Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/04 p. 1
  • Ndị Mmụọ Ozi Na-enyere Anyị Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Mmụọ Ozi Na-enyere Anyị Aka
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 6/04 p. 1

Ndị Mmụọ Ozi Na-enyere Anyị Aka

1 “Lee! M nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ ihe na-agba ume nye ndị nile na-edebe iwu Jizọs bụ́: “Ya mere gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ”! (Mat. 28:18–20) Otu ụzọ dị ịrịba ama Jizọs si anọnyere ezi Ndị Kraịst bụ site n’aka ndị mmụọ ozi ya. (Mat. 13:36–43) Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ iso ndị mmụọ a e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi na-ekwusakọ “ozi ọma ebighị ebi”!—Mkpu. 14:6, 7.

2 N’ozi Anyị: Bible na-eme ka a mara na e zipụrụ ndị mmụọ ozi “ijere ndị gaje iketa nzọpụta ozi.” (Hib. 1:14) Na narị afọ mbụ, ndị mmụọ ozi keere òkè n’iduru ụmụazụ Jizọs gaa n’ebe ndị nwere obi eziokwu nọ. (Ọrụ 8:26) Taa, ndị ohu Chineke anọgidewo na-ahụ ihe àmà nke nduzi ndị mmụọ ozi. Ọtụtụ mgbe, ndị nwe ụlọ ekwuwo na ha anọwo na-ekpe ekpere maka enyemaka mgbe Onyeàmà bịara na nke ha. Lee ka anyị na ndị mmụọ ozi si aṅụrị ọṅụ mgbe ndị dị otú ahụ nabatara ozi Alaeze ahụ!—Luk 15:10.

3 Iche Mmegide Ihu: Daniel, ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru, Pita onyeozi, na ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị nwetaworo ule ndị tara akpụ, nwetara nchebe Jehova site n’aka ndị mmụọ ozi, bụ́ “ndị dike dị ike.” (Ọma 103:20; Dan. 3:28; 6:21, 22; Ọrụ 12:11) N’agbanyeghị na ọ pụrụ ịdị anyị ka anyị enweghị enyemaka mgbe ụfọdụ a na-emegide anyị, anyị pụrụ inweta agbamume site n’ahụmahụ nke onye ozi Ịlaịsha, mgbe ọ matara na “ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” (2 Eze 6:15–17) Ọ bụrụgodị na e kewapụrụ anyị n’ike n’ebe ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst nọ, ọ dịghị anyị mkpa inwe nkụda mmụọ. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya.”—Ọma 34:7.

4 N’isi nso, usuu ndị agha bụ́ ndị mmụọ ozi ga-agbara ịnyịnya gaa ikpochapụ ndị nile na-emegide ịchịisi nke Kraịst. (Mkpu. 19:11, 14, 15) Ka anyị na-echere ụbọchị ahụ, ka anyị nọgide jiri obi ike na-enye Jehova otuto, na-enwe obi ike zuru ezu na usuu ndị agha dị ike nke eluigwe, bụ́ ndị nọ n’okpuru nduzi nke Kraịst, ga na-akwado anyị.—1 Pita 3:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya