Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 27
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 27
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe E Mere 25-28
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchichị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. “Kalenda 2011 Gosiri Uru Ofufe Ezinụlọ Bara.” Okwu.
Nkeji 10: Otú Ihe Ndepụta Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka n’Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 167 ruo peeji nke 168, paragraf nke 1. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa na-ekwupụta ihe ọ na-atụgharị n’uche ya. Ọ ga-ekwu na ya chọrọ ịkwadebe otú ya ga-esi enyefe akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa ọzọ tupu ya agawa ozi ọma. Ọ ga-eji nkeji ole na ole kwuo otú ya ga-esi enyefe mmadụ akwụkwọ ahụ.
Nkeji 10: Isi Awọ́ Bụ Okpueze Mara Mma. (Ilu 16:31) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche August, 15, 2008, peeji nke 19-20, paragraf nke 13-16. Ị kọchaa ahụmahụ nke ọ bụla, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Magazin na Jenụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ dị na ha, ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ na amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ya ma ha nyefewe magazin nke ọ bụla. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.