Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 11 p. 180-197
  • E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịa
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • DANIEL EJIRI ỊDỊ UMEALA N’OBI RỊỌ JEHOVA ARỊRỊỌ
  • GEBRIEL ABỊA NGWA NGWA
  • “IRI IZU ASAA” IJI MEE KA MMEHIE GWỤSỊA
  • “IRI IZU ASAA” AHỤ AMALITE
  • “ONYE E TERE MMANỤ, BỤ́ ONYE NDÚ” APỤTA
  • IHE NDỊ MERE N’IZU NKE IKPEAZỤ
  • AMỤMA AHỤ NKE CHINEKE KWADORO
  • Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Amụma Daniel Kwuru Gbasara Ọbịbịa Mesaya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • E Gosiri Onye Amụma A Dọọrọ n’Agha Ihe Ndị Ga-eme n’Ọdịnihu
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 11 p. 180-197

Isi nke Iri na otu

E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịa

1. Ebe Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?

JEHOVA bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. Ọ na-achịkwa oge na ụbọchị nile ndị e jikọtara ha na ọrụ ya. (Ọrụ 1:7) Ihe omume nile ndị ọ haziworo maka oge na ụbọchị ndị a aghaghị imezu. Ha agaghị ada.

2, 3. N’amụma dị aṅaa ka Daniel tinyere uche ya, oleekwa alaeze ukwu na-achị Babilọn n’oge ahụ?

2 Dị ka onye ji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ, Daniel onye amụma nwere okwukwe n’ikike Jehova nwere idokwa ihe ma mezuo ha. Nke kasị kpalie mmasị Daniel bụ amụma ndị metụtara mbibi Jerusalem. Jeremaịa edekọwo ihe Chineke kpughere banyere ogologo oge obodo nsọ ahụ ga-atọgbọrọ n’efu, Daniel jikwa nlezianya tụlee amụma a. O dere, sị: “N’afọ mbụ nke Daraịọs nwa Ahasuerọs, onye sitere ná mkpụrụ ndị Midia, onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldea; n’afọ mbụ nke ọbụbụeze ya ka mụ onwe m, bụ́ Daniel, jiri akwụkwọ nile anyị ghọta ọnụ ọgụgụ afọ ahụ, nke okwu Jehova ruru Jeremaịa, bụ́ onye amụma, ntị banyere ha, imezuru mkpọmkpọ ebe nile nke Jerusalem, bụ́ [iri afọ asaa].”—Daniel 9:1, 2; Jeremaịa 25:11.

3 Daraịọs onye Midia na-achị “alaeze ndị Kaldea” n’oge ahụ. Amụma Daniel buburu mgbe ọ na-akọwa ihe ahụ e ji aka dee n’elu mgbidi, emezuwo ngwa ngwa. Alaeze Ukwu Babilọn adịkwaghị. E ‘nyewo ya ndị Midia na ndị Peasia’ na 539 T.O.A.—Daniel 5:24-28, 30, 31.

DANIEL EJIRI ỊDỊ UMEALA N’OBI RỊỌ JEHOVA ARỊRỊỌ

4. (a) Gịnị dị mkpa iji nweta mgbapụta Chineke? (b) Olee otú Daniel si gakwuru Jehova?

4 Daniel ghọtara na afọ 70 nke ịtọgbọrọ n’efu Jerusalem fọrọ nke nta ka ọ gwụ. Gịnị ka ọ ga-emezi? Ya onwe ya na-agwa anyị, sị: “M wee chee Onyenwe anyị Chineke ihu m, ịchọ Ya n’ekpere na arịrịọ amara dị iche iche, n’obubu ọnụ na ákwà mkpe na ntụ́. M wee kpeere Jehova, bụ́ Chineke m, [meekwa nkwupụta, NW].” (Daniel 9:3, 4) Ọ dị mkpa inwe ọnọdụ obi kwesịrị ekwesị iji nweta mgbapụta obi ebere Chineke. (Levitikọs 26:31-46; 1 Ndị Eze 8:46-53) Ọ dị mkpa inwe okwukwe, mmụọ ịdị umeala n’obi, na nchegharị zuru ezu ná mmehie ndị dugara n’ije biri n’ala ọzọ na ịbụ ndị ohu. Ya mere, n’ihi ndị obodo ya na-emehie emehie, Daniel gakwuuru Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ibu ọnụ, iru újú, iyikwasị ákwà mkpe, bụ́ ihe ngosipụta nke nchegharị na obi eziokwu.

5. N’ihi gịnị ka Daniel pụrụ iji nwee obi ike na a ga-eweghachi ndị Juu n’obodo ha?

5 Amụma Jeremaịa emewo ka Daniel nwee olileanya, n’ihi na o gosiri na a ga-eweghachi ndị Juu n’obodo ha bụ́ Juda n’oge na-adịghị anya. (Jeremaịa 25:12; 29:10) Obi abụọ adịghị ya na Daniel nwere obi ike na ndị Juu ahụ e meriri emeri ga-enwe ahụ efe n’ihi na otu nwoke aha ya bụ́ Saịrọs amalitelarị ịchị dị ka eze Peasia. Ọ̀ bụ na Aịsaịa aka-ebughị amụma na a ga-esite n’aka Saịrọs tọhapụ ndị Juu iji wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya? (Aịsaịa 44:28–45:3) Ma Daniel amaghị nnọọ otú nke ahụ ga-esi mee. Ya mere ọ nọgidere na-arịọ Jehova arịrịọ.

6. Gịnị ka Daniel kwetara n’ekpere?

6 Daniel dọọrọ uche gaa n’obi ebere na ebere ịhụnanya Chineke. N’obi umeala, o kwetara na ndị Juu emehiewo site n’inupụ isi, isi n’iwu Jehova wezụga onwe ha, na ileghara ndị amụma ya anya. N’ụzọ ziri ezi, Chineke ‘achụgawo ha n’ala nile n’ihi mmekpu ha.’ Daniel kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, anyị ka ihere ihu dịịrị, ọ dịịrị ndị eze anyị, dịkwara ndị isi anyị, dịkwara nna anyị hà, n’ihi na anyị emehiewo megide Gị. Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere nile na mgbaghara nile dịịrị; n’ihi na anyị enupụwo isi n’okpuru Ya; anyị egeghịkwa olu Jehova, bụ́ Chineke anyị, ntị, ijegharị n’iwu Ya nile, nke O tinyere n’ihu anyị site n’aka ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma. Ee, Israel nile agabigawo iwu Gị, wee wezụga onwe ha, ka ha wee ghara ige olu Gị ntị: e wee wụkwasị anyị ọgbụgba iyi ahụ na ọṅụṅụ iyi ahụ nke e deworo n’akwụkwọ iwu Mosis, bụ́ ohu Chineke; n’ihi na anyị emehiewo megide Ya.”—Daniel 9:5-11; Ọpụpụ 19:5-8; 24:3, 7, 8.

7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova mere ihe ziri ezi n’ikwere ka a dọrọ ndị Juu n’agha?

7 Chineke adọọla ụmụ Israel aka ná ntị banyere ihe ndị ga-esi n’inupụrụ ya isi na ileghara ọgbụgba ndụ ahụ ha na ya gbara anya, pụta. (Levitikọs 26:31-33; Deuterọnọmi 28:15; 31:17) Daniel kwetara na ihe Chineke mere ziri ezi, na-asị: “O wee mee ka okwu Ya nile guzosie ike, bụ́ nke O kwuru megide anyị, megidekwa ndị ikpe anyị ndị kpere anyị ikpe, n’ime ka ihe ọjọọ ukwu bịakwasị anyị: n’ihi na e meghị n’okpuru eluigwe nile otú e meworo na Jerusalem. Dị ka e deworo ya n’akwụkwọ iwu Mosis, ihe ọjọọ a nile abịakwasịwo anyị: ma anyị emeghị ka ihu Jehova, bụ́ Chineke anyị, dajụọ, ka anyị wee si n’ajọ omume nile anyị chigharịa, nwee uche n’eziokwu Gị. Jehova wee mụọ anya n’ebe ihe ọjọọ ahụ dị, mee ka ọ bịakwasị anyị: n’ihi na Onye ezi omume ka Jehova, bụ́ Chineke anyị, bụ banyere ọrụ Ya nile nke Ọ rụworo, ma anyị egeghị olu Ya ntị.”—Daniel 9:12-14.

8. Na gịnị ka Daniel gbakwasịrị ụkwụ na-arịọ Jehova arịrịọ?

8 Daniel achọghị ịgọchitere ndị obodo ya. Obibi ha bi n’ala ọzọ kwesịrị ha n’ụzọ ziri ezi, dị ka o kwetara ngwa ngwa, sị: “Anyị emehiewo, anyị emebiwo iwu.” (Daniel 9:15) Nchegbu ya abụghịkwa nanị ka ha nwere onwe ha pụọ ná nhụjuanya. Ee e, ọ gbakwasịrị ụkwụ n’otuto na nsọpụrụ nke Jehova wee na-arịọ arịrịọ ya. Site n’ịgbaghara ndị Juu na iweghachi ha n’obodo ha, Chineke ga-emezu nkwa o kwere site n’ọnụ Jeremaịa, ọ ga-edokwa aha nsọ Ya, nsọ. Daniel na-arịọ, sị: “Onyenwe anyị, dị ka ezi omume Gị nile si dị, biko, ka iwe Gị na ọnụma Gị si n’obodo Gị, bụ́ Jerusalem, bụ́ ugwu nsọ Gị, laghachi: n’ihi na ọ bụ n’ihi mmehie nile anyị, na n’ihi ajọ omume nile nke nna anyị hà, ka Jerusalem na ndị Gị ghọworo ihe ịta ụta nye ndị nile dị anyị gburugburu.”—Daniel 9:16.

9. (a) Arịrịọ amara ndị dị aṅaa ka Daniel ji mechie ekpere ya? (b) Gịnị na-eme ka obi ghara iru Daniel ala, ma olee otú o si na-egosi nkwanye ùgwù maka aha Chineke?

9 N’ikpesi ekpere ike, Daniel gara n’ihu, na-asị: “Ugbu a, Chineke anyị, gee ntị n’ekpere ohu Gị na n’arịrịọ amara ya nile, mee ihu Gị ka ọ mụkwasị ebe nsọ Gị nke tọgbọrọ n’efu, n’ihi Onyenwe anyị. Chineke m, tọọ ntị Gị n’ala, nụ; saghee anya Gị abụọ, hụ ebe nile anyị nke tọgbọrọ n’efu, na obodo ahụ nke a kpọkwasịworo ya aha Gị: n’ihi na ọ bụghị n’ihi ezi omume nile anyị ka anyị onwe anyị na-eme ka arịrịọ amara nile anyị daa n’ihu Gị, kama n’ihi ọtụtụ obi ebere Gị. Onyenwe anyị, nụrụ: Onyenwe anyị, gbaghara: Onyenwe anyị, ṅaa ntị mee ihe: anọla ọdụ: n’ihi Gị onwe gị, Chineke m, n’ihi na aha Gị ka a kpọkwasịworo obodo Gị na ndị Gị.” (Daniel 9:17-19) A sị na Chineke agbagharaghị wee hapụ ndị ya n’ala ọzọ, kwere ka obodo nsọ ya, bụ́ Jerusalem, tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi, mba dị iche iche hà ga-ele ya anya dị ka Eze Eluigwe na Ala? Ọ̀ bụ na ha agaghị ekwubi na chi ndị Babilọn ka Jehova ike? Ee, a ga-akọcha aha Jehova, nke a na-emekwa ka obi ghara iru Daniel ala. N’ime ugboro 19 nke aha Chineke ahụ, bụ́ Jehova, pụtara n’ihe odide mbụ nke akwụkwọ Daniel, 18 n’ime ha bụ n’ihe metụtara ekpere a!

GEBRIEL ABỊA NGWA NGWA

10. (a) Ònye ka e zigaara Daniel, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ihi gịnị ka Daniel ji kwuo banyere Gebriel dị ka “onye ahụ”?

10 Mgbe Daniel ka nọ na-ekpe ekpere, mmụọ ozi Gebriel bịara. Ọ na-ekwu, sị: “Daniel, ugbu a ka m pụtaworo ime ka i nwee uche ịghọta ihe. N’isi mmalite arịrịọ amara gị nile ka okwu pụtara, mụ onwe m abịawokwa igosi gị; n’ihi na ihe a na-achọsi ike nke ukwuu ka ị bụ: ya mere tụgharịa uche n’okwu a, ghọta ọhụụ a.” Ma n’ihi gịnị ka Daniel ji kwuo banyere ya dị ka “onye ahụ, bụ́ Gebriel”? (Daniel 9:20-23) Mgbe Daniel chọrọ ịghọta ọhụụ mbụ ya banyere mkpi na ebule, “[onye] dị ka nwoke dị ike n’ile ya anya” pụtara n’ihu ya. Ọ bụ mmụọ ozi Gebriel, bụ́ onye e zigara ime ka Daniel nweta nghọta. (Daniel 8:15-17) N’otu aka ahụ, mgbe Daniel kpesịrị ekpere, mmụọ ozi a bịakwutere ya n’ụdị mmadụ ma kpanyere ya ụka otú mmadụ si akpanyere ibe ya ụka.

11, 12. (a) Ọ bụ ezie na e nweghị ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà Jehova na Babilọn, olee otú ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe si gosi nkwanye ùgwù maka ịchụ àjà ndị Iwu ahụ chọrọ? (b) N’ihi ka e ji kpọọ Daniel “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu”?

11 Gebriel bịara “mgbe onyinye ịnata ihu ọma nke anyasị.” E bibiwo ebe ịchụàjà Jehova tinyere ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, ndị Babilọn na-ekpere arụsị jikwa ndị Juu eji. Ya mere, ndị Juu nọ na Babilọn adịghị achụrụ Chineke àjà. Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nye ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe nọ na Babilọn ito na ịrịọ Jehova arịrịọ n’oge ndị ahụ e wepụtara maka ịchụ àjà n’okpuru Iwu Mosis. Dị ka nwoke nke raara onwe ya nye Chineke n’ụzọ miri emi, a kpọrọ Daniel “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu.” Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” nwere mmasị n’ebe ọ nọ, e zipụkwara Gebriel ngwa ngwa ịga zaa ekpere okwukwe nke Daniel.—Abụ Ọma 65:2.

12 Ọbụnadị mgbe ikpegara Jehova ekpere tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ, Daniel nọgidere na-ekpegara Chineke ekpere ugboro atọ n’ụbọchị. (Daniel 6:10, 11) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji hụta ya dị ka ihe a na-achọsi ike nke ukwuu! Tụkwasị n’ekpere, ntụgharị uche Daniel na-enwe n’Okwu Chineke mere ka o nwee ike ịmata uche Jehova. Daniel nọgidere na-ekpe ekpere, ọ makwaara ụzọ kwesịrị ekwesị isi bịakwute Jehova ka e wee zaa ekpere ya. O mere ka ezi omume Chineke pụta ìhè. (Daniel 9:7, 14, 16) N’agbanyeghịkwa na ndị iro ya apụghị ịhụta mmerụ ọ bụla n’ebe ọ nọ, Daniel maara na ya bụ onye mmehie n’anya Chineke ma kwupụta mmehie ya n’egbughị oge.—Daniel 6:4; Ndị Rom 3:23.

“IRI IZU ASAA” IJI MEE KA MMEHIE GWỤSỊA

13, 14. (a) Ihe ọmụma dị aṅaa dị mkpa ka Gebriel kpugheere Daniel? (b) Olee otú “iri izu asaa” ahụ hàruru n’ogologo, ànyị sikwa aṅaa mara?

13 Lee azịza magburu onwe ya Daniel ji ekpere kpọrọ ihe nwetara! Ọ bụghị nanị na Jehova mesiri ya obi ike na a ga-eweghachi ndị Juu n’obodo ha kamakwa o mere ka ọ ghọta ihe dị ịrịba ama nke ukwuu karị—mpụta nke Mesaịa ahụ e buru n’amụma. (Jenesis 22:17, 18; Aịsaịa 9:6, 7) Gebriel na-agwa Daniel, sị: “[Iri izu asaa] . . . ka e kpeworo n’ikpe banyere ndị gị, banyekwara obodo nsọ gị, ime ka njehie bie, na ime ka mmehie gwụsịa, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighị ebi bata, na ịkachite ọhụụ na amụma akara, na ite [Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile mmanụ. Ma mara, werekwa uche mata, na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na [iri izu isii na abụọ], a ga-ewuzikwa ya ọzọ, ya na ámá na ékpè, ọbụna ná mkpa nke mgbe ndị a.”—Daniel 9:24, 25.

