Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite October 14
Abụ nke 103
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ịtụleghachi ihe ndị ha deturu ná mgbakọ sekit gara aga iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi n’izu na-esonụ. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 7 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 15 na Teta! nke November 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi zaghachi ihe na-egbochi mkparịta ụka bụ́ “Amataworị m ọrụ unu nke ọma.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 12.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Otú Ndị Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Egosi Mmasị Onwe Onye.” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ga-eme. N’okwu mmeghe, kọwaa ná mkpirikpi otú ndokwa ọmụmụ akwụkwọ si malite. (jv-E 237, para. 4) Buru ụzọ mee ndokwa ka ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ kwuo otú ha siworo rite uru ná mmasị onwe onye e gosiri ha site n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.
Abụ nke 65 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 21
Abụ nke 206
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ.” Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Mee ka a gụpụta paragraf nke 5 ma jide n’aka na a ghọtara isi ihe dị na ya.
20 min: “Tụọnụ Egwu Chineke, Nyekwa Ya Otuto.” (Mkpu. 14:7) Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke a ga-eji tụleghachi usoro ihe omume mgbakọ sekit e nwere n’afọ a. Gwa ọgbakọ ka ha kwuo isi ihe ndị ha mụtara na otú ha si nwee ike itinye ha n’ọrụ n’onwe ha ma ọ bụ dị ka ezinụlọ. (A pụrụ ikenye ụfọdụ ndị akụkụ ụfọdụ tupu oge eruo.) Kọwapụta usoro ihe omume ndị a: (1) “Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Ịzụlite Egwu Chineke.” Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere mmasị bụ́ ndị bịara Ememe Ncheta aka inwe ọganihu na ịghọ ndị ohu Jehova na-arụsi ọrụ ike? (2) “Ịtụ Egwu Jehova Pụtara Ịkpọ Ihe Ọjọọ Asị.” (w88-IB 3/15 24-26) Olee otú Ilu 6:16-19 pụrụ isi nyere anyị aka izere ihe ndị Jehova kpọrọ asị—nganga, ịgha ụgha, nchụso nke ihe onwunwe, ntụrụndụ na-ezighị ezi, iji Intanet eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? (3) “Nọgide Na-abịaru Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nso.” Anyị hụrụ Jehova, Jizọs, ndị òtù ezinụlọ anyị, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ n’anya; olee otú ịbịaru ha nso si echebe anyị pụọ n’ụwa? (4) “Tụọ Egwu Jehova, Ọ Bụghị Mmadụ.” Olee otú egwu imejọ Jehova si nyere gị aka imeri ime ihere mgbe ị na-eme nkwusa, ịgbasosi ụkpụrụ Chineke ike mgbe ị nọ n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ịjụ nrụgide nke onye were gị n’ọrụ na-arụgide gị ịhapụ ịga nzukọ na mgbakọ dị iche iche? (5) “Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto.” (Ọma 119:37; Hib. 4:13) N’ihi gịnị ka egwu Chineke kwesịrị iji gbochie anyị ịṅụbiga mmanya ókè, ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ime mmehie ndị ọzọ zoro ezo? (6) “Nọgide Na-eje Ije n’Egwu Jehova.” Olee otú Jehova siworo gọzie gị maka ikwe ka mmụọ ya na-arụ ọrụ n’ụzọ zuru ezu ná ndụ gị?—Ọma 31:19; 33:18; 34:9, 17; 145:19.
Abụ nke 171 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 28
Abụ nke 110
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ịtụleghachi ihe ndị ha deturu n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche gara aga iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka October. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 7 eme ihe, mee ka otu nwanna nwanyị mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke November 1, meekwa ka otu nwanna nwoke gosi ụzọ isi nyefee Teta! nke November 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kọwapụta n’ụzọ dị mkpirikpi akụkụ dị mma n’ihe ngosi ahụ.
12 min: Ahụmahụ ndị sitere n’ógbè unu. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nweworo ka ha na-agba àmà mberede n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, mgbe ha na-azụ ahịa, nakwa n’ebe ndị ọzọ.
25 min: “Ịkwaga ná Mba Ọzọ n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị—Kpachara Anya Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Zoro Ezo Dị na Ya.” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye okenye ruru nnọọ eru ga-eme. Mee ka a gụpụta paragraf nke 6, 7, 10.
Abụ nke 67 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 4
Abụ nke 66
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi aro ụfọdụ ndị sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 banyere ụzọ isi nyefee broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee otu n’ime ihe ndị a.
13 min: Onye Ihere Ozi Ọma ahụ Na-adịghị Eme. (Rom 1:16) Onye ntorobịa agakwuru nna ya gaa kọọrọ ya otu nsogbu o nwere. Onye ahụ na-eto eto achọghị ka a mata ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ihi ụjọ nke ịbụ onye ndị ọgbọ ya ga-akwa emo. Nna ya ekelee ya n’ihi ikwu eziokwu banyere ọnọdụ ahụ. Nna ya akọọrọ ya otú Pita si meghachi omume n’otu oge n’ihi nrụgide ndị ọgbọ. (Mat. 26:69-74) Nna ya enye ya ndụmọdụ na-esonụ: Anyị ekwesịghị ime ihere na anyị bụ Ndị Kraịst. (Mak 8:38) Ọ bara uru ime ka a mara gị dị ka Onyeàmà n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe i mere ka ha mata, ọtụtụ ndị nkụzi ga-egosi nkwanye ùgwù maka nkwenkwe gị ma ghara ime ka i sonye n’ihe omume ndị i weere dị ka ndị na-ekwesịghị ekwesị. O yikwara ka ndị ntorobịa na-enweghị ụkpụrụ agaghị anwa ịrụgide gị ime omume na-adịghị mma. Ọ ga-adịkwuru ụmụ klas gị mfe ịghọta ihe mere na ị dịghị eyi oge mkpapụ, na-ekere òkè n’egwuregwu ndị na-esoghị n’usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ na-ekere òkè n’ihe omume ndị a na-eme mgbe a gbasara akwụkwọ. Dị ka oge nyere ohere ya, nna ahụ na nwa ya atụlee isi ihe ndị sitere n’isiokwu nta bụ́ “Ịkpọsa Ọbụbụenyi Gị na Chineke n’Ihu Ọha” nke sitere n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peeji nke 315-318. Onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma egosipụta ekele maka ezi ndụmọdụ ahụ.
22 min: Doonụ Onwe Unu n’Okpuru Chineke—Guzogidenụ Ekwensu. (Jes. 4:7) Site n’iji ajụjụ ndị e depụtara n’ebe a eme ihe, otu okenye eduzie mkparịta ụka na-ekpo ọkụ nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche e nwere n’afọ a. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ otú ha siworo nwee ike itinye ihe ndị ha mụtara n’ọrụ. (A pụrụ ikenye ụfọdụ ndị akụkụ ụfọdụ tupu oge eruo.) Kọwapụta akụkụ ndị na-esonụ n’usoro ihe omume: (1) “Ido Onwe Onye n’Okpuru Chineke n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ohu.” Gịnị mere anyị ga-eji nọrọ na nche iji zere ọnyà nke ụwa? (2) “Igosi Ido Onwe Onye n’Okpuru Chineke Dị Ka Ndị Òtù Ezinụlọ.” Gịnị mere o ji dị oké mkpa n’ime nzukọ Jehova iwusi mmekọrịta ezinụlọ ike? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? (3) “Nyere Ndị Ọhụrụ Na-eso Ụzọ Aka Iguzosi Ike n’Akụkụ nke Jehova.” Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka imeri ihe mgbochi ndị na-ele okwukwe ha ule? (4) “Ihe Iguzogide Ekwensu Pụtara.” Gịnị bụ isi ihe dị mkpa n’inwe ike iguzogide Ekwensu? Olee otú ihe agha ime mmụọ ndị ahụ a kọwara ná Ndị Efesọs 6:11-18 pụrụ isi chebe anyị? (w92-IB 5/15 21-23) (5) “Ndị Ntorobịa Ndị Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma n’Iguzogide Ajọ Onye Ahụ” na “Ndị Ntorobịa Ndị Na-erite Uru n’Ido Onwe Ha n’Okpuru Chineke.” Olee ụfọdụ n’ime ụzọ Setan nke ndị na-eto eto na-aghaghị ịnọ na nche megide? Olee otú e si na-agọzi ndị na-eto eto n’ihi ido onwe ha n’okpuru Jehova? (w90-IB 8/1 13-14, para. 15-17) (6) “Irite Uru Site n’Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Ụzọ nke Chineke.” Kọwaa otú Ndị Kraịst si egosipụta ido onwe onye n’okpuru nye ndị ọchịchị, ndị were ha n’ọrụ, n’ime ezinụlọ, na n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ?
Abụ nke 185 na ekpere mmechi.