Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 56
  • Sọl​—⁠Eze Mbụ nke Izrel

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Sọl​—⁠Eze Mbụ nke Izrel
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eze Mbụ Chịrị Izrel
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Jizọs Họọrọ Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 56
Mgbe Samuel onye amụma na-awụsa Sọl mmanụ n’isi

AKỤKỌ NKE 56

Sọl—Eze Mbụ nke Izrel

LEE Samuel ka ọ na-awụsa mmanụ n’isi nwoke a. Nke a bụ ihe ha na-eme mmadụ iji gosi na a họpụtawo ya ịbụ eze. Jehova gwara Samuel ka ọ wụsa mmanụ n’isi Sọl. Ọ bụ mmanụ pụrụ iche nke na-esi ísì ụtọ.

Sọl echeghị na ya ruru eru ịbụ eze. Ọ gwara Samuel, sị: ‘Abụ m onye ebo Benjamin nke kachasị nta n’Izrel. N’ihi gịnị ka i ji asị na m ga-abụ eze?’ Jehova nwere mmasị n’ebe Sọl nọ n’ihi na o meghị ka à ga-asị na ọ bụ onye ukwu na onye dị mkpa. Ọ bụ ya mere Jehova ji họpụta ya ịbụ eze.

Ma Sọl abụghị ogbenye ma ọ bụ obere mmadụ. O si n’ezinụlọ bara ọgaranya, ọ bụkwa nwoke mara nnọọ mma ma topụ etopụ. O tokarịrị nnọọ onye ọ bụla nọ n’Izrel ogologo! Sọl nwekwara ụkwụ ọsọ ma dị ike. Ndị Izrel nwere obi ụtọ na Jehova họpụtara Sọl ịbụ eze. Ha niile malitere iti mkpu, sị: ‘Ka eze dị ogologo ndụ!’

Ndị iro Izrel ka dịkwa ike. Ha ka na-enye ụmụ Izrel nnukwu nsogbu. Ngwa ngwa e chiri Sọl eze, ụmụ Amọn gbagotara ibuso ha agha. Ma Sọl kpọkọtara ọtụtụ ndị agha wee merie ndị Amọn. Obi tọrọ ndị Izrel ụtọ na Sọl bụ eze ha.

Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, Sọl duziri ụmụ Izrel inwe ọtụtụ mmeri n’ebe ndị iro ha nọ. Sọl nwekwara otu nwa nwoke bụ́ dike a na-akpọ Jonatan. Jonatan nyekwaara Izrel aka inwe mmeri n’ọtụtụ agha. Ndị Filistia ka bụkwa ndị iro kasịnụ Izrel nwere. Otu ụbọchị, ọtụtụ puku ndị Filistia bịara ibuso Izrel agha.

Samuel gwara Sọl ka o chere ruo mgbe ya ga-abịa chụọrọ Jehova àjà ma ọ bụ nye ya onyinye. Ma Samuel abịaghị n’oge. Sọl tụrụ egwu na ndị Filistia ga-amalite ibu agha, o wee malite ịchụ àjà ahụ n’onwe ya. Mgbe Samuel mesịrị bịa, ọ gwara Sọl na o nupụwo isi. Samuel wee sị ya: ‘Jehova ga-ahọpụta onye ọzọ ịbụ eze Izrel.’

Mgbe e mesịrị, Sọl nupụrụ isi ọzọ. Samuel wee sị ya: ‘Ọ dị mma irubere Jehova isi karịa inye ya atụrụ kachasị mma. Ebe ọ bụ na i rubeghịrị Jehova isi, Jehova agaghị ekwe ka ị nọgide na-abụ eze Izrel.’

Anyị pụrụ ịmụta ezigbo ihe na nke a. Ọ na-egosi anyị mkpa ọ dị irubere Jehova isi mgbe niile. Ọ na-egosikwa na ezi mmadụ, dị ka Sọl bụbu, pụrụ ịgbanwe ghọọ ajọ mmadụ. Anyị achọghị ịbụ ndị ọjọọ, ka ànyị chọrọ?

1 Samuel isi 9 ruo 11; 13:5-14; 14:47-52; 15:1-35; 2 Samuel 1:23.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya