Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/1 p. 13-19
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgụ Ya Kwa Ụbọchị
  • Mkpa nke Ịgụ Bible Mgbe Mgbe
  • Mgbe A Pụrụ Ịgụ Bible
  • Ụzọ Dị Iche Iche E Si Agụ Bible
  • Ghọta Ihe Ị Na-agụ
  • Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Bible—Akwụkwọ nke A Ga-agụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/1 p. 13-19

Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị

“Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ . . . [onye] n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.”—ABỤ ỌMA 1:1, 2.

1. (a) Ihe odide dị aṅaa a pụrụ ịhụ nke ọma pụtara n’otu akụkụ nke ụlọ obibi akwụkwọ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nke Watch Tower Society? (b) Olee otú anyị ga-esi rite uru ma ọ bụrụ na anyị eburu okwu ntụziaka ahụ n’obi n’onwe anyị?

“GỤỌ OKWU CHINEKE BỤ́ BIBLE NSỌ KWA ỤBỌCHỊ.” Ná mkpụrụ okwu ndị gbara okpotokpo, okwu ndị ahụ pụtara ìhè n’otu akụkụ nke otu ụlọ na Brooklyn, New York, ebe Watchtower Bible and Tract Society na-ebi Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Okwu ntụziaka ahụ abụghị nke e zubere maka nanị ndị ụwa na-ahụ ihe odide ahụ. Ndịàmà Jehova na-aghọta na ọ dịkwa ha mkpa iburu ya n’obi. Ndị na-agụ Bible mgbe nile ma na-etinye ya n’ọrụ n’onwe ha na-erite uru site n’ozizi, ịtụ mmehie n’anya, mgbazi olu, na ịdọ aka ná ntị n’ezi omume nke ọ na-enye.—2 Timoti 3:16, 17.

2. Olee otú Nwanna Russell si mesie ịdị mkpa nke ọgụgụ Bible ike?

2 Ndịàmà Jehova na-enwe ekele nke ukwuu maka akwụkwọ ndị na-enyere ha aka ịmụ Bible, tinyere Ụlọ Nche, ha na-ejikwa ndị a eme ihe mgbe nile. Ma ha maara na ọ dịghị otu n’ime ha na-ewere ọnọdụ nke Bible n’onwe ya. Laa azụ na 1909, Charles Taze Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, degaara ndị na-agụ magazin Ụlọ Nche, sị: “Unu echefula na Bible bụ Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ anyị nakwa na n’agbanyeghị otú ihe enyemaka anyị bụruru ndị sitere n’aka Chineke, ha bụ ‘ihe enyemaka,’ ha abụghị ihe e ji edochi Bible.”

3. (a) Mmetụta dị aṅaa ka “okwu Chineke” na-enwe n’ahụ ndị e kpughere nye ya? (b) Ugbo ole ka ndị Beria na-agụ ma na-amụ Akwụkwọ Nsọ?

3 Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee nwere ịdị omimi na ikike nke akwụkwọ ọzọ na-enweghị. “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Onye na-eso ụzọ bụ́ Luk jara ndị Beria mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ, na-akpọ ha ‘ndị ka mma n’obi.’ Ọ bụghị nanị na ha ji ịnụ ọkụ n’obi nara okwu ahụ dị ka Pọl onyeozi na onye òtù ya bụ́ Saịlas si kwusaa ya kamakwa “na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị” iji mara ebe ihe ndị a na-akụzi nwere ndabere ha n’ime Akwụkwọ Nsọ.—Ọrụ 17:11.

Ịgụ Ya Kwa Ụbọchị

4. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi banyere ugbo ole anyị kwesịrị ịdị na-agụ Bible?

4 Bible ekwughị kpọmkwem ugbo ole anyị kwesịrị ịdị na-agụ ya. Otú ọ dị, o dekọrọ ndụmọdụ Jehova nyere Joshua ‘ịtụgharị uche n’akwụkwọ iwu ahụ ehihie na abalị’ ka o wee mee ka ije ya gaa nke ọma ma nweekwa uche n’ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. (Joshua 1:8) Ọ na-agwa anyị na onye ọ bụla chịrị Israel oge ochie dị ka eze ga na-agụ Akwụkwọ Nsọ “ụbọchị nile nke ndụ ya.” (Deuterọnọmi 17:19) Ọ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . Kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọzọ, Oziọma nke Matiu dere na-agwa anyị na mgbe Jisọs Kraịst jụrụ mgbalị Setan mere ịnwa Ya ọnwụnwa, O hotara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e ji ike mmụọ nsọ dee, na-asị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Ugbo olè ka nri anụ ahụ na-adị anyị mkpa? Kwa ụbọchị! Iri nri ime mmụọ kwa ụbọchị dị mkpa ọbụna karị n’ihi na ọ na-emetụta olileanya anyị maka ndụ ebighị ebi.—Deuterọnọmi 8:3; Jọn 17:3.

