Ezumike Nká—Ọ̀ Bụ Ọnụ Ụzọ Ghere Oghe Maka Ọrụ Ọchịchị Chineke?
EZUMIKE nká—nye ọtụtụ ndị ọ na-emechi ọnụ ụzọ nke ogologo oge nke nrụgide na mkpasu iwe. Mgbe oge nke ịbụ onye e kechigidere n’otu usoro ime ihe nke tara akpụ ma ọ bụ nke ime ara ara gasịrị, ọtụtụ ndị na-elepụ anya n’ihu ịhụ ka ezumike nká meghere ọnụ ụzọ nke ọtụtụ afọ nke ntụsara ahụ na nnwere onwe nke onwe onye. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọnụ ụzọ ahụ na-eduje n’ike ọgwụgwụ na enweghị mmasị. Ntụrụndụ na ihe omume ntụrụndụ adịghị nnọọ enye echiche ịba uru onwe onye nke ịrụ ọrụ na-enye.
Nye Ndịàmà Jehova, ezumike nká pụrụ imeghe “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” (1 Ndị Kọrint 16:9) Ọ bụ ezie na ime agadi nwere nsogbu na ịkpa ókè ndị nke ya, ụfọdụ ndị mere okenye karị achọpụtawo na site n’enyemaka Jehova ha pụrụ ịmụba ozi ha na-ejere ya. Tụlee ahụmahụ nke ndị Kraịst ụfọdụ meworo okenye karị na Netherlands. N’afọ ije ozi 1995, n’ime ihe karịrị 1,223 ndị ọsụ ụzọ (ndị nkwusa oge nile nke Alaeze) e nwere, 269 dị 50 afọ ma ọ bụ karị. N’ime ndị a, 81 dị 65 afọ ma ọ bụ karị.
Ụfọdụ nwere ike ịsụ ụzọ nanị site n’ịnọgide n’usoro iji ọrụ n’aka ha guzobere n’oge ha ka na-arụ ọrụ ego. (Tụlee Ndị Filipaị 3:16.) Otu onye Kraịst laworo ezumike nká aha ya bụ Karel na-echeta, sị: “Mgbe m na-arụ ọrụ ego, m na-amalitekarị ọrụ n’elekere 7:30 nke ụtụtụ. Mgbe m malitere ịnata ego ezumike nká m, ekpebiri m ịnọgide n’otu usoro ime ihe ahụ. N’elekere asaa n’ụtụtụ ọ bụla m ga-eji nkesa magazin n’okporo ámá ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị amalite ụbọchị.”
Iji nlezianya mee atụmatụ bụkwa isi ihe dị mkpa n’inwe ihe ịga nke ọma. (Ilu 21:5) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ enwewo ike ichekwa ego zuru ezu iji kwadoo onwe ha n’ozi ha. Ndị ọzọ ekpebiwo igbubilata mmefu ego ha na inweta ọrụ nwa oge. Tụlee banyere Theodore na Ann. Ha malitere ndụ alụmdi na nwunye dị ka ndị ọsụ ụzọ ruo mgbe ibu ọrụ ezinụlọ mere ka ha kwụsị ịsụ ụzọ. Ma mmụọ ịsụ ụzọ ha dịgidere! Ka ụmụ ha ndị nwanyị na-etolite, a na-agba ha ume mgbe nile ịsụ ụzọ. Nke ka mkpa, Theodore na Ann setịpụrụ ezi ihe nlereanya, na-eje ozi ọtụtụ mgbe dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ka ụmụ ha ndị nwanyị na-emewanye okenye, Theodore na Ann malitere igbubilata ọrụ ego ha na-arụ iji nwekwuo oge maka ozi ubi.
Mgbe ụmụ ha nwanyị banyesịrị n’ozi oge nile ma hapụ ụlọ, Ann malitere ịsụ ụzọ. Otu ụbọchị ọ gbara Theodore ume ịhapụ ọrụ ya. “Anyị abụọ nwere ike ịsụ ụzọ,” ka ọ tụrụ n’aro. Theodore gwara onye ọ na-arụrụ ọrụ nzube ya. N’ụzọ tụrụ ya n’anya ọga ya kwuru na ya ga-enye aka site n’inye ya ọrụ nwa oge, na-asị: “Ama m na ị chọrọ ịrụrụ ọga gị nọ n’elu [n’eluigwe] ọrụ oge nile.” Ugbu a Theodore na Ann na-enweta ọṅụ ịsụkọ ụzọ ọnụ.
Ụfọdụ ndị malitere ịsụ ụzọ ná nzaghachi nye ọnọdụ ndị bilitere ná ndụ ha. Ọnwụ ọdachi nke ada ha na nwa nwanyị nke ada ha mere ka otu di na nwunye meworo okenye karị chesie echiche ike n’ụzọ ha si eji afọ ha fọrọ afọ eme ihe. (Eklisiastis 7:2) Kama ịbụ ndị iru újú rikpuru, ha weere ozi oge nile, bụ́ nke ha rụworo ugbu a ruo ihe karịrị afọ asatọ!
N’ụzọ a pụrụ ikweta, ọ na-achọ ezi mkpebisi ike iji nọgide n’ozi oge nile. Dị ka ihe atụ, Ernst na nwunye ya, bụ́ Riek, malitere ịsụ ụzọ ngwa ngwa ụmụ ha hapụrụ ụlọ. Ntakịrị oge ka nke ahụ gasịrị, otu onye ya na ya na-achụkọbu nta ego nyere Ernst ọrụ ego dị na ya. Ernst zaghachiri: “Anyị nwere onye na-ewe mmadụ n’ọrụ nke kasị mma a pụrụ inwe, anyị adịghịkwa njikere ịhapụ ya!” N’ihi na Ernst na nwunye ya nọgidere “n’ọrụ” Jehova, ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ megheere ha. Ha jere ozi n’ọrụ sekit ruo ihe karịrị 20 afọ ma nọgide dị ka ndị ọsụ ụzọ ruo taa. Hà na-akwa ụta maka ụzọ iji onwe onye chụọ àjà ha? N’otu oge gara aga di na nwunye ahụ dere, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche Jehova, n’ọnwa atọ na-abịanụ anyị na-atụ anya ime ememe ịgba 50 afọ n’alụmdi na nwunye anyị, bụ́ nke a na-akpọkarị ememe ịgba 50 afọ. Ma anyị ji nkweta zuru ezu na-ekwu na afọ anyị ndị kasị mma n’ezie bidoro mgbe anyị malitere ịsụ ụzọ.”
Ọtụtụ na-achọpụta na ọnụ ụzọ ahụ na-eduje n’ọrụ ka ukwuu na-edujekwa n’ọṅụ ka ukwuu! Otu nwanna nwoke nke malitere ịsụ ụzọ izu abụọ ka ọ gbasịrị 65 afọ na-ekwu, sị: “Aghaghị m ikwu na enwetụbeghị m oge ọ bụla ná ndụ m nke jupụtara nnọọ ná ngọzi ka afọ iri gara aga nke ịsụ ụzọ.” Otu di na nwunye ndị sụworo ụzọ ruo ihe karịrị afọ asaa na-ekwu, sị: “Gịnị ọzọ ka di na nwunye nọ n’afọ ndụ anyị na n’ọnọdụ anyị kwesịrị ịdị na-eme? Ọtụtụ mgbe anyị na-ahụ ndị ọ dị ka ọ dị anyị n’ókèala anyị—ka ha ji ntụsara ahụ nọrọ n’ụlọ, na-ebu nanị ibu, na-aka nká, ma ghara ịdị na-emegharị ahụ. Ije ozi na-eme ka anyị nwee ahụ ike n’uche na n’anụ ahụ. Anyị na-anọkọ ọnụ mgbe nile. Anyị na-achị ọchị nke ukwuu ma na-anụ ụtọ ndụ.”
N’ezie, ọ bụghị ndị nile mere okenye karị nwere ọnọdụ ndị ga-enye ha ohere ịsụ ụzọ. Ndị Kraịst a pụrụ ijide n’aka na Jehova nwere mmasị n’ihe ọ bụla ha nwere ike ime n’ozi ya. (Tụlee Mak 12:41-44.) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị nwere nkwarụ nọ n’ebe a na-elekọta ndị na-apụghị ilekọta onwe ha. Otú ọ dị, otu ọnụ ụzọ nke ịrụ ọrụ ka ghere oghe nye ya! Otu dọkịta jụrụ ya ihe ọ na-eji oge ya eme. Ọ na-akọ, sị: “Agwara m ya na ọ dịghị mgbe oge na-ezuru m. Nke a ekweghị ya nghọta. M gwara ya na nke a bụ n’ihi na ụbọchị m jupụtara n’ọrụ ndị na-enye afọ ojuju. Owu adịghị ama m, ma ana m achọta ndị ọzọ owu na-ama ma gbalịa ịkọrọ ha ihe Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ.” Ọ na-achịkọta okwu nile site n’ikwu, sị: “Mmadụ agaghị atụ anya oké ihe site n’aka onye ọ fọrọ nke nta ka ọ gbaa 80 afọ. Na-ekpere m ekpere ka m ka nwee ike iduru ọtụtụ ndị gaa n’ebe Jehova nọ.”
Ì ruola oge ịla ezumike nká? Ọnụ ụzọ nke izuru ike pụrụ ịdị na-adọrọ nnọọ adọrọ, ma ọ bụghị ọnụ ụzọ na-eduje ná ngọzi ime mmụọ. Jiri ekpere chebara ọnọdụ gị echiche. Ọ pụrụ ịbụ na ị pụrụ isi n’ọnụ ụzọ ahụ na-eduje n’ọrụ ka ukwuu n’ozi Jehova gafere.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Ezumike nká pụrụ iduje n’ọrụ ka ukwuu n’ozi ahụ