Otú Ndị Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Egosi Mmasị Onwe Onye
1 E mere Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ iji mee ka “o kwe mee ileba anya n’uto ime mmụọ nke onye ọ bụla n’otu n’otu. . . . Nke a bụ nnọọ ngosipụta ịhụnanya Jehova na nlekọta obi ọma ya n’ebe ndị ya nọ.” (om-IB p. 75; Aịsa. 40:11) Onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na-arụ ọrụ dị mkpa n’inye ụdị nlebara anya onwe onye ahụ.
2 N’ọmụmụ Akwụkwọ: Ebe ọ bụ na a ma ụma na-eme ka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ dị nta, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ga-enwe ike ịma ndị nọ n’ìgwè ya nke ọma. (Ilu 27:23) A na-enwekarị ohere nke ịkpakọrịta tupu ma ọ bụ mgbe e mechisịrị ọmụmụ ihe kwa izu. N’ihe dị ka otu ọnwa, ọ pụrụ iso ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile so n’ìgwè ahụ kwurịta okwu. Nke a na-enyere ndị òtù ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ahụ aka inwe ahụ́ iru ala n’ịgakwuru ya mgbe ha na-eche ule ihu ma ọ bụ mgbe ha chọrọ agbamume.—Aịsa. 32:2.
3 Onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na-agbalị ịgba ndị nile so n’ìgwè ahụ ume ikere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ. Otu ụzọ o si eme nke a bụ site n’iji obiọma na ịdị nro na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ. (1 Tesa. 2:7, 8) Ọ na-achọ ụzọ isi mee ka onye ọ bụla, gụnyere ụmụaka, kere òkè ná nkwurịta okwu ahụ. Ọ bụrụ na ụfọdụ na-eme ihere ịza ajụjụ, ọ pụrụ inyere ha aka site n’ime ndokwa tupu oge eruo ka ha gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ zaa ajụjụ n’otu paragraf. Ma ọ bụ ọ pụrụ igosi ha otú ha pụrụ isi zaa ajụjụ n’okwu nke aka ha.
4 Ọ bụrụ na onye na-enyere onye nlekọta ọmụmụ ihe aka bụ ohu na-eje ozi, onye nlekọta ahụ pụrụ ịdị na-eme ndokwa ka o duzie ọmụmụ ihe ahụ otu ugboro n’ọnwa abụọ ọ bụla. Nke a na-enye onye nlekọta ahụ ohere ịhụ otú onye na-enyere ya aka si eme ma tụọ aro ndị ga-enye aka. Lee ndokwa ọma ọ bụ iji nyere ụmụnna aka ime ka nkà izi ihe ha ka mma!—Taị. 1:9.
5 N’ozi Ubi: Otu n’ime ọrụ ndị bụ́ isi nke onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ bụ ibute ụzọ n’izisa ozi ọma. (Ọnụ Ọgụ. 27:16, 17) Ọ na-eme ndokwa ndị dị irè maka ịgba àmà n’ìgwè ma na-agbalị inyere mmadụ nile nọ n’ìgwè ahụ aka inweta ọṅụ n’ozi ha. (Efe. 4:11, 12) Iji mezuo nke a, ọ na-eme ya ihe mgbaru ọsọ ya iso onye ọ bụla so n’ìgwè ahụ rụọ ọrụ n’ozi. Ya na onye nlekọta ije ozi na-arụkọkwa ọrụ ọnụ n’ime ndokwa ka ndị ga-achọ imeziwanye akụkụ ụfọdụ n’ozi ha nweta enyemaka site n’aka ndị nkwusa nwere ahụmahụ karị.
6 Dị Ka Onye Ọzụzụ Atụrụ nke Na-ahụ n’Anya: Onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ nwere mmasị n’ebe ndị nwere ike ikere nanị òkè dị nta n’ọrụ ime nkwusa n’ihi ọnọdụ ha, nọ. Ọ na-ahụ na ndị a kpaara ihe ha pụrụ ime ókè n’ihi ime agadi ma ọ bụ n’ihi na ha adịghị apụtali èzí na ndị a kpaara ihe ha pụrụ ime ókè ruo nwa oge n’ihi na ezigbo ọrịa ji ha ma ọ bụ n’ihi mmerụ ahụ́ maara banyere ndokwa nke na-enye ha ohere inye akụkọ ozi ubi ha ndị ruru minit 15 ma ọ bụrụ na ha enyelighị ihe ruru otu awa n’otu ọnwa. (Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ekpebi onye ruru eru ịbata ná ndokwa a.) Ọ na-enwekwa mmasị n’ebe ndị e kenyere n’ìgwè ya nọ bụ́ ndị pụrụ ịbụ ndị na-adịghị ejekwa ozi, na-agbalị inyere ha aka ịmaliteghachi iso ọgbakọ na-arụ ọrụ.—Luk 15:4-7.
7 Lee ekele anyị nwere maka mmasị ịhụnanya ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na-egosi! Nlebara anya nke ha na-egosi na-enyere mmadụ nile aka ‘inweta ịdị n’otu n’okwukwe ahụ, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogo dịịrị izu ezu nke Kraịst ahụ.’—Efe. 4:13.