Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite June 14
  • Izu Na-amalite June 21
  • Izu Na-amalite June 28
  • Izu Na-amalite July 5
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 6/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite June 14

Abụ nke 168

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa June. Jiri aro ndị dị na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na o kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 15 na Teta! nke July 8. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-agba àmà n’ógbè azụmahịa. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ nke iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu mee ihe.

20 min: “Jehova Na-enyere Ndị Na-atụkwasị Ya Obi Aka.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke May 2000, peeji nke 5, paragraf nke 14–15, na akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 67, paragraf nke 1.

15 min: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Zere Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peeji nke 272–281. Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe “maka ntụrụndụ” bụ ihe a na-eme n’ebe nile. Ọtụtụ ndị na-ekwusi ike na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ adịghị ize ndụ; ụfọdụ na-ekwudị ka e mee ka ọ bụrụ ihe iwu kwadoro. Kwuo otú anyị pụrụ isi soro ndị dị otú ahụ tụgharịa uche.

Abụ nke 179 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 21

Abụ nke 29

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Ndị Mmụọ Ozi Na-enyere Anyị Aka.”b Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

20 min: Amamihe nke Sitere n’Elu Nwere Ezi Uche. (Jems 3:17) Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 251–252. Gịnị ka inwe ezi uche pụtara? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa n’ozi anyị? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Pọl onyeozi? Olee otú ndị nkwusa pụrụ isi chebara nzụlite nke ndị nọ n’ókèala ha echiche? Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị a na-amụrụ Bible aka igosipụta ezi uche? Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kọọ ahụmahụ ndị na-egosi uru iji ezi uche na-amalite mkparịta ụka n’ozi bara.

Abụ nke 53 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 28

Abụ nke 139

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa June. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe (ma ọ bụrụ na o kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu), mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 1. N’ihe ngosi ahụ, mee ka onye nkwusa ahụ jiri okwu dị nkenke nke e ji ihu enyi kwuo, malite okwu ya. Kwuo na ime otú ahụ pụrụ inye aka n’ime ka ahụ́ ruo onye nwe ụlọ ala.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

18 min: “Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ—Ihe Mere O Ji Dị Anyị Mkpa.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’isiokwu bụ́ “Nyere Onye Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Gị Aka,” bụ́ nke pụtara na peeji nke 1 nke Ozi Alaeze Anyị nke November 2002.

Abụ nke 20 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 5

Abụ nke 3

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Gịnị Ka Ị Ga-ekwu? Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. N’ime ọnwa July na August, anyị ga-enyefe broshuọ. Olee broshuọ ndị nkwusa hụtaworo dị ka ndị na-adị irè n’ókèala unu? Tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha n’Ozi Alaeze Anyị nke July 1997, peeji nke 4, Ozi Alaeze Anyị nke October 2003, peeji nke 8, ma ọ bụ ná mbipụta ndị ọzọ gara aga nke Ozi Alaeze Anyị. Mee ka ọ pụta ìhè na ụzọ iche ihe n’ihu nke ọ bụla na-agụnye (1) ajụjụ, (2) otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, na (3) otu isi ihe sitere n’akwụkwọ ahụ a ga-enyefe. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị ahụ a tụrụ aro ha. Gbaa mmadụ nile ume iji Bible na-eme ihe mgbe ha na-ezi ozi ọma.

20 min: Ihe Dị Ụmụaka Mkpa Inweta n’Aka Ndị Mụrụ Ha. Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, peeji nke 6–7. Ọ dị mkpa ụmụaka ịmụta ụkpụrụ Bible ndị na-achịkwa ezi ofufe na ịghọta òkè bụ́ isi ndị mụrụ ha na-ekere n’ịzụlite ha. Tụlee aro ndị a tụrụ banyere ụzọ a ga-esi na-amụ akwụkwọ ahụ. Gwa ndị mụrụ ụmụ ka ha kwuo otú ha siworo na-eji akwụkwọ ahụ e ji amụ ihe eme ihe. Mee ka otu nwatakịrị ma ọ bụ abụọ kwuo ihe mere akwụkwọ a ji amasị ha.

Abụ nke 65 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya