Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 3/1 p. 26-29
  • A Kpọsaa Ọdịda Babilọn na Japan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kpọsaa Ọdịda Babilọn na Japan
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • O Biri Ọkụ na Japan
  • Ozi Ọsụ Ụzọ Inyeaka
  • Ụbọchị Pụrụ Iche nke Ịrụ Ọrụ
  • Ịgba Àmà Okporo Ụzọ
  • Ikesa Magazin
  • Ike Karịrị Ike Mmadụ Efu
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 3/1 p. 26-29

A Kpọsaa Ọdịda Babilọn na Japan

“Ọ DAWO, ọ dawo, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, nke mewọro ka mba nile ṅụọ n’ime mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya!” Jọn onyeozi nụrụ ịma ọkwa ahụ na-aknali aknali nke mmụọ ọzi mara na nke mbụ ya laa azụ na narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Otú ọ dị, n’ime oge anyị a, n’ime “ụbọchị Onyenwe anyị,” ọ bụwo nke ndị Kraịst bụ Ndịama nke Jehova meworo ka ọ daa ụda ná ntị nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.—Mkpughe 1:10; 14:8.

Babilọn Ukwu ahụ bụ usoro zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha, nke Krisendọm bụ akụkụ ya kasị kwesị nkatọ. N’ime “mgbe ọgwụgwụ” nile, ikpe Jehova megide ya abụwo nke Ndịama Jehova kpọsara n’elu ụwa dum. (Daniel 12:4) Dị ka ihe atụ, mbipụta Ụlọ Nche nke April na May afọ gara aga bipụtara isiokwu ndị dị ike ndị na-ekpughe ikpe ọmụma nke okpukpe ụgha na mbibi ya nke na-abianụ. E kesara ihe kariri 50 nde n’ime mhipụta ndị ahụ n’ụwa nile—mkpọsa dị ukwuu nke ọdịda Babilọn Ukwu ahụ!

O Biri Ọkụ na Japan

Otu ihe atụ nke ịnụ ọkụ n’obi Ndịama Jehova nwere maka mbipụta ndị ahụ pụrụ iche bụ nke a na-ahụta na Japan, bụ́ ebe akụkụ Babilọn Ukwu ahụ nke okpukpe Shinto na Buddha siri oke ike. Na Japan mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa December 1988 chetaara ọgbakọ ndị ahụ banyere mkpọsa pụrụ iche nke ije ozi ubi e dokwara maka ọnwa April na May 1989. Ọkpụkpọ òkù a kpọrọ ịkwado ọrụ magazin nke a pụrụ iche pụtara ná mbinụta Ozi Alaeze Anyị ndị sochirinụ, sitekwa n’akwụkwọ ozi ndị e degaara ọgbakọ ndị ahụ nakwa òtù nile nke ndị okenye.

Otú e si zaghachi n’òkù ahụ bụ ihe pụrụ iche. Site n’enyemaka Jehova, n’ime ọnwa abụọ ndị ahụ nke afọ gara aga, Japan nwetara ịgba àmà na-enweghị atụ.

Ozi Ọsụ Ụzọ Inyeaka

Ịma ọkwa nke ọnwa December 1988 tinyere okwu ndị a: “Anyị na-agba unu ume inwe ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April na May, karịsịa n’April.” E kwupụtara echiche nke a ọzọ ná mbipụta Ozi Alaeze Anyi nke February 1989, bụ́ nke gbara ụmụnna ume ka ha ‘dozigharịa usoro ha ji eme ihe kwa ụbọchị iji nwee ike inwe ọtụtụ ndị ozi raara onwe ha nye ruo n’ókè o kwere omume bụ́ ndị ga-edebenye aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April.’

Ndịàmà ahụ chebaara ihe ncheta ndị a echiche. Gịnị si na ya pụta? Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke a na-enwetụbeghị mbụ nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Na March 1989 ọnụ ọgụgụ nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka eruworị ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 24,115. Ma n’April ọnụ ọgụgụ ahụ fọrọ nke nta ka ọ dị okpukpu abụọ na-eru 41,055. Lee aha mgbalị pụrụ iche nke a bụ!

N’ọtụtụ ọgbakọ, ndị nkwusa nile ma ọ bụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị nkwusa keere òkè n’ụdị dị iche iche nke ije ozi oge nile n’ọnwa abụọ ndị ahụ a rụrụ ọrụ pụrụ iche. Nke a na-akpatakarị ime nhazi dị ukwuu. Otu nwunye nke na-arụ ọrụ n’ụlọ nwere obi abụọ ma yà pụrụ ikere òkè, ebe ọ bụ na o bi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3,000 amaụkwụ [900 mita] n’elu ugwu bụ́ ebe a na-enweghị usoro ịga njem. Otú o sina dị, ọ chọrọ n’ezie ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ya mere ndị okenye mere ndokwa inyere ya aka inweta ụgbọ njem, ya onwe ya, tinyere ndị nkwusa nile ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ, nwetara ọṅụ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’otu ọnwa.

Idu ndú dị mma nke ndị okenye pụtara ìhè n’Ọgbakọ Otsuka nke nwere 77 ndị nkwusa, bụ́ nke dị n’Osaka Prefecture, Takatsuki City, bụ́ ebe ndị okenye nile na ndị ohu na-eje ozi soro n’ime 73 ndị keere òkè n’ụdị dị iche iche nke ozi ọsụ ụzọ. Ndị ọsụ ụzọ ndị ahụ gụnyekwara ndị nkwusa nile na-eto eto meworo baptism bụ́ ndị ka nọ n’ụlọ akwụkwọ. Mmụọ ọsụ ụzọ ahụ nke Ndịàmà ndị a na-eto eto gosipụtara dị nnọọ ka nke a na-ahụ n’ime ọtụtụ ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, n’ime 23 ndị na-erubeghi iri afọ abụọ meworo baptism n’Ọgbakọ Heiwadai nke dị na Tokyo Prefecture, 11 bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile, 11 rụkwara ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April. N’ọgbakọ ahụ, ngụkọta nke 93 ndị nkwusa rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’otu ọnwa ahụ.

Ụbọchị Pụrụ Iche nke Ịrụ Ọrụ

Mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị Japan nke ọnwa March ji okwu ndị a gbaa ụmụnna nile ume: “Ọrụ magazin abụwo nke a kwadoro ọ bụghị nanị na Saturday nke abụọ na nke anọ kama na Saturday nile nke ọnwa ọ bụla. A na-aja inụ ọkụ n’obi nke ụmụnna na-egosipụta mma. N’April e mekwara ndokwa ịrụ ọrụ magazin n’ụbọchị Saturday ọ bụla, ma biko mee mgbalị pụrụ iche isetipụ April 8 maka ụbọchị magazin ka onye ọ bụla wee nwee ike ikere òkè n’ọrụ magazin n’ụbọchị ahụ. Iji nwee ike ịkpọsa ịdọ aka ná ntị nye ndị nile ga-aṅa ntị, ọ dị mkpa ikesa mbipụta ndị a biara n’ezi oge n’ebe nile.”—Aịsaịa 61:2; Mkpughe 18:4, 5.

Na February Ozi Alaeze Anyị ndị Japan emesiwo ọrụ nke a dị mkpa ike. O kwuru, sị: “Na Saturday nke abụọ, April 8, ka onye ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova nọ na Japan —nke ọnụ ọgụgụ ha karịrị 130,000 ugbu a —kere òkè n’ọrụ magazin.” A gbara ndị okenye ume ime ndokwa ọrụ magazin dị iche iche n’ime ụbọchị ahụ nile ka ọtụtụ ndị, ruo ókè o kwere mee, wee nwee ike ikere òkè. Site ná nzaghachi dị mma nke ndị okenye nakwa nkwado nke ndị nkwusa nile ji obi ha mee, ụbọchị ahụ gara nnọọ nke ọma n’ụzọ dị mma. Anyị pụrụ ikwu na n’ụbọchị ahụ, e ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu na Japan ná mkpọsa a na-akpọsa ikpe Jehova megide Babilọn Ukwu ahụ.

Dị ka ihe atụ, na Yokohama City, n’Ọgbakọ Ushioda, ndị okenye mere ndokwa maka ije ozi ga-adịru 13 awa, na-amalite na 7:00 nke ụtụtụ ruo 8:00 nke abali. Ná ndokwa ahụ, e wepụtara ugbo abụọ maka ịgba àmà okporo ụzọ, tinyekwara oge e wepụtara maka ileta ndị a na-enwetabughi n’ụlọ nakwa maka ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ nke a na-arụ n’oge nile. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nkwusa ahụ nwere ike ikere òkè ma ọ dịkaria ala n’otu n’ime ụdị ije ozi ndị ahụ e dokwara, ole na ole kerekwara òkè n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe omume nile e dokwara.

E mere ndokwa maka ije ozi n’akwụsịghi akwụsi n’Ọgbakọ Jonan, Fukuoka City. N’ebe ahụ, e mere ndokwa ịrụgide ọrụ malite n’awa nke 8:00 nke ụtụtụ ruo 9:00 nke abalị, na-enwe nanị oge nkwụsitụ dị nta n’ehihie. E tinyekwara oge maka ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eleta ógbè azụmahịa na ọma ahịa dị iche iche, na-agakwa n’ebe a na-enwetaghị onye ọ bụla n’oge a kpọtụburu n’ebe ahụ. Ụfọdụ Ndịàmà n’ọgbakọ ahụ nyere akụkọ ozi ruru ihe dị ka awa asatọ nke ọrụ ime nkwusa maka ụbọchi ahụ!

Nzaghachi nke ụmụnna ji obi ha nile mee bụ nke a na-ahụta na Wakayama Prefecture, ebe 55 ndị nkwsa nile nọ n’Ọgbakọ Kainan keere òkè n’ụbọchi ahụ pụrụ iche nke ịrụ ọrụ. Otu nwanna nwanyi n’ebe ahụ, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile, mụrụ nwa n’April 7. Nke ahụ ọ̀ kwụsịri ya ịgba àmà n’April 8? Ee e. O chere magazin ndị ahụ n’ihu ndị mmadụ kpọmkwem n’ụlọ ọgwụ ahụ! N’igosipụta otu ụdị mmụọ ahụ, ọ dịri mkpa na otu nwanna sitere Osaka Prefecture aghaghị ime ihe ụfọdụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ o ji akpata ego n’April 8. Olee otú ọ pụrụ isi kere òkè n’ọrụ ahụ pụrụ iche? O ji ebe ọ na-arụ ọrụ mere ókèala nke ya, ọ natakwara ụtụ magazin ise.

Otu nwanna nwanyi nọ na Saitama Prefecture nwere mmasị ikere òkè n’ọrụ ahụ pụrụ iche n’ụbọchị ahụ, ma ọ ghaghi iso di ya na-ekweghi ekwe gaa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 800 maịlụ [1,280 kilomita] ruo Asahikawa City. Otú ọ dị, mmụọ ya adaghi mbà. N’Asahikawa, ọ kpọọrọ obere ụmụ ya abụo gaa n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’ebe ahụ, n’ebe mpụta ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, ọ chọtara ihe ọ tụrụ anya ya: otu ìgwè ndị nkwusa sitere n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ ndị nọ n’ozi ubi. O nwere ike isoro ha kere òkè n’ọrụ a rụrụ n’ụbọchi ahụ.

Ịgba Àmà Okporo Ụzọ

Ozi Alaeze Anyị nke ndị Japan gbara ndị okenye ume karịsịa idokwa ịgba àmà okporo ụzọ maka April 8, nke ghọkwara akụkụ pụtara ìhè nke ụbọchị ahụ pụrụ iche. Dị ka o si dapụta, oké mmiri zoro ná mba ahụ nile, ma nke ahụ abịanyụghị ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna ahụ. Ihe ka ọtụtụ gosipụtara otu mmụọ ahụ dị ka nke a na-ahụta n’ụmụnna nwanyi atọ ndị nwere nkwarụ nọ n’Ọgbakọ Minamata, Kumamoto Prefecture. N’agbanyeghị afọ ndụ ha—65, 80, na 85—ha kara obi pụọ n’ọnọdụ ihu igwe ahụ, ihe ha mere gbakwara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ ume; ha dọrọkwaara mmasị nke ọtụtụ ndị na-agafe.

Ka ọ nọ na-agba àmà n’okporo ụzọ, otu nwanna nwanyị nọ n’Ọgbakọ Kashiwa City West jụrụ otu nwoke, sị: “Ọ̀ dịwo mgbe ị nụrụ ihe banyere Babilọn Ukwu ahụ?” Mgbe o chere mbipụta magazin ndị ahụ nke ọnwa April n’ihu ya, nwoke ahụ sịrị, “Enweghị m mmasi” ma si n’ebe ahụ pụọ. Otú ọ dị, mgbe o rutere n’ebe ụzọ okporo ígwè ahụ gafere ma kwụsi, ọ nọ na-ajụ onwe ya, “Gị bụ Babilọn Ukwu ahụ?” Otu nwanna nwoke bụ onye na-agba àmà okporo ụzọ n’ebe dị nso nụchatara ihe ọ na-ajụ ma sonyere ya n’okporo ụzọ ahụ, na-akọwa ihe Babilọn Ukwu ahụ bụ. Nwoke ahụ natara magazin ndị ahụ.

Ọgbakọ ụfọdụ adịbeghi mgbe ha gbaworo àmà okporo ụzọ na mbụ. Ma kemgbe April 8, ha emewo ka ọ bụrụ akụkụ nke ọrụ ha na-arụ n’oge nile. Ka a sịkwa! Ịgba àmà okporo ụzọ bụ nnọọ ụzọ e si enwe ihe ịga nke ọma n’ịchọta ndị mmadụ bụ́ ndị a na-apụghị inweta n’ụlọ. Otu nwanna nwanyị bi na Naha City, Okinawa, gbara àmà okporo ụzọ ná mpụta nke otu ụlọ ọrụ a na-adịghị ekwe ka Ndịàmà Jehova bata na ya iji gbaa àmà. O tinyere 12 magazin n’aka ndị mmadụ n’ime otu awa site n’igakwuru ndị na-abatá ma ọ bụ na-apụ n’ụlọ ahụ.

Otu nwanna nwayị na Muroran City, Hokkaido, gbara àmà okporo ụzọ n’ebe mpụta ụlọ ahịa ndị ukwu e nwere n’obodo ahụ. Ọ gwara otu nwoke natara magazin ndị ahụ, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụta karị, anyị pụrụ ileta gị n’ụlọ gị.” Nwoke ahụ nyere ya address ya, nọmba telifonu, otu map a ga-eji chọta ụlọ ya, na oge ọ ga-anọ n’ụlọ! N’izu na-esonụ, nwanyị ahụ na otu nwanna nwoke letara ya, ma chọpụta na o bi n’otu ụlọ a machibidoro Ndịàmà Jehova ibata na ya zie ozi ọma. O dowo nwa okorobia ahụ anya site n’ọmụmụ Bible onwe onye ya na Krisendọm enweghị ihu ọma Chineke. Ọ na-achọ ezi Iso Ụzọ Kraịst, o nwekwara obi ụtọ ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi oge nile.

Otu onye nkwusa nọ na Kawasaki City keere òkè n’ịgba àmà okporo ụzọ n’ehihie nke April 8. Ná ngwụsị nke oge o wepụtara ime otú ahụ, ọ gwara onye ikpeazụ okwu, bụ́ otu nwa agbọghọ nke sịrị na ya esorowo Ndịàmà Jehova mụọ Bible na mbụ. Ọ natawo mmegide site n’aka ndị mụrụ ya ma mesia banye mahadum wee biri ebiri n’ụlọ akwụkwọ. Ya mere ọ kwụsịrị ọmụmụ ihe ya. Otú ọ dị, n’ihi igba àmà okporo ụzọ, o ji obi ụtọ maliteghachi ọmụmụ Bible ya, ọ malitewokwa ibia nzukọ nile.

Ikesa Magazin

N’ihi nkwado nke ọtụtụ kwadoro ọrụ ahụ pụrụ iche, magazin ndị e tinyere—karịsịa ndị ahụ bu ozi ikpe ọmụma ndị ahụ megide Babilọn Ukwu ahụ—dị ukwuu. Otu onye nkwusa ọgbakọ nọ n’Osaka Prefecture tinyere 205 magazin n’April. N’Ọgbaka East nke dị na Kagoshima City, 12 ndị nkwusa tinyere ihe karịrị otu narị magazin n’otu n’otu, ebe òtù nke ndị nkwusa iri na abụọ dịpụrụ iche n’Ogawa Town, Ibaraki Prefecture, kesara ngụkọta nke 1,388 magazin n’ọnwa April.

N’ezie, na Japan nile, e tinyere 3,293,266 magazin n’April afọ gara aga—nke ji 92 pasenti karịa nke April 1988! Lee otú ozi ikpe ọmụma Jehova si daa ụda siri ike megide Babilọn Ukwu ahụ!

Ike Karịrị Ike Mmadụ Efu

N’ezie, dị ka n’akụkụ ndị ọzọ nile nke ụwa, Ndịàmà Jehova na Japan nwere echiche ziri ezi na ịnụ ọkụ n’obi n’oge udu mmiri nke afọ 1989. Ahụmahụ ha na-enye ihe àmà na Jehova gọziri ịnụ ọkụ n’obi ha ma kwadoo mgbalị ha nile ịkpọsa ikpe ya megide okpukpe ụgha. Nye ụfọdụ, ọ dịghi mfe ikere òkè; otú o sina dị, ha kpebisiri ike, Jehova gọzikwara ịnụ ọkụ n’obi ha. Ọtụtụ bi n’ókèala a na-arụkarị ọrụ na ya, ma ha gosipụtakwara otu ụdị mmụọ ahụ nke ịdị ngwa na ịnụ ọkụ n’obi dị ka ụmụnna ha nọ n’ebe ndị ọzọ. N’ọnọdụ nile, okwu ndị ahụ Aisaia kwuru mezuru: “Ọ bụ onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghi ka ọ na-emekwa ka o nwee ume.”—Aịsaịa 40:29.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ahụmahụ ndị ha nwere chetaara ha okwu ndị ahụ nke Pọl onyeozi: “Anyi nwere akụ a n’ite ájá, ka [ike karịri ike mmadụ efu, NW] wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ee, mgbe mmadụ butere ozi ndị Kraịst, bụ́ “akụ a,” ụzọ ná ndụ ya, ọ na-enwe ahụmahụ nke ‘ike kariri ike mmadụ efu’ nke Chineke na-enye. Ka Jehova nọgide na-eji ndị ohu nọ ná mba Japan nakwa n’ala ndị ọzọ nile na-eme ihe ịgba àmà zuru ezu tupu ọgwụgwu ahụ abịa.—Matiu 24:14.

N’afọ a, mbipụta Ụlọ Nche nke ọnwa April na May ga-ebu usoro isiokwu ndị bụ “Ònye Ga-eduru Ihe A Kpọrọ Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?” “Udo Ụwa-Gịnị Ka Ọ Ga-apụta n’Ezie”? “Ọtụtụ Nde Ndị Nwụrụ Anwụ Ugbu a Ga-adị Ndụ Ọzọ,” na “Amagedọn—Òle Mgbe?” Gịnị mere i gaghị eme ndokwa isoro ndị agbata obi gị kerịta ihe ọmụma nke a? Jide n’aka na e mere ka ọnụ ọgụgụ dị ukwu ruo ókè o kwere omume maara banyere ozi ọma ahụ dị ebube nke Chineke chebeworo n’ime Bible maka ụbọchị anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya