Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 5
  • Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Nụrụ, Wee Tụkwasị Ihe Mmụta n’Amamihe Gị’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Gee Ntị Ka Ị Mụta Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 5

Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

1 Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” anyị nke na-abịanụ ga-enye anyị ohere magburu onwe ya iji gboo mkpa ime mmụọ anyị. Dị ka nri nkịtị nke na-edozi ahụ́, usoro ihe omume ahụ ga-eji “okwu okwukwe” zụọ anyị n’ụzọ ime mmụọ. (1 Tim. 4:6) Ọ ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. Anyị ga-atụkwa anya inweta ndụmọdụ na agbamume iji nyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa ndị anyị na-enweta ná ndụ. Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” (Ọma 32:8) Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi inwe nduzi ịhụnanya ya ná ndụ anyị! Tụlee ihe ụfọdụ bara uru anyị pụrụ ime iji rite uru kasị ukwuu n’usoro ihe omume mgbakọ ahụ.

2 Ọ Dị Anyị Mkpa Idozi Obi Anyị: Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọrụ nke ichebe obi ihe atụ ya. (Ilu 4:23) Nke a na-achọ ka anyị na-enye onwe anyị ọzụzụ ma na-agwa onwe anyị eziokwu. Mgbakọ bụ oge ịtụgharị uche ná mmekọrịta anyị na Jehova, oge ‘inyonye anya n’iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe.’ Iji dozie obi anyị ‘ịnakwere nkụnye a na-akụnye okwu ahụ,’ anyị kwesịrị ịrịọsi Jehova ike ka o nyochaa anyị, ma chọpụta n’ime anyị “ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu” nke chọrọ mgbazi, ka o duziekwa anyị “n’ụzọ ebighị ebi.”—Jes. 1:21, 25; Ọma 139:23, 24.

3 Ṅaa Ntị Ma Tụgharịa Uche: Jizọs jara Meri mma n’ihi ịṅa ntị nke ọma n’okwu ya, na-asị: “Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:39, 42) Ọ bụrụ na anyị nwere otu ụdị echiche ahụ, anyị agaghị ekwe ka ihe ndị na-enweghị isi dọpụ uche anyị. Anyị ga-ejide n’aka na anyị nọdụrụ ala ma ṅaa ntị n’usoro ihe omume ahụ nile. Anyị ga-ezere ikwu okwu ma ọ bụ ịdị na-agagharị n’ụzọ na-adịghị mkpa, anyị ga-akpacharakwa anya ka anyị ghara iji fon na-enweghị eriri, ígwè ozi pager, kamera, na camcorder dọpụ uche ndị ọzọ.

4 Mgbe anyị na-ege ntị n’okwu ndị a na-ekwu, ọ dị mkpa ịdị na-edetu ihe ndị dị mkpirikpi iji nyere anyị aka ịtụle otú e si na-akọwapụta isiokwu ahụ. Anyị ga-ejikọta ihe anyị na-anụ na ihe ndị anyị mabu ama. Nke a ga-enyere anyị aka ịghọta na ịdị na-echeta ihe ahụ e kwuru. Mgbe anyị na-atụleghachi ihe anyị deturu, ọ ga-adị mkpa ka anyị mee ya n’ebumnobi nke itinye ihe ahụ n’ọrụ. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú nke a si emetụta mmekọrịta mụ na Jehova? Olee mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka m mee ná ndụ m? Olee otú m pụrụ isi tinye ihe ọmụma a n’ọrụ ná mmekọrịta nke mụ na ndị ọzọ? Olee otú m pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ozi m?’ Ka anyị soro ndị ọzọ kwurịta isi ihe ndị anyị kasị nwee mmasị na ha. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka idebe ihe ndị Jehova kwuru ‘n’etiti obi anyị.’—Ilu 4:20, 21.

5 Ka Anyị Tinye Ihe Anyị Mụtara n’Ọrụ: Mgbe ọ gasịrị otu mgbakọ distrikti, otu onye kwuru, sị: “Usoro ihe omume ahụ na-agwa nnọọ mmadụ okwu n’otu n’otu, na-akpali mmadụ inyocha obi ya na nke ezinụlọ ya, na inye aka site n’Akwụkwọ Nsọ dị ka o si dị mkpa. O mewo ka m matakwuo ibu ọrụ m nke bụ́ inyekwuru ọgbakọ aka.” Ma eleghị anya, ọtụtụ n’ime anyị enwewo mmetụta dị otú ahụ. Ma ọ kwụsịghị nanị n’anyị ịlawa, bụrụ ndị e wuliri elu na ndị nwere ume ọhụrụ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu emee ha.” (Jọn 13:17) Anyị aghaghị iji ịdị uchu na-etinye isi ihe ndị metụtara anyị onwe anyị n’ọrụ. (Fil. 4:9) Nke a bụ ụzọ bụ́ isi nke isi gboo mkpa ime mmụọ anyị n’ụzọ zuru ezu.

[Igbe dị na peeji nke 5]

Tụgharịa Uche n’Ihe Ndị Ị Nụrụ:

■ Olee otú o si emetụta mmekọrịta mụ na Jehova?

■ Olee otú o si emetụta mmekọrịta nke mụ na ndị ọzọ?

■ Olee otú m pụrụ isi na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ m na n’ozi m?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya