Ezinụlọ Ndị Siri Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ—E Si Aṅaa Enwe Ha?
1 A na-aja ezinụlọ dị iche iche nke Ndị Kraịst mma n’ihi “itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha.” (1 Tim. 5:4) Otú ọ dị, n’ihi mmetụta ọjọọ ndị gbara anyị gburugburu bụ́ ndị pụrụ ime ka okwukwe anyị daa mbà, ọ dị mkpa ka ezinụlọ dị iche iche rụsie ọrụ ike iji nọgide na-esi ike n’ụzọ ime mmụọ. Olee ụzọ a pụrụ isi mezuo nke a?
2 Gosipụta Ụdị Ịbụisi nke Kraịst: Ọ dị ndị isi ezinụlọ mkpa iṅomi Jizọs Kraịst n’ụzọ ha si arụ ọrụ ha nke iwusi ezinụlọ ha ike. Tụkwasị n’otu ngosipụta nke ịhụnanya o nwere maka anyị site n’ọnwụ ọ nwụrụ iji chụọ àjà, Jizọs nọgidere ‘na-azụ ma na-elezi ọgbakọ ya anya.’ (Efe. 5:25-29) Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-agbaso ihe nlereanya a nke nlekọta ịhụnanya site n’igbo mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha kwa ụbọchị. Nke a na-agụnye inwe ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu, inwe nkwurịta okwu ndị miri emi n’ihe ime mmụọ mgbe ọ bụla o kwere omume, nakwa ilebara nsogbu anya mgbe ọ bụla o bilitere.—Deut. 6:6, 7.
3 N’ozi Ubi: Ndị òtù ezinụlọ nile kwesịrị ịghọta na ịgbara ndị ọzọ àmà banyere Jehova na nzube ya bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe ha. (Aịsa. 43:10-12) Ọ bụrụ na unu bụ́ ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ unu bụrụ Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi nke Jehova, unu ga-amalite nnọọ n’oge na-akwadebe obi ha maka ozi ahụ. Kwurịtanụ ihe ndị mere o ji dị mkpa inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà n’ozi, nakwa ịdị na-ekere òkè na ya kwa izu. (Mat. 22:37-39) Mgbe ahụ, mee ndokwa ka ha soro gị na-ekerechi òkè anya n’ozi ubi.
4 Nyere ha aka ịghọtakwu mkpa ọrụ ime nkwusa dị site n’ịdị na-ewepụta oge mgbe a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ kwa izu iji kwadebe ma mụgharịa ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị irè. Nye ụmụ gị ọzụzụ n’ozi ubi n’otu n’otu, na-enyere ha aka inwe ọganihu dị ka afọ ndụ na ikike ha si dị. Mgbe unu jekọsịrị ozi, kparịtanụ otú ha onwe ha si hụ ịdị mma nke Jehova. Kọọ ahụmahụ ndị na-ewusi okwukwe ike. Ka ezinụlọ dị iche iche ‘na-edetụkwu ire na Onyenwe anyị nwere obiọma,’ otú ahụ ka ha ga-abịarukwu Jehova nso, bụ́ nke ga-ewusi ha ike iguzogide “ihe ọjọọ nile.”—1 Pita 2:1-3.
5 Ná Nzukọ: Lee ihe ọma ọ bụ mgbe ndị òtù ezinụlọ na-enyere ibe ha aka ịga nzukọ nile nke ọgbakọ, karịsịa ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha na-enwe ike ọgwụgwụ, nkụda mmụọ, ma ọ bụ bụrụ onye ihe karịrị aka! “Mgbe nna m lọtara ọrụ, ike na-agwụ ya,” ka otu nwanna nwanyị na-eto eto kwuru. “Ma ana m eso ya kwurịta otu isi ihe dị mma a ga-atụle ná nzukọ n’uhuruchi ahụ, nke ahụ na-agbakwa ya ume ịga. Mgbe ike gwụkwara m, ọ na-agbakwa m ume ịga.”—Hib. 10:24, 25.
6 Imekọ Ihe Ọnụ: Ezinụlọ kwesịrị ịdị na-emekọ ihe ọnụ, dị ka inye aka n’ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. E kwesịkwara iwepụta oge maka ntụrụndụ e ji nlezianya họrọ. Ime mkpapụ, ịga mkpagharị, igwuri egwu, na ịga leta ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi pụrụ ịbụ oge obi ụtọ na oge ndị na-atọ ụtọ icheta.—Ekli. 3:4.
7 Ezinụlọ Ndị Kraịst siri ike na-emeri ihe ndị na-ama ọnọdụ ime mmụọ ha aka kwa ụbọchị. Site n’ịbịaru Jehova nso ọbụna karị, ha na-enweta ike nke ọ na-enye.—Efe. 6:10.