Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 6-7
“Ugbu A, Ị Ga-ahụ Ihe M Gaje Ime Fero”
it-2 436 ¶3
Mozis
E nwekwara ezigbo mgbanwe n’ebe ụmụ Izrel nọ. Na mbụ, ha nabatara Mozis, ma mgbe Fero nyere iwu ka e mee ka ọrụ ha sikwuoro ha ike, ha malitere ime mkpesa megide Mozis ruo na nke na ike gwụrụ ya, ya akpọkuo Jehova. (Ọpụ. 4:29-31; 5:19-23) Ọ bụzi mgbe ahụ ka Onye Kasi Elu kpugheere ya na oge eruola ka ya mezuo ihe ahụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb tụrụ anya ya. Ihe ahụ ha tụrụ anya ya bụ ịnapụta mba Izrel, mee ka ha banye n’ala nkwa ahụ ma ghọọ mba dị ukwuu. Ihe a o kpugheere Mozis gbara ya ume. (Ọpụ. 6:1-8) Ma, ndị Izrel egeghị Mozis ntị. Ma, mgbe e tichara ndị Ijipt ihe otiti nke itoolu, ha kwadosiwere Mozis ike, na-ege ya ntị nke na mgbe e tichara ndị Ijipt ihe otiti nke iri, o nweliri ike ịhazi ha n’usoro, “dị ka ndị agha.”—Ọpụ. 13:18.
it-2 436 ¶1-2
Mozis
N’Ihu Fero Ijipt. Jehova ji Mozis na Erọn mee ka a mata na chi ndị Ijipt abụghị ezi Chi. Fero ji ndị dibịa anwansi, ndị ọ ga-abụ na ndị isi ha bụ Janis na Jambris (2 Tim. 3:8), chọọ igosi na chi ndị Ijipt karịrị Jehova ike. Ọrụ ebube mbụ Mozis gwara Erọn ka ọ rụọ n’ihu Fero gosiri na Jehova karịrị chi ndị Ijipt ike, ma Fero kpọchikwuru obi ya. (Ọpụ. 7:8-13) Mgbe Jehova mechara tie ha ihe otiti nke atọ, ndị dibịa anwansi ahụ kwuru sị: “Ọ bụ mkpịsị aka Chineke!” Etuto ọjọọ e ji tie ha ihe otiti nyere ha ezigbo nsogbu n’ahụ́ nke na ha enweghịdị ike ịpụta n’ihu Fero iji megide Mozis n’oge ahụ.—Ọpụ. 8:16-19; 9:10-12.
Ihe otiti iri ahụ mere ka ụfọdụ hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka ụfọdụ nupụkwuoro ya isi. Ọ bụ Mozis na Erọn na-ekwu mgbe a ga-enwe ihe otiti nke ọ bụla n’ime Ihe Otiti Iri ndị ahụ. Ihe otiti ndị ahụ na-abịa mgbe ha kwuru na ha ga-abịa. Nke a na-egosi na Mozis bụ onye nnọchiteanya Jehova. A kpọsara aha Jehova n’Ijipt, ọtụtụ mmadụ kwukwara gbasara ya. O mere ka ndị Izrel na ụfọdụ ndị Ijipt hụ Jehova n’anya, meekwanụ ka Fero, ndị ndụmọdụ ya na ndị na-akwado ya kpọchie obi ha. (Ọpụ. 9:16; 11:10; 12:29-39) Ndị Ijipt ma na ọ bụ Jehova na-emesi chi ha ike, ha ekwetaghị na ihe kpatara ihe otiti ndị ahụ bụ n’ihi na ha nupụụrụ chi ha isi. Ka e tichara ndị Ijipt ihe otiti itoolu, Mozis abụrụla “nnọọ nnukwu mmadụ n’ala Ijipt, n’anya ndị na-ejere Fero ozi nakwa n’anya ndị Ijipt.”— Ọpụpụ 11:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 78 ¶3-4
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile
Jehova kwuru gbasara utu aha ya bụ́ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” mgbe ọ na-ekwe Ebreham nkwa na ọ ga-amụ Aịzik. Nkwa a chọrọ ka Ebreham nwee ezigbo okwukwe na Chineke nwere ike ọ ga-eji emezu ihe o kwuru. E mechakwara kwuo gbasara utu aha ahụ mgbe a na-ekwu na Chineke ga-agọzi Aịzik na Jekọb, bụ́ ndị nketa nke ọgbụgba ndụ ya na Ebreham gbara.— Jen. 17:1; 28:3; 35:11; 48:3.
Ọ bụ ya mere Jehova ji mechaa gwa Mozis, sị: “M na-apụta n’ihu Ebreham, Aịzik na Jekọb dị ka Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ma emeghị m ka ha mara m n’aha m bụ́ Jehova.” (Ọpụ. 6:3) Nke a apụtaghị na ndị nna ochie ndị ahụ amaghị aha a bụ́ Jehova, ebe ọ bụ na ma ha ma ndị ọzọ dịrị ndụ tupu hanwa kpọrọ ya ugboro ugboro. (Jen. 4:1, 26; 14:22; 27:27; 28:16) Nke bụ́ eziokwu bụ na n’akwụkwọ Jenesis, bụ́ nke kọrọ otú ndị nna ochie si bie ndụ, okwu bụ́ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” dị naanị ugboro isii, ebe aha Chineke bụ́ Jehova dị otu narị na iri asaa na abụọ n’Akwụkwọ Nsọ mbụ e ji asụsụ Hibru dee. Ọ bụ eziokwu na ndị nna ochie ndị ahụ ma ihe mere Chineke ji kwesị ka a na-akpọ ya “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” na ihe mere o ji ruo eru ịza ya, ha amachaghị ihe aha Chineke bụ́ Jehova pụtara.
it-2 435 ¶5
Mozis
Chineke ajụghị Mozis n’ihi ihere. Ma Mozis mere ihere. O kwuru na ya amaghị otú e si ekwu okwu nke ọma. Ị hụlanụ na Mozis agbanweela. Ọ bụghịzi Mozis ahụ chọrọ iji aka ya napụta ndị Izrel afọ iri anọ tupu mgbe ahụ. Ọ nọ na-arụ Jehova ụka. O mechara gwa Jehova ka o nye onye ọzọ ọrụ ọ chọrọ inye ya. Ọ bụ eziokwu na ihe a Mozis kwuru were Chineke iwe, ma ọ jụghị Mozis, kama ọ họpụtara Erọn nwanne ya ka ọ na-ekwuchitere ya ọnụ. Ebe Mozis na-anọchiteanya Chineke, ọ bụ ya mere o ji ghọọrọ Erọn “Chineke,” Erọn ana-ekwuchitekwanụ ọnụ Mozis. N’oge Mozis na Erọn na ndị okenye Izrel nwere nnọkọ, nakwa n’oge ndị ha gara hụ Fero, o nwere ike ịbụ na Chineke agwala Mozis ihe ndị ọ ga-eme, nyekwa ya iwu. Mozis agwazie Erọn ihe ndị ahụ, Erọn agwa ha Fero (Fero nke a nọchiri Fero nke ahụ dịrị ndụ afọ iri anọ gara aga tupu Mozis esi n’Ijipt gbaa ọsọ ndụ). (Ọpụ. 2:23; 4:10-17) Jehova mechara kwuo na Erọn bụ “onye amụma” Mozis. Nke a pụtara na ebe Mozis bụ onye amụma Jehova, Jehova ana-eduzi ya, n’ihi ya, Mozis kwesịrị ịna-eduzi Erọn. Ihe ọzọ bụ na Chineke gwara Mozis na ya emeela ka ọ bụụrụ “Fero Chineke.” Nke a pụtara na Jehova nyere ya ike na ikike ọ ga-eji agwa Fero okwu. N’ihi ya, o nweghịzi ihe kwesịrị ime ka ọ na-atụ eze Ijipt a ụjọ.—Ọpụ. 7:1, 2.
JULAỊ 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 8-9
“Fero Onye Mpako Amaghị na Ọ Na-emezu Nzube Chineke”
it-2 1040-1041
Isi Ike
A bịa n’otú Jehova Chineke si na-emeso ndị mmadụ ihe, ọ hapụrụ ndị mmadụ na mba dị iche iche ka ha dịrị ndụ n’ihi na ọ na-enwere ha ndidi, ọ bụ eziokwu na ha kwesịrị ọnwụ. (Jen. 15:16; 2 Pita 3:9) Ma e nwere ndị rubeere Chineke isi, ya emeere ha ebere. (Josh. 2:8-14; 6:22, 23; 9:3-15) E nwekwara ndị nke mere ka obi ha kpọkwuo nkụ iji megidedị Jehova na ndị na-efe ya. (Diut. 2:30-33; Josh. 11:19, 20) Ebe ọ bụ na Jehova anaghị egbochi ndị mmadụ ime isi ike, Baịbụl kwuru na ọ ‘na-ahapụ ka ha kwesie olu ike’ ma ọ bụ ‘kwe ka obi ha kpọchie.’ Mgbe Chineke ga-emecha bibie ndị isi ike, ọ ga-egosi na o nwere ike dị ukwuu, meekwa ka a kpọsaa aha ya ebe niile.—Tụlee Ọpụ. 4:21; Jọn 12:40; Rom 9:14-18.
it-2 1181 ¶3-5
Ajọ Omume
N’ọnọdụ ụfọdụ, Jehova Chineke nwere ike iji ndị ajọ omume mezuo nzube ya, ma ha agaghị ama. Ọ bụ eziokwu na ha na-enupụrụ ya isi, o nwere ike igbochi ha ime ihe iji chebe ndị na-efe ya otú ọ chọrọ. O nwekwara ike ime ka e jiridị ihe ndị ajọ omume ndị ahụ na-eme gosi na ọ bụ onye ezi omume. (Rom 3:3-5, 23-26; 8:35-39; Ọma 76:10) Ihe a ka e kwuru n’Ilu 16:4. Ọ sịrị: “Jehova emewo ihe niile maka nzube ya, ee, ọbụna onye ajọ omume maka ụbọchị ihe ọjọọ.”
Otu ihe atụ bụ Fero ahụ Jehova si n’aka Mozis na Erọn gwa ka ọ hapụ ndị Izrel na-agbara ya ohu ka ha laa. Ọ bụghị Chineke mere ka eze Ijipt a bụrụ onye ọjọọ, ma o kwere ka ọ dịrị ndụ ma mee ka e nwee ihe ndị mere ka Fero ahụ gosi na ọ bụ onye ọjọọ na onye kwesịrị ọnwụ. Baịbụl kwuru ihe mere Jehova ji mee ihe ahụ n’Ọpụpụ 9:16. Ọ sịrị: “Ọ bụ nke a mere m ji debe gị ndụ, iji gosi gị ike m nakwa iji mee ka a kpọsaa aha m n’ụwa dum.”
Ihe Otiti Iri ahụ Chineke tiri ndị Ijipt na ọnwụ Fero na ndị agha ya mechara nwụọ n’Oké Osimiri Uhie gosiri na Jehova nwere ike dị ukwuu. (Ọpụ. 7:14–12:30; Ọma 78:43-51; 136:15) Mgbe ọtụtụ afọ ihe ndị ahụ mere gachara, mba ndị nọ gburugburu ka na-ekwu gbasara ha, e sikwa otú ahụ kwusaa aha Chineke n’ụwa niile. (Josh. 2:10, 11; 1 Sam. 4:8) A sị na Jehova gburu Fero ozugbo, o nweghị onye gaara ama gbasara ike Chineke nwere, nke mere ka e too aha ya, meekwa ka a na-apụta ndị ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 878
Odudu
Okwu Hibru e si sụgharịa ahụhụ ahụ e ji tie ndị Ijipt ihe otiti nke anọ na Baịbụl bụ ʽA·rov,ʹ ma e nweghị onye ma kpọmkwem ahụhụ ahụ. Ihe otiti nke anọ a bụ nke mbụ na-akpaghị ndị Izrel bi na Gọshen aka. (Ọpụ. 8:21, 22, 24, 29, 31; Ọma 78:45; 105:31) E sila ụzọ dị iche iche sụgharịa okwu Hibru ahụ n’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl. Ụfọdụ sụgharịrị ya “odudu” (JB, NW, Ro), “ébé” (Yg), “ijiji” (AS, KJ, RS), “anwụ” (AT), na “oké ijiji” (LXX).
Okwu Bekee a sụgharịrị “odudu” nwere ụdị dị iche iche. E nwere ndị nke na-atapu anụmanụ na mmadụ ahụ́ ma mịrị ọbara ha. E nwekwara ndị nke na-eyisa àkwá ha n’ahụ́ mmadụ na n’ahụ́ anụmanụ, ya emechaa ghọọ nje. Ndị nke na-ebunye mmadụ ọrịa na-anọ n’ebe na-ekpokarị ọkụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ìgwè odudo ndị ahụ e ji tie ndị Ijipt ihe otiti mekpọrọ ha na anụmanụ ha ọnụ. O gbudịrị ụfọdụ n’ime ha.
JULAỊ 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 10-11
“Fero Amaghị na Ọ Na-emezu Nzube Chineke”
it-2 436 ¶4
Mozis
Obi ike na okwukwe dị ya mkpa iji gakwuru Fero. Ọ bụ n’ike Jehova na mmụọ nsọ ya o nyere Mozis na Erọn ka ha ji nwee ike ịrụ ọrụ o nyere ha. Weregodị ya na ị na-ahụ obí eze Fero, bụ́ eze o doro onye ukwu na onye nta anya na ọ na-achị ụwa niile n’oge ahụ. Obí a dị ebube. Ị ga-ahụ Fero, bụ́ onye mpako na onye e weere ka chi, hụkwa ebe ndị ndụmọdụ ya, ndị isi agha ya, ndị nche ya, na ndị ohu ya gbara ya gburugburu. E nwekwara ndị ndú okpukpe na ndị dibịa anwansi. Ọ bụ ndị a kacha emegide Mozis. Ndị a niile bụ ndị ọnụ kacha eru n’okwu n’ebe niile Fero na-achị. Ha niile na-akwado Fero, si otú ahụ na-akwado chi dị iche iche ndị Ijipt na-efe. Mozis na Erọn bịakwara hụ Fero ọtụtụ ugboro. Mgbe ọ bụla ha bịara hụ Fero, obi ya na-akpọkwu nkụ n’ihi na o kpebisiri ike na ya emekataghị hapụ ndị Hibru na-agbara ya ohu ka ha laa. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Mozis na Erọn kwuru na a ga-enwe ihe otiti nke asatọ, a chụpụrụ ha n’ihu Fero. Mgbe e tichara ndị Ijipt ihe otiti nke itoolu, Fero gwara Mozis na Erọn ka ha ghara ịnwa anwa hụ ihu ya ọzọ, n’ihi na ha mee otú ahụ, a ga-egbu ha.—Ọpụ. 10:11, 28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 783 ¶5
Ọpụpụ
Jehova gosiri ike ya n’ụzọ dị ukwuu. Otú o si mee ya bụ ịnapụta ndị Izrel na ime ka e too aha ya. Mgbe ụkwụ ndị Izrel kpara n’ụsọ Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke Oké Osimiri Uhie, Mozis duuru ụmụ nwoke Izrel bụkuo Jehova abụ. Miriam nwanne ya, bụ́ onye amụma nwaanyị ejirikwanụ obere ịgbà na-agba egwú. Ụmụ nwaanyị ndị Izrel niile esoro ya jiri obere ịgbà na-agba egwú ma na-abụ abụ ụmụ nwoke Izrel na-abụ. (Ọpụ. 15:1, 20, 21) Jehova kewapụrụ ndị Izrel kpamkpam n’ebe ndị iro ha nọ. Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụta, Jehova ekweghị ka ma mmadụ ma anụ ọhịa merụọ́ ha ahụ́. O kweghịdị ka nkịta ọ bụla gbọọ ha ụja. (Ọpụ. 11:7) Ọ bụ eziokwu na akwụkwọ Ọpụpụ ekwughị na Fero so ndị agha ya banye n’osimiri ahụ, Chineke ebibie ha, ma Abụ Ọma nke 136:15 kwuru na Jehova “tụbara Fero na ìgwè ndị agha ya n’ime Oké Osimiri Uhie.”
JULAỊ 27–ỌGỌST 2
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 582 ¶2
Ememme Ngabiga
Ihe Otiti Iri ahụ e tiri ndị Ijipt bụ iji gosi na chi ha adịghị ike. Nke kacha gosi ya bụ ihe otiti nke iri, ya bụ, ọnwụ ụmụ e bu ụzọ mụọ. (Ọpụ. 12:12) Ndị Ijipt weere ebule ka chi ha a na-akpọ Ra. N’ihi ya, ifesa ọbara nwa atụrụ e ji eme Ememme Ngabiga n’awara ụzọ ha bụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt. Ihe ọzọkwa bụ na ndị Ijipt weere oké ehi ka chi ha a na-akpọ Osiris. Ogbugbu e gbukwara ụmụ oké ehi e bu ụzọ mụọ mechuru chi a ihu. A na-efekwa Fero ofufe ka ọkpara Ra. Ọnwụ ọkpara Fero gosiri na ma Fero ma Ra adịghị ike.
it-1 504 ¶1
Mgbakọ
Otu n’ime ihe pụrụ iche a na-eme ná “mgbakọ dị nsọ” niile ahụ bụ na n’oge a na-eme ha, ndị Izrel agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike. Dị ka ihe atụ, ụbọchị nke mbụ na ụbọchị nke asaa nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko bụ “mgbakọ dị nsọ.” Jehova kwuru banyere ya, sị: “A gaghị arụ ọrụ na ha. Ọ bụ naanị ihe dị mkpụrụ obi ọ bụla mkpa iri, naanị ihe ahụ ka a pụrụ ịkwadebere unu.” (Ọpụ. 12:15, 16) Ma, n’oge “mgbakọ dị nsọ,” ndị nchụàjà anaghị ezu ike, ha na-achụrụ Jehova ọtụtụ àjà. (Lev. 23:37, 38) Àjà ndị ahụ ha na-achụ apụtaghị na ha dara iwu kwuru ka mmadụ ghara ịrụ ọrụ ndị ọ na-arụ kwa ụbọchị n’oge a na-eme ememme ndi ahụ. Oge ememme ndị ahụ abụghị oge ndị mmadụ ji anọ nkịtị, kama ha na-eji ha eme ihe ndị na-abara ha uru n’ofufe Chineke. N’Ụbọchị Izu Ike a na-enwe kwa izu, ndị mmadụ na-abịakọta ọnụ iji fee Chineke na iji nụrụ ihe ndị ọ chọrọ ka ha na-eme. Okwu Chineke a na-agụpụtara ha ma kọwaara ha na-agba ha ezigbo ume. Ọ bụkwa ihe a na-eme n’ụlọ nzukọ ndị e mechara nwee. (Ọrụ 15:21) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ndị Izrel anaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike n’Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ a na-enwe “mgbakọ dị nsọ,” ha na-eji oge ahụ ekpe ekpere ma na-echebara Onye kere ha na nzube ya echiche.—Gụọkwa MGBAKỌ.