Kalenda 2011 Gosiri Uru Ofufe Ezinụlọ Bara
Isi ihe kalenda anyị nke afọ 2011 na-ekwu maka ya bụ Ofufe Ezinụlọ. Na kalenda ahụ, e gosiri ezinụlọ ndị e nwere n’oge a na ezinụlọ ndị yiri ha n’oge Baịbụl. E gosikwara ebe ndị ohu Jehova, ma ndị bụ́ di na nwunye ma ndị nke na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, na-amụ Okwu Chineke.
Ịmụ iwu Jehova tọrọ ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị e sere na kalenda ahụ, ụtọ. Nke a nyekwaara ha aka idi nsogbu ndị bịaara ha. (Ọma 1:2, 3) Ka anyị na-ekiri foto nke ọ bụla na kalenda ahụ, ọ ga na-echetara anyị na ọ dị mkpa ịna-enwe Ofufe Ezinụlọ, ma ezinụlọ anyị ò buru ibu ma ọ̀ dị obere, ma ndị ezinụlọ anyị niile hà bụ Ndịàmà ma ọ bụ na e nwere ndị nke na-abụghị Ndịàmà. Na kalenda ahụ, e nwere ebe ị ga-ede mgbe ezinụlọ unu wepụtara maka Ofufe Ezinụlọ. Ì deela nke unu?