Nzukọ Ije Ozi Maka August
Izu Na-amalite August 4
Abụ 16
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi April maka mba a na maka ọgbakọ unu.
13 min: “Nzukọ Na-akpasu Ọrụ Ọma.” Ajụjụ na azịza. Gosi uru nke mkparịta ụka na-ewuli elu tupu na mgbe nzukọ gasịrị.—Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 97, paragraf nke 17-18.
25 min: “Dabere na Jehova Ime Ka Ihe Na-aba Ụba.” Okwu na ihe ngosi. Mesie mkpa ọ dị ike ime nletaghachi n’ebe ndị e tinyere broshuọ. Mee ihe ngosi abụọ a kwadebere nke ọma na-egosi ụzọ isi malite ọmụmụ ihe. Gụnye aro ndị sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1997, paragraf nke 7-11.
Abụ 78 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 11
Abụ 20
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Ndị Agadi Na-eme Nkwusa n’Esepụghị Aka.” Ajụjụ na azịza. Gụnye ahụmahụ banyere nne ochie meworo agadi nke rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, site n’Ụlọ Nche nke July 1, 1988, peji nke 13.
20 min: “Mmụba Nọgidere Na-aga n’Ihu Na-amụba Mkpa E Nwere Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 1-10 nke ihe ntinye. Mesie ike ihe mere o ji dị mkpa ka ndị okenye kpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ná mmalite mgbe ha na-eche echiche iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Abụ 71 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 18
Abụ 14
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Mmụba Nọgidere Na-aga n’Ihu Na-amụba Mkpa E Nwere Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Okwu na-ekpo ọkụ onye okenye ga-ekwu na paragraf nke 11-17 nke ihe ntinye. Mesie ike mkpa e nwere maka inwetakwu ndị ọrụ afọ ofufo. Dị ka oge nyere ohere, gụnye ahụmahụ ndị kwesịrị ekwesị ndị metụtara iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge gara aga n’ógbè unu.
20 min: Mee Nletaghachi, Na-eji Broshuọ Bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Gosi ụzọ isi kpalite ajụjụ ma zoo aka na broshuọ ahụ maka azịza. Dị ka ihe atụ, broshuọ ahụ na-aza ajụjụ ndị na-esonụ: È nwere olileanya ọ bụla dịịrị ndị nwụrụ anwụ? (Peji nke 5-6) Ọ̀ dị njọ iru újú? (Peji nke 8-9) Olee otú mmadụ pụrụ isi nagide iru újú? (Peji nke 18) Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nye aka? (Peji nke 20-23) Olee otú a pụrụ isi nyere ụmụaka aka ịghọta ọnwụ? (Peji nke 25) Nkasi obi dị aṅaa ka Bible na-enye? (Peji nke 27) Mgbe ahụ, soro ndị nkwusa abụọ ruru eru kwurịta ná mkpirikpi otú ha siworo jiri broshuọ a mee ihe ná nletaghachi iji zaa ajụjụ ndị a na-ajụkarị banyere ọnwụ. Mee ihe ngosi nke ụzọ isi jiri broshuọ a mee ihe mgbe a na-eme nletaghachi.
Abụ 94 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 25
Abụ 23
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile itinye akụkọ ozi ubi. Maa ọkwa ndokwa ije ozi maka ngwụsị izu.
15 min: “Nweta Ihe Kasị Mma n’Ụlọ Akwụkwọ.” Nna esoro ụmụ ya kwurịta isiokwu ahụ, na-agụnye isi ihe ndị na-enye aka sitere na Teta! nke January 1, 1996, peji nke 19-23.
20 min: Jiri Nzube Na-eme Nkwusa. Onye okenye na otu ohu na-eje ozi ma ọ bụ abụọ atụleghachi akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 8-12. Tinye uche n’ihe ndị na-arụgide arụgide mere anyị kwesịrị iji nọgide na-enwe àgwà ziri ezi, nke na-aga n’ihu n’ebe ozi anyị dị ma na-eso nzukọ emekọ ihe mgbe nile n’ụzọ chiri anya.
Abụ 100 na ekpere mmechi.