Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ
    Ụlọ Nche—2014 | Eprel 15
    • Ebe Jane na-ele James di ya na Frank nwa ya nwoke anya. Ihu ya gosiri na obi adịghị ya mma na ọ na-ahapụ ha

      E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ

      “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ . . . Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—MAT. 6:24.

      GỊNỊ KA I CHERE?

      • Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị aka ịma otú Jehova chọrọ ka anyị si na-elekọta ndị ezinụlọ anyị?

      • Olee otú ihe anyị kpebiri ime nwere ike isi gosi na anyị na-efe naanị Jehova?

      • Olee otú Jehova ga-esi agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi?

      1-3. (a) Olee nsogbu ọtụtụ ezinụlọ na-enwe taa gbasara ego? Gịnị ka ụfọdụ ezinụlọ na-eme gbasara ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye echewe echiche ịhapụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, olee ihe nwere ike ịna-echu ya ụra gbasara ịzụ ụmụ ha?

      OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Jane kwuru, sị: “Ụbọchị ọ bụla James di m lọtara ọrụ, ike na-agwụru ya n’ọkpụkpụ. Ma, ego a na-akwụ ya ehighị nne. Ọ bụ naanị nri ọnụ ka ọ na-ezuru anyị.a Achọrọ m ime ka ihe dịtụrụ di m mfe, chọọkwa ka nwa anyị nwoke aha ya bụ Frank nweta ihe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe ya nwere.” Jane chọkwara inyere ndị ikwu ya ndị ọzọ aka, dewekwa ego buru ibu maka echi. Ọtụtụ ndị enyi ya agaala mba ọzọ ka ha kpatakwuo ego. Ma, o chechaala otú ọ ga-esi kwaga mba ọzọ, ya ana-eme ya obi abụọ. N’ihi gịnị?

      2 Ụjọ na-atụ Jane ma o cheta ihe nwere ike ime ma ya hapụ di ya na nwa ha gaa mba ọzọ. Ezinụlọ ha na-efekọ Jehova. Olee otú ha ga-esi na-eme ya ma ọ gaa biri ná mba ọzọ? O chetakwara ndị o yiri ka hà ka na-efe Jehova n’agbanyeghị na di ha ma ọ bụ nwunye ha gara biri ná mba ọzọ. Ma, ọ nọ na-eche otú ọ ga-esi nọrọ ná mba ọzọ na-azụ Frank nwa ha. Ọ̀ ga-esili n’Ịntanet na-azụ ya ma na-akụziri ya ka ọ na-efe Jehova?—Efe. 6:4.

      3 Jane jụrụ ndị ọzọ ihe ọ ga-eme. Di ya achọghị ka ọ gaa biri ná mba ọzọ. Ma, ọ gwara ya na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịga na ya agaghị asị ya agala. Ndị okenye na ụfọdụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha gwara ya agala, ma ụfọdụ ụmụnna nwaanyị gwara ya na o kwesịrị ịga. Ha gwara ya, sị: “I kwesịrị ịga ma ọ bụrụ na ị hụrụ ezinụlọ gị n’anya. Ị ka nwere ike ịnọ n’ebe ahụ na-efe Jehova.” N’agbanyeghị na ọ na-eme ya obi abụọ, ọ gwara di ya na nwa ha nwoke ka ha nọrọ nke ọma ma gawa ịchọ ọrụ ná mba ọzọ. Ọ gwara ha, sị: “Agaghị m anọte aka.”

      ỌRỤ EZINỤLỌ NA IHE BAỊBỤL KWURU

      4. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ahapụ ezinụlọ ha gaa mba ọzọ? Ọ bụrụ na mmadụ ahapụ ezinụlọ ya gaa mba ọzọ, olee ndị na-azụkarị ụmụ ya?

      4 Jehova achọghị ka agụụ na-agụgbu ndị ohu ya. (Ọma 37:25; Ilu 30:8) Kemgbe ụwa, e nweela ndị ohu Chineke gara biri ná mba ọzọ ka ha hụ ihe ha ga-eri. Jekọb zigara ụmụ ya Ijipt ka ha gaa zụta nri n’ihi na ọ chọghị ka agụụ gụgbuo ezinụlọ ya.b (Jen. 42:1, 2) Ma, ihe mere ọtụtụ ndị ji aga mba ọzọ taa abụghị ka agụụ ghara ịgụgbu ha. Gịnịzi mere ha ji aga? Ọtụtụ n’ime ha ji nnukwu ụgwọ. E nwekwara ndị nke bi n’ebe ihe siri ezigbo ike. Ha nwere ike ịhapụ ezinụlọ ha gaa biri n’ebe ịkpata ego ga-adịrị ha mfe n’ihi na ha chọrọ ịzụ ihe ndị ọgbara ọhụrụ ma na-ebi ndụ okomoko. Ọ na-abụkarị ndị ọzọ na-azụ ụmụ nne ha ma ọ bụ nna ha hapụrụ gaa mba ọzọ. O nwere ike ịbụ nwanne ha nke okenye, nne nne ha na nna nna ha, ndị ikwu ha ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị enyi mama ha ma ọ bụ papa ha. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ewute onye hapụrụ di ya, nwunye ya, ma ọ bụ ụmụ ya gaa na-arụ ọrụ ná mba ọzọ, ọ na-adị ọtụtụ ndị mere ụdị ihe a ka o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme.

      5, 6. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala? (b) Olee ihe Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke meere anyị? (ch) Olee otú Jehova si agọzi anyị?

      5 N’oge Jizọs, e nwere ọtụtụ ndị ogbenye. O nwere ike ịbụ na ha chere na ọ bụrụ na ha akpatakwuo ego, ọ ga-eme ka ha nwekwuo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa ha ala. (Mak 14:7) Ma, Jizọs achọghị ka obi ha dịrị n’ihe ndị na-agaghị adịte aka. Ọ chọrọ ka ha tụkwasị Jehova obi n’ihi na ngọzi ya na-adịru mgbe ebighị ebi. N’ihe Jizọs kụziri mgbe ọ nọ n’elu ugwu, o kwuru na ihe ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala, bụ anyị na Jehova ịdị ná mma, ọ bụghị ihe ndị anyị nwere ma ọ bụ mbọ anyị na-agba ka ihe dịrị anyị ná mma.

      6 N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs akụzirighị anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka anyị baa ọgaranya. Kama, ọ kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị nri “maka ụbọchị taa.” Ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa . . . Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” (Mat. 6:9, 11, 19, 20) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị otú ahụ o kwuru. Ihe ọ pụtara abụghị naanị na anyị na ya ga-adị ná mma. Ọ pụtakwara na ọ ga-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa. Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala, bụ ịtụkwasị Jehova, Nna anyị hụrụ anyị n’anya, obi, kama ịtụkwasị ego obi.—Gụọ Matiu 6:24, 25, 31-34.

      7. (a) Ole ndị ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ? (b) Gịnị mere nne na nna kwesịrị iji gbakọọ aka na-azụ ụmụ ha?

      7 ‘Ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke’ pụtara na anyị ga-ewere ọrụ anyị n’ezinụlọ otú Jehova si were ya. Dị ka ihe atụ, n’Iwu Mozis, a gwara ndị nne na nna ka ha na-akụziri ụmụ ha okwu Chineke. Ndị Kraịst kwesịkwara ime otú ahụ ka obi dị Jehova mma. (Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7.) Ọ bụ nne na nna ka Chineke nyere ọrụ a, ọ bụghị ndị nne nne na ndị nna nna ma ọ bụkwanụ onye ọzọ. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Jehova chọrọ ka ezinụlọ bikọta ọnụ ka nne na nna nwee ike ịna-akụziri ụmụ ha okwu ya ma na-eduzi ha. (Ilu 31:10, 27, 28) Ọ bụrụ na ụmụ ana-anụ ka papa ha na mama ha na-ekwu gbasara Jehova, na-ahụkwa ka ha na-ejere ya ozi kwa ụbọchị, ha nwere ike ịmụta ịna-eme otú ahụ.

      NSOGBU O NWERE IKE ỊKPATA

      8, 9. (a) Gịnị na-emekarị ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ahapụ ụmụ ya gaa biri ná mba ọzọ? (b) Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ebighị, olee nsogbu ọ na-akpata n’ezinụlọ?

      8 Tupu ọtụtụ ndị agawa mba ọzọ, ha na-ebu ụzọ chee uru na ọghọm dị na ya. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ha na-ahụ nsogbu niile o nwere ike ịkpatara ezinụlọ ha. (Ilu 22:3)c Ozugbo Jane gawara mba ọzọ, obi malitere ịjọ ya njọ na ya na di ya na nwa ha ebighịzi. Obi adịghịkwa di ya na nwa ha mma. Frank nwa ya na-ajụkarị ya, sị, “Gịnị mere i ji hapụ m?” Jane chọrọ ịnọ naanị ọnwa ole na ole n’ebe ahụ. Ma, mgbe ọ nọrọ afọ ole na ole, ọ chọpụtara na ihe agbanweela n’ezinụlọ ha, ya emee ka obi jọkwuo ya njọ. Frank nwa ya na-emezi isi ike. Ọ naghịzi agwa mama ya ihe o bu n’obi. Jane kwuru, sị, “Ọ hụghịzi m n’anya.”

      9 Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ebighị, obi nwere ike ịna-ajọ ha njọ. Obi ha agaghị abụ otu n’ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ.d Ọ na-akacha njọ ma ọ bụrụ na nne na nna hapụrụ ụmụ ha mgbe ha ka dị obere ma nọọ ọtụtụ afọ tupu ha alọta. Jane gwara Frank na ihe mere ya ji gaa mba ọzọ bụ na ya chọrọ ka ihe dịrị ya ná mma. Ma, ọ dị Frank ka mama ya ahụghịzi ya n’anya. Ná mmalite, obi adịghị ya mma na mama ya hapụrụ ya. Ma, mgbe mama ya bịara leta ya, iwe were ya na mama ya bịara. O chere na ya ekwesịghị ịhụ mama ya n’anya ma na-erubere ya isi. Ọ bụ otú ọtụtụ ụmụaka papa ha ma ọ bụ mama ha hapụrụ gaa mba ọzọ na-echekarị.—Gụọ Ilu 29:15.

      Ebe Jane na-ahụ di ya, bụ́ James, na nwa ya nwoke, bụ́ Frank, na kọmputa, ha na ya ana-akparịta ụka

      Ị gaghị esili n’Ịntanet makụọ nwa gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

      10. (a) Gịnị ga-eme ụmụaka ma ọ bụrụ na nne ha na nna ha na-enye ha onyinye kama iwepụta oge ka ha na ha na-anọ? (b) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, gịnị ka ọ na-agaghị emeliri nwa ya?

      10 Jane gbara mbọ na-ezigara Frank nwa ya ego na ihe ndị ọzọ. Ọ chọrọ isi otú ahụ mee ka ọ ghara ịna-ewute Frank na ya na ya ebighị. Ma, Jane chọpụtara na ihe a ọ na-eme mere ka nwa ya na-agbara ya ọsọ, chọpụtakwa na ọ na-akụziri ya ka ọ na-ahụ ego n’anya karịa ndị ezinụlọ ya na Jehova. (Ilu 22:6) Frank na-agwakarị ya, sị, “Alọtala. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịna-ezitere m ihe.” Jane mechara ghọta na otú ya ga-esi zụọ nwa ya abụghị ịna-edetara ya akwụkwọ ozi, ịna-akpọ ya na fon, ma ọ bụkwanụ ya na ya ịna-akparịta ụka n’Ịntanet. O kwuru, sị, “Ị gaghị esili n’Ịntanet makụọ nwa gị ma ọ bụkwanụ susuo ya ọnụ, sị ya ka chi bọọ.”

      Ebe Jane nọ n’ụlọ ọrụ, onye ọ na-arụrụ ọrụ ana-achụ ya

      Olee nsogbu i nwere ike inwe ma ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ebighị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

      11. (a) Olee nsogbu di na nwunye ga-enwe ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha agaa rụwa ọrụ ná mba ọzọ? (b) Olee mgbe Jane ghọtara na ya kwesịrị ịlakwuru di ya na nwa ha?

      11 Jane na Jehova adịghịzi ná mma otú ha dịbu. Ọ na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma naanị otu ugboro n’izu. E nwedịrị izu ndị ọ na-anaghị aga. Ya na di ya adịghịkwa ná mma otú ha dịbu. Onye ọ na-arụrụ ọrụ nọ na-enye ya nsogbu ka ha nwee mmekọahụ. Ebe ọ bụ na ya na di ya ebighị, ha nwee nsogbu, ha na-akọrọ ya ndị ọzọ kama ịkọrọ ya ibe ha. Ọ fọdịrị obere ka onye nke ọ bụla kwaa iko. N’agbanyeghị na o nweghị onye n’ime ha kwara iko, ọ ghọtara na agwọ nọ n’akịrịka. Baịbụl kwuru na di na nwunye kwesịrị ịna-eme ka obi dị ibe ha mma, na-enwekwa mmekọahụ. Ha abụọ nwere ike ikwurịta okwu mgbe ọ bụla, chịrịta ọchị, bitụ ibe ha aka, gwusa ibe ha egwu, makụọ ibe ha, ‘gosi ibe ha ịhụnanya,’ nyekwa ibe ha “ihe ruuru ya.” Ma, o nweghị otú Jane na di ya ga-esi eme ihe ndị a ebe ọ bụ na ha abụọ ebighị otu ebe. (Abụ Sọlọ. 1:2; 1 Kọr. 7:3, 5) O nweghịkwa otú ha na nwa ha ga-esi na-efekọ Jehova. Jane kwuru, sị: “Mgbe m mụtara ná mgbakọ na ezinụlọ kwesịrị ịna-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịlafere oké ụbọchị Jehova, m ghọtara na m kwesịrị ịla.” O kwesịrị ịga mee ka ya na di ya na nwa ha dị ná mma otú ha dịbu, meekwa ka ya na Jehova dị ná mma.

      NDỤMỌDỤ DỊ MMA NA NKE NA-ADỊGHỊ MMA

      12. Ọ bụrụ na e nwere onye hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, olee ihe Baịbụl kwuru e nwere ike ịgwa ya?

      12 Mgbe Jane kpebiri na ya ga-ala, o nweghị ụdị ndụmọdụ a na-enyeghị ya, ma nke ọma ma nke ọjọọ. Ndị okenye ọgbakọ ha n’ebe ahụ o bi gwara ya na ihe o kpebiri ime dị mma, na o gosiri na o nwere okwukwe na obi ike. Ma, ụmụnna ndị ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebighị gwara ya na ihe ọ chọrọ ime adịghị mma. Kama ime ka Jane, ha nọ na-asị ya, “Ị laa, ị ga-alaghachite n’oge na-adịghị anya. Oleekwanụ otú ị ga-esi na-akpata ego ga-ezuru unu?” Ụmụnna ekwesịghị ikwu ụdị okwu ahụ na-anaghị agba ume. Ha kwesịrị ịna-agwa ‘ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ ka ha hụ di ha n’anya, hụ ụmụ ha n’anya, na-arụkwa ọrụ n’ụlọ,’ ya bụ, ịna-elekọta ezinụlọ ha, “ka e wee ghara ịkatọ okwu Chineke.”—Gụọ Taịtọs 2:3-5.

      13, 14. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Jehova kwuru kama ime ihe ndị ezinụlọ anyị kwuru? Nye ihe atụ.

      13 N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị eji omenala ha na ihe papa ha na mama ha kwuru egwu egwu. Ha na-eji ha akpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ndị hapụrụ ezinụlọ ha gaa na-arụ ọrụ ná mba ọzọ toro n’ụdị ebe ahụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst akata obi mee ihe na-abụghị obi ndị ezinụlọ ya n’ihi na ọ chọrọ ime ihe Jehova kwuru, o gosiri na okwukwe onye ahụ siri ike.

      14 Ka anyị were ihe mere Angela dị ka ihe atụ. O kwuru, sị: “Mụ na di m bi ná mba ọzọ mgbe m mụrụ Ben nwa m. N’oge ahụ, ọ dịbeghị anya mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Mmadụ niile nọ n’ezinụlọ anyị chọrọ ka m kpọgara papa m na mama m Ben ruo mgbe mụ na di m kpatakwuru ego.” Mgbe Angela gwara ha na ya ga-eji aka ya zụọ nwa ya, ma ndị ezinụlọ ha ma di ya kwara ya emo, kpọọkwa ya onye umengwụ. Angela kwuru, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge ahụ, amachaghị m ihe mere na ịkpọgara papa m na mama m Ben ka ha na ya bie afọ ole na ole adịghị mma. Ma, m ma na ọ bụ mụ na di m ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ya n’ihi na ọ bụ anyị mụrụ ya.” Mgbe Angela dị ime ọzọ, di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova gwara ya ka o tee ya. Otú ahụ Angela si mee ihe dị mma na nke mbụ mere ka obi sie ya ike imekwa ihe dị Jehova mma na nke ugbu a. Obi dịzi ya na di ya na ụmụ ha ụtọ na ha ebighị iche iche. A sị na Angela kpọlaara ndị ọzọ ụmụ ya ka ha zụọ, obi agaraghị adị ha ụtọ otú ahụ.

      15, 16. (a) Olee otú e si zụọ Felicia? (b) Gịnị mere o ji kpebie na ya agaghị esi otú ahụ zụọ nwa ya nwaanyị?

      15 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Felicia kwuru, sị: “Mụ na nne nne m biri afọ ole na ole. N’oge ahụ, ọ bụ papa m na mama m na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ bi. Mgbe m mechara lakwuru ha, ahụchaghị m ha n’anya. Nwanne m nwaanyị na-akọrọ ha obi ya, na-amakụ ha, ha na ya dịkwa n’ezigbo mma. Ma, anaghị m akpacha ha nso. Mgbe m toro, o sikwaara m ike ime ka ha mata ihe m bu n’obi. Mụ na nwanne m nwaanyị kwere ha nkwa na anyị ga-elekọta ha ma ha mee agadi. Ma, ihe mere m ga-eji elekọta ha bụ na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. Ma, ihe mere nwanne m nwaanyị ga-eji mee ya bụ na ọ hụrụ ha n’anya.

      16 “Mama m chọrọ ka m kpọtara ya nwa m nwaanyị ka ọ zụọ, otú ahụ o si kpọgara m mama nke ya.” Ma, Felicia jụrụ. O kwuru, sị: “Mụ na di m chọrọ ịzụ nwa anyị ka ọ na-efe Jehova. Achọghịkwa m ime ihe ga-emecha mee ka mụ na nwa m ghara ịdị ná mma.” Felicia achọpụtala na naanị ihe mmadụ ga-eme ka ihe gaziere ya bụ ịhụ Jehova na iwu ya n’anya karịa ego na ndị ezinụlọ ya. Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ,” ya bụ, Chineke na Akụnụba.—Mat. 6:24; Ọpụ. 23:2.

      JEHOVA GA-EME KA IHE NDỊ ANYỊ NA-EME “NA-AGA NKE ỌMA”

      17, 18. (a) Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị iji na-eme ihe ziri ezi mgbe niile? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

      17 Jehova bụ Nna anyị. O kwere anyị nkwa na ya ga-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya na ezi omume ya. (Mat. 6:33) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ime ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ bụrụgodị na nsogbu tara akpụ abịara anyị, Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-emere anyị “ụzọ mgbapụ” ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.) Anyị kwesịrị ‘icheresi Jehova ike’ ma tụkwasị ya obi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere ka o nye anyị amamihe ma na-eduzi anyị, anyị ana-emekwa ihe o nyere n’iwu. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka. (Ọma 37:5, 7) Ọ ga-agọzi mbọ niile anyị na-agba ịna-efe naanị ya. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, ọ ga-eme ka ihe niile anyị na-eme “na-aga nke ọma.”—Tụlee Jenesis 39:3.

      18 Ọ bụrụ na nsogbu dị n’ezinụlọ n’ihi na di ma ọ bụ nwunye gara biri ná mba ọzọ, gịnị ka e kwesịrị ime? Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-akpata ihe ezinụlọ anyị ga-eri ma ghara ịga biri ná mba ọzọ? Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka ha ghara ịhapụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche—2014 | Eprel 15
    • Ebe Jane na James di ya makụrụ n’ọdụ ụgbọelu, Frank nwa ha ana-ele ha

      Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka

      “Nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka.’”—HIB. 13:6.

      GỊNỊ KA I CHERE?

      • Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime iji nyere ezinụlọ ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma?

      • Olee otú onyeisi ezinụlọ nwere ike isi na-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha ma ghara ịhapụ ha gaa biri ná mba ọzọ?

      • Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndị ikwu na ibe na-agwa ya ka ọ hapụ ezinụlọ ya gaa kpatawa ego ná mba ọzọ?

      1, 2. Olee nsogbu ndị hapụrụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ na-enwe ma ha lọta? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

      OTU nwoke aha ya bụ Andy kwuru, sị: “Mgbe m hapụrụ ezinụlọ m gaa biri ná mba ọzọ, m na-arụ ezigbo ọrụ, na-akpatakwa ezigbo ego.a Ma, mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, m ghọtara na e nwere ọrụ ka mkpa m kwesịrị ịrụ. Ọ bụ inyere ezinụlọ m aka ka ha na Jehova dị ná mma, ọ bụghị naanị ịna-egboro ha mkpa ha. N’ihi ya, m lọtara.”—Efe. 6:4.

      2 Andy ma na Jehova chọrọ ka ọ lakwuru nwunye ya na ụmụ ya. Ma, ọ gaghị adịrị ya mfe. Ọ ga-eme ka ya na nwunye ya na ụmụ ya dị ná mma otú ha dịbu. Ọ ga na-arụtakwa ego ọ ga-eji na-elekọta ha. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ụmụnna hà ga-enyere ya aka?

      IME KA EZINỤLỌ DỊ N’OTU, HA NA JEHOVA ADỊKWA NÁ MMA

      3. Olee otú obi na-adị ụmụaka ma papa ha ma ọ bụ mama ha hapụ ha gaa biri ná mba ọzọ?

      3 Andy kwuru, sị: “Ama m na ahapụrụ m ụmụ m mgbe m kwesịrị ịna-eduzi ha, na-emekwa ka ha mata na m hụrụ ha n’anya. Mụ na ha anọghị n’oge ahụ ka m nwee ike ịna-agụrụ ha akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl, na-amakụ ha, anyị ana-ekpekọ ekpere, na-egwukwa egwu.” (Diut. 6:7) Ada ya aha ya bụ Anna kwuru, sị: “Mgbe ahụ papa m na-anọghị ya, obi anaghị eru m ala. Mgbe ọ lọtara, ihe anyị ji mata ya bụ ihu ya na olu ya. O nwechara otú ọ dị m mgbe ọ makụrụ m.”

      4. Ọ bụrụ na nna hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri n’ebe ọzọ, gịnị mere ọ ga-eji esiri ya ike ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ?

      4 Ọ bụrụ na nwoke ebiri ebe ọzọ, nwunye ya na ụmụ ha ebiri ebe ọzọ, ọ ga-esiri ya ike ịna-arụ ọrụ onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịrụ. Nwunye Andy aha ya bụ Ruth kwuru, sị: “Tupu di m alọta, ọ bụ m bụ nne, bụrụkwa nna. Ọ bụ m na-ekpebikarị ihe a ga-eme n’ụlọ anyị. Mgbe di m lọtara, amalitere m ịmụ otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-erubere di ya isi. O nwedịrị mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ihe mee, ya adị ka m̀ chefuru na di m alọtala.” (Efe. 5:22, 23) Andy kwuru, sị: “Ụmụ anyị chọọ ime ihe, ọ bụ mama ha ka ha na-aga anara ike. Mụ na nwunye m ghọtara na anyị kwesịrị ime ka ụmụ anyị mata na anyị na-agbakọ aka ekpebi ihe ọ bụla a ga-eme. M kwesịrị ịmụta ịna-elekọta ezinụlọ m otú Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme.”

      5. Mgbe Andy lọtara, olee otú o si mee ka ezinụlọ ya dị n’otu? Gịnị mechara mee?

      5 Andy mere ihe niile o nwere ike ime ka ya na ezinụlọ ya dị ná mma, ha na Jehova adịkwa ná mma. O kwuru, sị, “Achọrọ m iji ma okwu ọnụ m ma omume m kụziere ụmụ m eziokwu dị na Baịbụl. Achọghị m ịna-ekwu naanị n’ọnụ na m hụrụ Jehova n’anya. M chọrọ ịna-egosi ya n’omume.” (1 Jọn 3:18) Jehova ọ̀ gọziri mbọ a niile Andy gbara? Anna kwuru, sị: “Ihe malitere ịdị mma mgbe anyị hụrụ otú o si na-agba mbọ ka ọ bụrụ ezigbo nna nakwa ka anyị na ya dịrị ná mma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị hụrụ otú o si na-agba mbọ n’ọgbakọ. Ụwa Setan nọ na-agbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Ma, anyị chọpụtara na ụkwụ siri papa anyị na mama anyị ike n’ọgbakọ. N’ihi ya, anyị gbara mbọ ka anyị mee ka ha. Papa anyị kwere anyị nkwa na ya agaghị ahapụ anyị ọzọ. O nweghịkwa mgbe ọ hapụrụ anyị. A sị na o mere otú ahụ, e nwere ike agaraghị m anọ ná nzukọ Jehova taa.”

      GHỌTA NA I SO KPATA NSOGBU E NWERE

      6. Gịnị ka ụfọdụ nne na nna mụtara mgbe a na-alụ agha?

      6 Ụmụaka na-achọ ka ha na papa ha na mama ha na-anọ. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-alụ agha ná mba ụfọdụ dị na Yurop, ọtụtụ ụmụnna anyị anaghị agali ọrụ. N’ihi ya, ha na ụmụ ha na-eji oge ahụ anọ. Ha na ha na-ekwurịta okwu, na-egwu egwu, ha ana-amụkwara ha Baịbụl. O mere ka obi dị ụmụ ha ụtọ n’agbanyeghị na ihe siiri ha ike. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ụmụaka chọrọ ka ha na papa ha na mama ha na-anọ. Ọ na-atọ ha ụtọ karịa inye ha ego ma ọ bụ ihe ọzọ. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụrụ na nne na nna ewepụta oge ka ha na ụmụ ha na-anọ, ha ana-akụziri ha ihe, ọ ga-abara ụmụaka ahụ uru.—Ilu 22:6.

      7, 8. (a) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna esi ná mba ọzọ lọta, olee ihe nwere ike iju ya anya? (b) Olee otú o nwere ike isi mee ka ya na ụmụ ya dịwakwa ná mma?

      7 Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna esi ná mba ọzọ lọta, ihe ọ ga-ahụ nwere ike iju ya anya. Ụmụ ya nwere ike ịna-eme ka ha achọdịghị ịma na ọ lọtala ma ọ bụkwanụ na ha atụkwasịzighị ya obi. O nwere ike ịgwa nwa ya, sị: “Olee otú m si tachaara gị ahụhụ, gị ana-eme ka obi adịghị gị ụtọ?” Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na obi adịghị nwa ahụ ụtọ na papa ya ma ọ bụ mama ya hapụrụ ya. Olee otú nne ma ọ bụ nna nwere ike isi dozie nsogbu ahụ?

      8 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghọta otú obi dị ndị ezinụlọ gị. Meekwa ka ha ghọta na ị hụrụ ha n’anya. Mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu, mee ka ha ghọta na i so kpata nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile rịọ ha mgbaghara, o nwere ike inye aka. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ gị achọpụta na ị na-agba mbọ ka ihe dị mma, ha ga-ama na ihe ị na-eme si gị n’obi. I nwee ndidi ma ghara ịda mbà, ndị ezinụlọ gị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ hụwa gị n’anya, na-akwanyekwara gị ùgwù.

      OTÚ Ị GA-ESI NA-EGBORO NDỊ EZINỤLỌ GỊ MKPA HA

      9. Gịnị mere na mmadụ ‘igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha’ apụtaghị na ọ ga-aghọ ọgaranya?

      9 Pọl onyeozi kwuru na ọ bụrụ na Ndị Kraịst mere agadi agaghị elekọtali onwe ha, ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha kwesịrị ịna-enyere ha aka. Ma, Pọl gwakwara Ndị Kraịst niile na afọ kwesịrị iju ha ma ọ bụrụ na ha nwere ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Anyị ekwesịghị ịna-agba mbọ ka anyị biwe ndụ okomoko ma ọ bụ siwe ọnwụ na anyị ga-abụrịrị ndị aka ji akụ̀. (Gụọ 1 Timoti 5:4, 8; 6:6-10.) Onye Kraịst ‘igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha’ apụtaghị na ọ ga-aghọ ọgaranya n’ụwa a a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya. (1 Jọn 2:15-17) Anyị ekwesịghị ikwe ka “ike dị aghụghọ nke akụnụba” ma ọ bụ “nchegbu nke ndụ” mee ka ezinụlọ anyị ghara ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ ya bụ, ndụ a ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke.—Mak 4:19; Luk 21:34-36; 1 Tim. 6:19.

      10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịga koro ụgwọ?

      10 Jehova ma na ego dị anyị mkpa. Ma, ego agaghị echebeli anyị ma ọ bụ baara anyị uru ka amamihe Jehova. (Ekli. 7:12; Luk 12:15) Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ anaghị ama ihe niile ịga biri ná mba ọzọ ga-efu ha. Mmadụ gaa biri ná mba ọzọ, ọ pụtaghị na onye ahụ ga-akpatarịrị ego. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere nsogbu ndị ya na ya so. Ọ na-abụ, ọtụtụ ndị hapụrụ ezinụlọ ha lọta, ụgwọ ha ji akarịa nke ha jibu. Kama inwe ohere jekwuoro Chineke ozi, ha ga na-agbara ndị ha ji ụgwọ ohu. (Gụọ Ilu 22:7.) Ọ kacha mma ka mmadụ ghara ịga koro ụgwọ.

      11. Ọ bụrụ na ezinụlọ eburu ụzọ kpebie otú ha ga-esi na-emefu ego, olee uru ọ ga-abara ha?

      11 Mgbe Andy si mba ọzọ lọta, ọ ma na ya kwesịrị ịkpachara anya n’otú ezinụlọ ya si emefu ego ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịna-elekọta ha nke ọma. Ya na nwunye ya bu ụzọ mata ihe ndị dị ha mkpa, jirizie ya kpebie ego ole ha ga na-emefu. Ihe ahụ ha kpebiri mere ka ha ghara ịna-azụ ihe otú ha na-azụbu. Ma, obi ha niile bu otu. Ha anaghị emefu ego n’ihe na-adịghị mkpa.b Andy kwuru, sị: “Dị ka ihe atụ, m kpọpụtara ụmụ m n’ụlọ akwụkwọ ndị mmadụ nwe ma kpọga ha n’ụlọ akwụkwọ dị mma gọọmenti nwe.” Ya na ndị ezinụlọ ya kpere ekpere ka o nweta ọrụ na-agaghị eme ka ha na-ala azụ n’ofufe Chineke. Olee otú Jehova si zaa ekpere ha?

      12, 13. Gịnị ka Andy mere ka o nwee ike ịna-egboro ezinụlọ ya mkpa ha? Olee otú Jehova si gọzie ihe ahụ o mere?

      12 Ruo ihe dị ka afọ abụọ, o siiri Andy ike ịkpata ihe ga-ezuru ya na ezinụlọ ya. Ego ha dewere n’ụlọ akụ̀ nọ na-agbada. Ọ rụchaa ọrụ lọta, ike na-agwụru ya n’ọkpụkpụ. Ma, o kwuru, sị: “Anyị na-aga ọmụmụ ihe niile, na-agakọkwa ozi ọma ọnụ.” O kpebiri na ya agaghị arụ ọrụ ga-eme ka ọ hapụ ezinụlọ ya ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “Kama ime otú ahụ, m mụtara ịrụ ụdị ọrụ dị iche iche. Ọ bụrụ na nke m na-arụ enweghịzi isi, mụ arụwa ọzọ.”

      Ebe Jane na ndị ezinụlọ ya na-arụ ọrụ n’ebe a na-ere nri ka ha nweta ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha

      Ì nwere ike ịmụta ịrụ ụdị ọrụ dị iche iche ka i nwee ike ịna-egboro ndị ezinụlọ gị mkpa ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

      13 Andy ji nwayọọ nwayọọ na-akwụ ụgwọ o ji. N’ihi ya, ọmụrụ nwa ọ kwụrụ maka ego ọ gbaziiri abụghị obere ihe. Ma, o weere ya na ihe ahụ niile enweghị ihe ọ bụ, ebe ọ bụ na ya na ezinụlọ ya bi, ha ejiri otu obi na-efe Jehova. Andy kwuru, sị: “E kee ego m na-akpata mgbe m bi ná mba ọzọ ụzọ iri, ego m na-akpata ugbu a erudịghị otu ụzọ. Ma, anyị anaghị anọ agụụ. ‘Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ.’ Anyị kpebiri na anyị ga-abụ ndị ọsụ ụzọ.” Ọ dịghị anya, ihe adịtụ mma n’obodo ha, ya adịtụrụ ya mfe ịna-egboro ezinụlọ ya mkpa ha.—Aịza. 59:1.

      IHE Ị GA-EME MA NDỊ IKWU GỊ NYEWE GỊ NSOGBU

      14, 15. Gịnị ka ezinụlọ nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndị ikwu ha chọrọ ka ịchụ ego mee ka ha leghara ofufe Jehova anya? Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

      14 N’ọtụtụ obodo, ụfọdụ ndị chere na ọ bụ iwu na ha ga na-enye ndị ikwu na ibe ha ego ma ọ bụ ihe ọzọ. Andy kwuru, sị: “Ọ bụ otú ndị obodo anyị na-eme. Ime otú ahụ na-atọkwa anyị ụtọ.” O kwukwara, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ga-emeli ya. M na-ewetu obi gwa ndị ikwu m na m ga-enye ha ihe otú ike kwere m, ma agaghị m eleghara mkpa ndị ezinụlọ m anya ma ọ bụ ghara inyere ha aka ka ha nọsie ike n’ofufe Chineke.”

      15 Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ahapụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, ụfọdụ ndị ikwu na ibe ya nwere ike ịna-akwa ya emo ma ọ bụ na-ewesa ya iwe. Ha nwekwara ike ime otú ahụ ma mmadụ si mba ọzọ lọta ka ya na ezinụlọ ya biri. Ha nwere ike ịna-ekwu na ọ hụghị ha n’anya ma ọ bụ na ọ naghị enyere mmadụ aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha tụrụ anya na ọ ga na-ezitere ha ego ma ọ gaa rụwa ọrụ ná mba ọzọ. (Ilu 19:6, 7) Anna, bụ́ ada Andy, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekweghị ka ịchụ ego mee ka anyị leghara ofufe Jehova anya, o nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ikwu anyị ghọta na ozi anyị na-ejere Chineke dị ezigbo mkpa. Ma, olee otú ha ga-esi aghọta ya ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ọ bụla ha chọrọ ka anyị mee?”—Tụlee 1 Pita 3:1, 2.

      NWEE OKWUKWE NA CHINEKE

      16. (a) Olee ihe na-ezighị ezi mmadụ nwere ike ịna-eche? (Jems 1:22) (b) Olee ụdị ihe anyị ga-eme ka Jehova gọzie anyị?

      16 Otu nwanna nwaanyị nke hapụrụ di ya na ụmụ ya gaa ịkpata ego ná mba ọzọ gwara ndị okenye ebe ahụ, sị: “Ịbịa ebe a furu anyị nnukwu ihe. Ọ bụdị ya mere di m ji kwụsị ịbụ okenye. N’ihi ya, enwere m olileanya na Jehova ga-agọzi ọbịbịa m bịara ebe a.” Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe ma mee ihe Jehova chọrọ, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-agọzi anyị. Ma, ọ gaghị agọzi anyị ma anyị mee ihe na-abụghị uche ya. Obi agaghịkwa adị ya mma ma ọ bụrụ na anyị kwo ihe na-enweghị isi hapụ ihe ùgwù ije ozi o nyere anyị.—Gụọ Ndị Hibru 11:6; 1 Jọn 5:13-15.

      17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji rịọ Jehova ka o duzie anyị tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme? Olee otú anyị ga-esi eme ya?

      17 Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara imecha kwaa mmakwaara. Kpee ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ na amamihe, duziekwa gị. (2 Tim. 1:7) Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ ga-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe o nwere ike ifu m? M̀ ga-ege Jehova ntị, mụ na ezinụlọ m anọrọ, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na ihe ga-esitụrụ anyị ike?’ (Luk 14:33) Jụọ ndị okenye ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ị chọrọ ime. Ha gwa gị ya, gbalịa mee ya. I mee otú ahụ, ọ pụtara na obi siri gị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere na ya ga-enyere gị aka. Ndị okenye agaghị ekpebiri gị ihe ị ga-eme. Ma, ha ga-enyere gị aka ka i mee ihe ga-emecha mee ka obi dị gị ụtọ.—2 Kọr. 1:24.

      18. Ònye kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ? Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere ya aka?

      18 Jehova chọrọ ka onyeisi ezinụlọ na-elekọta ezinụlọ ya mgbe niile. E nwere ọtụtụ ndị ọ na-adị ka ha hapụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ. Ndị ọzọ nwedịrị ike ịna-agwa ha mee otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ekpebi ka ha na ezinụlọ ha nọrọ. Anyị kwesịrị ịna-aja ha mma, na-etinyekwa ha n’ekpere. Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ma ọ̀ bụ ọdachi ma ọ̀ bụ ọrịa, anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ha n’anya nakwa na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. (Gal. 6:2, 5; 1 Pita 3:8) Ì nwere ike inyere ha aka chọta ọrụ n’ebe na-adịghị anya ma ọ bụ nye ha ego, ihe oriri, ma ọ bụ ihe ọzọ dị ha mkpa? I mee otú ahụ, ihe nwere ike ịdịtụrụ ha mfe. O nwekwara ike ime ka ha ghara ịhapụ ezinụlọ ha gaa chọwa ọrụ n’obodo ọzọ.—Ilu 3:27, 28; 1 Jọn 3:17.

      CHETA NA Ọ BỤ JEHOVA NA-ENYERE GỊ AKA

      19, 20. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie Ndị Kraịst ike na Jehova ga na-enyere ha aka?

      19 Baịbụl gwara anyị, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’ Ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’” (Hib. 13:5, 6) Olee otú anyị ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru?

      20 N’otu mba ebe ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike, otu okenye kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwukarị na obi na-adị Ndịàmà Jehova ụtọ. Ha na-achọpụtakwa na ụmụnna ndị dara ogbenye na-eji ejiji dị mma mgbe niile, ya adị ka ihe ọ̀ dịịrị ha mma karịa ndị ọzọ.” Ọ bụ otú Chineke si emezu nkwa ahụ Jizọs kwere ndị bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:28-30, 33) O doro anya na Jehova, bụ́ Nna gị nke eluigwe, hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka ihe dịrị gị na ụmụ gị ná mma. Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) O nyere anyị iwu gbasara otú a ga-esi na-ebi n’ezinụlọ nakwa otú anyị ga-esi na-egbo mkpa anyị. Ihe mere o ji nye anyị iwu ndị ahụ bụ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ọ bụrụ na anyị na-erubere iwu ndị ahụ isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi. Baịbụl kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.

      21, 22. Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị ga na-atụkwasị Jehova obi?

      21 Andy kwuru, sị: “Ama m na o nweghị otú m ga-esi weghachite oge ahụ m hapụrụ nwunye m na ụmụ m. Ma, anaghị m eche naanị banyere ihe ahụ m mejọrọ. Ọtụtụ ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ abaala ọgaranya. Ma, obi anaghị adị ha ụtọ. Ezinụlọ ha nwekwara ezigbo nsogbu. Ma, obi dị ezinụlọ anyị ụtọ. Obi na-adịkwa m ụtọ ịhụ otú ụmụnna ndị ọzọ bi n’obodo a si tụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị na ha dara ogbenye. Ihe na-emenụ mere ka obi sie anyị ike na nkwa ahụ Jizọs kwere bụ eziokwu.”—Gụọ Matiu 6:33.

      22 Nwee obi ike. Na-erubere Jehova isi, tụkwasịkwa ya obi. Na-elekọta ezinụlọ gị nke ọma. Ị ga-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ ma ọ bụrụ na ị hụ Jehova n’anya, hụkwa nwunye gị na ụmụ gị n’anya. I mee otú ahụ, ị ga-amata na ‘Jehova bụ onye na-enyere gị aka.’

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya