Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?
    Teta!—2014 | Mee
    • Nwoke ike ụwa gwụrụ, ya ana-eche otú ọ ga-esi gbuo onwe yae

      ISIOKWU TETA! A

      Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?

      E NWERE otu nwa agbọghọ aha ya bụ Akụnne.a Isi na-aghọ ya nkọ, ihu na-abụkwa ya ọchị ọchị. Ọ na-achọkwa ka ya na ndị mmadụ na-anọrị. Ma, obi ya na-agwa ya na ọ baghị uru. Obi na-ajọkwa ya njọ ruo ọtụtụ ọnwa. O kwuru, sị: “Kwa ụbọchị, m na-eche otú m ga-esi nwụọ. Ama m na m nwụọ, e nweghị onye ga-eso m nwụọ.”

      Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi na Kanada kwuru na mgbe ọ bụla mmadụ gburu onwe ya n’obodo ahụ, e nweelarị narị mmadụ abụọ nwara igbu onwe ha, nweekwa narị mmadụ anọ ọzọ igbu onwe ha gbatarala n’obi.

      Akụnne kwuru na e nweghị ihe ga-eme ka ya gbuo onwe ya. Ma mgbe ụfọdụ, ọ na-eche na ndụ ọ dị abaghị uru. O kwuru na ihe ọ chọrọ bụ ka ụgbọala gbuo ya nakwa na ọ kaara ya mma ịnwụ.

      Otú a ọ dị Akụnne ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. E nwekwaala ndị chọrọ igbu onwe ha. Ma, ndị ọkachamara kwuru na ihe mere ụfọdụ ndị ji achọ igbu onwe ha abụghị na ha chọrọ ịnwụ kama ọ bụ na ike ahụhụ agwụla ha. N’obi ha, ha ekwesịghị ịnọ ndụ. Ma, e nwere ihe ndị mere ha ga-eji dị ndụ.

      Ka anyị kwuo banyere ihe atọ mere anyị ga-eji nọrọ ndụ.

      IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU: Ikwu banyere mmadụ igbu onwe ya na-eme ka ndị mmadụ chọọ igbu onwe ha.

      NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikwu banyere mmadụ igbu onwe ya na-eme ka onye chọrọ igbu onwe ya hụ na ihe mmadụ ga-eme mgbe nsogbu karịrị ya abụghị igbu onwe ya.

      a Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

  • 1 Ihe Nwere Ike Ịgbanwe
    Teta!—2014 | Mee
    • ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

      1 Ihe Nwere Ike Ịgbanwe

      “A na-akpagide anyị n’ụzọ niile, ma a kpagideghị anyị nke na anyị enweghị ike imegharị ahụ́; anyị na-enwe mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ.”—2 NDỊ KỌRỊNT 4:8.

      Ụfọdụ ndị na-ekwu na mmadụ igbu onwe ya maka na nsogbu karịrị ya bịaara ya dị ka ebe mmadụ chọrọ igbupụ isi ya maka na isi na-awa ya. Ọ bụrụgodị na i chere na o nwekataghị ka nsogbu tara ezigbo akpụ hapụ gị aka, ihe nwere ike ịgbanwe mgbe ị na-atụghị anya ya.—Gụọ igbe bụ́ “Ihe Mechara Dịrị Ha Mma.”

      Ọ bụrụgodị na ihe agbanweghị, ọ bụghị ichegbu onwe gị ga-ebi ya. Were ụbọchị ọ bụla otú i si hụ ya. Chetakwa na Jizọs sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—Matiu 6:34.

      Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ bụ nke o nweghị ihe ị ga-emeli ka o bie? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta, ma ọ bụkwanụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị etisaala, ma ọ bụdị na onye gị nwụrụ?

      Ọ sọkwa ya ya dịrị otú ahụ, a ka nwere ihe ị ga-agbanweli. Ị ga-agbanweli otú i si ele nsogbu ahụ anya. Ọ bụrụ na i were ụwa otú i si hụ ya, obi agaghị na-adị gị njọ nke otú ahụ. (Ilu 15:15) Kama ịchọwa ụzọ igbu onwe gị, ihe ị ga na-achọ bụ ụzọ ị ga-esi die ihe bịaara gị. Ò nwere uru ime otú a ga-abara gị? Ee, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eche na e nweghị ihe ọzọ ga-ebi nsogbu gị ma e wepụ ọnwụ.—Job 2:10.

      IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Nwayọọ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ. Nsogbu ọ bụla bịaara gị ga-emecha gafere, ya sọkwa ya ya hara ka elu na ala.

      IHE I NWERE IKE IME: Kọtatụrụ nwanne gị ma ọ bụ enyi gị nsogbu gị na ya na-alụ. Onye ahụ nwere ike tụọrọ gị aro ndị ga-enyere gị aka ịgbanwe otú i si ele nsogbu ahụ anya.—Ilu 11:14.

      IHE MECHARA DỊRỊ HA MMA

      E nwere mmadụ anọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ha ji obi ha niile jeere Chineke ozi. Ma, e nwere mgbe nsogbu bịara karịa ha, ha achọọkwa ịnwụ. Legodị ihe ha kwuru:

      • Ribeka: “Ọ bụrụ otú a ka ọ dị, gịnị medịrị m ji dịrị ndụ?”—Jenesis 25:22.

      • Mozis: “Biko, gbuo m ka m nwụọ. . . . ka m ghara ịhụ ọdachi ga-adakwasị m.”—Ọnụ Ọgụgụ 11:15.

      • Ịlaịja: “Wepụ mkpụrụ obi m, n’ihi na akaghị m nna nna m hà mma.”—1 Ndị Eze 19:4.

      • Job: “Gịnị mere ekubighị m ume ozugbo m pụtasịrị n’afọ?”​—Job 3:11.

      Ọ bụrụ na ị gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere mmadụ anọ a, ị ga-achọpụta na ihe mechakwara dịrị ha mma otú ha na-atụghịdị anya ya. Ihe nwere ike mechaa gbanweere gị echi. (Ekliziastis 11:6) Obi adala gị mbà.

  • 2 Enyemaka Dị
    Teta!—2014 | Mee
    • ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

      2 Enyemaka Dị

      “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 PITA 5:7.

      Mmadụ nwere ike chee na o nweghị ihe ya nọ ndụ eme ma ọ bụrụ na obi ya na-agwa ya na o nweghị ihe ọ ga-emeli ka nsogbu ya bie. Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka mgbe anyị nọ na nsogbu.

      Ekpere. Ihe mere anyị ji kwesị ikpe ekpere abụghị ka anyị chefuo nsogbu bịaara anyị. Ọ bụghịkwa mgbe anyị na-amaghịzi ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị kwesịrị ikpe ekpere. Kama, ekpere bụ otú anyị si agwa Nna anyị hụrụ anyị n’anya otú obi dị anyị. Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe dị anyị n’obi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” —Abụ Ọma 55:22.

      Ọ ga-adị mma ka i kpee ekpere taa. Si n’ala ala obi gị gwa Chineke otú obi dị gị, kpọọkwa aha ya bụ́ Jehova ma i kpewe ekpere. (Abụ Ọma 62:8) Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. (Aịzaya 55:6; Jems 2:23) Cheta na n’agbanyeghị ebe ị nọ, i nwere ike ikpe ekpere gwa Chineke ihe dị gị n’obi mgbe ọ bụla ọ sọrọ gị.

      N’Amerịka, e nwere otu ụlọ ọrụ na-enyere ndị chọrọ igbu onwe ha aka ka ha ghara igbu onwe ha. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru na nchọpụta ha mere gosiri na ọtụtụ n’ime ndị gburu onwe ha bụ ndị isi na-akpakọghị ọnụ. Ma, a chọpụtaghị ihe bụ́ nsogbu ha n’oge, e nyekwaghị ha ọgwụ gaara enyere ha aka.

      Ndị hụrụ gị n’anya. Ndị ikwu gị na ndị enyi gị hụrụ gị n’anya. O nwekwara ike ịbụ na ha agwala gị na ihe gbasara gị na-emetụ ha n’obi. E nwekwara ndị ọzọ hụrụ gị n’anya ma ị hụtụbeghị ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ Ndịàmà Jehova gaa izi ndị mmadụ ozi ọma, ha na-ahụ ndị ike ụwa gwụrụla ma ọ bụkwanụ ndị nke chọdịrị igbu onwe ha. Otú a Ndịàmà Jehova si aga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ na-eme ka ha nwee ike ịna-enyere ụdị ndị ahụ aka. Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ndịàmà Jehova na-emekwa ka ya. Ha hụrụ mmadụ ibe ha n’anya, hụkwa gịnwa n’anya. —Jọn 13:35.

      Ndị dọkịta. Oge ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ chọọ igbu onwe ya nwere ike ịbụ na isi akpakọchaghị onye ahụ ọnụ n’ihi na obi na-ajọkarị ya njọ. Ihere ekwesịghị ịna-eme gị ma ọ bụrụ na obi na-adị na-ajọ gị njọ n’ihi na onye ọ bụla nwere ihe ya na ya na-alụ. Ụfọdụ ndị ekwuola na ọ bụrụ na obi na-adakarị mmadụ mbà ma ọ bụ na obi na-ajọkarị ya njọ na o nwere ike ịbụ ọrịa ka onye ahụ na-arịa. Onye ọ bụla nwere ike ịrịa ọrịa a. Ma, a na-agwọ ya agwọ.a

      IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọkọ kọwa anụmanụ, ọ gakwuru osisi ma ọkọ kọwa mmadụ, ọ gakwuru mmadụ ibe ya. N’ihi ya, ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ka ihe dịrị gị mma.

      IHE I NWERE IKE IME: Gakwuru dọkịta ma nke a na-akọ n’ihe gbasara obi ịda mmadụ mbà ka o nyere gị aka.

      a Ọ bụrụ na igbu onwe gị na-abatakarị gị n’obi, gbaa mbọ gaa hụ dọkịta bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara obi ịda mmadụ mbà ka ọ gwa gị ihe ị ga-eme.

  • 3 Olileanya Dị
    Teta!—2014 | Mee
    • Nwoke obi siri ike na nkwa Chineke ga-emezu

      ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

      3 Olileanya Dị

      “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”​—ABỤ ỌMA 37:11.

      Baịbụl kwuru na ndụ ụmụ mmadụ ‘jupụtara ná nsogbu.’ (Job 14:1) Taa, e nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ihe niile dịịrị ya mma. Ma, e nwere ndị ike ụwa gwụrụla, ya adị ha ka ha enweghịzi olileanya nakwa na ihe agaghị adịkwara ha mma ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru na olileanya dị. O kwuru na ihe ga-adịrị ma gịnwa ma ụmụ mmadụ niile mma. Dị ka ihe atụ:

      • Baịbụl kwuru na Jehova Chineke buuru anyị niile ihe ọma n’obi.—Jenesis 1:28.

      • Jehova kwekwara nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 65:21-25.

      • Obi sikwara anyị ike na ọ ga-eme ihe ahụ o kwere ná nkwa. Mkpughe 21:3, 4 kwuru, sị:

        “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

      Ihe a Baịbụl kwuru abụghị nrọ. Jehova Chineke ga-emezurịrị ihe ahụ o kwuru, ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ya, o nwekwara ike ọ ga-eji eme ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-eme ihe niile o kwere anyị ná nkwa. Nkwa ahụ mere ka anyị mara na e nwere ihe anyị nọ ndụ eme.

      IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọ bụrụgodị na nsogbu ụwa a mere ka ike ụwa gwụ gị, nkwa Baịbụl kwere anyị nwere ike inyere gị aka ịna-edi nsogbu ndị ahụ.

      IHE I NWERE IKE IME: Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ahụ. I nwere ike ịjụ ndị nke nọ n’obodo unu ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet bụ́ www.pr2711.com/ig.a

      a Ihe i nwere ike ime: Gaa n’adres Ịntanet bụ́ www.pr2711.com/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa Ọ́BÁ AKWỤKWỌ. N’ebe ahụ e dere chọwa, denye “ịda mbà n’obi” ma ọ bụ “mmadụ igbu onwe ya,” ị ga-ahụ ihe ga-enyekwuru gị aka.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya