Nọgidesie Ike n’Ozi Ọsụ Ụzọ
1 Obi abụọ adịghị ya na anyị nwere ekele maka ndị ọsụ ụzọ nọ n’etiti anyị. Ha na-arụsi ọrụ ike ịchọpụta ndị kwesịrị ekwesị n’ókèala ọgbakọ ha. N’ihi ya, anyị nile na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọgbakọ anyị nwere ngọzi nke inwetakwu ndị ọsụ ụzọ.
2 Otú ọ dị, n’oge ndị na-adịbeghị anya, ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ enwewo nkụda mmụọ. Mgbe ọbụna obere nsogbu bilitere, ha na-ekpebi ịhapụ ozi oge nile. N’afọ ije ozi 2001, ndị ọsụ ụzọ 1,176 na Nigeria laghachiri n’ọnọdụ nke ịbụ ndị nkwusa. Ọtụtụ ihe pụrụ ịkpatawo ya, ikekwe ọ bụ nrụgide nke ụbọchị ikpeazụ ndị a, oké nsogbu ahụ́ ike, ilekọta nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye òtù ọlụlụ, mmụba nke ibu ọrụ ezinụlọ, na ihe ndị ọzọ. (2 Tim. 3:1) Anyị na-emetara ndị o si otú ahụ dapụtara ebere. Iji gbochie ndị ọzọ n’ime ndị ozi a na-achụ onwe ha n’àjà ịkwụsịkwu, enyemaka dị aṅaa ka anyị pụrụ inye ha? Gịnị ka ọ dị ha mkpa ime iji nọgide n’ozi ọsụ ụzọ?
3 Ekwela Ka Nkụda Mmụọ Merie Gị: Ilu 24:10 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Ndị ọsụ ụzọ nwere ọtụtụ nsogbu ha na-agbaso mgba. Nanị ihe inwe nkụda mmụọ na-eme bụ itinyekwu ihe ná nsogbu ha, ọ ga-emekwa ka ha daa mbà ọbụna karị. Ebe ọ bụ na ozi oge nile bụ ozi nke ịchụ onwe onye n’àjà, ọṅụ dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ndị ọsụ ụzọ ga-anọgide na ya.—Neh. 8:10.
4 Ka ndị ozi oge nile na-eso ndị kwere ekwe ibe ha na-arụkọ ọrụ, ọṅụ ha ga-amụba ma ọ bụrụ na ha amụta iso ndị ọzọ na-adị ná mma. Ya mere, ọ dị ha mkpa ịnọgide na-enwe aṅụrị ọbụna mgbe mmadụ kpasuru ha iwe. Ha pụrụ ime nke a site n’ịhụ ụmụnna ha dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị pụrụ imehie ihe, dịkwa ka ha onwe ha. (Jems 3:2) Ọ bụrụ na onye ya na ya na-efekọ ofufe akpasuo ya iwe, onye ọsụ ụzọ pụrụ ikpegara Jehova ekpere ka o nyere ya aka ileghara emezighị emezi nke ndị ọzọ anya.
5 Ọ bụrụ na ahụ́ esighị ike akpatara gị nkụda mmụọ, akwụsịla. Ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ anọgidesiwo ike n’agbanyeghị ahụ́ esighị ike, na-aghọta na site n’ịtachi obi n’ule, ha na-eme Ekwensu onye ụgha.—Ilu 27:11.
6 Otu onye bụworo ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị afọ 45 nyere ndụmọdụ na-esonụ maka ndị ọsụ ụzọ nsogbu na-anyịgbu, sị: “Anyị kwesịrị iche banyere ọtụtụ ngọzi ndị anyị nwere nakwa banyere ọtụtụ puku ndị ọzọ bụ́ ndị na-enwe ihe isi ike ndị ka ukwuu.” Lee okwu na-emesighachi obi ike nke ahụ bụ!—1 Pita 5:6-9.
7 Na-agbanụ Ndị Ọsụ Ụzọ Ume: Anyị nile na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na a gbaa anyị ume. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ịgba ndị ọsụ ụzọ ume. Agbamume nke ndị ohu a họpụtara ahọpụta nakwa ndị nkwusa dị ha mkpa. Jehova gwara Mozis ka ọ gbaa Jọshụa ume ma mee ka o sikwuo ike. (Deut. 3:28) Ị̀ pụrụ inyere onye ọsụ ụzọ aka site n’isonyere ya n’ozi n’etiti izu bụ́ mgbe ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ma ọ bụ mgbe ọ na-adịghị onye ga-apụta iji soro ya rụọ ọrụ? Ị̀ nọ n’ọnọdụ nke inyere ndị ọsụ ụzọ aka maka njem ha ma ọ bụ mmefu ndị ọzọ mgbe ọ dị mkpa? Ị̀ pụrụ ịkpọ ha òkù n’ụlọ gị site n’oge ruo n’oge maka ihe oriri ma ọ bụ nyetụ ha ihe oriri? Gịnịkwanụ banyere ikwu okwu ekele ndị na-ewuli elu maka mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ha?
8 Mkpa Ọ Dị Ịnọgidesi Ike: Ịrụzu awa ole a chọrọ chọrọ ịnọgidesi ike n’ihe. O kwere nghọta na ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba ma ọ bụ ibu ọrụ ndị ọzọ nke onwe onye ma ọ bụ nke ọgbakọ pụrụ igbochi ụfọdụ ndị ịrụzu awa ole a chọrọ. Ma ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere onye ọsụ ụzọ ji ala oké azụ n’iru awa ole a chọrọ, o rughịzi eru ịnọgide na-abụ onye ọsụ ụzọ ma ọ bụrụ na kọmitii ije ozi ọgbakọ achọpụta na a pụghị idozi nsogbu ahụ n’ime ọnwa ole na ole, ọ gwụla ma ò ruru eru ịnọ n’ọnọdụ onye ọsụ ụzọ ahụ́ na-adịkwaghị ike.
9 Ya mere, ndị nọworị na-asụ ụzọ pụrụ igosipụta na ha ji ihe ùgwù ha kpọrọ ihe n’ezie site ‘n’itinyesi mgbalị ike’ n’ọrụ Jehova. (Luk 13:24) A ghaghị ịchụ àjà onwe onye mgbe mgbe iji nọgide n’ozi oge nile. (Hib. 13:15) Ọ dịkwa ndị ọsụ ụzọ mkpa ịnọgide na-eri nri ime mmụọ Jehova na-enye iji nọgide na-esi ike n’ụzọ ime mmụọ. Nke a chọrọ mgbalị dị ukwuu na ezi atụmatụ, dị ka ndị ọsụ na-enwe ihe ịga nke ọma pụrụ ịgba akaebe ya.—Efe. 5:15, 16.
10 N’ezie, ndị ọsụ ụzọ bụ ngọzi nye ọgbakọ ndị ha nọ na ha. Ya mere, ka anyị nile nyere ha aka ịnọgide na-asụ ụzọ site n’ịdị na-akwado ha.