanyị na-akwa iko. Ka ọ na-akọwa nwanyị a “na-akwa iko,” ọ sịrị: “Ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke . . . ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 17:1-6; 18:24) Ee, okpukpe nile nke ụwa na-ebu oké ikpe ọmụma ọbara metụta ogbugbu nile nke ụmụ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa! N’ihi nke a, ha ga-aza ajụjụ ihe ha mere.
8. Olee otú okwu Jisọs banyere “ndị ndú kpụrụ ìsì” si nwee mmetụta taa?
8 Dị ka o doro anya, okpukpe ọ bụla nke ihe omume ya na-emegide Bible apụghị ịga nke ọma ma ọlị n’iduga ụmụ mmadụ gaa n’ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ọ bụ ya mere Jisọs ji kwuo banyere ndị ndú okpukpe ụgha n’ụbọchị ya, sị: “Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.” (Matiu 15:14) N’otu aka ahụ, okpukpe nile nke ụwa taa bụ “ndị ndú kpuru ìsì” n’ihe metụtara agha nakwa n’akụkụ ndị ọzọ ndị dị mkpa nke ndụ.
Okpukpe Nile Nke Ụwa Hà Na-akwalite Omume Ọma?
9, 10. (a) Gịnị kpatara ijigide ezi ụkpụrụ omume ọma ji dị mkpa maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? (b) Dị ka a kụziri na Bible, gịnị na-akwali ụdị omume ọma ahụ?
9 Ọ̀ dị onye ọ bụla ya na ndị agbata obi ya pụrụ inwe ezi udo ma ọ bụ ezi ịnọ ná ntụkwasị obi ma ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ụkpụrụ nke omume? Ebe a na-enweghị ụdị ụkpụrụ ndị dị otú ahụ, ịgha ụgha, izu ohi, ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, na omume ndị yiri ha na-ejupụta n’ebe nile. N’aka nke ọzọ, ezi ịhụnanya nke onye agbata obi kwesịrị ịkwalite omume ọma.
10 Bible kọwapụtara otú Chineke si ele omume ọma anya n’ụzọ dị otú a: “N’ihi na onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu. N’ihi na okwu a, Akwala iko, Egbula mmadụ, Ezula ohi, Agụụ ihe ọjọọ agụla gị, ọ bụrụkwa na ihe ọ bụla ọzọ dị e nyere n’iwu, a chịkọtara ya n’okwu a, bụ́ Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ịhụnanya adịghị arụ ọrụ ọjọọ n’ebe onye agbata obi ya nọ.”—Ndị Rom 13:8-10.
11, 12. (a) Onye na-adịghị ejigide ụkpụrụ omume ọma ọ̀ ga-ele anya na ya na Chineke ga-adị n’udo? (b) Ònye na-eguzobe ụkpụrụ ndị ahụ dị ka o kwesịrị?
11 Otú ọ dị, dị ka ihe ka mkpa karịa ihe ndị a, ì kwere na mmadụ na Chineke pụrụ ịdị n’udo, na-ejide n’aka inweta ihu ọma na nchebe Ya, ma ọ bụrụ na ọ dịghị eme ihe n’ụzọ ụkpụrụ omume ọma Chineke? Ị̀ ga-asọpụrụ ụdị Chineke nke na-achọghị ụdị ụkpụrụ omume ahụ site n’aka ndị sịrị na ha na-efe ya?
12 Ka Chineke wee chọọ ka a gbasoo ụkpụrụ ya nile, ọ ghaghị ime ka o doo anya ihe ụkpụrụ ndị ahụ bụ. Nke ahụ ka o meworo n’Okwu ya bụ Bible. (2 Timoti 3:16, 17) Ezi uche adịghị n’ikwu ka onye ọ bụla mebe ụkpụrụ omume nke ya ma were ha mee ihe dị ka ọ na-adịghị n’ikwu ka onye ọ bụla mebe usoro iwu okporo ụzọ nke ya ma jiri ha na-eme ihe. Ị maara ihe ga-esi na ya pụta. Bible ji ezi ịrụ ụka gosi na e nwere nanị otu ụzọ nke inweta nkwado Chineke. Dị ka Jisọs kwuru, ụzọ nile ndị ọzọ na-eduba nanị n’ịla n’iyi.—Matiu 7:13, 14; Luk 13:24.
13-15. (a) Olee ajụjụ ndị metụtara omume ka ọ dị mkpa ka a jụọ banyere ndị òtù nke chọọchị mmadụ na-eje? (b) Gịnị ka Bible kwuru na a ga-eme banyere onye òtù ọgbakọ nke nọgidere na-emebi iwu Chineke? (ch) À na-eme nke a na chọọchị dị iche iche?
13 Karịsịa, chọọchị nile nke Krisendọm hà na-ejigidesi ụkpụrụ nile nke omume nke Chineke ike wee si otú ahụ na-eguzobe ihe nlereanya nye ndị ọzọ nile nke ụwa? Gịnị ka ndụ nke ọtụtụ ndị so na chọọchị ndị ahụ na-egosipụta? Ị̀ nọ n’otu chọọchị? Ngwa jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ụwa ebie ndụ dị ka ndị chọọchị m, nke ahụ ọ̀ ga-akwụsị imempụ, omume akwụbaghị aka ọtọ n’azụmahịa, ibu iro, na mmekọahụ rụrụ arụ?’
14 Bible na-adọ aka ná ntị na “ihe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum” nakwa na “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (Ndị Galetia 5:9; 1 Ndị Kọrint 15:33) N’ihi nke a, o nyekwara ndị Kraịst iwu ka ha “na onye ọ bụla nke a na-akpọ ya aha na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye anya ukwu, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye nkwutọ, ma ọ bụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe; ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe. . . . Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti unu.”—1 Ndị Kọrint 5:11-13.
15 N’eziokwu, mmadụ pụrụ ịzọhie ụkwụ ma mesịa ghọta onwe ya. Ma gịnị banyere ndị ihe ndị dị otú ahụ bụ omume ha? Ọ bụrụ na ndị a na-ekwu na ha na-efe Chineke, ha bụ ndị ihu abụọ. Kpọmkwem, ị kpọrọ ihu abụọ asị, Bible na-egosi na Chineke kpọkwara ya na ndị na-eme ya asị. (Matiu 23:27, 28; Ndị Rom 12:9) Gịnịkwa banyere okpukpe gị? Ọ̀ na-agbaso iwu Bible nke sịrị “wepụnụ” ndị nọgidere na-emebi iwu Chineke ma ghara ịdị na-egosipụta nchegharị ziri ezi? Ka ọ̀ na-ekwere ka ndị dị otú ahụ nọgide n’ọnọdụ dị mma, si otú ahụ na-etinye ndị ọzọ n’ihe ize ndụ? Ò ji nanị egbugbere ọnụ na-ekwu maka omume ọma, ebe n’ezie, ọ na-elefuru ihe ọjọọ anya, ma ọ bụ ọbụna na-akwado ya?—Matiu 15:7, 8.
16. (a) Gịnị ka ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-ekwu banyere omume mmekọahụ? (b) Gịnị ka Bible kwuru banyere ụdị omume ahụ?
16 Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ndú okpukpe na-asị na ịkwa iko nke ndị lụrụ na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, na mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị adịchaghị nnọọ njọ. Ma ha adịghị ekwekọ n’echiche Chineke. Okwu ya sịrị n’ụzọ doro anya: “Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anya ukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Ihe Ịjụ Okwu Chineke Na-akpata
17-19. (a) Olee otú onyeozi bụ Pọl si lee Bible anya? (b) Olee otú ọtụtụ ndị ndú okpukpe n’oge a si ele Bible anya?
17 Ihe bụ isi kpatara okpukpe nile nke ụwa a ji nọrọ n’ọnọdụ e kewara ekewa, nke na-agba aghara otu a, bụ na ha na-elefuru iwu nile nke Chineke dị ka ha dị n’Okwu ya, bụ́ Bible, anya. N’ezie, ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-ajụ Bible dị ka Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ma, Pọl e nyere ike mmụọ nsọ kwupụtara, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Pọl gbakwara anyị ume ka anyị nakwere Bible ‘ọ bụghị dị ka okwu mmadụ . . . kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) N’ezie Jehova Chineke, Onye Okike Pụrụ Ime Ihe Nile nke eluigwe na ala dị ịtụnanya, pụrụ ide akwụkwọ wee hụ na a gwagbughị ya n’ọtụtụ narị afọ!
18 Ma, New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe e dere na Bible abụghị nnọọ eziokwu ma a tụnyere ya ihe ọmụma nke dị ugbu a nke sayensi na nke akụkọ ihe mere eme.”39 Ka ọ na-ede ihe na U.S. Catholic, otu ụkọchukwu kwuru na okike ụwa apụghị ịbụworị otú e si kọwaa ya na Jenesis. Banyekwara ihe ndekọ ya nke okike mmadụ, ọ sịrị: “Agbụrụ ụmụ mmadụ esighị otú ahụ malite.”40 Otu onye bishọp nke Episcopal kwuru, sị: “Ọtụtụ ndehie ihe, akụkọ na-ezighị ezi, ihe ndị na-emegide onwe ha jupụtara na Bible. Ya mere o kwere nghọta ihe kpatara na chọọchị nile ndị bụ isi ji ghara ịdị na-ele Bible anya dị ka ihe a na-apụghị ịrụ ụka.”41 N’England, otu Bishọp nke chọọchị Anglican zoro aka ná mbilite n’ọnwụ Kraịst dị ka “aghụghọ dị nkọ e ji ọkpụkpụ wee ghọọ.”42
19 N’ụzọ dị otú a, ma ọ̀ bụghị na ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-ewetu Bible ala ọ bụrụ na ha adịghị akụziri ndị na-eso ụzọ ha ka ha na-asọpụrụ ya ma na-agbaso iwu Chineke ndị dị na ya. Nke ahụ bụ ihe bụ isi kpatara ilefuru Okwu Chineke anya n’ụzọ jọrọ njọ na Krisendọm nile. Onye akụkọ banyere okpukpe bụ M. J. McManus dere nke a banyere ndị na-aga chọọchị: “Ihe ole na ole na-eme n’okpukpe na-eyi egwu imebi okpukpe a haziri ahazi n’afọ ndị 1980 dị ka ọnọdụ ihere nke ihe ọmụma Bible na-eme.” O hotara na “Bible anọgidewo na-abụ akwụkwọ a na-adịghị agụ nke si ofesi” nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-aga chọọchị.43
20, 21. Gịnị ka ịjụ ozizi nile nke Bible rụpụtaworo?
20 Gịnị ka ihe ndị a nile kpataworo? Okpukpe nile nke ụwa hà egosipụtawo na ha pụrụ imerụ ozizi nile nke Bible ma ka nweta udo ma ọ bụ omume ọma n’etiti ndị òtù ha? N’ụzọ na-emegide nke ahụ, ọnọdụ nile na-adịwanye njọ gburugburu ụwa. Mba ndị nwere okpukpe na-abụghị nke ndị Kristian na-aghọwanye ọgbọ nke aghara, nkewa, ịrụ arụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na mmetọ omume ọma na-akawanye njọ. Ma karịsịa Krisendọm kemgbe ogologo oge aghọwo nke kasị nwee imempụ, omume rụrụ arụ, iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ, ịkpa ókè agbụrụ na agha. O mewo nnọọ dị ka Okwu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, sị: “Okwu Jehova ka ha jụworo; ọ̀ bụkwa aha amamihe gịnị ka ha nwere?”—Jeremaịa 8:9.
21 A pụghị ịgọnarị ihe àmà ahụ. O gosiri na okpukpe nile nke ụwa abụghị ike mkpali ziri ezi maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ha ahapụwokwa ndị na-eso ụzọ ha n’enweghị ihe ọmụma nke ezi olileanya ahụ—bụ́ Alaeze Chineke. Ya mere, gịnị ka ihe a nile na-egosipụta?
Ọgwụgwụ nke Okpukpe Nile nke Ụwa Dị Nso
22, 23. Gịnị ka Bible kwuru ga-abịakwasị okpukpe ụgha nile nke ụwa?
22 Jisọs Kraịst kwuru, sị: “A ga-efopụ ihe ọkụkụ ọ bụla nke Nna m nke eluigwe na-akụghị.” (Matiu 15:13) Mkpụrụ ọjọọ nke okpukpe nile nke ụwa na-amị na-egosipụta na ọ bụghị Chineke kụrụ ha. N’ihi nke a, Bible buru amụma mbibi na-abịa nke usoro okpukpe ụgha nile.
23 Ka ọ na-ekwu banyere usoro okpukpe nile ndị a n’okpuru ihe atụ bụ “Babilọn Ukwu ahụ” dị ka nwanyị na-akwa iko, Chineke kwuru ihe ndị a sonụ banyere alaeze ụwa nke okpukpe ụgha: “Mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile . . . n’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ́ [Jehova, NW] Chineke, onye kpere ya ikpe.”—Mkpughe 18:2, 5-8.
24. Olee otú mbibi dị otú ahụ ga-esi bịa, sitekwa n’ole ebe?
24 Rịba ama na mbibi a ga-eji oké mberede bịa, dị ka ọ bụ “n’otu ụbọchị.” N’ijuanya na mmechuihu nke ọtụtụ ndị mmadụ, a ga-eme ka okpukpe ụgha laa n’iyi, bibie ya, site n’aka ndị ọchịchị mba nile ndị ya na ha kwaworo iko eri ogologo oge.—Mkpughe 18:10-17, 21; 17:12, 16.
25. (a) Ná Mkpughe 18:4, gịnị ka a gbara ndị chọrọ nkwado Chineke ume ka ha mee? (b) Gịnị kwesịrị ịkwali mmadụ ime ụdị ihe ahụ?
25 Ya mere, òkù Chineke na-akpọ bụ: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” (Mkpughe 18:4) Ime ihe dị otú ahụ pụtara na mmadụ na-ahụ okpukpe ụgha dị ka Chineke si ahụ ya. Ọ pụtara na mmadụ na-akpọ ya asị n’ihi mkpụrụ ọjọọ ya nile, ihu abụọ ya, na nkwenkwe ụgha ya nile. E kwesịrị ịkpọ asị ụzọ okpukpe ụgha siworo nọchie anya Chineke n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihu ụmụ mmadụ na ụzọ o siworo na-etinye ihe n’ịta ahụhụ na mmegbu nke ndị mmadụ. (Ndị Rom 2:24; Jeremaịa 23:21, 22) Ọ bụrụ na ị ghọta nke a, ị ga-esere onwe gị pụọ n’inye ụdị okpukpe ndị dị otú ahụ nkwado ọ bụla, wee si otú a na-egosipụta nkwado gị zuru ezu maka ikpe Chineke mara ha.
26. (a) Tinyere nke ahụ, gịnị ka mmadụ na-aghaghị ịchọta ma ọ bụrụ na ọ ga-enweta udo na nchebe Chineke? (b) Ụdị ndị dị aṅaa ka mmadụ kwesịrị ịdị na-achọ mgbe ọ na-achọ ịchọta ndị na-efe ezi ofufe?
26 Otú ọ dị, nanị isepụ aka ezughị. Ị ghaghị ịchọpụta ma chọta nke bụ ezi okpukpe, nke ihu abụọ na-adịghị na ya, nke ga-ewetara gị udo na nchebe nke Chineke mgbe mbibi e buru amụma bịara. Ndị na-esonye n’ụdị ezi ofufe dị otú ahụ aghaghị ịbụ ndị ‘kpụgharịworo mma agha ha ka ha bụrụ mma ògè, ndị na-adịghị amụta agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:4) Ha aghaghị ịbụ ndị mmadụ ndị kwere n’Okwu Chineke ma na-ebi ndụ kwekọrọ na ya, na-ekwe ka ọ bụrụ ike na-eduzi ha ná ndụ ha. (Abụ Ọma 119:105) Ha aghaghị igosi ịhụnanya ziri ezi, nke ihu abụọ na-adịghị ya maka mmadụ ibe ha. (Jọn 13:35; Ndị Rom 13:8) È nwere ụdị ofufe dị otú ahụ taa? Ọtụtụ achọtawo ya n’etiti Ndịàmà Jehova. A maara ha n’ụwa nile n’ihi ịrapagidesi ike n’iwu nile nke Chineke dị ka a hụrụ ha na Bible. Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ha na-enwekwa ọbụna ugbu a na-akpọsa eziokwu na ike nke Okwu Chineke.
27. Olee ihe mbụ ị ga-achọpụta n’onwe gị site n’ịbịa nzukọ Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha?
27 Ndịàmà Jehova na-echegbu onwe ha nke ukwuu banyere ọnọdụ ihe ize ndụ nke okpukpe ụgha wetaworo ụmụ mmadụ na ya. Ha ji obi ziri ezi na-agbalị inye Okwu Chineke ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. A na-akpọ gị òkù ịbịa kirie nzukọ ha nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha n’ógbè gị ma chọpụtara onwe gị ókè nke ha na-egosipụta mmụọ Chineke ma nwee udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ọ na-eweta. Ị ga-ahụkwa otú ha si amụta ma na-etinye n’ọrụ ihe Chineke chọrọ n’aka ndị ga-alanarị mbibi na-abịa ma biri ndụ n’Usoro Ihe Ọhụrụ nke ezi omume ya n’okpuru ịchịisi Alaeze eluigwe ya.
Igbe dị na peeji nke 29]
Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ndú okpukpe na-anakwere ihe Bible megidere dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, dị ka isi akụkọ na ihe akụkọ ndị a na-egosi:
“Mgbe Ihe Bụ Ihe Ọjọọ Ghọrọ Ihe Ọma Ndị Ndú Okpukpe Ga-agwa Anyị.” “[Chọọchị nke England] na-ahapụ echiche ha mbụ nke ọchịchị aka ike. A ga-anabata site n’ugbu a gaa n’ihu . . . isoro otu onye ma ọ bụ karịa nwee mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye dị ka omume ọma.”—Alberta Report.33
“Ndị Pastọ Na-agbachi Nkịtị n’Inwe Mmekọahụ Tupu A lụọ Di ma ọ bụ Nwunye.” “Ndị pastọ nke America ná mmehie agbachiwo nkịtị ikwusa megide mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye . . . Egwu na-atụ ha na ha ga-atụfu ụfọdụ ndị chọọchị ha. Aịsaịa maara maka ụdị ndị ụkọchukwu dị otú ahụ. N’isi 1 nke akwụkwọ ya, o hotara Onyenwe anyị ka ọ na-ekwu banyere ha, sị: ‘M ga-ezonarị unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.’”—Telegraph, North Platte, Nebraska.34
“Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Di na Nwunye Abụkwaghị Oké Ihe Ọjọọ.” “O juru ndị isi chọọchị anya mgbe onyendú chọọchị Bekee ahụ kwupụtara ụzọ ile ihe anya na-ezighị ezi banyere Iwu nke Asaa. . . . ‘Omume anyị bụ nke nlekọta anya, ọ bụghị nke ịma ikpe,’ ka ọ sịrị.”—The Sunday Times, Perth, Australia.35
“Chọọchị Unitarian Akwado Ọlụlụ Di na Nwunye nke Nwoke na Nwoke.”—The New York Times.36
“Òtù ndị ọrụ nke United Church of Canada akwadowo ichi ndị ọ pụtara ìhè na ha na-enwe mmekọahụ nwoke na nwoke echichi dị ka ndị ozi chọọchị.”—The Toronto Star.37
“Kwado Ịgba Akwụna n’Iwu—Ọ Bụ Ụzọ Ngwọta Dị Nsọ.”—Ihe odide pụrụ iche nke akwụkwọ akụkọ nke otu onye ọrụ Katọlik dere na Philadelphia Daily News.38
[Foto dị na peeji nke 25]
Ndị ndú okpukpe emewo ka aka ha jupụta ná mwụfu ọbara site n’ịkwado ndị ọchịchị nchịgbu