Bụrụ Onye Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe
1 Ezi ndị Kraịst ghọtara na ọ dịghị ihe mmadụ pụrụ ime nke dị mkpa karịa ịzụlite na ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, a pụghị ikwu na anyị na-ejere Chineke ozi. (1 Kọr. 2:14-16) Ya mere ọ dị anyị mkpa ịrụsi ọrụ ike iji zụlite iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ndị na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, gịnịkwa bụ ụgwọ ọrụ ọ na-eweta?
2 Ọmụmụ Ihe na Ntụgharị Uche: Ịmụ ihe pụtara ihe karịrị nanị ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ọ na-agụnye itinye uche n’ihe n’ụzọ nwere nzube, na-elekwasị anya ná nkọwa ndị miri emi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-enwe mmasị ịmụ ihe, ndị ọzọ adịghị enwe. Ọ dị ndị dị otú ahụ mkpa ịzụlite agụụ ịmụ ihe.—Ọma 34:8; 1 Pita 2:2.
3 Ntụgharị uche na-agụnye ichebasiri ihe echiche ike. Anyị pụrụ iche echiche banyere ihe mgbapụta ahụ, àgwà Jehova ndị pụtara ìhè n’ihe ndị e kere eke, ịdị mgbagwoju anya nke amụma dị iche iche nke Bible, na otú mmadụ pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’onwe ya. Ịgbalịsi ike ịzụchapụta oge ụfọdụ dị jụụ na ibelata ihe ndọpụ uche n’oge ndị a na-atụgharị uche ga-eme ka uche anyị dịrị otu ebe.—Jen. 24:63; Luk 4:42.
4 Anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara iwere uto ime mmụọ anyị dị ka ihe na-adịghị mkpa. Otu nwanyị nke gaworo nzukọ ma kere òkè n’ozi ubi, malite n’oge ọ bụ nwata, chọpụtara na a chọrọ ihe karịrị nanị usoro ihe omume ndị Kraịst, n’ihi na o mesịrị tinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ. Mgbe o nwetaghachisịworo onwe ya, o kwuru, sị: “Ewebuuru m ya na m bụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ma achọpụtara m na m nọ nanị na-emezu iwu. Mgbe m nwesịrị ihe mkpọbi ụkwụ n’ụzọ ime mmụọ, amalitere m inwesi ọmụmụ ihe onwe onye ike ma na-etinye ya n’ọrụ n’onwe m. Arịọrọ m maka enyemaka Jehova. N’ihi ya, amalitere m ito eto n’ụzọ ime mmụọ, na nke mbụ ya, malite iso ya nwee mmekọrịta onwe onye.”
5 Emezughị Agụụ nke Anụ Ahụ: Jehova achọghị ka anyị mụta ihe n’ụzọ siri ike. N’ụzọ amamihe dị na ya, Okwu ya na-adụ ọdụ, sị: “Na-ejegharịnụ site na Mmụọ Nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.” (Gal. 5:16) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-etinye mgbalị ịghọ ndị na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, anyị ga-enwe akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke ugbu a nakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.—Ọma 1:1-3.