Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb22 Mach p. 13
  • Nsogbu Ọ Bụla Nwere Ụbọchị Ọ Ga-ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsogbu Ọ Bụla Nwere Ụbọchị Ọ Ga-ebi
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-enyere Anyị Aka Mgbe Nsogbu Bịaara Anyị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jiri Ndidi Na-echere Jehova
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
mwb22 Mach p. 13
Foto ndị si na vidio bụ́ “Ndị Jehova Dị n’Otu n’Ụwa A Ọtụtụ Ndị Na-adịghị n’Otu.” 1. Ebe naanị ìgwè ụmụnna ndị isi ojii nọ ná mgbakọ. 2. Ebe ụmụnna ndị isi ojii na ndị ọcha nọkọtara ọnụ see foto. 3. Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-esighị n’otu agbụrụ, na-abụghịkwa ọgbọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nsogbu Ọ Bụla Nwere Ụbọchị Ọ Ga-ebi

Nsogbu nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi, karịchaa ma ọ nọtee aka. Devid maara na nsogbu Eze Sọl na-enye ya ga-emecha kwụsị nakwa na ya ga-abụ eze otú Jehova kwere ya ná nkwa. (1 Sam. 16:13) Okwukwe Devid mere ka o nwee ndidi ma chere Jehova.

Anyị nọrọ ná nsogbu, anyị nwere ike iji akọ na amamihe mee ihe ga-enyere anyị aka ịpụta ná nsogbu ahụ. (1 Sam. 21:​12-14; Ilu 1:4) Ma, nsogbu ụfọdụ ka nwere ike ịdịgide n’agbanyeghị na anyị esila n’ụzọ niile Baịbụl kwadoro mee ihe niile anyị nwere ike ime banyere ha. Ọ́ dị otú ahụ, anyị kwesịrị inwe ndidi ma chere Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akwụsị ahụhụ niile anyị na-ata, ‘hichapụkwa anya mmiri niile’ dị anyị n’anya. (Mkpu. 21:4) Ma nsogbu anyị ọ̀ kwụsịrị n’ihi na Jehova nyeere anyị aka ma ọ bụ n’ihi ihe ọ bụla ọzọ, otu ihe doro anya bụ: Nsogbu ọ bụla nwere ụbọchị ọ ga-ebi. Icheta ihe a ga-akasi anyị obi ma nsogbu bịara anyị.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ JEHOVA DỊ N’OTU N’ỤWA A ỌTỤTỤ NDỊ NA-ADỊGHỊ N’OTU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu bịaara ụfọdụ Ndị Kraịst bi n’ebe ndịda Amerịka?

  • Olee otú ha si gosi na ha nwere ndidi na ịhụnanya?

  • Olee otú ha si nọgide na-elekwasị anya ‘n’ihe ndị ka mkpa’?​—Fil. 1:10

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya