Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndịàmà ruo n’Ebe Ụwa Sọtụrụ
    Ụlọ Nche—1996 | Jun 15
    • [Igbe dị na peeji nke 28]

      N’ụsọ Oké Osimiri Ọwụwa Anyanwụ Greenland

      N’IHE dị ka n’otu oge ahụ ìgwè ndị nkwusa ahụ ruru Thule, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà, bụ́ Viggo na Sonja, gara n’ókèala ọzọ a na-adịghị arụ ọrụ na ya—Ittoqqortoormiit (Scoresbysund) n’akụkụ ụsọ oké osimiri ọwụwa anyanwụ nke Greenland. Iji garuo ebe ahụ, ha aghaghị ịga Iceland, gbaa ụgbọ elu laghachi Constable Point n’ụsọ osimiri Greenland, wee jirizie helikọpta gawa.

      “Nke a bụ nke mbụ Ndịàmà Jehova bịaworo n’ebe a,” ka ndị ọsụ ụzọ abụọ a na-akọ, bụ́ ndị asụsụ ala ha bụ Greenlandic. “N’agbanyeghị nkewapụ e kewapụrụ ha, n’ụzọ na-eju anya, ndị ahụ ma nke a na-akọ. Ma, obi dịkwa ha ụtọ ịmụta ihe ndị ọhụrụ. Dị ka ndị nwere onyinye ịkọ akụkọ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ anyị banyere achụmnta ha nke anụ seal na ahụmahụ ndị ọzọ n’okike.” Hà si aṅaa zaghachi n’ọrụ nkwusa ahụ?

      “Ka anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị zutere J——, bụ́ onye katkist. ‘Unu emeela maka ime ka m soro ná ndị unu kpọtụụrụ,’ ka o kwuru. Anyị gosiri ya akwụkwọ anyị na otú e si eji ya eme ihe. N’echi ya ọ bịakwutere anyị ma chọọ ịmụtakwu banyere aha ahụ bụ́ Jehova. Anyị gosiri ya nkọwa nke dị n’ala ala peji nke Bible Greenlandic nke ya. Mgbe anyị pụrụ, ọ kpọrọ ndị enyi anyị nọ na Nuuk na telifon iji kwupụta ekele ya maka ọbịbịa anyị. Anyị aghaghị ịgbalị ịnọgide na-enyere nwoke a aka.

      “Anyị zutekwara O——, bụ́ onye nkụzi nke maara banyere Ndịàmà Jehova. O nyere anyị hour abụọ iji gwa klas ya nke ndị nọ n’agbata afọ 14 ruo 16 okwu. Ya mere anyị gosiri ha ihe nkiri vidio anyị ma zaa ajụjụ ha. Akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Worka na akwụkwọ ndị ọzọ gara ọkụ ọkụ. Anyị zutere atọ n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ ka e mesịrị. Ha jụrụ ọtụtụ ajụjụ, otu n’ime ha nwere mmasị karịsịa. Ọ jụrụ, sị, ‘Olee otú mmadụ si aghọ Onyeàmà? Ọ ghaghị ịbụ ihe obi ụtọ ịdị ka unu. Papa m nọkwa unu n’akụkụ.’ Anyị kwere nkwa idere ya akwụkwọ ozi.

      “N’otu n’ime obodo nta ndị ahụ, anyị zutere onye katkist ọzọ, M——, anyị nwekwara mkparịta ụka mara mma. O kwuru na ya ga-ahụ na ndị ikom ahụ gara ịchụ nta ga-enweta akwụkwọ anyị ozugbo ha lọtara. Ya mere ọ bụ ‘onye nkwusa’ anyị ugbu a n’ebe ahụ dịmiri adịmi.”

      Ọ bụ ezie na ọ bụ njem ịga gburugburu, nke tara akpụ, ndị ọsụ ụzọ abụọ ahụ nwere mmetụta na mgbalị ha nwetara ụgwọ ọrụ bara ụba.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

  • “Rịbanụ Ndị ikom Dị Otú ahụ Ama”
    Ụlọ Nche—1996 | Jun 15
    • “Rịbanụ Ndị ikom Dị Otú ahụ Ama”

      IHE adịchaghị mma n’ọgbakọ Kọrint. E nwewo okwu omume rụrụ arụ nke na-awụ akpata oyi n’ahụ, ịrọ òtù dịkwa n’etiti ụmụnna ahụ. Ụfọdụ nwere nsogbu onwe onye ndị siri ike ma ọ bụ nwee ajụjụ ndị dị mkpa ka a zaa ha. Ụmụnna ụfọdụ na-akpụje ibe ha n’ụlọikpe; ndị ọzọ ọbụna ekweghị ná mbilite n’ọnwụ.

      Ajụjụ ndị siri ike bilitekwara. Ndị nọ n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe hà kwesịrị isoro ndị òtù ọlụlụ ha na-ekweghị ekwe biri, ka hà kwesịrị ikewa? Gịnị bụ òkè ụmụnna nwanyị n’ime ọgbakọ? Ò kwesịrị ekwesị ka e rie anụ a chụrụ n’àjà nye arụsị? Olee otú e kwesịrị isi duzie nzukọ—gụnyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?—1 Ndị Kọrint 1:12; 5:1; 6:1; 7:1-3, 12, 13; 8:1; 11:18, 23-26; 14:26-35.

      Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ebe ha nwere nchegbu maka ọdịmma ụmụnna ha ndị nọ n’ụdị ọnọdụ ime mmụọ a na-adịghị mma, Akaịkọs, Fọtunetọs, na Stefanas mere njem ije leta Pọl onyeozi n’Efesọs. Tinyere akụkọ ọjọọ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ha na-ewegakwara Pọl otu akwụkwọ ozi sitere n’ọgbakọ ahụ nke ajụjụ ndị a jụrụ n’okwu ndị a dị n’ime ya. (1 Ndị Kọrint 7:1; 16:17) Dị ka ihe àmà gosiri, ọ bụghị nanị ụmụnna atọ a ka ọnọdụ ahụ na-echegbu. N’ezie, Pọl anụworị akụkọ site n’aka “ndị ezinụlọ Kloi” na esemokwu dị n’etiti ndị òtù ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 1:11) N’enweghị ihe ịrụ ụka, akụkọ nke ndị ozi ahụ nyeere Pọl aka inweta nghọta ka doo anya banyere ọnọdụ ahụ, ikpebi ndụmọdụ ọ ga-enye, na otú ọ ga-esi zaa ajụjụ ndị ahụ e welitere. O yiri ka akwụkwọ ozi ahụ anyị maara ugbu a dị ka Ndị Kọrint nke Mbụ bụ nzaghachi Pọl, bụ́ nke mmụọ nsọ Chineke duziri. O nwere ike ịbụ Akaịkọs, Fọtunetọs, na Stefanas wetara akwụkwọ ozi ahụ.

      Olee ndị bụ́ Akaịkọs, Fọtunetọs, na Stefanas? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ha?

      Ezinụlọ Stefanas

      Ezinụlọ Stefanas bụ “mkpụrụ mbụ” nke ozi Pọl n’ógbè Rom bụ́ Akaịa, Ndịda Gris, n’ihe dị ka n’afọ 50 O.A., Pọl mekwara ha baptism n’onwe ya. N’ụzọ doro anya, Pọl weere ha dị ka ndị a pụrụ iji mee ihe atụ, ndị tozuru okè, ndị na-ewusi ndị Kọrint ike. Ọ jara ha mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ihi ọrụ ha maka ọgbakọ ahụ: “Ma arịọọ m unu, ụmụnna m, (unu matara ezinụlọ Stefanas, na ọ bụ mkpụrụ mbụ nke Akaịa, na ha dokwara onwe ha ijere ndị nsọ ozi), ka unu onwe unu dookwa onwe unu n’okpuru mmadụ dị otú a, na n’okpuru onye ọ bụla nke sooro anyị na-arụkọ ọrụ, onye na-adọgbukwa onwe ya n’ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 1:16; 16:15, 16) E kwughị kpọmkwem ndị mejupụtara “ezinụlọ” Stefanas. Okwu ahụ nwere ike nanị ịpụta ndị òtù ezinụlọ ma o nwekwara ike ịgụnye ndị ohu ma ọ bụ ndị e were n’ọrụ. Ebe Akaịkọs bụ aha Latin nke a na-enyekarị ohu, Fọtunetọs kwa nke onye nweere onwe ya, ụfọdụ ndị na-enye nkọwa na-atụ aro na ha abụọ nwere ike ịbụ ndị so n’otu ezinụlọ ahụ.

      N’agbanyeghị nke ọ bụ, Pọl weere ezinụlọ Stefanas dị ka ndị bụ ezi ihe nlereanya. Ndị òtù ya “dokwara onwe ha ijere ndị nsọ ozi.” Ezinụlọ Stefanas aghaghị ịghọtaworị na e nwere ọrụ a ga-arụ maka ọdịmma nke ọgbakọ ma nakwere ozi a n’afọ ofufo dị ka ibu ọrụ onwe onye. Ọchịchọ ha nwere ijere ndị nsọ ụdị ozi ahụ kwesịrị n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya ka e nye ya nkwado uche, rịbakwa ya ama.

      “Ha Mere Ka Mmụọ nke M na nke Unu Zuru Ike”

      Ọ bụ ezie na Pọl chegburu onwe ya banyere ọnọdụ dị na Kọrint, ọbịbịa nke ndị ozi atọ ahụ buliri ya elu. Pọl na-ekwu, sị: “Ana m aṅụrịkwa ọṅụ n’ọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaịkọs: n’ihi na ndị ahụ mezuru ihe fọdụụrụ unu imere m. N’ihi na ha mere ka mmụọ nke m na nke unu zuru ike.” (1 Ndị Kọrint 16:17, 18) N’iburu ọnọdụ ahụ n’uche, esoghị ndị Kọrint nọrọ n’anụ ahụ pụrụ ịbụwororị Pọl ihe nchegbu, ma ugbu a ọnụnọ nke ndị ha zitere gboro mkpa nke ọnụnọ nke ọgbakọ ahụ dum. O yiri ka akụkọ ha o mere ka Pọl ghọtazuo ọnọdụ ahụ ma wepụtụ ụjọ ụfọdụ o nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ. Ikekwe ihe adịchaghị njọ dị ka o chererịị ma e kwuwerị.

      Dị ka Pọl si kwuo, ozi mmadụ atọ ahụ bịara abụghị nanị na o mere ka mmụọ ya zuru ike kamakwa ọ kwalitere mmụọ nke ọgbakọ Kọrint. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o wetaara ha ahụ efe ịma na ndị ozi ha akọwaworo Pọl ọnọdụ ahụ nile nke ọma na ha ga-ejikwa okwu ndụmọdụ ya lọta.

      Ya mere a jara Stefanas na ndị enyi ya abụọ mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ihi ndọgbu nile ha dọgburu onwe ha n’ọrụ maka ọgbakọ Kọrint. Ekele Pọl nwere maka ndị ikom a dị ukwuu nke na mgbe ha lọghachiri ha kwesịrị idu ndú n’ọgbakọ Kọrint ahụ kewasịrị ekewasị. Onyeozi ahụ na-agba ụmụnna ahụ ume, sị: “Ka unu onwe unu dookwa onwe unu n’okpuru mmadụ dị otú a, na n’okpuru onye ọ bụla nke sooro anyị na-arụkọ ọrụ. . . . [Rịbanụ ndị ikom dị otú ahụ ama, NW].” (1 Ndị Kọrint 16:16, 18) Ihe ndị dị otú ahụ siri ike e kwuru banyere ha na-egosi n’ụzọ doro anya iguzosi ike n’ihe zuru ezu nke ndị ikom a n’agbanyeghị ahụ erughị ala ndị dị n’ọgbakọ. E kwesịrị ka e nye ndị ikom dị otú ahụ nsọpụrụ.—Ndị Filipaị 2:29.

      Imekọ Ihe Ọnụ n’Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-arụpụta Ihe Ọma

      Obi abụọ ọ bụla adịghị na ya, iso nzukọ Jehova na ndị nnọchiteanya ya na-emekọ ihe n’ụzọ chiri anya na-arụpụta ihe ndị dị mma. Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi ahụ a maara ugbu a dị ka Ndị Kọrint nke Abụọ, ntakịrị oge ka o desịrị nke mbụ, ihe amalitelarị na-aka mma n’ọgbakọ ahụ. Ọrụ ndidi nke ụmụnna dị ka Akaịkọs, Fọtunetọs, na Stefanas nọgidere na-arụ, tinyere ọbịbịa nke Taịtọs, rụpụtara ihe dị mma.—2 Ndị Kọrint 7:8-15; tụlee Ọrụ 16:4, 5.

      Ndị so n’ọgbakọ nke ndị Jehova n’oge a pụrụ irite uru site n’ịtụgharị uche ná nhota dị mkpirikpi e hotara ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na a pụghị idozi ọnọdụ dị n’ime ọgbakọ ozugbo n’ihi ihe ụfọdụ, na ọ na-akpatakwara ụmụnna nchegbu. Gịnị ka e kwesịrị ime? Ṅomie Stefanas, Fọtunetọs, na Akaịkọs, bụ́ ndị na-alaghị azụ n’ibu ọrụ ha nke ịkọrọ Pọl banyere ọnọdụ ahụ ma jirizie obi ike hapụrụ Jehova okwu. Ọ dịghị otú ịnụ ọkụ n’obi maka ezi omume si mee ka ha mee ihe n’onwe ha ma ọ bụ ghọọ ndị ‘obi ha dị ọkụ megide Jehova.’—Ilu 19:3.

      Ọ bụ Jisọs Kraịst nwe ọgbakọ nile, n’oge nke ya kwa, dị ka ọ dị na Kọrint, ọ ga-eme ihe iji dozie ihe isi ike ọ bụla nke pụrụ iyi ọdịmma ime mmụọ na udo ha egwu. (Ndị Efesọs 1:22; Mkpughe 1:12, 13, 20; 2:1-4) Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ bụrụ na anyị agbasoo ihe nlereanya ọma nke Stefanas, Fọtunetọs, na Akaịkọs ma nọgide na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ijere ụmụnna ozi, anyị onwe anyị kwa ga-eji iguzosi ike n’ihe na-akwado ndokwa ọgbakọ, na-ewulite ụmụnna anyị elu, ma ‘na-akpasu ha inwe ịhụnanya na ịrụ ọrụ ọma dị iche iche.’—Ndị Hibru 10:24, 25.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya