Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 37 p. 267-271
  • Iru Újú na Ịṅụrị Ọṅụ ná Mbibi nke Babilọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iru Újú na Ịṅụrị Ọṅụ ná Mbibi nke Babilọn
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ahịa Na-akwa Ákwá, Na-erukwa Újú
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Mkpochapụ Ya
  • Ịtụ Otu Oké Nkume Igwe Nri
  • Ikpe Ọmụma Ọbara Dị Egwu
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 37 p. 267-271

Isi nke 37

Iru Újú na Ịṅụrị Ọṅụ ná Mbibi nke Babilọn

1. Olee otú “ndị eze ụwa” ga-esi meghachi omume ná mbibi mberede nke Babilọn Ukwu ahụ?

MBIBI nke Babilọn bụ ozi ọma nye ndị Jehova, ma olee ụzọ mba nile si ele ya anya? Jọn na-agwa anyị, sị: “Ndị eze ụwa, ndị sooro ya kwaa iko nupụkwa isi, ha ga-akwakwara ya ákwá, tiekwara ya aka n’obi, mgbe ha ga-ele anwụrụ ọkụ nke orire ọkụ ya anya, ka ha na-eguzo n’ebe dị anya n’ihi egwu nke mmekpa ahụ ya, na-asị, Ahụhụ, ahụhụ, obodo ukwu ahụ, Babilọn, bụ́ obodo ahụ dị ike! n’ihi na n’otu oge hour ka ikpe gị bịara.”—Mkpughe 18:9, 10.

2. (a) Ebe ọ bụ mpi iri ihe atụ nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ, gịnị mere “ndị eze ụwa” ga-eji ruoro mbibi ya újú? (b) N’ihi gịnị ka ndị eze ahụ na-eru újú ga-eji guzoro n’ebe dị anya site n’obodo ahụ nke dakpọworo adakpọ?

2 Mmeghachi omume nke mba nile pụrụ iyi ihe ịtụnanya n’iburu eziokwu ahụ n’uche nke bụ́ na ọ bụ mpi iri ihe atụ nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie bibiri Babilọn. (Mkpughe 17:16) Ma mgbe e bibisịrị Babilọn, ihe àmà na-egosi na “ndị eze ụwa” ga-aghọta otú o si baara ha uru n’ime ka ndị mmadụ nọrọ duu, dookwa onwe ha n’okpuru. Ndị ndú okpukpe ekwuwo na agha dị iche iche bụ ihe ndị dị nsọ, rụọ ọrụ dị ka ndị na-ahọpụta ndị mmadụ ije agha, kwuokwa okwu ndị kpaliri ndị na-eto eto ịbanye n’ibu agha. Okpukpe enyewo ihe mkpuchi nke ịdị nsọ nke ndị ọchịchị rụrụ arụ zoworo n’okpuru ya wee na-eme ihe n’imegbu ndị nkịtị. (Tụlee Jeremaịa 5:30, 31; Matiu 23:27, 28.) Otú ọ dị, rịba ama na ndị eze ahụ nọ na-eru oké újú guzozi ugbu a n’ebe dị anya site n’obodo ahụ dakpọworo adakpọ. Ha adịghị abịa nso ruo n’ókè ịbịa nyere ya aka. Ọ na-ewute ha na e bibiri ya, ma o wuterughị ha n’ókè nke itinye onwe ha n’ihe ize ndụ n’ihi ya.

Ndị Ahịa Na-akwa Ákwá, Na-erukwa Újú

3. Olee ndị ọzọ ọ na-ewute bụ́ ngabiga nke Babilọn Ukwu ahụ, gịnịkwa ka Jọn sị na ọ bụ ya kpatara nke a?

3 Ọ bụghị nanị ndị eze ụwa ka ngabiga nke Babilọn Ukwu ahụ na-ewute. “Ndị ahịa nke ụwa na-akwakwara ya ákwá, na-erukwara ya újú, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-azụ ihe ahịa ha ọzọ, bụ́ nke ha na-eweta n’ụgbọ ha; ihe ahịa ọlaedo, na ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà odo odo, na nkịsị, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bụla na-esi ísì ụtọ, na ihe nile ọ bụla e ji ọdụ́ mee, na ihe nile ọ bụla e ji osisi dịkarịsịrị oké ọnụ ahịa, ma ọ bụ ọla, ma ọ bụ ígwè, ma ọ bụ marble, mee; na cinnamon, na amomum, na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na mmanụ otite, na frankincense, na mmanya vine, na mmanụ, na ụtụ ọka, na ọka, na anụ ụlọ, na atụrụ; na ihe ahịa nke bụ ịnyịnya na ụgbọ ala na ahụ mmadụ; na mkpụrụ obi mmadụ. Mkpụrụ osisi nile nke na-agụ mkpụrụ obi gị apụwo n’ebe ị [Babilọn Ukwu ahụ] nọ, ihe nile na-atọ ụtọ nke makwara mma apụwokwa n’aka gị laa n’iyi, mmadụ agaghị ahụkwa ha ọzọ ma ọlị.”—Mkpughe 18:11-14.

4. N’ihi gịnị ka “ndị ahịa” ji na-akwa ákwá, na-erukwa újú maka ọgwụgwụ nke Babilọn Ukwu ahụ?

4 Ee, Babilọn Ukwu ahụ bụ ezi enyi na ezi onye ahịa nke ndị ahịa bara ọgaranya. Dị ka ihe atụ, ụlọ ọzụzụ ndị mọnk, nke ndị nọn, na ụlọ chọọchị dị iche iche dị na Krisendọm anọwo eri ọtụtụ narị afọ na-akwakọba ọlaedo, ọlaọcha, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, osisi ndị dị oké ọnụ ahịa, na ụdị ihe onwunwe ndị ọzọ dị iche iche n’ebe ọ dị ukwuu. Ọzọkwa, ngọzi okpukpe adịkwasịwo oké azụmazụ na oké ịṅụ mmanya ndị na-ewe ego dị ukwuu, ndị ha na ememe ahụ na-adịghị enye Kraịst nsọpụrụ bụ́ Krismas na ihe ndị ọzọ a kpọrọ ụbọchị nsọ dị iche iche na-eso aga. Ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm abanyewo n’ala dị iche iche dị anya, na-emeghe ahịa ndị ọhụrụ nye “ndị ahịa” nke ụwa nke a. N’ime Japan nke narị afọ nke 17, ọbụna na okpukpe Katọlik, nke kpọ ndị ahịa bịa, tinyere aka ná mburịta agha ndị e ji azọ ala. Mgbe ọ na-akọ ihe banyere otu nnukwute agha e buru n’okpuru mgbidi nke ụlọ ukwu Osaka, akwụkwọ bụ The Encyclopædia Britannica kọrọ, si: “Usuu ndị agha nke Tokugawa hụrụ na ndị ha na-ebuso agha bụ ndị iro nke bu ọkọlọtọ e sere obé na ihe oyiyi dị iche iche nke Onye Nzọpụta ahụ na Senti James, bụ́ senti na-elekọta Spain.” Akụkụ meriri n’agha ahụ kpagburu, fọdụkwa nke nta ka ha kpochapụ okpukpe Katọlik ná mba ahụ. N’otu aka ahụ, òkè chọọchị na-ekere n’ihe omume nke ụwa taa agaghịkwa ewetara ya ngọzi ọ bụla.

5. (a) Olee otú olu ahụ sitere n’eluigwe si gaa n’ihu ịkọwa iru újú nke “ndị ahịa” ahụ? (b) Ọ̀ bụ gịnị mere ndị ahịa ahụ ji ‘guzoro n’ebe dị anya’?

5 Olu ahụ nke sitere n’eluigwe gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị ahịa ndị na-azụ ihe ndị a, ndị bụrụrụ ọgaranya site na ya, ha ga-eguzo n’ebe dị anya n’ihi egwu nke mmekpa ahụ ya, na-akwa ákwá, na-erukwa újú; na-asị, Ahụhụ, ahụhụ, obodo ukwu ahụ, nke e gbokwasịworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà na-acha ọbara ọbara na ákwà uhie, nke e werewokwara ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na pearl kee ya! N’ihi na n’otu oge hour e mere ka oké akụ dị otú a tọgbọ n’efu.” (Mkpughe 18:15-17a) Mgbe e bibiri Babilọn Ukwu ahụ, “ndị ahịa” ahụ na-eru újú na onye ahịa dị otú a funarịrị ha. N’eziokwu, ọ bụ “ahụhụ, ahụhụ” nye ha. Ma, rịba ama na ihe mere ha ji na-eru újú bụ ọchịchọ nke onwe ha nanị, na, ha—dịkwa ka ndị eze ahụ—“ga-eguzo n’ebe dị anya.” Ha adịghị abịa nso ruo n’ókè inyere Babilọn Ukwu ahụ aka ọ bụla.

6. Olee ụzọ olu ahụ sitere n’eluigwe si kọwaa iru újú nke ndị isi ụgbọ na ndị ọrụ ụgbọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ha ji na-akwa ákwá?

6 Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ịkọ, sị: “Ndị isi ụgbọ nile n’otu n’otu, na onye ọ bụla nke na-eje n’ebe ọ bụla n’ụgbọ, na ndị ụgbọ, ka ha hàkwa, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ime oké osimiri, ha guzokwara n’ebe dị anya, tiekwa mkpu mgbe ha na-ele anwụrụ ọkụ nke orire ọkụ ya anya, sị, Obodo gịnị yiri obodo ukwu a? Ha wee kpokwasị ájá n’isi ha, tiekwa mkpu, na-akwa ákwá, na-erukwa újú, sị, Ahụhụ, ahụhụ, obodo ukwu ahụ, nke ndị nile ndị nwere ụgbọ ha n’oké osimiri bụrụ ọgaranya n’ime ya site n’ibi obi ya dị oké ọnụ ahịa! N’ihi na n’otu oge hour ka e mere ka ọ tọgbọ n’efu.” (Mkpughe 18:17b-19) Babilọn oge ochie bụ obodo azụmahịa, o nwekwara ìgwè ụgbọ mmiri. N’otu aka ahụ, Babilọn Ukwu ahụ ji “ọtụtụ mmiri” nke ndị ya na-azụ ahịa. Nke a na-eme ka ọtụtụ ndị nọ n’okpukpe ya dị iche iche nwee ọrụ ha ga na-arụ. Lee nnọọ oké ihe otiti mbibi Babilọn Ukwu ahụ ga-abụrụ ndị a n’ụzọ akụ na ụba! Ọ dịghị ebe ọ bụla ọzọ a pụrụ iji tụnyere ya ha ga-esi na-achọta ihe ha ga-eri.

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Mkpochapụ Ya

7, 8. Olee ụzọ olu ahụ sitere n’eluigwe si mechie ozi ya banyere Babilọn Ukwu ahụ, oleekwa ndị ga-emeghachi omume n’okwu ndị ahụ?

7 Mgbe a kwaturu Babilọn oge ochie site n’aka ndị Midia na ndị Peasia, Jeremaịa kwuru n’ụzọ amụma, sị: “Eluigwe na ụwa na ihe nile nke dị n’ime ha ewee tie mkpu ọṅụ banyere Babilọn.” (Jeremaịa 51:48) Mgbe e bibiri Babilọn Ukwu ahụ, olu ahụ sitere n’eluigwe na-eweta ozi ya ná njedebe, na-ekwu banyere Babilọn Ukwu ahụ, sị: “Ka obi na-atọ gị ụtọ n’isi ya, gị eluigwe, na unu ndị nsọ, na unu ndị ozi, na unu ndị amụma; n’ihi na Chineke kpere ikpe unu n’ahụ ya.” (Mkpughe 18:20) Ọ ga-atọ Jehova na ndị mmụọ ozi ụtọ ịhụ mbibi nke onye iro ahụ nke Chineke malite n’oge ochie, otú ahụkwa ka ọ ga-adị ndị ozi na ndị Kraịst bụ́ ndị amụma n’oge ochie, ndị a ga-akpọliteworị mgbe ahụ, ndị ga-ewerewokwarị ọnọdụ ha ná ndokwa nke ndị okenye 24 ndị ahụ.—Tụlee Abụ Ọma 97:8-12.

8 N’eziokwu, “ndị nsọ” nile—ma à kpọlitewo ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe ma ọ bụ na ha ka dị ndụ n’elu ala—ga-eti mkpu ọṅụ, dịkwa ka oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ, ndị so ha. Mgbe oge na-aga, a ga-akpọlite ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie ịbata n’ime usoro ihe ọhụrụ ahụ, ha ga-esonyekwa n’ịṅụrị ọṅụ. Ndị Chineke anwabeghị ịbọrọ onwe ha ọ́bọ̀ megide ndị okpukpe ụgha na-akpagbu ha. Ha echetawo okwu Jehova, nke bụ́: “Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka [Jehova, NW] kwuru.” (Ndị Rom 12:19; Deuterọnọmi 32:35, 41-43) Ee, Jehova akwụghachiwo ụgwọ ugbu a. A ga-abọworị ọ́bọ̀ ọbara nile Babilọn Ukwu ahụ wụfuworo.

Ịtụ Otu Oké Nkume Igwe Nri

9, 10. (a) Gịnị ka otu mmụọ ozi dị ike mere ugbu a, kwuokwa? (b) Olee ihe omume yiri nke ahụ mmụọ ozi ahụ dị ike nke Mkpughe 18:21 mere weere ọnọdụ n’oge Jeremaịa, gịnịkwa ka o mesiri obi ike banyere ya? (ch) Gịnị ka ihe omume nke mmụọ ozi ahụ dị ike nke Jọn hụrụ mere, mesiri obi ike banyere ya?

9 Ihe ọzọ Jọn hụrụ na-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ́ na ikpe Jehova megide Babilọn Ukwu ahụ enweghị mmekwata: “Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị.” (Mkpughe 18:21) N’oge Jeremaịa, e mekwara ihe yiri nke a nke nwere ihe siri ike ọ pụtara n’ụzọ amụma. Mmụọ nsọ kpaliri Jeremaịa idetu “ihe ọjọọ ahụ nile nke ga-abịaru Babilọn ahụ” n’akwụkwọ. O nyere Seraịa akwụkwọ ahụ wee gwa ya ka o jee Babilọn. N’ebe ahụ, n’ịgbaso ntụziaka nile nke Jeremaịa, Seraịa gụpụtara nkwupụta okwu megide obodo ahụ, sị: “Jehova, gị onwe gị ekwuwo okwu banyere ebe a ibipụ ya, ka ihe ọ bụla wee ghara ibi n’ime ya, ma ọ bụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ, n’ihi na ebe tọgbọrọ n’efu mgbe ebighị ebi ka ọ ga-abụ.” Mgbe ahụ, Seraịa kekọtara otu nkume na akwụkwọ ahụ wee tụba ya n’ime osimiri Yufretis, na-asị: “Otú a ka Babilọn ga-emikpu, ghara ibili ọzọ n’ihi ihe ọjọọ ahụ nke mụ onwe m gaje ime ka ọ bịakwasị ya.”—Jeremaịa 51:59-64.

10 Ntụba a tụbara akwụkwọ ahụ na nkume ahụ e kegidere ya n’ime osimiri ahụ bụ ihe na-emesi obi ike na Babilọn ga-emikpu ruo ebe a na-apụghị ịhụkwa ya anya ọzọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ ọ ga-ebilikwa. Ọhụhụ Jọn onyeozi hụrụ mmụọ ozi dị ike ka o mere ihe yiri nke ahụ bụkwa oké ihe na-emesi obi ike na a gaje imezu nzube Jehova n’ebe Babilọn Ukwu ahụ dị. Ọnọdụ mbibi zuru ezu nke Babilọn oge ochie na-agba àmà n’ụzọ siri ike taa banyere ihe gaje ịdakwasị okpukpe ụgha n’isi nso.

11, 12. (a) Olee ụzọ mmụọ ozi ahụ dị ike si gwa Babilọn Ukwu ahụ okwu ugbu a? (b) Jeremaịa si aṅaa buo amụma banyere Jerusalem ahụ nke dapụworo n’ezi ofufe, gịnịkwa ka o sere onyinyo ya maka oge anyị a?

11 Mmụọ ozi ahụ dị ike chere Babilọn Ukwu ahụ ihu ugbu a, na-asị: “A gaghị anụkwa olu ndị na-akpọ ụbọ akwara na ndị na-akpọ ụbọ ọzọ na ndị na-egbu ọjà na ndị na-afụ opi n’ime gị ọzọ ma ọlị; a gaghị ahụkwa onye ọkà ọ bụla, nke na-eme nkà ọ bụla, n’ime gị ọzọ ma ọlị; a gaghị anụkwa olu nke nkume igwe nri n’ime gị ọzọ ma ọlị; ìhè nke oriọna agaghị enwukwa n’ime gị ọzọ ma ọlị; a gaghị anụkwa olu nke onye na-alu nwunye ọhụrụ na nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime gị ọzọ ma ọlị: n’ihi na ndị ahịa gị bụrịị ndị amadi nke ụwa; n’ihi na e weere ịgwọ nsí gị duhie mba nile.”—Mkpughe 18:22, 23.

12 N’okwu a pụrụ iji tụnyere nke ahụ, Jeremaịa buru amụma banyere Jerusalem ahụ nke siworo n’ezi ofufe dapụ, sị: “M ga-eme ka olu obi ụtọ, na olu ọṅụ, na olu nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ, na olu nwanyị a na-alụ ọhụrụ, na olu nkume igwe nri, na ìhè oriọna, lanarị ha n’iyi. Ala nke a nile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe na ihe ijuanya.” (Jeremaịa 25:10, 11) Dị ka akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ, Krisendọm ga-aghọ mkpọmkpọ ebe nke ndụ ọ bụla na-adịghị, dị ka ọnọdụ tọgbọrọ n’efu nke Jerusalem sere onyinyo ya n’ụzọ pụtara ìhè mgbe afọ 607 T.O.A. gasịrị. Krisendọm ahụ nke na-enwebu obi aṅụrị, na-ekwokwa ekwo site n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ga-ahụ onwe ya n’ọnọdụ nke ịbụ onye e meriri emeri, onye a gbakụtakwara azụ.

13. Mgbanwe mberede dị aṅaa zutere Babilọn Ukwu ahụ n’ike, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a nwere n’ahụ “ndị ahịa” ya?

13 N’eziokwu, dị ka mmụọ ozi ahụ gwara Jọn n’ebe a, Babilọn Ukwu ahụ dum ga-agbanwe site n’ịbụ alaeze dị ike nke zuru ụwa ọnụ gaa n’ịbụ ala ọkpọ nkụ nke tọgbọrọ n’efu dị ka ọzara. “Ndị ahịa” ya, gụnyere ndị aka ji akụ a maara aha ha, ejiriwo omume ya mere ihe maka abamuru nke onwe ha ma ọ bụ dị ka ihe mkpuchi, ndị ndú okpukpe achọpụtawokwa ya dị ka ihe na-eweta uru iso ha kerịta ọnọdụ pụtara ìhè. Ma ndị ahịa ahụ agaghị enwekwa Babilọn Ukwu ahụ ọzọ dị ka onye òtù ha. Ọ gaghị anọgidekwa na-eduhie mba nile nke ụwa site n’ihe omume okpukpe ya ndị dị omimi.

Ikpe Ọmụma Ọbara Dị Egwu

14. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ dị ike kwuru na ọ bụ ya kpatara isi ike nke ikpe Jehova, oleekwa ihe yiri ya nke Jisọs kwuru mgbe ọ nọ n’elu ala?

14 Ná mmechi, mmụọ ozi ahụ dị ike kọrọ ihe mere Jehova ji kpee Babilọn Ukwu ahụ ikpe n’ụzọ siri ike otú a. Mmụọ ozi ahụ sịrị, “Ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 18:24) Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs gwara ndị ndú okpukpe nọ na Jerusalem na ọ bụ ha ga-aza ajụjụ maka “ọbara ndị ezi omume nile a wụsiworo n’elu ụwa . . . site n’ọbara Ebel” gaa n’ihu. N’ihi nke a, e bibiri ọgbọ ahụ gbagọrọ agbagọ n’afọ 70 O.A. (Matiu 23:35-38) Taa, ọgbọ ọzọ nke ndị okpukpe na-enwekwa ikpe ọmụma ọbara maka mkpagbu ọ na-akpagbu ndị ohu Chineke.

15. Olee ụzọ Chọọchị Katọlik nke dị na Nazi Germany si nwee ikpe ọmụma ọbara n’ụzọ abụọ dị iche iche?

15 N’akwụkwọ ya bụ́ The Catholic Church and Nazi Germany, Guenter Lewy dere, sị: “Mgbe a malitere ịkpagbu Ndịàmà Jehova na Bavaria n’April 13 [1933], ọbụna na Chọọchị nakweere ọrụ ahụ nke ụlọ ọrụ Ministri Okwu Agụmakwụkwọ na Okpukpe dị n’aka nyere ya nke ime mkpesa banyere onye ọ bụla so n’òtù ahụ nke nọ na-ekpe okpukpe ahụ a machibidoro iwu.” Otú a, Chọọchị Katọlik keere òkè n’ịchịrị ọtụtụ puku Ndịàmà jee n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche; aka ya adịghị ọcha site n’ọbara nke ọtụtụ narị Ndịàmà e gburu egbu. Mgbe Ndịàmà na-eto eto, dị ka Wilhelm Kusserow, gosiri na ha pụrụ iji obi ike nwụọ site ná mgbagbu ihu ọha, Hitler kpebiri na mgbagbu ihu ọha anaghị enye ndị akọ na uche ha gbochiri ije agha ahụhụ kwesịrị ekwesị; ya mere, e ji ígwè e ji ebepụ mmadụ isi gbuo nwanne Wilhelm, bụ́ Wolfgang, mgbe ọ gbara afọ 20. N’otu mgbe ahụ, Chọọchị Katọlik nọ na-agba ndị Germany na-eto eto bụ́ ndị Katọlik ume ka ha jee nwụọ n’usuu ndị agha nke ala nna ha. Ikpe ọmụma ọbara nke chọọchị ahụ pụtara ìhè ebe anya ga-ahụ ya!

16, 17. (a) Ikpe ọmụma ọbara dị aṅaa ka a na-aghaghị ibokwasị Babilọn Ukwu ahụ, oleekwa ụzọ ikpe ọbara si maa Vatican n’ihe banyere ndị Juu ahụ nwụrụ ná mgbukpọ dị iche iche ndị Nazi mere? (b) Olee otu ụzọ nke ụta si dịrị okpukpe ụgha n’ihi ogbugbu nke ọtụtụ nde mmadụ n’ọtụtụ narị agha dị iche iche a lụworo n’oge anyị a?

16 Otú ọ dị, amụma ahụ kwuru na ọ ghaghị ịbụ Babilọn Ukwu ahụ ka a ga-ajụta ajụjụ ọbara nke “ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” Nke ahụ abụwo nnọọ eziokwu n’oge ndị dị ugbu a. Dị ka ihe atụ, ebe aghụghọ ndị Katọlik nyere aka iweta Hitler n’ike ọchịchị na Germany, Vatican na-ekere òkè n’ikpe ọmụma ọbara dị egwu n’ihe banyere nde ndị Juu isii, bụ́ ndị nwụrụ ná mgbukpọ dị iche iche ndị Nazi mere. Ọzọkwa, n’oge anyị a, e gbuwo ihe karịrị otu narị nde ndị mmadụ n’ọtụtụ narị agha dị iche iche. Ọ̀ bụ okpukpe ụgha ka ụta dịịrị n’ihe banyere nke a? Ee, n’ụzọ abụọ dị iche iche.

17 Otu ụzọ bụ na ọtụtụ agha a lụworo metụtara ndịrịta iche nke okpukpe. Dị ka ihe atụ, mburịta agha dịrị n’India n’etiti ndị Alakụba na ndị okpukpe Hindu na 1946-1948 bụ nke okpukpe kpaliri. Ọtụtụ narị puku ndị mmadụ nwụrụ. Esemokwu dịrị n’etiti Iraq na Iran n’afọ ndị 1980 bụ nke metụtara ndịrịta iche e nwere n’etiti ịrọ òtù okpukpe dị iche iche, e gburu ọtụtụ narị puku mmadụ na ya. Ibu agha dị n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant na Northern Ireland ewerewo ọtụtụ puku ndụ ụmụ mmadụ. N’ile ihe ndị a nile na-emenụ anya, odeakụkọ bụ́ C. L. Sulzberger kwuru na 1976, sị: “Ọ bụ eziokwu jọgburu onwe ya na, ma eleghị anya, ọkara ma ọ bụ karịa n’ime agha ndị a na-alụ ugbu a gburugburu ụwa bụ ndị o doro anya na ha bụ ọgụ metụtara okpukpe ma ọ bụ bụrụ ndị metụtara esemokwu okpukpe dị iche iche.” N’eziokwu, ọ dịwo otú ahụ n’akụkọ ihe mere eme nile jupụtara n’ọgba aghara nke Babilọn Ukwu ahụ.

18. Gịnị bụ ụzọ nke abụọ ikpe ọbara si maa okpukpe ụwa nke a?

18 Gịnị bụ ụzọ nke abụọ? Dị ka Jehova si ele ihe anya, okpukpe nile nke ụwa nwere ikpe ọmụma ọbara n’ihi na ha akụzibeghịrị ndị na-eso ụzọ ha eziokwu nke ihe ndị Jehova chọrọ ndị ohu ya n’aka n’ụzọ ha ga-anakwere ha. Ha akụzibeghịrị ndị mmadụ n’ụzọ ha ga-anakwere na ndị na-efe Chineke ezi ofufe aghaghị iṅomi Jisọs Kraịst ma gosi ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ n’agbanyeghị mba ha si na ya pụta. (Maịka 4:3, 5; Jọn 13:34, 35; Ọrụ 10:34, 35; 1 Jọn 3:10-12) N’ihi na okpukpe ndị mejupụtara Babilọn Ukwu ahụ akụzibeghị ihe ndị a, a dọọrọ ndị nọ na ha gaa n’ọgba aghara nke agha mba dị iche iche. Lee nnọọ ka nke a si pụta ìhè n’agha ụwa abụọ ndị a lụrụ n’ime ọkara nke mbụ nke narị afọ nke 20, bụ́ ndị ha abụọ malitechara na Krisendọm, nke rụpụtakwara ndị okpukpe igburịta ndị okpukpe ibe ha! A sị na ndị nile na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst gbasoro ụkpụrụ Bible, ọ pụrụ ịbụ na a garaghị alụ agha ndị ahụ ma ọlị.

19. Oké ikpe ọmụma ọbara dị aṅaa ka Babilọn Ukwu ahụ na-ebu?

19 Jehova na-eburu ụta nile e nwere maka mwụfu ọbara nile a busa n’ụkwụ Babilọn Ukwu ahụ. A sị na ndị ndú okpukpe, karịsịa ndị ahụ nọ na Krisendọm, kụziiri ndị ha eziokwu nke Bible, a garaghị enwe oké mwụfu ọbara dị otú ahụ. Ya mere, n’eziokwu, site n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, Babilọn Ukwu ahụ—oké nwanyị ahụ na-akwa iko na alaeze ụwa nke okpukpe ụgha—aghaghị ịza Jehova ajụjụ, ọ bụghị nanị maka “ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ” ndị ọ kpagbuworo ma gbuokwa, kamakwa maka ọbara nke “ndi nile e gbuworo n’elu ụwa.” N’ezie, Babilọn Ukwu ahụ na-ebu ikpe ọmụma ọbara dị egwu. Ọ ga-adị nnọọ mma mgbe mbibi ikpeazụ ya weere ọnọdụ!

Igbe dị na peeji nke 270]

Ihe Ịgọnarị Okwukwe Na-efu

Guenter Lewy dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Catholic Church and Nazi Germany, sị: “À sị na okpukpe Katọlik Germany sitere ná mmalite nọgide n’ụkpụrụ nke imegide ọchịchị ndị Nazi, akụkọ ihe mere eme nke ụwa gaara adịwo nnọọ iche. Ọbụna ma a sị na mgba nke a mesịrị ghara imeri Hitler na ịkwụsị ọtụtụ mpụ nile o mere, ọ gaara esiworị otú a bulite ùgwù nke Chọọchị ahụ n’ụzọ na-enweghị atụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmegide dị otú a gaara eweworị ndụ ọtụtụ mmadụ, ma ndị a gaara abụworị àjà a chụrụ maka ihe kasị mma. N’ịbụ onye na-ejighị ọnọdụ dị n’obodo ya n’aka, Hitler agaraghị anwa anwa ịga agha, a gaara azọpụtawokwa ndụ ọtụtụ nde mmadụ. . . . Mgbe a tara ọtụtụ puku ndị Germany na-emegide ndị Nazi ahụhụ ruo ọnwụ n’ogige ịta ahụhụ Hitler, mgbe e gbukpọrọ ndị Poland nwere ọgụgụ isi, mgbe ọtụtụ narị nde ndị Russia nwụrụ n’ihi na e mesoro ha dị ka ndị Untermenschen [ndị mmadụ dị ala] nke agbụrụ Slavic, mgbe e gbukwara 6,000,000 mmadụ n’ihi na ha ‘abụghị ndị Aryan,’ ndị isi Chọọchị Katọlik na Germany kwadoro ọchịchị ahụ nke na-eme mpụ ndị a. Popu nke nọ na Rom, bụ́ onyeisi n’ụzọ ime mmụọ na onye ozizi kasị elu n’ihe banyere omume nke Chọọchị Roman Katọlik, gbachiri nkịtị.”—Peji 320, 341.

[Foto dị na peeji nke 268]

“Ahụhụ, ahụhụ,” ka ndị ọchịchị na-asị

[Foto dị na peeji nke 268]

“Ahụhụ, ahụhụ,” ka ndị ahịa na-asị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya