Ndị Agadi Na-eme Nkwusa n’Esepụghị Aka
1 Ka ndị mmadụ na-eme agadi, ọtụtụ n’ime ha na-elekwasị anya n’ịla ezumike nká n’ọrụ ego ha na ibi ndụ enweghị nchegbu n’afọ ndụ ha ndị fọdụrụ. Ha pụrụ iche na ha arụsiwo nnọọ ọrụ ike ma kwesị izu ike ugbu a. Ma ọ bụ ha pụrụ nanị ịchọ ịnụ ụtọ ndụ, ihe ọ bụla fọdụrụ na ya.—Luk 12:19.
2 Dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, anyị nwere echiche dị iche ná ndụ. Anyị maara na ọ dịghị ịla ezumike nká dị n’ozi Chineke. Echiche anyị dị mma n’ihi na anyị na-eburu “ndụ ebighị ebi” n’uche. (Jud 21) Ọtụtụ afọ nke ihe ọmụma na ahụmahụ e nwekọbara pụrụ ime ka mmadụ nwekwuo nghọta na amamihe. Nke a pụrụ ime ka mmadụ nwekwuo amamihe ma nwee nguzozi karị, gosipụtakwa ekele miri emi karị maka ndụ. Àgwà ndị a nile na-abara mmadụ uru nke ukwuu dị ka onye ozi nke ozi ọma ahụ.
3 Ime agadi abụghị nanị okwu metụtara ịka nká; ọ na-agụnyekwa echiche uche mmadụ. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya ibi ndụ ogologo oge, ị na-agbalịkwa ịbụ onye na-eto eto n’echiche gị, ohere ndị i nwere ime ha abụọ pụrụ ịmụba. Ndị agadi pụrụ imeziwanye ndụ ha site n’ịmụba ihe ọmụma ime mmụọ ha na isoro ndị ọzọ na-ekerịta ya.—1 Kọr. 9:23.
4 Ihe Atụ Ndị Mere Eme: N’afọ ndụ nke 86, otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Mgbe m tụgharịrị uche na afọ 60 ndị gafeworo kemgbe m matara eziokwu ahụ, nkwa na-emesighachi obi ike nke Chineke na-emetụ m n’obi. Ee, Jehova, bụ́ onye ga-eme ihe n’iguzosi ike n’ihe n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ na-ekwe ka anyị weta ọṅụ dị ukwuu dị ka ihe ubi.” (Abụ Ọma 18:25) Otu nwanna nwoke meworo agadi chetara otú ọnwụ nwunye ya si bịara ya dị ka oké ihe mberede, nke ihe sochiri ya bụ ịka njọ nke ọnọdụ ahụ ike ya. O kwuru, sị: “Ma, site n’ebere Jehova na-erughịrị mmadụ, agbakere m ruo n’ókè nke inwe ike ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ afọ abụọ ka ọ gasịrị. Lee ka m si nwee ekele nye Jehova na ahụ ike m akawanyewo mma n’ihi mmụba a n’ọrụ ime nkwusa!”
5 Lee ka o si bụrụ ihe kwesịrị ịja mma na ọtụtụ ndị agadi ekpebisiwo ike ịnọgide na-eme nkwusa ruo n’ókè ọ bụla ahụ ike na ume ha nyere ohere ya—n’esepụghị aka! Ha nwere ezi ihe mere ha ga-eji tie mkpu, sị: “Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile.”—Abụ Ọma 71:17.