Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 65
  • E Kewaa Alaeze Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Kewaa Alaeze Ahụ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kewara Alaeze Izrel
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jehova Agaghị Ahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ebe Ọ Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọ Gaara Enweta Ngọzi Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 65
Mgbe Ahaịja onye amụma na-adọwa uwe ya mgbe ya na Jeroboam na-ekwu okwu

AKỤKỌ NKE 65

E Kewaa Alaeze Ahụ

Ị̀ MA ihe mere nwoke a ji na-adọrisi uwe ya? Jehova gwara ya mee otú ahụ. Nwoke a bụ Ahaịja onye amụma Chineke. Ị̀ ma onye bụ́ onye amụma? Ọ bụ onye Chineke na-agwa ihe ga-eme mgbe ihe ahụ na-emebeghị.

Ahaịja na-agwa Jeroboam okwu n’ebe a. Jeroboam bụ onye Solomọn mere onye nlekọta nke ọrụ ihe owuwu ya. Mgbe Ahaịja zutere Jeroboam n’ụzọ ebe a, o mere ihe dị ịtụnanya. O yipụrụ uwe ọhụrụ o yi, wee dọwaa ya iberibe iri na abụọ. O wee sị Jeroboam: ‘Chịrị iberibe iri.’ Ị̀ ma ihe mere Ahaịja ji nye Jeroboam iberibe iri?

Ahaịja kwuru na Jehova ga-anapụ Solomọn alaeze. Ọ sịrị na Jehova ga-enye Jeroboam ebo iri. Nke a pụtara na ọ bụ naanị ebo abụọ ga-afọdụrụ Rehoboam nwa Solomọn ịchị.

Mgbe Solomọn nụrụ ihe Ahaịja gwara Jeroboam, o were iwe. Ọ nwara igbu Jeroboam. Ma Jeroboam gbagara Ijipt. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Solomọn wee nwụọ. Solomọn chịrị afọ iri anọ, ma ugbu a, e chiri Rehoboam nwa ya eze. Jeroboam nọ n’Ijipt nụ na Solomọn anwụwo, o wee laghachi Izrel.

Rehoboam abụghị ezigbo eze. O ji obi ọjọọ mesoo ụmụ Izrel ihe karịa nna ya Solomọn. Jeroboam na ndị okenye ụfọdụ jekwuuru Eze Rehoboam ma rịọ ya ka ọ na-emeso ha nke ọma. Ma Rehoboam egeghị ntị. N’ezie, o mesoro ha n’ụzọ obi ọjọọ karịa ka o mesoro ha na mbụ. Ụmụ Izrel wee mee Jeroboam eze ebo iri, ma ebo abụọ nke Benjamin na Juda weere Rehoboam dị ka eze ha.

Jeroboam achọghị ka ndị ya jee Jeruselem ife Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. O wee mee ụmụ ehi ọlaedo abụọ ma gwa ndị alaeze ebo iri ahụ ka ha na-efe ha. Ọ dịghị anya, mmebi iwu na ime ihe ike ejupụta n’ala ahụ.

Nsogbu dapụtakwara n’alaeze ebo abụọ ahụ. Ihe na-erughị afọ ise ka Rehoboam ghọsịrị eze, eze Ijipt jere busoo Jeruselem agha. O wepụrụ ọtụtụ akụ̀ n’ụlọ nsọ Jehova. N’ihi ya, ọ bụ naanị nwa oge ka ụlọ nsọ ahụ dị otú ọ dị mgbe e wusịrị ya.

1 Ndị Eze 11:26-43; 12:1-33; 14:21-31.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya