Jehova Abụwo Nkume M Dị Elu
Dị Ka Emmanuel Lionoudakis Si Kọọ
Nne m gbarụrụ ihu ma gwa m, sị: “Ọ bụrụ na ị nọgidesie ike ná mkpebi gị, mgbe ahụ ị ghaghị isi n’ụlọ a pụọ.” Ekpebiwo m ikwusa Alaeze Chineke oge nile. Otú ọ dị, ezinụlọ m apụghị ịnagide mmechuihu njide a na-ejide m ugboro ugboro na-ewetara ha.
NNE na nna m dị umeala n’obi ma na-atụ egwu Chineke. Ha bi n’obodo nta bụ́ Douliana, n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke àgwàetiti Gris bụ́ Krit, bụ́ ebe a mụrụ m n’afọ 1908. Site n’oge m bụ onye ntorobịa gawa, ha kụziiri m ịtụ egwu Chineke na ịkwanyere Ya ùgwù. Enwere m mmasị n’Okwu Chineke, ọ bụ ezie na ahụtụbeghị m Bible n’aka ndị nkụzi ma ọ bụ ndị ụkọchukwu Ọtọdọks nke Gris.
Mgbe otu onye agbata obi anyị gụsịrị mpịakọta isii nke Studies in the Scriptures, nke C. T. Russell dere, nakwa akwụkwọ bụ́ The Harp of God, o ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ m ihe ndị na-emepe anya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ndị dị na ha. Ọ bụ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bipụtara akwụkwọ ndị ahụ. Eji m obi ụtọ nweta otu Bible na akwụkwọ ụfọdụ site n’ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Atens. M ka na-echeta mgbe mụ na onye agbata obi anyị ahụ na-anọru n’ime ime abalị, na-ekpegara Jehova ekpere, jirikwa ìhè ọkụ kandụl na-amụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị ahụ.
Adị m afọ 20 ma na-akụzi ihe n’obodo nta dị nso mgbe m malitere isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ọmụma Bible m chọtara ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya, anyị mmadụ anọ nọ na-enwechi nzukọ ọmụmụ Bible anya na Douliana. Anyị kesakwara traktị, akwụkwọ nta, akwụkwọ ukwu, na Bible iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, Alaeze Chineke.
Na 1931 anyị so n’ime ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa bụ́ ndị nakweere aha ahụ dabeere na Bible bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10) N’afọ sochirinụ, anyị keere òkè ná mkpọsa ihe ọmụma, na-akọwara ndị ọchịchị aha ọhụrụ anyị na ihe ọ pụtara. Nke a gụnyere inye ụkọchukwu, ọkàikpe, onye uwe ojii, na onye ọchụ ntá ego ọ bụla nọ n’ógbè anyị otu akwụkwọ nta kwuru maka ya.
Dị ka a tụrụ anya ya, ndị ụkọchukwu kpalitere mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. N’oge mbụ e jidere m, a tụrụ m mkpọrọ ụbọchị 20. N’oge na-adịghị anya a hapụsịrị m, e jidere m ọzọ ma tụọ m mkpọrọ otu ọnwa. Mgbe otu ọkàikpe kwuru ka anyị kwụsị ime nkwusa, anyị ji okwu ndị dị n’Ọrụ Ndị Ozi 5:29 zaghachi: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” Mgbe e mesịrị, na 1932, onye nnọchiteanya Watch Tower letara ìgwè nta anyị nọ na Douliana, e mekwara anyị nile bụ́ mmadụ anọ baptism.
Ịchọta Ezinụlọ Ime Mmụọ
N’ihi ọchịchọ m imekwu ihe n’ọrụ nkwusa ahụ, agbara m arụkwaghị m n’ọrụ nkụzi m. Nke ahụ ka nne m na-enweghịzi ike ịnabata. Ọ gwara m ka m si n’ụlọ pụọ. Site ná nkwado nke alaka ụlọ ọrụ Watch Tower dị n’Atens, otu nwanna nwoke bụ́ onye Kraịst na-emesapụ aka nke nọ n’obodo ukwu bụ́ Iráklion, Krit, ji obi ụtọ nabata m n’ụlọ ya. Ya mere n’August 1933, ụmụnna si n’obodo nta anyị, tinyere ụfọdụ ndị nwere mmasị, bịara n’ebe a na-aba bọs iji sị m gaa nke ọma. Nke a bụ oge na-emetụ nnọọ n’ahụ, anyị nile kwakwara ákwá, ebe ọ bụ na anyị ejighị n’aka mgbe anyị ga-ahụ ibe anyị ọzọ.
N’Iráklion, aghọrọ m akụkụ nke otu ezinụlọ ime mmụọ na-ahụ n’anya. E nwere ụmụnna nwoke atọ ndị ọzọ na otu nwanna nwanyị bụ́ ndị Kraịst anyị na ha so na-ezukọchi anya maka ọmụmụ ihe na ofufe. Apụrụ m ịhụ n’onwe m mmezu nke nkwa Jisọs, bụ́: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne.” (Mak 10:29, 30) Ọrụ e kenyere m bụ ime nkwusa n’obodo ukwu ahụ nakwa n’obodo nta ndị dị ya nso. Mgbe m mezuru nkwusa n’obodo ukwu ahụ, agara m n’ihu n’obodo nta ndị dị n’Iráklion na Lasithion.
Ọsụ Ụzọ Nanị Ya Nọ
Ana m etinye ọtụtụ awa n’ịga ije site n’otu obodo nta gaa n’ọzọ. Ọzọkwa, aghaghị m iburu akwụkwọ ndị e biri ebi ruru ọtụtụ kilogram, ebe ọ bụ na a dịghị ebubatakebe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ebe ọ bụ na enweghị m ebe m ga-ehi ụra, ana m abanye n’otu ebe a na-ere kọfị n’obodo nta ahụ, chere ruo mgbe onye ahịa nke ikpeazụ lara—nke na-abụkarị mgbe ọ gaferela etiti abalị—rahụ n’elu oche, ma bilie n’isi isi ụtụtụ tupu onye nwe ya amalite ire ihe ọṅụṅụ. Akpịrị ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ sooro m na-edina n’oche ahụ.
Ọ bụ ezie na ndị ahụ na-emeghachikarị omume n’ụzọ jụrụ oyi, enwere m obi ụtọ inye Jehova ike ntorobịa m. Mgbe m hụrụ onye nwere mmasị n’eziokwu Bible, ọ na-eme ka mkpebisi ike m ịnọgide n’ozi a na-azọpụta ndụ dịghachi ọhụrụ. Ọ na-enyekwa m ume ọhụrụ isoro ụmụnna ime mmụọ m na-akpakọrịta. Ana m ezute ha mgbe ụbọchị 20 ruo 50 m na-anọghị ya gasịrị, na-adabere n’otú ebe m na-eme nkwusa dịruru anya site n’obodo ukwu bụ́ Iráklion.
M ka na-echeta nke ọma otú owu maruru m n’otu ehihie, karịsịa mgbe m chetara na ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst nọ n’Iráklion ga-enwe nzukọ ha na-enwechi anya n’anyasị ahụ. Ọchịchọ m nwere ịhụ ha siri nnọọ ike nke na m kpebiri iji ụkwụ gaa ihe karịrị kilomita 25 ahụ kewapụrụ m n’ebe ha nọ. Ejetụbeghị m ije ọkụ ọkụ otú ahụ. Lee ihe nkasi obi ọ bụ isoro ụmụnna m nwee mkpakọrịta dị mma n’anyasị ahụ nakwa inweghachi ume n’ụzọ ime mmụọ!
N’oge na-adịghị anya, mgbalị siri ike m na-eme ná nkwusa malitere ịmị mkpụrụ. Dị ka ọ dị n’oge ndị ozi, ‘Onyenwe anyị na-atụkwasịrị anyị ndị a na-azọpụta.’ (Ọrụ 2:47) Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-efe Jehova malitere ịrị elu na Krit. Ka ndị ọzọ na-esonyere m n’ozi, owu anaghịzi ama m. Anyị diri ihe isi ike anụ ahụ na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. Ihe oriri anyị kwa ụbọchị bụ bred, tinyere àkwá, olive, ma ọ bụ akwụkwọ nri ọ bụla anyị pụrụ iji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gbanwere n’aka ndị anyị mere nkwusa nye.
N’obodo bụ́ Ierápetra, n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Krit, emere m nkwusa nye Minos Kokkinakis, bụ́ onye na-ere ákwà. N’agbanyeghị mgbalị m nọgidere na-eme iji malite ịmụrụ ya Bible, o nwere ohere dị nta n’ihi ụzọ ndụ ya nke iji ọrụ n’aka. Otú ọ dị, mgbe o mesịrị kpebie ịdị uchu n’ọmụmụ ihe ya, o mere mgbanwe ndị dị ngwa ná ndụ ya. Ọ ghọkwara onye nkwusa nke ozi ọma ahụ na-anụ nnọọ ọkụ n’obi ma dị irè. Mgbanwe ndị a masịrị Emmanuel Paterakis, bụ́ onye dị afọ 18 nke na-arụrụ Kokkinakis ọrụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ rịọrọ ka e nye ya akwụkwọ e ji amụ Bible. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ ya ka ọ nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ ma mesịa ghọọ onye ozi ala ọzọ!a
Ka ọ dịgodị, ọgbakọ nke dị n’obodo m nọgidere na-eto, o nwekwara ndị nkwusa 14 ugbu a. Agaghị m echefu ụbọchị m gụrụ akwụkwọ ozi nwanne m nwanyị, bụ́ Despina, dere, na-ekwupụta na ya na nne na nna m anabatawo eziokwu ahụ, na ha bụzikwa ndị na-efe Jehova e mere baptism!
Ịnagide Mkpagbu na Nchụpụ
Chọọchị Ọtọdọks nke Gris malitere ile ọrụ nkwusa anyị anya dị ka ihe otiti nke ìgwè igurube na-emebi ihe, ha kpebisikwara ike iwepụ anyị kpam kpam. Na March 1938, a kpọpụtara m n’ihu ọkà iwu obodo, bụ́ onye kwuru ka m hapụ ógbè ahụ ozugbo. Azaghachiri m na ọrụ anyị bara uru n’ezie nakwa na ọ bụ onye ọchịchị ka elu, bụ́ Eze anyị Jisọs Kraịst, nyere anyị iwu ịrụ ya.—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8.
N’echi ya, a kpọrọ m òkù n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n’ógbè ahụ. A gwara m n’ebe ahụ na e werewo m dị ka onye dị ize ndụ nye ọha na eze, a makwara m ikpe ịchụga m n’àgwàetiti Aegean nke Amorgos ruo otu afọ. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, a tụrụ m ịgà ma jiri ụgbọ epeepe buga m n’àgwàetiti ahụ. E nweghị Ndịàmà Jehova ọzọ nọ n’Amorgos. Chee echiche ihe ijuanya m nwere mgbe m chọpụtara, ka ọnwa isii gasịrị, na a chụtawo Onyeàmà ọzọ n’àgwàetiti ahụ! Ònye ka ọ ga-abụ? Ọ bụ Minos Kokkinakis, bụ́ onye m nọ na-amụrụ Bible na Krit. Lee obi ụtọ m nwere inwe onye ibe ime mmụọ! Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, enwere m ihe ùgwù nke ime ya baptism na mmiri nke Amorgos.b
N’oge na-adịghị anya mgbe m laghachiri Krit, e jidere m ọzọ, na nke ugbu a kwa, a chụgara m n’obodo nta bụ́ Neapolis dị n’àgwàetiti ahụ ruo ọnwa isii. Mgbe ọnwa isii nke m ga-ebi n’ala ọzọ bịara ná njedebe, e jidere m, tụọ m mkpọrọ ụbọchị iri, ma kpọgazie m ịnọ ruo ọnwa anọ n’otu àgwàetiti e debere maka ndị òtù ọchịchị Kọmunist a chụpụrụ achụpụ. Aghọtara m otú okwu Pọl onyeozi bụruru eziokwu: “A ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:12.
Mmụba n’Agbanyeghị Mmegide
N’ihi mbichi ndị Germany bichiri Gris n’afọ 1940-1944, ọ fọrọ nke nta ka ọrụ nkwusa anyị kwụsị. Otú ọ dị, a hazigharịrị ndị Jehova nọ na Gris ngwa ngwa, anyị malitekwara ọrụ nkwusa anyị n’isi. Ná mgbalị iji rụzuo ihe ndị anyị gaara arụzu n’oge ndị ahụ furu efu, anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na ịdị uchu na-arụ ọrụ Alaeze ahụ.
Dị ka a tụrụ anya ya, mmegide okpukpe bikwaara ọkụ ọzọ. Mgbe mgbe, ndị ụkọchukwu Ọtọdọks nke Gris ga-eme ihe ndị na-erughịrị ha. N’otu n’ime obodo nta ndị ahụ, otu ụkọchukwu kpaliri otu ìgwè na-eme ihe ike megide anyị. Ụkọchukwu ahụ n’onwe ya malitere ịkụ m ihe ka nwa ya nwoke si m na-azụ na-emekwa otu ihe ahụ. Agbagara m n’otu ụlọ dị nso maka nchebe, ebe a dọkpụụrụ onye mụ na ya na-eso eme nkwusa gaa n’ámá nke obodo nta ahụ. N’ebe ahụ, ìgwè ahụ na-eme ihe ike dọkasịrị akwụkwọ ya, otu nwanyị nọgidekwara na-eti mkpu site na varanda ya na-asị, “Gbuonụ ya!” N’ikpeazụ, otu dọkịta na otu onye uwe ojii na-agafe agafe bịara napụta anyị.
Mgbe e mesịrị, na 1952, e jidere m ọzọ ma chụpụ m ruo ọnwa anọ, bụ́ nke m nọrọ na Kastelli Kissamos, Krit. Ozugbo nke ahụ gasịrị, anatara m ọzụzụ ileta ọgbakọ dị iche iche ma wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe m rụsịrị ụdị ọrụ njegharị a ruo afọ abụọ, alụrụ m otu nwanna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye Kraịst, nke aha ya bụ́ Despina bụ́ ogbo nwanne m nwanyị, bụ́ onye gosipụtaworo onwe ya ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe nke na-efe Jehova kemgbe. Mgbe agbamakwụkwọ anyị gasịrị, e kenyere m ọrụ dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Hania, Krit, bụ́ ebe m ka na-eje ozi.
N’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 70 nke ozi oge nile, ejezuwo m akụkụ ka ukwuu nke Krit—àgwàetiti dị square kilomita 8,300, nke gbasapụrụ ruo ihe dị ka kilomita 250 n’ịdị ogologo. Obi ụtọ m kasị ukwuu abịawo site n’ịhụ ka Ndịàmà ole na ole nọ n’àgwàetiti a n’afọ ndị 1930 si mụbaa ruo ihe karịrị 1,100 ndị nkwusa Alaeze Chineke na-arụsi ọrụ ike taa. Ana m ekele Jehova maka inye m ohere ikere òkè n’inyere ọtụtụ n’ime ndị a aka inweta ezi ihe ọmụma sitere na Bible nakwa olileanya dị ebube maka ọdịnihu.
Jehova, “Onye Na-eme Ka M Gbapụ”
Ahụmahụ akụziworo m na ọ na-ewe ntachi obi na ndidi iji nyere ndị mmadụ aka ịmara ezi Chineke ahụ. Jehova na-eji mmesapụ aka enye àgwà ndị a a na-achọsi ike. N’ime afọ 67 nke ozi oge nile m, atụgharịwo m uche mgbe mgbe n’okwu Pọl onyeozi, bụ́: “N’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, n’ime oké ntachi obi, n’ime mkpagbu, n’ime mkpa, n’ime oké mkpa, n’ime ihe otiti, n’ime ụlọ mkpọrọ, n’ime aghara, n’ime ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ, n’ime ịmụrụ anya, n’ime obubu ọnụ.” (2 Ndị Kọrint 6:4, 5) Karịsịa n’afọ ndị mbụ nke ije ozi m, anọrọ m nnọọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ụzọ ego. Otú ọ dị, Jehova ahapụghị mụ na ezinụlọ m ma ọlị. O gosipụtawo onwe ya ịbụ Onye Inyeaka dị ike nke na-anọgidesi ike n’ihe. (Ndị Hibru 13:5, 6) Anyị hụrụ aka ịhụnanya ya mgbe nile ma n’ịchịkọta atụrụ ya ma n’igbo mkpa anyị.
Mgbe m leghachiri anya azụ ma hụ na, n’ụzọ ime mmụọ, ọzara etowo akwụkwọ ndụ, ana m enwe obi ike na ọrụ m abụghị ná nkịtị. Eji m ikike ntorobịa m mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Ọrụ m n’ozi oge nile abawo uru karịa nchuso ọ bụla ọzọ. Ugbu a m merela agadi, apụrụ m iji obi dum gbaa ndị na-eto eto ume ‘icheta Onye keworo ha n’ụbọchị nile nke ntorobịa ha.’—Eklisiastis 12:1.
N’agbanyeghị na m dị afọ 91, m ka na-enwe ike itinye ihe karịrị awa 120 n’ọrụ nkwusa ahụ kwa ọnwa. Kwa ụbọchị, ana m ebili n’elekere 7:30 nke ụtụtụ wee na-agba àmà nye ndị mmadụ n’okporo ámá, n’ụlọ ahịa, ma ọ bụ n’ogige ntụrụndụ. Ná nkezi, ana m enyefe ihe karịrị magazin 150 kwa ọnwa. Nsogbu ịnụ ihe na icheta ihe na-emezi ka ndụ na-esiri m ike, ma ụmụnna ime mmụọ m ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya—ezinụlọ ime mmụọ m buru ibu—gụnyere ezinụlọ nke ụmụ m ndị inyom abụọ, enyewo m ezi nkwado.
Karịsịa, amụtawo m ịtụkwasị Jehova obi. N’oge a nile, o gosipụtawo onwe ya ịbụ “nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ.”—Abụ Ọma 18:2.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta akụkọ ndụ Emmanuel Paterakis, lee Ụlọ Nche, November 1, 1996, peji nke 22-27.
b Iji hụ mmeri okwu ikpe metụtara Minos Kokkinakis, lee Ụlọ Nche, September 1, 1993, peji nke 27-31. Minos Kokkinakis nwụrụ na January 1999.
[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]
N’okpuru: Mụ na nwunye m; n’aka ekpe: n’afọ 1927; peji nke ọzọ: mụ na Minos Kokkinakis (n’aka ekpe) na Onyeàmà ọzọ ka anyị nọ n’Acropolis, 1939, n’oge na-adịghị anya mgbe anyị si n’ebe a chụgara anyị lọta