5. Olee otú ọgụgụ Bible kwa ụbọchị pụrụ isi nyere anyị aka “ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị” mgbe a wụkwasịrị anyị ihe ndị na-ele okwukwe ule?

5 Ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ịbụ onye e ji Okwu Chineke wusie ike kwa ụbọchị. Ụbọchị ọ bụla—n’ụlọ, n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’okporo ámá, mgbe a na-azụ ihe, n’ozi anyị—a na-awụkwasị anyị ihe ndị na-eche okwukwe anyị aka mgba. Olee otú anyị ga-esi mesoo ihe ndị a? Iwu na ụkpụrụ dị iche iche nke Bible hà ga-agbata n’uche ngwa ngwa? Kama ịkwado mmetụta nke ịdabere n’onwe onye, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:12) Ọgụgụ Bible kwa ụbọchị ga-enyere anyị aka ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị’ kama inye ụwa ohere ime ka anyị yie ya.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10; Ndị Rom 12:2.

Mkpa nke Ịgụ Bible Mgbe Mgbe

6. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịgụ Bible mgbe mgbe?

6 Ịgụ Bible dị nnọọ iche pụọ n’ịgụ akwụkwọ akụkọ e chepụtara echepụta. A na-ede ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke akwụkwọ akụkọ e chepụtara echepụta ndị na-ewu ewu maka ịgụ ya otu ugbo; mgbe ọ bụla mmadụ maara akụkọ ya na otú o si jedebe, ọ gwụla ebe o biri. N’ụzọ dị iche, n’agbanyeghị ugbo ole anyị gụworo Bible, anyị na-erite uru dị ukwuu site n’ime ya ọzọ. (Ilu 9:9) Nye onye na-aghọta ihe, Akwụkwọ Nsọ na-apụta ihe ọhụrụ mgbe nile. Amụma ndị metụtara mgbe ikpeazụ na-aghọ ihe dị ebube nye ya n’ihi ihe ndị ọ hụworo, nụ, ma nwee ahụmahụ ya n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. (Daniel 12:4) Ka ọ na-agbasawanye ahụmahụ nke onwe ya ná ndụ ma na-anagide nsogbu dị iche iche, onye ahụ na-agụ Bible nke na-aghọta ihe na-aghọta n’ụzọ zuru ezu karị ndụmọdụ nke ọ pụrụ ịbụ na ọ gụwo ya elu elu na mbụ. (Ilu 4:18) Ọ bụrụ na ọrịa siri ike adakwasị ya, nkwa nile nke Bible banyere mwepụ nke ahụ mgbu na mweghachi nke ahụ ike na-apụta ihe miri emi nye ya karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe ezi ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ nwụrụ, nkwa nke mbilite n’ọnwụ na-adị oké ọnụ ahịa ọbụna karị.

7. Gịnị ga-enyere anyị aka mgbe anyị weere ibu ọrụ ọhụrụ ná ndụ, n’ihi gịnịkwa?

7 Ị pụrụ ịgụwo Bible n’onwe gị ma tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Kama ma eleghị anya ugbu a ị na-ewere ibu ọrụ ndị ọhụrụ ná ndụ. Ị̀ na-eme atụmatụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ị̀ na-aga ịbụ nne ma ọ bụ nna? È nyewo gị ibu ọrụ n’ime ọgbakọ dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi? Ị̀ ghọwo onye nkwusa oge nile, na-enwekwu ohere maka ime nkwusa na izi ihe? Lee uru ọ ga-aba ịgụ Bible dum ọzọ na-eburu ibu ọrụ ọhụrụ ndị ahụ n’uche!—Ndị Efesọs 5:24, 25; 6:4; 2 Timoti 4:1, 2.

8. Olee otú ọnọdụ ndị gbanwerelanụ pụrụ isi gosipụta mkpa nke ịmụkwu banyere ihe ndị anyị chere na anyị amaraworị?

8 N’oge gara aga ị pụrụ imewo nke ọma n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ma ọnọdụ ndị gbanwerelanụ pụrụ ime ka i nwee mkpa nke ịmụkwu ihe nke ukwuu karị banyere àgwà ndị ahụ nke Chineke. (Tụlee Ndị Hibru 5:8.) Onye bụbu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke ọ dịrị mkpa ịhapụ ije ozi ya pụrụ iche iji lekọta ndị mụrụ ya na-eme agadi kwuru, sị: “M na-echebu na m na-eme nnọọ nke ọma n’ụzọ ezi uche dị na ya n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ugbu a ọ na-adị m ka m na-amaliteghachi n’isi.” N’otu aka ahụ, ndị bụ di na nwunye bụ́ ndị òtù ọlụlụ ha dara ọrịa anụ ahụ ma ọ bụ nke mmetụta uche siri ike pụrụ ịchọpụta na n’inye nlekọta onwe onye, nrụgide na-akpali mgbe mgbe mmeghachi omume ndị na-akụda ha obi. Ịgụchi Bible anya bụ isi iyi nke nkasi obi na enyemaka dị ukwuu.

Mgbe A Pụrụ Ịgụ Bible

9. (a) Gịnị pụrụ inyere onye ji ọrụ n’aka nke ukwuu aka ịchọta oge maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị? (b) N’ihi gịnị ka ịgụ Okwu Chineke ji dịrị ndị okenye mkpa karịsịa?

9 N’ezie, nye ndị ji nnọọ ọrụ n’aka ugbu a, ịchọta oge ime ihe ọzọ n’ụzọ chiri anya bụ ihe ịma aka. Otú ọ dị, anyị pụrụ irite uru site n’ihe nlereanya Jehova. Bible na-ekpughe na ọ na-eme ihe ‘na mgbe a kara aka.’ (Jenesis 21:2; Ọpụpụ 9:5; Luk 21:24; Ndị Galetia 4:4) Ịghọta ịdị mkpa nke ịgụchi Okwu Chineke anya pụrụ inyere anyị aka ịka otu oge akara maka ya n’usoro ihe omume anyị kwa ụbọchị. (Ndị Efesọs 5:15-17) Ọ dị ndị okenye mkpa karịsịa isetịpụ oge maka ịgụchi Bible anya ka ndụmọdụ ha na-enye daberechaa n’ụkpụrụ Bible nakwa ka mmụọ ha na-egosi na-egbukepụ “amamihe ahụ nke si n’elu bịa.”—Jemes 3:17; Taịtọs 1:9.

10. Òle mgbe ka ndị na-agụ Bible kwa ụbọchị na-achọta oge ịgụ ya?

10 Ọtụtụ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’usoro ihe omume nke ọgụgụ Bible onwe onye na-agụ nke ha n’isi ụtụtụ tupu ha amalite ọrụ ụbọchị ha. Ndị ọzọ na-achọpụta na ha na-enwe ike ịnọgide na-eme ya n’oge ọzọ. Kaseti Bible ndị a na-ege ege (ebe e nwere ya) na-enyere ndị na-eme njem aka iji oge ha na-eji eme njem eme ihe dị mma, ụfọdụ Ndịàmà na-egekwa ha mgbe ha na-ahụ maka ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ. Usoro ihe omume ndị dịworo irè maka ụfọdụ Ndịàmà na Europe, Africa, North America, South America, na n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ nke e gosiri na peji nke 20 na 21, n’okpuru isiokwu bụ́ “Mgbe Ha Na-agụ Ya na Otú Ha Si Erite Uru.”

11. Olee otú a pụrụ isi na-agụ Bible kwa ụbọchị ọbụna ọ bụrụ na ohere dị adị dị nnọọ nta?

11 Ihe kasị mkpa abụghị otú oge ị na-etinye n’ọgụgụ Bible gị n’otu oge ọ bụla hà kama ime ya n’ụzọ chiri anya. Ị pụrụ ịchọpụta ya ịbụ ihe na-akwụghachi ụgwọ ịgụ ya ruo otu hour ma ọ bụ karịa n’otu mgbe, na-emekwu nnyocha, na-emikpu uche kpam kpam n’ihe a na-agụ. Ma usoro ime ihe gị ọ̀ na-enye ohere maka nke ahụ n’ụzọ chiri anya? Kama ikwe ka ọtụtụ ụbọchị na-agafe n’agụghị Bible ma ọlị, ọ̀ bụ na ọ gaghị aka mma ịgụ ihe minit 15 ma ọ bụ ọbụna minit 5 ụbọchị ọ bụla? Kpebie ịgụ Bible kwa ụbọchị. Mgbe ahụ gbakwụnye ime nnyocha mikwuru emi n’ọgụgụ ihe ahụ mgbe o kwere mee.

Ụzọ Dị Iche Iche E Si Agụ Bible

12. Usoro ihe omume dị aṅaa nke ọgụgụ Bible ka ndị òtù ọhụrụ nke ezinụlọ Betel na ụmụ akwụkwọ Gilead nwere?

12 E nwere ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi gụọ Bible. Ọ bara uru ịgụ ya site na Jenesis ruo Mkpughe. A na-achọ ka ndị òtù ezinụlọ Betel n’ụwa nile bụ́ ndị na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Society gụọ Bible dum n’oge afọ mbụ nke ije ozi Betel ha. (Nke ahụ na-apụtakarị ịgụ isi atọ ruo ise, n’adabere n’ogologo ha, ma ọ bụ peji anọ ruo ise, kwa ụbọchị.) Ụmụ akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead aghaghịkwa ịgụ Bible site n’isi ruo ná ngwụcha tupu ha agụsịa akwụkwọ. E nwere olileanya na nke a ga-enyere ha aka ime ọgụgụ Bible kwa ụbọchị otu akụkụ nke ndụ ha.

13. Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka a na-atụrụ Ndịàmà e mere baptism ọhụrụ aro inwe?

13 Ọ bara uru ka Ndịàmà e mere baptism ọhụrụ setịpụrụ onwe ha ihe mgbaru ọsọ nke ịgụ Bible dum. Na 1975, n’oge ọ na-akwadebe maka baptism, otu okenye jụrụ otu nwa okorobịa na France ma o nwekwara usoro ihe omume pụtara ìhè maka ọgụgụ Bible. Kemgbe ahụ ọ gụchaala Bible dum kwa afọ, na-agụkarị ya n’ụtụtụ tupu ya agaa ọrụ. Banyere ihe si na ya pụta, ọ sịrị: “Amatawo m Jehova nke ukwuu karị. M pụrụ ịhụ otú ihe ọ bụla ọ na-eme si metụta nzube ya na otú o si azaghachi mgbe ihe mgbochi bilitere. Ana m ahụ na Jehova bụkwa onye ezi omume na onye dị mma n’ihe nile ọ na-eme.”

14. (a) Iji bido usoro ihe omume nke ọgụgụ Bible onwe onye nke ga-aga n’ihu, gịnị dị mkpa? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka itinye n’uche anyị ozuzu nke isi ihe nke akwụkwọ Bible ọ bụla mgbe anyị na-agụ ya?

14 Ị̀ gụchaala Bible dum? Ma ọ bụghị otú ahụ, ugbu a bụ oge dị mma ịmalite. Depụta usoro ihe omume doro anya, ma gbasosie ya ike. Kpebie peji ole ma ọ bụ isiakwụkwọ ole ị ga-agụ kwa ụbọchị, ma ọ bụ nanị kpebie oge hà aṅaa ị ga-etinye na mgbe ọ ga-abụ. Ọ bụghị mmadụ nile ga-agụcha Bible n’otu afọ, ma ihe ka mkpa bụ ịgụchi Okwu Chineke anya, na-eme nke ahụ kwa ụbọchị ma o kwee omume ma ọlị. Ka ị na-agụ Bible, ị pụrụ ịchọpụta na iji akwụkwọ ntụaka ụfọdụ eme ihe ga-enye aka ịkụnye n’uche gị isi ihe ebe ahụ ị na-agụ nwere n’ozuzu ya. Ọ bụrụ na Insight on the Scriptures dị n’asụsụ gị, mgbe ahụ tupu gị ebido ịgụ otu akwụkwọ Bible, tụleghachi ndepụta dị mkpirikpi nke isi ihe ndị dị na ya dị ka e nyere n’Insight.* Rịba ama karịsịa isiokwu ndị e dere ná mkpụrụ okwu ndị gbara okpotokpo n’ihe ndepụta ahụ. Ma ọ bụ jiri nchịkọta sara mbara karị e nyere n’akwụkwọ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial” mee otu ihe ahụ.a

15. (a) Aro ndị dị aṅaa a tụrụ na peji nke 16 na 17 pụrụ inye aka ime ka ọgụgụ Bible gị ka mma? (b) Kama ime ka ọgụgụ nke peji ole na ole bụrụ ihe e ji emezu iwu, nye ihe dị aṅaa dị oké mkpa ka anyị kwesịrị inye nlebara anya ka ukwuu?

15 Ịgụchi Bible anya n’esepụghị aka bara uru, ma abụla onye na-agụ nanị iji mezuo iwu. Agụla ụfọdụ ọnụ ọgụgụ peji kwa ụbọchị nanị ka i wee nwee ike ịsị na ị na-agụcha Bible kwa afọ. Dị ka e gosiri na igbe bụ́ “Aro Ndị Ga-eme Ka Ọgụgụ Bible Gị Ka Mma” (peji nke 16 na 17), e nwere ọtụtụ ụzọ ị pụrụ isi gụọ ma nụ ụtọ Bible. N’agbanyeghị ụzọ i ji mee ihe, jide n’aka na ị na-enye ma uche gị ma obi gị nri.

Ghọta Ihe Ị Na-agụ

16. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ihe anyị na-agụ?

16 Mgbe ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe, Jisọs mesiri ike ịdị mkpa nke ha ịghọta ihe o kwuru. Ihe dị oké mkpa abụghị nghọta ọgụgụ isi, kama ọ bụ ha “iwere obi ha ghọta” ka ha wee tinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. (Matiu 13:14, 15, 19, 23) Ihe mmadụ bụ n’ezie bụ ihe dị Chineke mkpa, nke a bụkwa ihe obi na-anọchite anya ya. (1 Samuel 16:7; Ilu 4:23) N’ihi ya, tinyere ijide n’aka na anyị ghọtara ihe akụkụ Bible dị iche iche na-ekwu, ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche na ha, na-atụle ihe ha pụtara ná ndụ anyị onwe anyị.—Abụ Ọma 48:9; 1 Timoti 4:15.

17. Olee akụkụ ụfọdụ anyị pụrụ isi na ya tụgharịa uche n’ihe anyị na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ?

17 Gbalịa ịmata ụkpụrụ ndị bụ isi n’ihe ndekọ dị iche iche nke Bible ka i wee nwee ike iji ndị a mee ihe n’ọnọdụ ndị ị na-eche ihu. (Tụlee Matiu 9:13; 19:3-6.) Ka ị na-agụ banyere ma na-atụgharị uche n’àgwà Jehova ndị magburu onwe ha, jiri ohere ahụ wusie mmekọrịta gị na ya ike, iwulite n’ime onwe gị echiche siri ike nke nsọpụrụ Chineke. Mgbe ị gụrụ okwu nke nzube Jehova, tụlee ihe ị pụrụ ime iji rụọ ọrụ n’ikwekọ n’ihe ndị a. Mgbe ị gụrụ ndụmọdụ bịaara gị kpọmkwem, kama nanị ịgwa onwe gị, ‘Amaara m nke ahụ,’ jụọ, ‘M̀ na-eme ihe o kwuru?’ Ọ bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị, sị ‘N’ụzọ ndị dị aṅaa ka m pụrụ ime ya “nke ukwuu karị”?’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:1) Ka ị na-amụta ihe ndị Chineke chọrọ anyị n’aka, rịbakwa ama ihe nlereanya Bible ndị mere eme banyere ndị biri ndụ n’ikwekọ n’ihe ndị a a chọrọ na ndị na-emeghị otú ahụ. Tụlee ihe mere ha ji gbasoo ụzọ ha gbasoro na ihe ọ rụpụtara. (Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11) Mgbe ị gụrụ banyere ndụ Jisọs Kraịst, cheta na Jisọs bụ onye Jehova nyefeworo ịchị eze n’elu ụwa nile; jiri ohere ahụ wusie ike n’ime onwe gị ọchịchọ maka ụwa ọhụrụ Chineke. Ọzọ, nyochaa ụzọ ndị ị pụrụ isi ṅomie Ọkpara Chineke n’ụzọ zuru ezu karị.—1 Pita 2:21.

18. Olee otú anyị pụrụ isi hazie ọgụgụ Bible anyị na ojiji anyị na-eji ihe e ji amụ ihe nke a na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a atụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eme ihe?

18 N’ezie, ọgụgụ Bible ekwesịghị ịnọchi ojiji ị na-eji ihe magburu onwe ya a na-eji amụ ihe nke e nyeworo site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eme ihe. Nke ahụkwa bụ akụkụ nke ndokwa Jehova—nke dị nnọọ oké ọnụ ahịa. (Matiu 24:45-47) Jide n’aka na ịgụchi Okwu Chineke n’onwe ya anya nwere ọnọdụ dị mkpa ná ndụ gị. Ọ bụrụ na o kwee mee, “GỤỌ OKWU CHINEKE BỤ́ BIBLE NSỌ KWA ỤBỌCHỊ.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịgụtụ Bible kwa ụbọchị?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịgụ Bible ugboro ugboro?

◻ N’usoro ime ihe gị, gịnị bụ oge dị mma maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị?

◻ Ka ị na-agụ Bible mgbe mgbe, gịnị pụrụ itinyetụ ọdịiche n’usoro ihe omume gị?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ?

[Igbe dị na peeji nke 16, 17]

Aro ndị ga-eme ka ọgụgụ Bible gị ka mma

(1) Ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ Bible n’usoro a na-esokarị n’ibipụta ha, site na Jenesis ruo Mkpughe. Ị pụkwara ịgụ ha n’usoro e ji dee ha ná mbụ. Buru n’uche na Bible bụ nchịkọta nke akwụkwọ 66 e ji ike mmụọ nsọ dee, ọ́bá akwụkwọ Chineke. Iji mee ka ọ dịtụ iche, ị pụrụ ịchọ ịgụ ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ na-enye akụkọ ihe mere eme, e mesịa ụfọdụ nwere amụma siri ike, nke ụfọdụ bụ́ akwụkwọ ozi nke ndụmọdụ na-esote, kama nanị ịgbaso usoro peji ya. Buru n’obi ihe ị gụrụ, ma jide n’aka ịgụ Bible dum.

(2) Mgbe ị gụsịrị otu akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ, jụọ onwe gị ihe ọ na-ekpughe banyere Jehova, nzube ya, ụzọ ọ na-esi eme ihe; otú o kwesịrị isi metụta ndụ gị onwe gị; otú ị pụrụ isi jiri ya nyere onye ọzọ aka.

(3) Ijiri dị ka ihe nduzi chaatị bụ́ “Main Events of Jesus’ Earthly Life” (Ihe Omume Ndị Bụ Isi nke Ndụ Elu Ala Jisọs), nke e bipụtara n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Jesus Christ” (Jisọs Kraịst) n’akwụkwọ Insight on the Scriptures (nakwa na “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial”), gụọ akụkọ ndị yiri ibe ha n’akụkụ ọ bụla nke Oziọma ndị ahụ, otu gasịa ibe ya esochie. Gbakwụnye ihe na nke a site n’ịtụle akụkụ ndị kwekọrọ na nke ahụ n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.

(4) Mgbe ị na-agụ site n’Ọrụ Ndị Ozi akụkọ nke ndụ na ozi Pọl, gụọkwa akwụkwọ ozi ndị e ji ike mmụọ nsọ dee ndị metụtara ya. N’ihi ya, mgbe a kpọtụrụ aha obodo ma ọ bụ ebe dị iche iche Pọl kwusara ozi ọma, kwụsị ma gụọ akwụkwọ ozi ndị o mesịrị degaara ndị Kraịst ibe ya n’ebe ndị ahụ. Ọ na-enyekwa aka ịgbaso njem ya na map, dị ka nke ahụ dị n’ime azụ akwụkwọ nke New World Translation.

(5) Tinyere ọgụgụ gị nke Ọpụpụ ruo Deuterọnọmi, gụọ akwụkwọ ozi e degaara ndị Hibru iji nweta nkọwa nke ọtụtụ n’ime ụkpụrụ amụma dị iche iche. N’okpuru “Law” (Iwu) n’ime Insight on the Scriptures, tụlee chaatị ahụ bụ́ “Some Features of the Law Covenant” (Ụfọdụ Akụkụ nke Ọgbụgba Ndụ Iwu Ahụ).

(6) Mgbe ị na-agụ akwụkwọ ndị nke amụma, wepụta oge iji tụleghachi akụkọ ihe mere eme metụtara ha na Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-agụ akwụkwọ Aịsaịa, tụleghachi ihe e kwuru n’ebe ndị ọzọ banyere eze Uzaịa, Jọtam, Ehaz, na Hezekaịa, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’Aịsaịa 1:1. (2 Ndị Eze, isi nke 15-20; 2 Ihe Emere, isi nke 26-32) Ma ọ bụ mgbe ị na-agụ Hagaị na Zekaraịa, wepụta oge iji tụleghachi ihe dị n’akwụkwọ Ezra.

(7) Họrọ otu akwụkwọ Bible, gụọ otu akụkụ ya (eleghị anya otu isiakwụkwọ), mezie nnyocha, na-eji Watch Tower Publications Index ma ọ bụ Watchtower Library e tinyere na kọmputa ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị. Tinye ihe ndị ị gụtara n’ọrụ ná ndụ gị. Jiri ya mee ihe n’okwu na n’ozi ubi. Gazie n’akụkụ ọzọ.

(8) Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ Watch Tower nke nyere nkọwa banyere otu akwụkwọ Bible ma ọ bụ akụkụ ya, tụlee ya ọtụtụ oge mgbe ị na-agụ akụkụ Bible ahụ. (Dị ka ihe atụ: banyere Abụ nke Abụ, Ụlọ Nche, December 1958, peji nke 364-377; banyere Ezikiel, “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”—How?; banyere Daniel, “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa” ma ọ bụ Our Incoming World Government—God’s Kingdom; banyere Hagaị na Zekaraịa, Paradise Restored to Mankind—By Theocracy!; banyere Mkpughe, Revelation—Its Grand Climax At Hand!)

(9) Ka ị na-agụ ya, lee ntụaka ụfọdụ. Rịba ama 320 akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị e hotara kpọmkwem n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nakwa ọtụtụ narị akụkụ ndị ọzọ a tụrụ aka na ha, nakwa nkọwa e nyere ha. Ntụaka na-ezo aka ná mmezu amụma ndị e dekọrọ na Bible, ná nkọwa ihe ndị gbara gburugburu ndụ mmadụ na ókèala, nakwa echiche ndị yiri nke ahụ ndị pụrụ ime ka okwu ndị ma eleghị anya gaara esiri gị ike ịghọta doo anya.

(10) Iji New World Translation nwere Mbipụta Ntụaka eme ihe, ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị, lee nkọwa ala ala peji na isiokwu ndị dị na peji ndị ikpeazụ ya ndị metụtara ihe ị na-agụ. Ndị a na-egosi ebe mgbakwasị ụkwụ maka okwu ndị e ji mee ihe na ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi asụgharị okwu ndị dị mkpa. Ị pụkwara ịchọ ịtụle nsụgharị nke ụfọdụ amaokwu ná nsụgharị Bible ndị ọzọ.

(11) Mgbe ị gụsịrị isiakwụkwọ nke ọ bụla, dee nchịkọta dị mkpirikpi nke isi ihe bụ isi n’isiakwụkwọ Bible ahụ. Jiri ya mee ihe dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka ntụleghachi na ntụgharị uche a ga-eme ma e mesịa.

(12) Ka ị na-agụ Bible, katụ amaokwu ndị ị họọrọ bụ́ ndị ị ga-achọ icheta karịsịa akara, ma ọ bụ detuo ha na kaadị ma tinye ndị a n’ebe ị ga na-ahụ ha kwa ụbọchị. Buru ha n’isi; tụgharịa uche na ha; jiri ha mee ihe. Anwala iburu ọtụtụ n’isi otu mgbe, ma eleghị anya nanị otu ma ọ bụ abụọ kwa izu; mgbe ahụ họrọkwuo ọzọ n’oge ọzọ ị ga-agụ Bible.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ị̀ na-agụ Bible ka ọ bụ na-ege kaseti ya kwa ụbọchị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya