AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 23-24
Esola Ìgwè Mmadụ
Jehova dọrọ ndị akaebe na ndị ikpe aka ná ntị ka ha ghara ikwe ka ìgwè mmadụ mee ka ha gbaa akaebe ụgha ma ọ bụ kpee ikpe na-ezighị ezi. Ihe a ọ gwara ha gbasakwara ihe ndị ọzọ a na-eme ná ndụ. Ụwa na-agbalị mgbe niile ka Ndị Kraịst na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà ka ha.—Rom 12:2.
Gịnị mere na ọ dịghị mma iso ìgwè mmadụ mgbe
a kọọrọ anyị asịrị ma ọ bụ akụkọ na-erijughị afọ?
anyị na-ahọrọ ụdị uwe anyị ga-eyi, ụdị isi anyị ga-akpụ ma ọ bụ mee, ma ọ bụkwanụ ihe ndị anyị ga-eji atụrụ ndụ?
anyị na-eche banyere ndị anyị na ha na-esighị n’otu agbụrụ ma ọ bụ obodo, ndị anyị ka jiri ego ma ọ bụ ndị ka anyị jiri ego nakwa mgbe anyị na-emeso ha ihe?