14 Nke a bụ ozi ọma n’ezie! Ọ bụghị nanị na a ga-ewughachi Jerusalem ma maliteghachi ofufe n’ụlọ nsọ ọhụrụ kamakwa “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-apụta n’otu oge a kapịrị ọnụ. Nke a ga-eme n’ime “iri izu asaa.” Ebe ọ bụ na Gebriel ehotaghị ụbọchị, ndị a abụghị izu nke ụbọchị asaa, bụ́ nke ga-apụta ụbọchị 490—nanị otu afọ na ọnwa anọ. Mwughachi Jerusalem “ya na ámá na ékpè,” bụ́ nke e buru n’amụma, were oge karịa otú ahụ. Izu ndị ahụ bụ izu nke afọ. Ụfọdụ nsụgharị ndị nke oge a na-atụ aro na izu nke ọ bụla dị afọ asaa n’ogologo. Dị ka ihe atụ, “iri izu asaa nke afọ” bụ nsụgharị e nyere na ntụaka ala ala peji banyere Daniel 9:24 na Tanakh—The Holy Scriptures, nke The Jewish Publication Society bipụtara. An American Translation na-agụ, sị: “A kawo iri izu asaa nke afọ maka ndị gị nakwa obodo nsọ gị akara.” Nsụgharị ndị yiri ndị ahụ pụtara ná nsụgharị ndị nke Moffatt na Rotherham mere.

15. Gaa n’oge atọ dị aṅaa ka e kewara “iri izu asaa” ahụ, oleekwa mgbe ha ga-amalite?

15 Dị ka mmụọ ozi ahụ kwuru, a ga-ekewa “iri izu asaa” ahụ gaa n’oge atọ: (1) “izu asaa,” (2) “iri izu isii na abụọ,” na (3) otu izu. Nke ahụ ga-abụ afọ 49, afọ 434, na afọ 7—afọ 490 ná ngụkọta. N’ụzọ na-akpali mmasị, The Revised English Bible na-agụ, sị: “A kawo afọ asaa ụzo iri asaa akara maka ndị gị na obodo nsọ gị.” Mgbe ibi n’ala ọzọ na nhụsianya ha na Babilọn ruo afọ 70 gasịrị, ndị Juu ga-enwe ihu ọma pụrụ iche site n’aka Chineke ruo afọ 490, ma ọ bụ afọ 70 a mụbara ụzọ 7. Ọ ga-amalite site ná “mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem.” Olee mgbe nke a ga-abụ?

“IRI IZU ASAA” AHỤ AMALITE

16. Dị ka iwu ya gosiri, n’ihi nzube dị aṅaa ka Saịrọs ji weghachi ndị Juu n’obodo ha?

16 Ihe omume atọ dị ịrịba ama kwesịrị ka a tụlee ha n’ihe banyere mmalite nke “iri izu asaa” ahụ. Nke mbụ mere na 537 T.O.A. mgbe Saịrọs nyere iwu ya nke mere ka ndị Juu laghachi n’obodo ha. Ọ na-agụ, sị: “Otú a ka Saịrọs, bụ́ eze Peasia, sịrị, Alaeze nile nke ụwa ka Jehova, bụ́ Chineke eluigwe, nyeworo m; Ya onwe ya mekwara m ka m bụrụ onye nlekọta n’iwuru Ya ụlọ n’ime Jerusalem, nke dị na Juda. Ònye nọ n’etiti unu site ná ndị Ya nile? ka Chineke ya nọnyere ya, ya rịgoruokwa Jerusalem, wuo ụlọ Jehova, bụ́ Chineke Israel, (Ya onwe ya bụ Chineke,) nke dị na Jerusalem. Ma onye ọ bụla nke fọdụrụ afọdụ, site n’ebe nile ebe onye ahụ nọ dị ka ọbịa, ka ndị ikom nke ebe ya were ọlaọcha na ọlaedo na akụ̀ na anụ ụlọ, ya na onyinye afọ ofufo ha nke dịịrị ụlọ Chineke nke dị na Jerusalem, nyere ya aka.” (Ezra 1:2-4) N’ụzọ doro anya, nzube bụ́ isi e ji nye iwu a bụ iji wughachi ụlọ nsọ ahụ—“ụlọ Jehova”—n’ebe ọ dịbu.

17. Akwụkwọ ozi ahụ e nyere Ezra kwuru na ọ bụ gịnị mere o ji gaa Jerusalem?

17 Ihe nke abụọ mere n’afọ nke asaa nke ọchịchị Eze Ataksakses nke Peasia (Ataksakses Longimanus, nwa Xerxes nke Mbụ). N’oge ahụ, Ezra bụ́ odeakwụkwọ mere njem were ọnwa anọ site na Babilọn gaa Jerusalem. O ji akwụkwọ ozi pụrụ iche nke si n’aka eze, ma akwụkwọ ozi ahụ enyeghị ikike iwughachi Jerusalem. Kama nke ahụ, ọrụ Ezra jedebere ‘n’ime ka ụlọ Jehova maa mma.’ Ọ bụ ya mere akwụkwọ ozi ahụ ji zoo aka n’ọlaedo na ọlaọcha, arịa ndị dị nsọ, na onyinye ọka wheat, mmanya vine, mmanụ, na nnu iji kwado ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ, tinyere ime ka ndị na-eje ozi n’ebe ahụ nwere onwe ha pụọ n’ịtụ ụtụ isi.—Ezra 7:6-27.

18. Olee ozi nyere Nehemaịa nsogbu, oleekwa otú Eze Ataksakses si mara banyere ya?

18 Ihe nke atọ mere n’afọ 13 mgbe e mesịrị, n’afọ nke 20 nke ọchịchị Eze Ataksakses nke Peasia. N’oge ahụ, Nehemaịa na-eje ozi dị ka obu ihe ọṅụṅụ ya na “Shushan, bụ́ ụlọukwu eze.” Ndị fọdụrụnụ si Babilọn lọta ewughachiwo Jerusalem ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ma ihe adịchaghị mma na Jerusalem. Nehemaịa nụrụ na ‘e tipusiri mgbidi Jerusalem, sureekwa ọnụ ụzọ ámá ya nile n’ọkụ.’ Nke a nyere ya nsogbu nke ukwuu, obi jọkwara ya njọ. N’ịbụ onye a jụrụ ihe na-ewute ya, Nehemaịa zara, sị: “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi: gịnị mere ihu m agaghị eji jọọ njọ, mgbe obodo ahụ, bụ́ ụlọ nke ili nna m hà, bụ mkpọmkpọ ebe, e ripịawokwa ọnụ ụzọ ámá ya nile n’ọkụ?”—Nehemaịa 1:1-3; 2:1-3.

19. (a) Mgbe Eze Ataksakses jụrụ ya ajụjụ, gịnị ka Nehemaịa bu ụzọ mee? (b) Gịnị ka Nehemaịa rịọrọ, oleekwa otú o si kweta òkè Chineke keere n’okwu ahụ?

19 Ihe ndekọ ahụ metụtara Nehemaịa gara n’ihu, na-asị: “Eze wee sị m, Ọ̀ bụ gịnịkwa ka gị onwe gị na-achọ? M wee kpeere Chineke nke eluigwe. M wee sị eze, Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na ohu gị dị mma n’anya gị, ọ bụ ka i ziga m na Juda, ruo obodo ili nna m hà, ka m wee wuo ya.” Aro a masịrị Ataksakses, bụ́ onye mezukwara arịrịọ ọzọ Nehemaịa rịọrọ: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e nye m akwụkwọ ozi inye ndị na-achị ala n’ofe osimiri [Yufretis], ka ha kwe ka m gabiga ruo mgbe m batara Juda; na akwụkwọ ozi inye Esaf, bụ́ onye na-eche ogige ọma nke eze nwere, ka o nye m osisi ijikọta ọnụ ụzọ ámá nile nke ụlọukwu ahụ n’otu nke dịịrị ụlọ ahụ, na ijikọta mgbidi obodo n’otu, na ijikọta ụlọ n’otu, bụ́ nke m ga-aba n’ime ya.” Nehemaịa kwetara òkè Jehova keere n’ihe a nile, na-ekwu, sị: “Eze wee nye m [akwụkwọ ozi ndị ahụ], dị ka ezi aka Chineke m si dị n’ahụ m.”—Nehemaịa 2:4-8.

20. (a) Olee mgbe okwu ahụ bụ́ “iwughachi na iwuzi Jerusalem” malitere ịdị irè? (b) Olee mgbe “iri izu asaa” ahụ malitere, oleekwa mgbe ha gwụrụ? (ch) Olee ihe àmà na-ezo aka n’izi ezi nke akara ụbọchị maka mmalite na ọgwụgwụ nke “iri izu asaa” ahụ?

20 Ọ bụ ezie na e nyere ikike n’ọnwa Nisan, ná mbido afọ nke 20 nke ọchịchị Ataksakses, “mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem” n’ezie malitere mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị. Nke a mere mgbe Nehemaịa rutere Jerusalem ma malite ọrụ mwughachi ya. Njem Ezra were ọnwa anọ, ma Shushan dị ihe karịrị kilomita 322 n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Babilọn, n’ihi ya kwa, ọ dị anya ọbụna karị site na Jerusalem. Mgbe ahụ, o yikarịrị ka Nehemaịa o rutere Jerusalem ná ngwụsị afọ nke 20 nke Ataksakses, ma ọ bụ na 455 T.O.A. Ọ bụ mgbe ahụ ka “iri izu asaa,” ma ọ bụ afọ 490 ahụ e buru n’amụma, malitere. Ha ga-agwụ ná ngwụsị nke afọ 36 O.A.—Lee “Olee Mgbe Ọchịchị Ataksakses Malitere?” na peji nke 197.

“ONYE E TERE MMANỤ, BỤ́ ONYE NDÚ” APỤTA

21. (a) Gịnị bụ ihe a ga-arụzu n’ime “izu asaa” mbụ ahụ, ọ̀ bụkwa n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị aṅaa? (b) Olee afọ Mesaịa kwesịrị ịpụta, gịnịkwa ka Oziọma Luk na-ekwu na o mere n’oge ahụ?

