Na-echebara Ọrụ Dị Iche Iche Dị Ebube nke Chineke Echiche
1 Ruo ụbọchị atọ mara nnọọ mma, anyị zukọtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke.” Anyị wepụrụ uche anyị ná nchegbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị ná ndụ ma tinye uche n’ọrụ dị iche iche dị ebube nke Jehova. A haziri usoro ihe omume ahụ iji mee ka okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ na n’Okwu ya bukwuo ibu, iji wusie mmekọrịta anyị na ya ike, na iji mee ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi maka ozi ahụ. Olee otú anyị si na-erite uru site n’ihe ndị a kụziiri anyị?—Jọn 13:17.
2 Ezinụlọ Dị Iche Iche Na-erube Isi n’Okwu Chineke: Usoro isiokwu bụ́ “Na-erubere Okwu Chineke Isi” nyeere anyị aka inyocha ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ anyị. Ọ na-atọ ụmụaka ụtọ ịmụ ihe. N’ihi ya, a gbara ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke ume ime ọmụmụ Bible ezinụlọ ntọala maka iwulite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Ọtụtụ ndị isi ezinụlọ so obere ụmụaka ha na-atụle broshuọ ọhụrụ bụ́ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Nke a ga-enyere ha aka iwulite mmekọrịta na-enye obi ụtọ na nke siri ike n’etiti ha na Jehova. Ndị mụrụ ụmụ, kụzierenụ ụmụ unu ụzọ isi na-aṅa ntị n’echiche Chineke. Na-ekwupụtanụ ịhụnanya unu onwe unu nwere n’ebe ọ nọ nakwa maka mmeso ya nile. (Abụ Ọma 103:2) Na-arụkọnụ ọrụ ọnụ iji setịpụ ma ruo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ nakwa iji na-ekere òkè zuru ezu n’ijere Jehova ozi.
3 Okwu Chineke Na-amụkwasị Ìhè n’Ụzọ Anyị: Anyị nwere obi ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I. Olee ebe ị gụruworo mpịakọta nke mbụ a? Akwụkwọ Aịsaịa na-ebu amụma banyere amamikpe ọdachi ga-abịakwasị mba ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nakwa ngọzi Alaeze ndị na-enye obi ụtọ maka ndị Chineke. (Aịsa. 34:2; 35:10) Ọ na-emekwa ka e nwee okwukwe na obi ike n’ebe Jehova nọ na n’ụzọ o si eme ihe.—Aịsa. 12:2-5.
4 Mgbe ị na-agụ Amụma Aịsaịa I, site ná mmalite ị pụrụ ịhụ otú Aịsaịa si nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’agbanyeghị na ajọ omume gbara ya gburugburu. Mgbe a kpọrọ ya òkù ịbụ onye ozi Chineke, Aịsaịa zara, sị: “Lee m; ziga m.” (Aịsa. 6:8) Ịtụgharị uche na mmụọ afọ ofufo ya ga-agba gị ume ịnọgide na-ekwusa ozi ọma, na-ekere òkè zuru ezu n’ịgba “àmà nye mba nile.”—Mat. 24:14.
5 Anyị ichebara ọrụ dị iche iche nke Jehova echiche ga-eme ka ịdị ukwuu ya bukwuo ibu. Ya mere jiri ihe ùgwù nke ịbụ onye na-eme okwu Chineke kpọrọ ihe!