Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
ỤMỤ anụmanụ apụghị ime ihe ị na-eme ugbu a. Otu onye n’ime mmadụ 6 ọ bụla amaghị otú e si agụ ihe—ọ na-abụkarị n’ihi enweghị ohere iji gaa akwụkwọ—n’ime ndị maara agụ ihe, ọtụtụ adịghị eme otú ahụ mgbe nile. Ma, gị inwe ike ịgụ akwụkwọ na-eme ka o kwe gị omume isi n’ụzọ dị otú a jee n’ala ndị ọzọ, izute ndị ndụ ha pụrụ ime ka nke gị ka mma, na inweta ihe ọmụma bara uru nke ga-enyere gị aka ịnagide nchegbu nke ndụ.
Ihe ị na-agụrụ ụmụ gị pụrụ inye aka n’ịkpụzi ụdị mmadụ ha ga-abụ
Ikike ịgụ ihe na-enwe mmetụta n’otú onye na-eto eto ga-eriteru uru n’agụmakwụkwọ ya. Mgbe ọ na-achọ ọrụ, ikike ịgụ ihe ya pụrụ inwe mmetụta n’ụdị ọrụ o nwere ike inweta na awa ole ọ ga-arụ ọrụ iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Ndị nwunye na-agụ ihe nke ọma na-enwe ike ilekọta ezinụlọ ha karị n’ihe banyere ezigbo ihe oriri na-edozi ahụ́, idebe ihe ọcha, na mgbochi ọrịa. Ndị nne maara agụ ihe nke ọma pụkwara inwe mmetụta dị mma n’uto ọgụgụ isi nke ụmụ ha.
Otú ọ dị, uru kasịnụ a na-erite n’ịgụ ihe bụ na ọ pụrụ ime ka ị ‘chọta ihe ọmụma Chineke.’ (Ilu 2:5) Ọtụtụ n’ime ụzọ anyị si ejere Chineke ozi na-agụnye ikike ịgụ ihe. A na-agụ Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị dabeere na Bible ná nzukọ ọgbakọ. Otú i si agụ ihe na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ịdị irè gị n’ozi ubi. Ịkwadebe maka ihe omume ndị a na-agụnyekwa ịgụ ihe. N’ihi nke ahụ, uto ime mmụọ gị dabeere nke ukwuu n’àgwà gị n’ebe ịgụ ihe dị.
Jiri Ohere E Nwere Mee Ihe nke Ọma
Mụta ịbụ onye na-agụ ihe n’ihu ọha nke na-akpọpụta okwu nke ọma
Ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-amụ banyere ụzọ Chineke agụghị oké akwụkwọ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ịkụziri ha ịgụ ihe iji mee ka ha nwekwuo ọganihu ime mmụọ. Ma ọ bụ enyemaka onwe onye pụrụ ịdị ha mkpa iji meziwanye nkà ịgụ ihe ha. N’ebe ọ dị mkpa, ọgbakọ na-agbalị ihazi klas ịgụ ihe na ide ihe nke dabeere n’akwụkwọ bụ́ How to Read and Write nke dị na Bekee. Ọtụtụ puku mmadụ eritewo uru nke ukwuu site ná ndokwa a. N’ihi mkpa inwe ike ịgụ ihe nke ọma dị, ọgbakọ ụfọdụ na-eme ndokwa ka e nwee klas maka imeziwanye otú e si agụ ihe, bụ́ nke a na-enwe n’otu oge ahụ a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọbụna n’ebe a na-enweghị klas ndị dị otú ahụ, mmadụ pụrụ inwe ezi ọganihu site n’iwepụta oge ụfọdụ kwa ụbọchị iji gụpụta ihe agụpụta na site n’ịgachi ụlọ akwụkwọ anya na ikere òkè na ya.
N’ụzọ dị mwute, ihe ndị na-atọ ọchị nakwa telivishọn, tinyere ihe ndị ọzọ, emewo ka ọtụtụ ndị na-eleghara ịgụ ihe anya ná ndụ ha. Ikiri telivishọn na adịghị agụkebe ihe ọgụgụ pụrụ igbochi ọganihu mmadụ na-enwe n’ịgụ ihe nakwa ikike ya iche echiche na ịkọwa onwe ya nke ọma.
“Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta mbipụta ndị na-enyere anyị aka ịghọta Bible. Ha na-enye ihe ọmụma bara ụba banyere ihe ime mmụọ ndị dị oké mkpa. (Mat. 24:45; 1 Kọr. 2:12, 13) Ha na-emekwa ka anyị mata ihe dị mkpa na-emegasị n’ụwa na ihe ha pụtara, na-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị e kere ekere nke ọma karị, na-akụzikwara anyị ụzọ ndị anyị pụrụ isi nagide ihe ndị na-echegbu anyị. Nke kasịnụ, ha na-elekwasị anya n’otú anyị ga-esi jeere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anara nke ọma ma nweta ihu ọma ya. Ịgụ ihe ziri ezi dị otú ahụ ga-enyere gị aka ito eto dị ka onye mmụọ nsọ na-achị.
N’ezie, ikike ịgụ ihe nke ọma abụghị omume ọma n’onwe ya. Ọ dị mkpa ka e jiri nkà ahụ mee ihe n’ụzọ ziri ezi. Dịkwa ka iri nri, a ghaghị ịhọrọ ihe a na-agụ ahọrọ. Gịnị mere ị ga-eji rie nri na-adịghị edozi ahụ́ n’ezie ma ọ bụ nke pụrụ ọbụna ịbụrụ gị nsí? N’ụzọ yiri nke ahụ, gịnị mere ị ga-eji na-agụ, ọbụna ná ndaba, ihe pụrụ imerụ uche na obi gị? Ụkpụrụ Bible kwesịrị ịbụ ihe ndabere maka ikpebi ihe ọgụgụ ọ bụla anyị na-ahọrọ. Tupu i kpebie ihe ị ga-agụ, buru n’uche akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Eklisiastis 12:12, 13; Ndị Efesọs 4:22-24; 5:3, 4; Ndị Filipaị 4:8; Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Jọn 2:15-17; na 2 Jọn 10.
Jiri Ezi Ebumnobi Na-agụ Ihe
Mkpa ọ dị iji ezi nzube agụ ihe na-apụta ìhè ma ọ bụrụ na e nyochaa ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, n’Oziọma Matiu, anyị na-ahụ ka Jizọs na-ajụ ndị ndú okpukpe maara ihe nke ọma ajụjụ ndị dị ka “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị?” na “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị nke a?” tupu ya esite n’Akwụkwọ Nsọ zaa ha ajụjụ aghụghọ ha. (Mat. 12:3, 5; 19:4; 21:16, 42; 22:31) Otu ihe anyị na-amụta site na nke a bụ na ọ bụrụ na nzube anyị ji agụ ihe ezighị ezi, anyị pụrụ iru ná nkwubi okwu na-ezighị ezi ma ọ bụ ghara ịghọta ihe ọ na-ekwu ma ọlị. Ndị Farisii nọ na-agụ Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ha chere na site n’ịgụ ya, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi. Dị ka Jizọs mere ka ọ pụta ìhè, a dịghị enye ndị na-ahụghị Chineke n’anya ma nabata ụzọ O si enye nzọpụta ụgwọ ọrụ ahụ. (Jọn 5:39-43) Ebumnobi ndị Farisii bụ ịchọ ọdịmma onwe ha nanị; n’ihi ya, ọtụtụ n’ime nkwubi okwu ha ruru ezighị ezi.
Ịhụnanya maka Jehova bụ nzube kasị zie ezi anyị pụrụ inwe maka ịgụ Okwu ya. Ịhụnanya dị otú ahụ na-akpali anyị ịmụ uche Chineke, n’ihi na ịhụnanya “na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ.” (1 Kọr. 13:6) Ọ bụrụgodị na ịgụ ihe adịbughị amasị anyị, iji ‘uche anyị dum’ hụ Jehova n’anya ga-akwali anyị iji uche anyị rụsie ọrụ ike iji nweta ihe ọmụma Chineke. (Mat. 22:37) Ịhụnanya na-akpali mmasị, mmasị na-akpalikwa ịmụ ihe.
Chebara Otú I si Agụ Ihe Ngwa Ngwa Echiche
Ịgụ ihe na ịrịba ihe ama na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọbụna ugbu a ị na-agụ ihe, ị na-amata okwu dị iche iche ma na-echeta ihe ha pụtara. Ị pụrụ ịgụ ihe ngwa ngwa karị ma ọ bụrụ na i mee ka ihe ị na-arịba ama n’otu mgbe hikwuo nne. Kama ịkwụsịtụ iji lee mkpụrụ okwu nke ọ bụla anya, gbalịa ịhụ ọtụtụ okwu n’otu mgbe. Ka ị na-azụlitekwu ikike a, ị ga-achọpụta na ị na-aghọta ihe ị na-agụ n’ụzọ ka mma.
Ịgụkọ ihe ọnụ na-eme ka ndị òtù ezinụlọ dị n’otu karị
Otú ọ dị, mgbe ị na-agụ ihe sitụrụ ike, ihe ị ga-enweta site ná mgbalị gị pụrụ ihikwu nne site n’iji ụzọ dị iche mee ihe. Ka ọ na-enye Jọshụa ndụmọdụ banyere ọgụgụ ọ ga-agụ Akwụkwọ Nsọ, Jehova sịrị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ghaghịkwa ịgụ ya n’olu dị ala.” (Josh. 1:8, NW) Mmadụ na-ekwukarị okwu n’olu dị ala mgbe ọ na-echemiri ihe echiche. Ya mere, okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịgụ n’olu dị ala’ bụkwa nke a na-asụgharị ‘ịtụgharị uche.’ (Ọma 63:6; 77:12; 143:5) Mgbe mmadụ na-atụgharị uche, ọ na-echemi echiche echemi; ọ naghị adị ya ngwa ngwa. Iji ichemi echiche agụ ihe na-eme ka Okwu Chineke nwee mmetụta ka ukwuu n’uche na n’obi. Bible nwere amụma, ndụmọdụ, ilu, uri, okwu amamikpe Chineke, nkọwa ndị miri emi banyere nzube Jehova, na ọtụtụ ihe atụ mere eme—ha nile baara ndị chọrọ ịga ije n’ụzọ Jehova uru. Lee ka o si baa uru ịgụ Bible n’ụzọ ga-ekwe ka ọ bamie abami n’uche na n’obi gị!
Mụta Itinye Uche n’Ihe
Àgwà gị n’ebe ịgụ ihe dị na-emetụta uto ime mmụọ gị
Ka ị na-agụ ihe, were ya na ị nọ n’ọnọdụ nke ọ bụla a na-akọwa. Gbalịa iji anya nke uche gị hụ ndị a kpọtụrụ aha, jirikwa uche gị kere òkè n’ihe ndị na-eme ná ndụ ha. Nke a na-adịtụ mfe mgbe a na-agụ ihe ndekọ dị ka nke bụ́ banyere Devid na Golaiat, bụ́ nke e dekọrọ na 1 Samuel isi 17. Ma ọbụna ụmụ irighiri ihe dị n’Ọpụpụ na Levitikọs banyere owuwu nke ụlọikwuu ma ọ bụ nhiwe e hiwere òtù ndị nchụàjà ga-akpali mmasị mgbe i ji anya nke uche na-ahụ otú akụkụ ya dị iche iche hà na ihe ndị e ji wuo ya ma ọ bụ chee otú ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ọka a hụrụ n’ọkụ, na anụmanụ ndị e chere n’ihu dị ka àjà nsure ọkụ si esi. Chee echiche otú ọ ga-esiworị na-emenye ụjọ ije ozi dị ka onye nchụàjà! (Luk 1:8-10) Iji ikike iche echiche gị na uche gị na-eme ihe n’ụzọ dị otú a ga-enyere gị aka ịghọta ịdị mkpa nke ihe ị na-agụ, ọ ga-abụkwa ihe na-enye aka icheta ihe.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, uche gị pụrụ ịkpafu mgbe ị na-agbalị ịgụ ihe. Anya gị pụrụ ịdị na-ele akwụkwọ, ma echiche gị pụrụ ịdị ebe ọzọ. Egwú ọ̀ na-akpọ? À gbanyere telivishọn? Ndị ezinụlọ gị hà na-akparịta ụka? Ọ bụrụ na o kwe mee, ọ kasị mma ịgụ akwụkwọ n’ebe mkpọtụ na-adịghị. Otú ọ dị, ihe ndọpụ uche pụrụ isite n’ahụ́ nke gị onwe gị. Eleghị anya i zutụdịghị ike n’ụbọchị ahụ. Lee nnọọ ka o si adị mfe iji obi gị gaghachi n’ihe ndị i mere n’ụbọchị! N’ezie, ọ dị mma ịtụleghachi ihe ndị mere n’ụbọchị—ma, ọ bụghị mgbe ị na-agụ ihe. Eleghị anya obi gị dị n’ihe ị na-agụ ná mmalite, ma ọ bụ ọ pụrụ ọbụna ịbụ na i ji ekpere malite ịgụ ihe gị. Ma ka ị na-agụ ihe, uche gị na-amalite ịkpafụ. Gbalịa ọzọ. Zụọ onwe gị ime ka uche gị dịgide n’ihe ị na-agụ. Nke nta nke nta, ị ga-ahụ ọganihu.
Gịnị ka ị na-eme mgbe i rutere n’okwu ị na-aghọtaghị? A pụrụ ịkọwa ma ọ bụ tụlee okwu ụfọdụ ị na-amaghị n’ihe odide ahụ. Ma ọ bụ ị pụrụ inwe ike ịghọta ihe ha pụtara site n’okwu ndị dị gburugburu ha. Ma ọ́ bụghị otú ahụ, wepụta oge lee okwu ahụ n’akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụrụ na ọ dị, ma ọ bụ kanye okwu ahụ akara ka i wee nwee ike ịjụta mmadụ ihe ọ pụtara mgbe e mesịrị. Nke a ga-eme ka okwu ndị ị maara hiwanye nne ma nye aka ime ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ.
Ịgụ Ihe n’Ihu Ọha
Nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha
Mgbe Pọl onyeozi gwara Timoti ka ọ nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe, Pọl na-ezo aka kpọmkwem n’ịgụ ihe maka abamuru ndị ọzọ. (1 Tim. 4:13) Ịgụ ihe n’ihu ọha n’ụzọ dị irè gụnyere ihe karịrị nanị ịkpọpụta okwu ndị dị na peeji. Ọ dị onye na-agụ ihe mkpa ịghọta ihe okwu ndị ahụ pụtara na ịghọta echiche ndị ha na-akọwapụta. Nanị mgbe o mere nke ahụ ka ọ ga-enwe ike mee ka echiche ndị dị na ya pụta n’ụzọ ziri ezi ma wepụta mmetụta ndị dị na ya nke ọma. Otú ọ dị, nke a chọrọ ezi nkwadebe na mmụgharị ihe. N’ihi ya, Pọl gbara ume, sị: “Nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha.” Ị ga-enweta ọzụzụ bara uru na nkà dị otú a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
Wepụta Oge Iji Gụọ Ihe
“Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” (Ilu 21:5) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ihe banyere ọchịchọ anyị nwere ịgụ ihe! Iji rite ‘uru’ ahụ, ọ dị anyị mkpa ime atụmatụ n’ụzọ dị nkọ ka ihe omume ndị ọzọ hapụ iwekọrọ oge anyị ji agụ ihe.
Olee mgbe i ji agụ akwụkwọ? Ị̀ na-erite uru site n’ịgụ akwụkwọ n’isi ụtụtụ? Ka ị̀ na-aka adị nkọ ma oge gamikwuo n’ụbọchị? Ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụta ọbụna minit 15 ma ọ bụ 20 kwa ụbọchị iji gụtụ akwụkwọ, ihe ị ga-enwe ike ịgụzu ga-atụ gị n’anya. Isi ihe dị na ya bụ ime ya mgbe nile.
N’ihi gịnị ka Jehova jiworo họrọ ime ka e detuo nzube ya dị ebube n’akwụkwọ? Ọ bụ ka ndị mmadụ wee nwee ike ile ihe Okwu ya e dere ede na-ekwu. Nke a na-eme ka ha nwee ike ịtụle ọrụ ebube Jehova, ịkọrọ ha ụmụ ha, na icheta ihe dị iche iche Chineke na-eme. (Ọma 78:5-7) Ụzọ kasị mma isi gosipụta ekele anyị nwere maka mmesapụ aka Jehova n’okwu a bụ site n’ụzọ anyị si agbalịsi ike ịgụ Okwu ya nke na-enye ndụ.