21 Afọ ole gafere tupu e wughachi Jerusalem n’ezie? A gaje iwughachi obodo ahụ “ná mkpa nke mgbe ndị a” n’ihi ihe isi ike ndị e nwere n’etiti ndị Juu n’onwe ha na mmegide sitere n’aka ndị Sameria na ndị ọzọ. Ihe àmà na-egosi na a rụchara ọrụ ahụ ruo n’ókè dị mkpa ka ọ na-erule n’ihe dị ka 406 T.O.A.—n’ime “izu asaa,” ma ọ bụ afọ 49 ahụ. (Daniel 9:25) Oge dị izu 62, ma ọ bụ afọ 434, ga-esochi. Mgbe oge ahụ gasịrị, Mesaịa ahụ e kwere nkwa ya ogologo oge gara aga ga-apụta. Ịgụta afọ 483 (49 tinyere 434) malite na 455 T.O.A. na-eduru anyị bịa na 29 O.A. Gịnị mere n’oge ahụ? Onye dere Oziọma bụ́ Luk na-agwa anyị, sị: “N’afọ nke iri na ise n’ọchịchị nke Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ onye na-achị Judia, mgbe Herọd bụkwa tetrarch nke Galili, . . . okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zakaraịas n’ọhịa. O wee bịa n’ala nile dị Jọdan gburugburu, na-ekwusa baptism nke nchegharị ka e wee gbaghara mmehie.” N’oge ahụ “ndị Juu nọ na-ele anya” Mesaịa ahụ.—Luk 3:1-3, 15.

22. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si ghọọ Mesaịa ahụ e buru n’amụma?

22 Jọn abụghị Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ma banyere ihe ọ hụrụ n’oge e mere Jisọs onye Nazaret baptism, n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 29 O.A., Jọn kwuru, sị: “Ekiriwo m Mmụọ Nsọ ka O si n’eluigwe na-efeda ka nduru; O wee nọgide n’ahụ Ya. Mụ onwe m amaghịkwa Ya: ma Onye zitere m ka m were mmiri mee baptism, Onye ahụ sịrị m, Onye ọ bụla ị ga-ahụ Mmụọ Nsọ ka Ọ na-efedakwasị Ya, na-anọgidekwa n’ahụ Ya, Onye ahụ bụ Onye na-eji Mmụọ Nsọ eme baptism. Mụ onwe m ahụwokwa, gbaakwa àmà na Onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:32-34) N’oge e mere ya baptism, Jisọs ghọrọ Onye E Tere Mmanụ—Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, onye na-eso ụzọ Jọn bụ́ Andru zutere Jisọs ahụ e tere mmanụ ma gwa Saịmọn Pita, sị: “Anyị ahụwo Mesaịa anyị.” (Jọn 1:41) N’ụzọ dị otú a, “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” pụtara kpọmkwem n’oge—n’ọgwụgwụ nke izu 69 ahụ!

IHE NDỊ MERE N’IZU NKE IKPEAZỤ

23. N’ihi gịnị ka “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndụ” na-aghaghị iji nwụọ, oleekwa mgbe nke a ga-eme?

23 Gịnị bụ ihe a ga-arụzu n’izu nke 70 ahụ? Gebriel kwuru na e kpebiwo “iri izu asaa” maka “ime ka njehie bie, na ime ka mmehie gwụsịa, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighị ebi bata, na ịkachite ọhụụ na amụma akara, na ite [Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile mmanụ.” Iji mezuo nke a, “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” aghaghị ịnwụ. Olee mgbe? Gebriel kwuru, sị: “Mgbe [iri izu isii na abụọ] ahụ gasịrị a ga-ebipụ onye e tere mmanụ, ọ dịghịkwa ihe ọ ga-enwe. . . . Ọ ga-emekwa ka otu ọgbụgba ndụ siere ọtụtụ mmadụ ike otu izu: ọ bụkwa ná nkera izu ahụ ka ọ ga-eme ka àjà na onyinye ịnata ihu ọma kwụsị.” (Daniel 9:26a, 27a) Oge dị oké mkpa bụ “ná nkera izu ahụ,” ya bụ, n’etiti izu ikpeazụ nke izu ndị ahụ bụ́ afọ.

24, 25. (a) Dị ka e buru n’amụma, olee mgbe Kraịst nwụrụ, gịnịkwa ka ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya kwụsịrị? (b) Gịnị ka ọnwụ Jisọs mere ka o kwe omume?

24 Ozi ihu ọha Jisọs Kraịst malitere ná ngwụsị nke afọ 29 O.A. ma dịgide ruo afọ atọ na ọkara. Dị ka e buru n’amụma, e ‘bipụrụ’ Kraịst ná mmalite nke afọ 33 O.A. mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, na-enye ndụ mmadụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 53:8; Matiu 20:28) E nwekwaghị mkpa maka iji ụmụ anụmanụ na-achụ àjà na inye onyinye ịnata ihu ọma ndị e depụtara n’Iwu ahụ mgbe Jisọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite nyefere Chineke uru nke ndụ mmadụ ya o jiri chụọ àjà, n’eluigwe. Ọ bụ ezie na ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu nọgidere na-achụ àjà ruo mgbe e bibiri ụlọ nsọ Jerusalem na 70 O.A., Chineke adịghịkwa anabata àjà ndị dị otú ahụ. E jiriwo àjà ka mma dochie ha, bụ́ nke a na-agaghị achụghachi ma ọlị. Pọl onyeozi dere, sị: “[Kraịst] chererịị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie . . . N’ihi na O sitewo n’iche Onwe ya n’ihu Chineke dị ka àjà otu mgbe mee ka ndị a na-edo nsọ zuo okè mgbe nile.”—Ndị Hibru 10:12, 14.

25 Ọ bụ ezie na mmehie na ọnwụ nọgidere na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti, mbipụ e bipụrụ Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya gaa ná ndụ eluigwe mezuru amụma. O ‘mere ka njehie bie, mee ka mmehie gwụsịa, kpuchite ajọ omume, meekwa ka ezi omume bata.’ Chineke ewepụwo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, bụ́ nke gbaworo ndị Juu ọtọ, maakwa ha ikpe dị ka ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12, 19, 20; Ndị Galetia 3:13, 19; Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Ugbu a, a pụrụ ịkagbu mmehie nke ndị mmehie nwere nchegharị, a pụkwara iwepụ ntaramahụhụ ndị so ya. Site n’àjà ịjụrụ obi nke Mesaịa chụrụ, ọ ga-ekwe ndị nwere okwukwe mee isoro Chineke dịghachi n’otu. Ha pụrụ inwe olileanya ịnata onyinye Chineke bụ́ “ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Rom 3:21-26; 6:22, 23; 1 Jọn 2:1, 2.

26. (a) Ọ bụ ezie na e wepụworị ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka ‘e mere ka o sie ike n’otu izu’? (b) Gịnị weere ọnọdụ n’ọgwụgwụ izu nke 70 ahụ?

26 Otú ahụ ka Jehova si wepụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ site n’ọnwụ Kraịst na 33 O.A. Oleezi otú a pụrụ isi kwuo na Mesaịa ‘ga-eme ka otu ọgbụgba ndụ siere ọtụtụ mmadụ ike otu izu’? N’ihi na o mere ka ọgbụgba ndụ Abraham nọgide na-adị irè. Ruo mgbe izu nke 70 ahụ gwụrụ, Chineke mere ka ngọzi nke ọgbụgba ndụ ahụ rute ụmụ Abraham bụ́ ndị Hibru. Ma n’ọgwụgwụ nke “iri izu asaa” ahụ nke afọ, na 36 O.A., Pita onyeozi mere nkwusa nye onye Itali ahụ ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ Kọniliọs, ezinụlọ ya, na ndị Jentaịl ndị ọzọ. Sitekwa n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, a malitere ikwusa ozi ọma ahụ n’etiti ndị mba ọzọ.—Ọrụ 3:25, 26; 10:1-48; Ndị Galetia 3:8, 9, 14.

27. “[Ebe, NW] nsọ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” dị aṅaa ka e tere mmanụ, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

27 Amụma ahụ kwukwara banyere ite “[Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” mmanụ. Nke a adịghị ezo aka n’ite Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, ma ọ bụ nkebi nke kasị dịrị n’ime, nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, mmanụ. Okwu ahụ bụ́ “[Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” n’ebe a na-ezo aka n’ebe nsọ eluigwe nke Chineke. N’ebe ahụ, Jisọs chere uru nke àjà mmadụ ya n’ihu Nna ya. Àjà ahụ tere ebe ime mmụọ ahụ dị n’eluigwe, nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu elu ala nakwa nke ụlọ nsọ ahụ e mesịrị wuo nọchitere anya ya, mmanụ, ma ọ bụ debe ya iche.—Ndị Hibru 9:11, 12.

AMỤMA AHỤ NKE CHINEKE KWADORO

28. Gịnị ka “ịkachite ọhụụ na amụma akara” pụtara?

28 Amụma ahụ banyere Mesaịa bụ́ nke mmụọ ozi Gebriel kwupụtara kwukwara banyere “ịkachite ọhụụ na amụma akara.” Nke a pụtara na ihe nile e buru n’amụma banyere Mesaịa—ihe nile ọ rụzuru site n’àjà, mbilite n’ọnwụ, na mpụta ya n’eluigwe, tinyekwara ihe ndị ọzọ merenụ n’ime izu nke 70 ahụ—bụ ndị a ga-eji nkwado Chineke kaa akara, ha ga-abụkwa eziokwu, a pụkwara ịtụkwasị ha obi. A ga-akachite ọhụụ ahụ akara, ọ ga-emezukwa nanị n’isi Mesaịa. Ọ ga-emezu n’ahụ ya nakwa n’ọrụ Chineke ji ya na-arụ. Ọ bụ nanị n’ihe metụtara Mesaịa ahụ e buru n’amụma ka anyị pụrụ ịchọta nkọwa ziri ezi banyere ọhụụ ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ nke ga-ekpughe ihe ọ pụtara.

29. Gịnị ga-eme Jerusalem e wughachiri ewughachi, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

29 Gebriel ebuwo amụma na mbụ na a ga-ewughachi Jerusalem. Ugbu a ọ na-ebu amụma banyere mbibi nke obodo ahụ e wughachiri na ụlọ nsọ ya, na-asị: “Ọ bụkwa obodo ahụ na ebe nsọ ahụ ka ndị nke otu onye ndú nke gaje ịbịa ga-ebibi; ma ọgwụgwụ ya ga-adị ná nrubiga ókè dị ka nke mmiri, ọ bụkwa ruo ọgwụgwụ mgbe ahụ ka agha ga-adị; ihe a kara aka bụ ịtọgbọrọ n’efu dị iche iche. . . . Ọ bụkwa n’elu nku ihe arụ dị iche iche ka otu onye nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu ga-abịa: ọ bụkwa ruo mgbe a ga-awụkwasị ngwụsị na ihe a kara aka n’ahụ onye ahụ na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Daniel 9:26b, 27b) Ọ bụ ezie na ịtọgbọrọ n’efu a ga-ewere ọnọdụ mgbe “iri izu asaa” ahụ gasịrị, ọ ga-abụ kpọmkwem ihe ndị si n’ihe ndị mere ‘n’izu’ ikpeazụ ahụ pụta, mgbe ndị Juu jụrụ Kraịst, gbuokwa ya.—Matiu 23:37, 38.

30. Dị ka e gosiri site n’ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme, olee otú iwu nke Onye Ukwu ahụ Na-edebe Oge si mezuo?

30 Ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme na-egosi na usuu ndị agha Rom gbara Jerusalem gburugburu na 66 O.A., n’okpuru idu ndú nke Gọvanọ Cestius Gallus nke Siria. N’agbanyeghị nguzogide ndị Juu guzogidere ha, ndị agha Rom ahụ bu ihe nnọchianya, ma ọ bụ ọkọlọtọ ikpere arụsị ha, banyere n’obodo ahụ ma malite igwu ala n’okpuru mgbidi ụlọ nsọ ahụ n’akụkụ ebe ugwu. Nguzo ha guzo n’ebe ahụ mere ka ha bụrụ “ihe arụ” nke pụrụ ịkpata ịtọgbọrọ n’efu kpam kpam. (Matiu 24:15, 16) Na 70 O.A., ndị Rom n’okpuru Ọchịagha Titus bịara dị ka ‘nrubiga ókè nke mmiri’ wee mee ka obodo ahụ na ụlọ nsọ ya tọgbọrọ n’efu. Ọ dịghị ihe gbochiri ha, n’ihi na Chineke enyewo iwu—‘kaa nke a akara.’ Onye Ukwu ahụ Na-edebe Oge, bụ́ Jehova, emezuwo okwu ya ọzọ!

GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?

• Mgbe afọ 70 nke ịtọgbọrọ n’efu Jerusalem na-abịaru ná ngwụsị ya, olee arịrịọ amara Daniel rịọrọ Jehova?

• Olee otú “iri izu asaa” ahụ hàruru n’ogologo, oleekwa mgbe ha malitere nakwa mgbe ha gwụrụ?

• Olee mgbe “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” pụtara, ọ bụkwa n’oge dị aṅaa dị oké mkpa ka ‘e bipụrụ’ ya?

• Olee ọgbụgba ndụ ‘e mere ka o siere ọtụtụ mmadụ ike otu izu’?

• Gịnị weere ọnọdụ mgbe “iri izu asaa” ahụ gwụsịrị?

Igbe dị na peeji nke 197]

Olee Mgbe Ọchịchị Ataksakses Malitere?

E NWEGHỊ nkwekọ n’etiti ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere afọ ọchịchị Eze Ataksakses nke Peasia malitere. Ụfọdụ ekwuwo na ọ malitere ọchịchị n’afọ 465 T.O.A. n’ihi na nna ya, bụ́ Xerxes, malitere ịchị na 486 T.O.A., nwụọkwa n’afọ nke 21 nke ọchịchị ya. Ma, e nwere ihe àmà na-egosi na Ataksakses rịgooro n’ocheeze na 475 T.O.A. ma malite afọ mbụ nke ọchịchị ya na 474 T.O.A.

Ihe odide na ihe ndị a kpụrụ akpụ ndị e gwupụtara n’ala n’isi obodo oge ochie nke Peasia bụ́ Persepolis na-egosi ọchịchị e jikọtara aka chịa n’etiti Xerxes na nna ya, bụ́ Daraịọs nke Mbụ. Ọ bụrụ na nke a dịruru afọ 10, Xerxes achịakwa nanị ya ruo afọ 11 mgbe Daraịọs nwụsịrị na 486 T.O.A., afọ mbụ nke ọchịchị Ataksakses ga-abụworị 474 T.O.A.

Ihe àmà nke abụọ bụ banyere Ọchịagha Themistocles nke Atens, bụ́ onye meriri ndị agha Xerxes na 480 T.O.A. O mesịrị bụrụ onye ndị Gris na-enweghị mmasị n’ebe ọ nọ, e bokwara ya ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru. Themistocles gbara ọsọ ma gbaga n’obí eze Peasia, bụ́ ebe a nabatara ya nke ọma. Dị ka onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Thucydides si kọọ, nke a mere mgbe Ataksakses “ka nọkwasịchara n’ocheeze n’oge na-adịbeghị anya.” Onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere bụ́ Diodorus Siculus na-ekwu na Themistocles nwụrụ na 471 T.O.A. Ebe ọ bụ na Themistocles rịọrọ ka e nye ya otu afọ iji mụta asụsụ Persian tupu ya na Eze Ataksakses enwee mkparịta ụka, ọ ghaghị ịbụ na ọ bịarutere n’Asia Minor n’oge na-adịghị anya karịa 473 T.O.A. Chronicle of Eusebius nke Jerome dere kwadoro ụbọchị ahụ. Ebe Ataksakses “ka nọkwasịchara n’ocheeze n’oge na-adịbeghị anya” mgbe Themistocles bịarutere n’Esia na 473 T.O.A., onye ọkà mmụta bụ́ onye Germany bụ́ Ernst Hengstenberg kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Christology of the Old Testament na ọchịchị Ataksakses malitere na 474 T.O.A., dịkwa ka akwụkwọ ndị ọzọ si kwuo. Ọ gbakwụnyere, sị: “Afọ nke iri abụọ nke Ataksakses bụ afọ 455 tupu Kraịst.”

[Foto]

Ihe a kpụrụ akpụ nke na-egosi isi na obi Themistocles

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke nke 188, 189]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

“IRI IZU ASAA”

455 T.O.A 406 T.O.A. 29 O.A. 33 O.A. 36 O.A.

“Okwu ahụ E wughachi Mesạia E bipụ Ọgwụgwụ

iwughachi . . . Jerusalem apụta Mesaịa nke “iri izu

Jerusalem” asaa” ahụ”

Izu 7 izu 62 1 izu

afọ 49 afọ 434 afọ 7

[Foto dị na peeji nke nke 180]

[Foto dị na peeji nke nke 193]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya