Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite October 13
  • Izu Na-amalite October 20
  • Izu Na-amalite October 27
  • Izu Na-amalite November 3
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 10/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite October 13

Abụ nke 215

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke mbụ nke ọnwa October. Gbaa mmadụ nile ume iji broshuọ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ bịa Nzukọ Ije Ozi n’izu na-abịanụ nakwa ịtụleghachi ihe ndị ha deturu ná mgbakọ sekit nke afọ a, ná nkwadebe maka Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịanụ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 1 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ kwekọrọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala ọgbakọ unu nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 15 na Teta! nke November 8. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a na-eme nletaghachi n’ụlọ onye a na-ewegara magazin kwa ọnwa. Tọọ ntọala maka nleta ọzọ site n’ịdọrọ uche gaa n’igbe bụ́ “N’ime Mbipụta Anyị Ọzọ.”—Lee Ozi Alaeze Anyị nke October 1998, p. 8, para. 7-8.

20 min: Jiri Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Na-eme Ihe. (Efe. 6:17) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 143-144. Mee ka a zaa ajụjụ ndị a: (1) N’ihi gịnị ka anyị na-eji eji Bible eme ihe mgbe anyị na-aza ajụjụ? (2) Gịnị ka aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova na-egosi banyere anyị? (3) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụrụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya? (4) N’ókèala unu, olee ụzọ ụfọdụ dị irè a ga-esi ewebata echiche ndị sitere na Bible? (5) N’ihi gịnị ka o ji dị mma ịgụpụta ihe kpọmkwem site na Bible mgbe ọ bụla o kwere mee? (6) Olee otú ndị okenye pụrụ isi gbaa ndị ọzọ ume iji Bible na-eme ihe nke ọma? Mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma bụ́ nke dabeere n’ihe omume dị na peeji nke 144 bụ́ nke onye nkwusa nwere nkà n’ịgba àmà ji, ma ọ dịkarịa ala, otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ. Gbaa mmadụ nile ume ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha iji Bible na-eme ihe mgbe ọ bụla ha na-agba àmà.

15 min: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-eweta Ngọzi. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ sitere n’akwụkwọ anyị bụ́ ndị metụtara ọmụmụ Bible ndị nwere ọganihu. (w00-IB 3/1 p. 6; yb98-E p. 55-60) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe anyị na-amụta n’ahụmahụ ndị ahụ nakwa ụzọ anyị si erite uru site n’iduzi ọmụmụ Bible.

Abụ nke 172 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 20

Abụ nke 86

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Inyefe Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?” Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-ekwu ya dị ka okwu nke nwere akụkụ ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Mee ka e jiri abụọ n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị ahụ mee ihe ngosi. N’otu n’ime ihe ngosi abụọ ahụ, gosi otú a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible. A pụrụ ịgba ndị ezinụlọ na ndị ọzọ ume ịmụgharị ụzọ iche ihe n’ihu ndị a n’ụlọ. Mmadụ nile kwesịrị iji broshuọ ọhụrụ a mee ihe n’ụzọ dị mma dị ka akwụkwọ a ga-enyefe na November. Nke ahụ gasịa, nọgide na-eji ya eme ihe nke ọma n’ókèala gị nakwa n’ịmalite ọmụmụ Bible.

20 min: “Tụkwasị Jehova Obi, Meekwa Ezi Ihe.” (Ọma 37:3) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’ajụjụ ndị na-esonụ, bụ́ ndị na-eme ka isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume mgbakọ sekit e nwere n’afọ ije ozi gara aga, pụta ìhè. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ụzọ ha si nwee ike itinye isi ihe ndị a tụlere n’ọrụ n’onwe ha ma ọ bụkwanụ dị ka ezinụlọ. Jiri akụkụ usoro ihe omume ndị a mee ihe: (1) “Igosipụta Ntụkwasị Obi n’Ebe Jehova Nọ.” N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa igosipụta ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ n’akụkụ nile nke ndụ? (it-2-E p. 521) Olee otú akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index pụrụ isi nyere anyị aka? (2) “Nọrọ na Nche Megide Ihe Efu nke Ndụ.” (Ekli. 2:4-8, 11) Ọrụ ndị dị aṅaa na-enweghị isi ka anyị na-aghaghị ịnọrọ na nche megide, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? (3) “Zerenụ Ihe Ọjọọ—Bụrụnụ Ndị Na-eme Ezi Ihe.” N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịgbasosi ụkpụrụ Jehova ike? (Aịsa. 5:20) Ezi ọrụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị na-arụsi ike? (4) “Anyị Ịnọgide Na-enwe Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ.” Gịnị ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’agbanyeghị ule na ọnwụnwa? N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji dị mkpa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ n’aka Jehova? (5) “À Ga-agụ Gị n’Onye Ruru Eru Iketa Alaeze Chineke?” (Kọl. 1:10) Olee ihe atụ Bible ndị na-akpali anyị ịnọgide na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova? (6) “Tụkwasịnụ Nkwa Dị Iche Iche nke Jehova Obi.” Olee otú ime nke a pụrụ isi metụta ndụ anyị?

Abụ nke 58 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 27

Abụ nke 64

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October. Gbaa mmadụ nile ume ịtụleghachi ihe ndị ha deturu ná mgbakọ pụrụ iche nke afọ a, ná nkwadebe maka Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịanụ. N’iji aro a tụrụ na peeji nke 1 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke November 1. Gosi otú a pụrụ isi zaghachi okwu na-egbochi nkwurita okwu bụ́ “Enweghị m mmasị.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 8.

20 min: “Werenụ Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi.”a Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 4, kwuo na na November anyị ga-enyefe broshuọ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ. N’ụzọ dị nkenke, tụleghachi otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha na peeji nke 8 nke Ozi Alaeze Anyị a. E mesịa, mee ihe ngosi ebe a na-amụgharị otú a ga-esi jiri ụzọ iche ihe n’ihu ahụ mee ihe. Gbaa mmadụ nile ume ịkwadebe nke ọma maka ozi.

13 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere ka ha na-agba àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi—n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ.

Abụ nke 52 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 3

Abụ nke 147

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

25 min: Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ. (1 Tim. 6:18) N’iji ajụjụ ndị e depụtara n’ebe a eme ihe, onye okenye eduzie mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’usoro ihe omume mgbakọ pụrụ iche nke e nwere n’afọ a. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ otú ha siworo nwee ike itinye ihe ha mụtara n’ọrụ. (Tupu oge eruo, a pụrụ ikenye ndị mmadụ akụkụ ha ga-ekwu okwu na ha.) Mee ka akụkụ ndị a nke usoro ihe omume ahụ pụta ìhè: (1) “Ezi Ọrụ Na-eweta Uru Buru Ibu.” (Ekli. 2:11) N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke ji achụso ezi ọrụ ndị ahụ a kọwara n’Okwu Chineke kama ịchụso ọrụ na-enweghị isi nke ụwa a? (2) “Baa Ọgaranya n’Ụzọ Chineke Si Ele Ihe Anya.” (Mat. 6:20) Olee otú ụfọdụ ndị siworo ‘kpakọba akụ̀ n’eluigwe,’ oleekwa uru ndị ha riteworo? (3) “Mee Ka Ozi Gị Ka Mma Site n’Iduzi Ọmụmụ Bible.” (om-IB p. 91) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible? (4) “Ezi Ọrụ n’Oge Owuwe Ihe Ubi A.” (Mat. 13:37-39) Ihe nlereanya dị aṅaa nke ezi ọrụ ka Ndị Kraịst oge mbụ setịpụrụ, oleekwa otú ọrụ Alaeze ahụ siworo gbasaa n’oge anyị? (5) “Ka Ezi Ọrụ Gị Na-ewetara Jehova Otuto.” (Mat. 5:14-16) Olee otú ụfọdụ ndị siworo ‘kwe ka ìhè ha na-enwu’? (6) “Ịja Ndị Ntorobịa Mma Maka Ezi Ọrụ Ha Na-arụ n’Inye Jehova Otuto.” (Ọma 148:12, 13) Olee otú ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst nọ na sekit anyị si enye Jehova otuto? (7) “Nọgide Na-arụ Ezi Ọrụ Ma Nweta Ngọzi Jehova.” (Ilu 10:22) Ka anyị nọgidere na-arụsi ezi ọrụ ike, ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta n’otu n’otu, dị ka ezinụlọ, dị ka ọgbakọ, nakwa dị ka nzukọ zuru ụwa ọnụ?

Abụ nke 180 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya