Inyefe Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
1 Ọtụtụ ndị na-achọ ụzọ ziri ezi isi jeere Chineke ozi. Ha chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi. Ma olee ebe ha pụrụ ịchọta ya? Ọ na-adị anyị ọkụ n’obi igosi ha ụzọ ahụ dị warara. Ọtụtụ nde mmadụ emikpuwo onwe ha kpam kpam n’ịta amoosu. Anyị chọrọ inyere ha aka isi na ya nwere onwe ha. Broshuọ ọhụrụ bụ́ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi−Ị̀ Chọtawo Ya? bụ ngwá ọrụ dị irè iji nyere ndị mmadụ aka. Lee ụfọdụ ụzọ ndị anyị pụrụ isi chee ha n’ihu ndị mmadụ.
2 Okpukpe dị iche iche hà bụ ụzọ dị iche iche e si ejekwuru Chineke? (Dabere n’Okwu Mmalite.) “Biko lee anya na foto a dị na broshuọ a. (Peeji nke 2 na nke 3) Ọtụtụ ndị kweere na okpukpe bụ ụzọ dị iche iche e si ejekwuru Chineke. Gịnị ka i chere? (Nye ohere maka nzaghachi.) Lee ihe paragraf nke abụọ na peeji nke abụọ na-ekwu. (Gụọ.) Dị ka ezinụlọ e gosiri ebe a, ọtụtụ ndị nwere mgbagwoju anya banyere ụzọ ha ga-eso eso. Broshuọ a ga-enyere gị aka ịchọta ụzọ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.”
3 Okpukpe nile hà na-akụzi eziokwu? (Dabere n’Ihe Ọmụmụ nke 1.) “Gịnị ka i chere? Okpukpe nile hà na-akụzi eziokwu? (Mgbe ọ zaghachisịrị, gaa n’ihu.) Ọtụtụ chọọchị na-apụtagasị, ụfọdụ ndị pụkwara iche na nke ọ bụla n’ime ha pụrụ iduga anyị n’ijere Chineke ozi. Otú ọ dị, ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:21, a na-adọ anyị aka ná ntị ịkpachapụ anya. (Gụọ.) N’ihi gịnị ka okpukpe nile na-ejighị site n’aka Chineke? Rịba ama ahịrịokwu abụọ mbụ dị na peeji nke 5, paragraf nke 3, nke Ihe Ọmụmụ nke 1 na broshuọ a. (Gụọ.) Ebe ọ bụ na okpukpe nile apụghị ịbụcha ezigbo ya, olee otú anyị pụrụ isi chọta nke bụ́ ezigbo ya? Broshuọ a ga-egosi gị.”
4 Ànyị kwesịrị ife ndị nna nna anyị hà ofufe? (Dabere n’Ihe Ọmụmụ nke 4.) “Ọtụtụ ndị na-efe ndị nna nna ha ofufe. Ọtụtụ omenala olili ozu dabeere n’ofufe ndị nna nna. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ na-eji efe ma ọ bụ na-asọpụrụ ndị nna nna ha? Biko rịba ama ihe paragraf nke 1 na nke 2 nke dị na peeji nke 12 na broshuọ a na-ekwu. (Gụọ.) Ndị nna nna anyị nwụrụ anwụ hà na-ama ihe anyị na-eme? (Chere ka onye nwe ụlọ zaa.) Ka anyị gụọ ihe Bible na-ekwu n’Eklisiastis 9:5, 10. Ebe ọ bụ na ha amaghị ihe ọ bụla, ọ gaghị ekwesị ekwesị ife ha ofufe. Ị pụrụ ịgụkwu banyere nke a n’Ihe Ọmụmụ nke 4 nke broshuọ a.”
5 Ànyị kwesịrị ịtụ egwu na a ga-ata anyị amoosu? (Dabere n’Ihe Ọmụmụ nke 5.) “Anyị na-eleta ndị mmadụ iji tụlee otu ajụjụ ọtụtụ ndị chebawooro echiche: Ànyị kwesịrị ịtụ egwu na a ga-ata anyị amoosu? Gịnị ka i chere? (Chere ka onye nwe ụlọ zaa.) Ọtụtụ ndị kweere na mgbe ihe ọjọọ mere mmadụ, a tara ya amoosu. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị ji eji ọtụmọkpọ eme ihe. Ànyị kwesịrị iji ọtụmọkpọ na-echebe onwe anyị? Rịba ama ihe broshuọ a na-ekwu na peeji nke 18, paragraf nke 16. (Gụọ.) Jehova Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, dị ike karịa Setan. Ọ pụrụ ichebe anyị pụọ n’aka Setan. (Gụọ Jems 4:7.) Iji nwetakwuo ihe ọmụma, gụọ Ihe Ọmụmụ nke 5 nke broshuọ a.”
6 Okpukpe nile hà na-amasị Chineke? (Dabere n’Ihe Ọmụmụ nke 6.) “Okpukpe nile hà na-amasị Chineke? Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke okpukpe ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst kweere na Chineke, Jizọs, na Bible, ọtụtụ ndị na-eche na nke ahụ mere ka ha na-amasị Chineke. Gịnị ka i chere? (Chere maka nzaghachi.) Jizọs kwuru banyere nke a na Matiu 7:13, 14. (Gụọ.) E nwere nanị ụdị okpukpe abụọ, otu bụ ezigbo ya, nke ọzọ bụ nke ụgha ya. Ezi okpukpe na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Okpukpe ụgha na-eduga ná mbibi. Olee otú anyị pụrụ isi mata nke bụ́ ezigbo ya? Jizọs zara nke ahụ na Matiu 7:16-20. (Gụọ.) Ọ bụrụ na okpukpe bụ ezigbo ya, ọ ga-amị ezi mkpụrụ, ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Setan, ọ ga-amị mkpụrụ na-adịghị mma. Broshuọ a na-akọwa ezi mkpụrụ ahụ na peeji nke 19, paragraf nke 4. (Gụọ.) Ọ̀ bụ na i kweghị otú ahụ? O gosiziri mkpụrụ na-adịghị mma nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-amị. Obi abụọ adịghị ya na ị ga-achọ ịgụ Ihe Ọmụmụ nke 6 nke broshuọ a.”
7 Ọrụ ebube hà na-eme ka okpukpe bụrụ ezigbo ya? (Dabere n’Ihe Ọmụmụ nke 7.) “Abịara m ịza otu ajụjụ: Ọ̀ bụ iwu na okpukpe ga-arụ ọrụ ebube iji bụrụ ezi okpukpe? (Chere ka onye nwe ụlọ zaa.) Ọtụtụ ndị na-eche otú ahụ, ikekwe n’ihi na Jizọs rụrụ ọrụ ebube. Ma lee ihe Jizọs kwuru na Matiu 7:21-23. (Gụọ.) Rịba ama na o kwuru na ụfọdụ ndị ga-azọrọ na ha na-ebu amụma, na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ga-ajụ ha. Paragraf nke 10 na peeji nke 24 nke broshuọ a na-ekwu sị: (Gụọ.) Ònye ga-abanye n’Alaeze ahụ? Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ kama ọ bụ onye na-eme uche Chineke. Olee otú mmadụ pụrụ isi mata ezi okpukpe ahụ? Broshuọ a na-aza ajụjụ ahụ n’Ihe Ọmụmụ nke 7.”
8 Ndị a bụ isiokwu ụfọdụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ anyị pụrụ iji chee ngwá ọrụ a dị ike n’ihu ndị mmadụ. Ọ bụrụ na onye ị na-agwa okwu gosiri ezi mmasị, malite ọmụmụ Bible n’isiokwu i ji nyefee ya broshuọ ahụ ma ọ bụkwanụ malite n’Ihe Ọmụmụ nke 1. Mgbe unu mụsịrị broshuọ ahụ, gaanụ n’ihu n’ịmụ broshuọ Na-achọ. Jiri ngwá ọrụ a dị mma mee ihe nke ọma iji duzie ndị mmadụ gaa n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi!